ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 30
Na-ahụkwu Jehova na Ndị Ọzọ n’Anya
“Ka ịhụnanya mee ka anyị tozuo etozuo n’ụzọ niile.” —EFE. 4:15.
ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee ihe ndị ị mụtara mgbe ị malitere ịmụ Baịbụl?
Ì CHETARA mgbe ị malitere ịmụ Baịbụl? O nwere ike ịbụ na o juru gị anya mgbe ị matara na Chineke nwere aha. O nwekwara ike ịbụ na obi ruru gị ala mgbe ị matara na Chineke anaghị ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Ọ ga-abụkwa na ọ tọgburu gị atọgbu mgbe ị mụtara na i nwere ike ịhụ ndị gị nwụrụ anwụ ọzọ, gị na ha ebiri n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.
2. E wezụga ịmụta eziokwu dị na Baịbụl, olee ihe ndị ọzọ i merela? (Ndị Efesọs 5:1, 2)
2 Ka ị na-amụkwu Okwu Chineke, ị bịara na-ahụkwu Jehova n’anya. Otú ahụ i si na-ahụkwu Jehova n’anya mere ka ị na-eme ihe ndị ị na-amụta. Ihe ndị Baịbụl kwuru enyerela gị aka ịna-ekpebi ihe ndị dị mma. Ị mụtala ịna-eche echiche dị mma na ịna-eme ihe ndị dị mma n’ihi na ị chọrọ ịna-eme ihe ga na-eme Jehova obi ụtọ. Otú ahụ nwatakịrị si agbalịsi ike ịna-eme ka nne ya ma ọ bụ nna ya hụrụ ya n’anya, gịnwa bidokwara ịna-eme ka Nna gị nke eluigwe.—Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2.
3. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị?
3 Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ hụrụ Jehova n’anya ugbu a karịa mgbe m ghọrọ Onye Kraịst ọhụrụ? Kemgbe m mere baptizim, m̀ na-egosikwu ụmụnna m na m hụrụ ha n’anya, si otú ahụ na-egosi na m na-emekwu ka Jehova?’ Ọ bụrụ na ‘ị hụghịzi Chineke n’anya otú ị hụrụ ya na mbụ,’ ike agwụkwala gị. Ụdị ihe ahụ mere Ndị Kraịst n’oge ndịozi. Jizọs ajụghị ha. Ọ gaghịkwa ajụ anyị. (Mkpu. 2:4, 7) Ọ ma na anyị nwere ike ịmalite hụwa Jehova n’anya otú anyị hụrụ ya mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu.
4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
4 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi na-ahụkwu Jehova na ndị ọzọ n’anya. Anyị ga-ahụkwa uru ịhụkwu Jehova na ụmụnna anyị n’anya ga-abara anyị.
NA-AHỤKWU JEHOVA N’ANYA
5-6. Olee ihe ndị siiri Pọl onyeozi ike mgbe ọ na-eje ozi ya? Gịnị mere ka ọ nọsie ike n’ozi ọ na-ejere Jehova?
5 Obi dị Pọl onyeozi ụtọ ife Jehova. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ dịịrị ya mfe. Ọtụtụ mgbe, Pọl gara ebe dị ezigbo anya. Ime njem n’oge ahụ adịghị mfe. N’ụfọdụ njem Pọl mere, ọ ‘hụsiri anya ma n’osimiri ma n’aka ndị ohi.’ E nwekwara mgbe ndị mmegide tiri ya ihe. (2 Kọr. 11:23-27) Ọ bụghịkwa mgbe niile ka ụmụnna mere ihe gosiri na obi dị ha ụtọ maka mbọ ọ na-agba inyere ha aka.—2 Kọr. 10:10; Fil. 4:15.
6 Gịnị nyeere Pọl aka ịnọsi ike n’ozi Jehova? Pọl si na Baịbụl nakwa n’ihe ndị mere ná ndụ ya mụta àgwà ndị Jehova nwere. Obi siri Pọl ike na Jehova hụrụ ya n’anya. (Rom 8:38, 39; Efe. 2:4, 5) O mekwara ka ọ hụ Jehova n’anya nke ukwuu. Otú Pọl si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya bụ ‘ijere ndị nsọ ozi ma ka na-ejere ha ozi.’—Hib. 6:10.
7. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi na-ahụkwu Jehova n’anya?
7 Ọ bụrụ na anyị ana-amụsi Baịbụl ike, anyị ga na-ahụkwu Chineke n’anya. Ka ị na-agụ Baịbụl, gbalịa ka ị chọpụta ihe ebe ị na-agụ na-akụziri gị gbasara Jehova. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ebe a si egosi na Jehova hụrụ m n’anya? Olee ihe ndị ọ na-agwa m mere m kwesịrị iji hụ Jehova n’anya?’
8. Olee otú ekpere nwere ike isi nyere anyị aka ịna-ahụkwu Chineke n’anya?
8 Ụzọ ọzọ anyị nwere ike isi na-ahụkwu Jehova n’anya bụ ịna-ekpe ekpere mgbe niile, na-agwa ya otú ọ dị anyị n’obi. (Ọma 25:4, 5) Jehova ga-azakwa ekpere anyị. (1 Jọn 3:21, 22) Otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia aha ya bụ Khanh sịrị: “Na mbụ, ihe mere m ji hụ Jehova n’anya bụ ihe ndị m mụtara gbasara ya. Ma, ka m na-ahụ ka ọ na-aza ekpere m, m bịara hụkwuo ya n’anya. Ihe a mere ka m chọkwuo ime ihe ga-adị ya mma.” b
NA-AHỤKWU NDỊ ỌZỌ N’ANYA
9. Olee otú Timoti si gosi na ọ na-ahụkwu ụmụnna ya n’anya?
9 Mgbe Pọl ghọrọ Onye Kraịst, afọ ụfọdụ agaa, ọ hụrụ otu ọmarịcha nwa okorobịa aha ya bụ Timoti. Timoti hụrụ Jehova n’anya, hụkwa ndị ọzọ n’anya. Pọl gwara ndị Filipaị banyere Timoti, sị: “Enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya.” (Fil. 2:20) Ihe Pọl na-ekwu okwu ya ebe a abụghị na Timoti na-ahazi ihe nke ọma ma ọ bụ na ọ na-ekwu okwu nke ọma, kama Pọl chọpụtara na Timoti ji obi ya niile hụ ụmụnna ya n’anya. O doro anya na ọ gụsiri ọgbakọ ndị Timoti gara leta agụụ ike ka ọ bịa ọzọ.—1 Kọr. 4:17.
10. Olee otú Nwanna Nwaanyị Anna na di ya si gosi na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya?
10 Anyịnwa na-achọkwa ụzọ ndị anyị si enyere ụmụnna anyị aka. (Hib. 13:16) Ì chetara Nwanna Nwaanyị Anna anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ? Legodị ihe o mere. Mgbe oké ifufe kpachara mkpamkpa, ya na di ya gara n’ụlọ otu nwanna chọpụta na ifufe ahụ mebiri elu ụlọ ya, nke mere ka ezinụlọ ahụ ghara inwe uwe dị ọcha. Nwanna Nwaanyị Anna sịrị: “Anyị chịịrị efe ha, saa ya, dee ya, pịa ya ma chịghachiri ha ya. Anyị lere ihe ahụ anyị mere anya ka obere ihe. Ma, o mere ka anyị na ezinụlọ ahụ dịrị n’ezigbo mma ruo taa.” Otú Nwanna Nwaanyị Anna na di ya si hụ ụmụnna ha n’anya mere ka ha nyere ha aka.—1 Jọn 3:17, 18.
11. (a) Olee otú obi na-adị ndị ọzọ ma anyị mee ihe gosiri na anyị hụrụ ha n’anya? (b) Dị ka e kwuru n’Ilu 19:17, olee ihe Jehova ga-eme ma anyị na-eme ihe gosiri na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya?
11 Ọ bụrụ na anyị adịrị obiọma, na-egosikwa ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya, ha ga-amata na anyị na-agbalị ime ka Jehova. Obi nwere ike ịdị ha ụtọ maka ihe anyị meere ha karịa otú anyị chere. Obi na-adị Nwanna Nwaanyị Khanh anyị kwuburu okwu ya ụtọ ma o cheta ndị nyeere ya aka. Ọ sịrị: “Obi dị m ụtọ maka ihe ọma ụmụnna nwaanyị meere m kpọrọ m gaa ozi ọma. Ha na-abịa n’ụlọ m kpọrọ m, gwakwa m ka m soro ha gaa tatụ ihe ma ọ bụ rie nri ehihie. Ha na-ebulatakwa m. Ugbu a, achọpụtala m na ha gbara ezigbo mbọ iji mee ya. Ihe mere ha ji mee ya bụ na ha hụrụ m n’anya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ga-ekele anyị maka ihe anyị meere ha. Mgbe Nwanna Nwaanyị Khanh na-ekwu banyere ndị nyeere ya aka, ọ sịrị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na m ga-akwụli ndị niile nyeere m aka ụgwọ ihe ha meere m. Ma, amaghị m ebe ha niile bi. Mana, Jehova ma. M na-ekpe ekpere ka ọ kwụghachiri m onye nke ọ bụla n’ime ha.” Ihe Nwanna Nwaanyị Khanh kwuru bụ eziokwu. Jehova na-ahụ ihe anyị mere iji nyere ndị ọzọ aka ọ bụrụgodị na ihe ahụ di ezigbo obere. Ọ na-ewere ya ka àjà bara ezigbo uru anyị chụụrụ ya nakwa ka ihe anyị gbazinyere ya ọ ga-akwụghachi.—Gụọ Ilu 19:17.
12. Olee otú ụmụnna nwoke nwere ike isi gosi na ha hụrụ ọgbakọ n’anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
12 Ọ bụrụ na ị bụ nwanna nwoke, olee otú ị ga-esi gosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya ma na-enyere ha aka? Otu nwanna aha ya bụ Jordan jụrụ otu okenye ihe o nwere ike imekwu iji nyere ọgbakọ aka. Okenye ahụ jara ya mma maka ebe ndị ọ na-eme nke ọma ma gwa ya ihe ndị o nwere ike imekwu. Dị ka ihe atụ, ọ tụụrụ Jọrdan aro ka ọ na-erute Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge ma kelee ndị ọzọ, na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe, soro ìgwè ozi ubi ya na-aga ozi ọma mgbe niile, na-achọkwa ụzọ ndị ọ ga-esi na-enyere ndị ọzọ aka. Mgbe Nwanna Jordan mere ihe ndị a, ihe o mere abụghị naanị ịmụta otú e si eme ihe ụfọdụ, kama ọ mụtara ịhụkwu ụmụnna ya n’anya. Nwanna Jordan mụtara na nwanna ghọọ ohu na-eje ozi, ihe ọ na-eme abụghị ibido inyere ndị ọzọ aka, kama ọ na-enyere ndị ọzọ aka na-aga.—1 Tim. 3:8-10, 13.
13. Olee otú ịhụnanya si mee ka otu nwanna aha ya bụ Christian gbaa mbọ ruo eruo ịghọ okenye ọzọ?
13 Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị bụbu ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye? Jehova na-echeta ihe ị rụrụ n’oge gara aga nakwa na ihe mere i ji rụọ ya bụ na ị hụrụ ya na ndị ọzọ n’anya. (1 Kọr. 15:58) Ọ na-ahụkwa otú ị ka si na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Obi jọrọ otu nwanna aha ya bụ Christian njọ mgbe a kwụsịrị ya ịbụ okenye. N’agbanyeghị ya, ọ sịrị: “M kpebiri ime ihe niile m ga-emeli iji na-efe Jehova ma m̀ nwere ọrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ na enweghị m.” Ka oge na-aga, a họpụtakwara ya ịbụ okenye. Nwanna Christian sịrị: “Obi eruchaghị m ala ịghọ okenye ọzọ. Ma, m kpebiri na ebe ọ bụ na Jehova meere m ebere chọọ ka m bụrụkwa okenye ọzọ, m ga-abụ ya n’ihi na m hụrụ ya na ụmụnna m n’anya.”
14. Gịnị ka ị mụtara n’ihe otu nwanna nwaanyị bi na Jọjịa kwuru?
14 Ndị Jehova na-egosikwa na ha hụrụ ndị agbata obi ha n’anya. (Mat. 22:37-39) Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị bi na Jọjịa aha ya bụ Elena sịrị: “Na mbụ, naanị ihe mere m ji ekwusa ozi ọma bụ na m hụrụ Jehova n’anya. Ma, ka m na-ahụkwu Jehova n’anya, m malitere ịna-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. M na-agbalị na-eche gbasara nsogbu ndị ha nwere nakwa isiokwu ndị ga-eru ha n’obi. Ka m na-echekwu gbasara ha ka m na-achọkwu inyere ha aka.”—Rom 10:13-15.
OTÚ JEHOVA SI AGỌZI ANYỊ MA ANYỊ NA-AHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA
15-16. Dị ka anyị hụrụ na foto, olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị na-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya?
15 Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya, ọ bụghị naanị ha ka ọ ga-abara uru. Mgbe ọrịa koronavaịrọs malitere, otu nwanna aha ya bụ Paolo na nwunye ya nyeere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị mere agadi aka ịmụta otú ha ga-esi jiri kọmputa ha ma ọ bụ ekwentị ha na-ezi ozi ọma. Otu nwanna nwaanyị o siiri ike ná mmalite mechara mụta ya. O ji ya kpọọ ndị ikwu ya ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Mmadụ iri isii n’ime ha si n’Ịntanet bịa ya. Mbọ a Nwanna Paolo na nwunye ya gbara baara nwanna nwaanyị ahụ na ndị ikwu ya uru. Nwanna nwaanyị ahụ mechara degara Nwanna Paolo akwụkwọ ozi, sị ya: “I meela kụziere anyị bụ́ ndị agadi ihe. Agaghị m echefu otú Jehova si eche banyere anyị nakwa otú i si gbasie mbọ ike nyere anyị aka.”
16 Ụdị akụkọ a kụziiri Nwanna Paolo ihe dị ezigbo mkpa. O chetaara ya na ịhụ ndị ọzọ n’anya dị mkpa karịa ihe anyị ma ma ọ bụ nkà ndị anyị nwere. Ọ sịrị: “Abụbu m onye nlekọta sekit. Taa, ama m na o nwere ike ịbụ na ụmụnna echefuola okwu ndị m kwuru. Ma, ha ka na-echeta aka m nyeere ha.”
17. Ọ bụrụ na anyị ana-egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, olee onye ọzọ ọ ga-abara uru?
17 Anyị gosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya, ọ na-abara anyị ọtụtụ uru anyị na-atụghị anya ha. Otu nwanna bi na Niu Ziland aha ya bụ Jonathan chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Otu ehihie Satọdee ezigbo anwụ na-acha, ọ hụrụ otu ọsụ ụzọ naanị ya so na-aga ozi ọma. Nwanna Jonathan kpebiri na ya na nwanna ahụ ga na-eso aga ozi ọma n’ehihie Satọdee ndị na-eso ya. N’oge ahụ, ọ maghị ụdị uru ọ ga-erite n’ihe ọma a o mere. Nwanna Jonathan sịrị: “N’oge ahụ, ozi ọma anaghị atọ m ụtọ. Ma, ka m na-ege ntị ka ọsụ ụzọ ahụ na-akụzi ihe, na-ahụkwa ihe ndị ọ na-arụpụta n’ozi ọma ya, o mere ka ozi ọma tọwa m ụtọ. Nwanna ahụ ghọkwara ezigbo enyi m, mee ka ozi ọma na-atọ m ụtọ, meekwa ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma.”
18. Gịnị ka Jehova chọrọ ka anyị na-eme?
18 Jehova chọrọ ka anyị niile na-ahụkwu ya na ndị ọzọ n’anya. Dị ka anyị mụtarala, anyị ga-enweli ike ịna-ahụkwu Jehova n’anya ma anyị na-agụ Okwu ya, na-atụgharị uche na ya, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Otú anyị ga-esi na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya bụ ịna-enyere ha aka. Ka anyị na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, anyị na Jehova na ụmụnna anyị ga na-adịkwu ná mma. Adịm ná mma ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi.
ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya
a Anyị niile nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ofufe Jehova ma ànyị ka malitere ife ya ọhụrụ ma ọ̀ dịla anya anyị fewere ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otu ụzọ dị mkpa anyị nwere ike isi eme ya, ya bụ, ịna-ahụkwu Jehova na ndị ọzọ n’anya. Ka ị na-echebara ihe e kwuru n’isiokwu a echiche, chee gbasara ebe ndị ị na-eme nke ọma nakwa ebe ndị ị ka nwere ike imekwu nke ọma.
b Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.