ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32
Na-ele Ihe Anya Otú Kwesịrị Ekwesị Ka Jehova
“Meenụ ka mmadụ niile mara na unu na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.”—FIL. 4:5.
ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị
IHE ISIOKWU A NA-EKWU a
1. Olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi adị ka osisi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
E NWERE ndị na-ekwu, sị: “Ifufe anaghị agbaji osisi nwere ike ịrọgharị arọgharị.” Ihe a gosiri na ọ bụrụ na osisi ana-arọgharị arọgharị mgbe ifufe na-efesi ike, ọ na-eme ka ọ ghara ịgbaji. Anyị chọọ ịna-eme nke ọma n’ofufe Chineke, anyị agaghị esiwe ọnwụ ka ihe gaa otú anyị chọrọ mgbe niile. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ọ bụ ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma nabata ihe ndị gbanwere ná ndụ anyị, gharakwa ịmanye ndị ọzọ ka ha gbanwee otú ha si ele ihe anya nakwa ihe ndị ha kpebiri ime.
2. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịnabata ihe ndị gbanwere ná ndụ anyị? Oleekwa ihe anyị ga-amụ n’isiokwu a?
2 Ebe anyị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịkwara ịdị umeala n’obi ma na-enwere ndị mmadụ obi ebere. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú àgwà ndị a si nyere ụfọdụ Ndị Kraịst aka idi ihe ndị gbanwere ná ndụ ha. Anyị ga-ahụkwa otú àgwà ndị a nwere ike isi enyere anyị aka. Ma, ka anyị buru ụzọ hụ ihe anyị ga-amụta n’aka Jehova na Jizọs. Ọ bụ ha kacha egosi na ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.
JEHOVA NA JIZỌS NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ
3. Olee otú anyị si mara na Jehova na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị?
3 Baịbụl kpọrọ Jehova “Oké Nkume” n’ihi na o guzosiri ike, kwụrụkwa chịm. (Diut. 32:4) Ma, ọ na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ka ihe na-agbanwe n’ụwa a, Jehova na-agbanwekwa ihe ndị ọ na-eme iji jide n’aka na ihe niile o kwere ná nkwa mezuru. Jehova kere ụmụ mmadụ n’oyiyi ya. N’ihi ya, anyị ga-enwe ike ịgbanwe ma ọ bụrụ na ihe agbanwee. O si na Baịbụl kwuo ihe ndị doro anya ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị. Ihe Jehova na-eme nakwa ihe ndị dị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl na-egosi n’eziokwu na n’agbanyeghị na ọ bụ “Oké Nkume,” ọ na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị.
4. Nye ihe atụ gosiri na Jehova na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị? (Levitikọs 5:7, 11)
4 Jehova zuru okè, na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ naghị eji aka ike emeso ụmụ mmadụ ihe. Dị ka ihe atụ, legodị otú Jehova si gosi na ọ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị n’otú o si meso ụmụ Izrel. O nyeghị iwu ka ma ọgaranya ma ogbenye jiri otu ihe na-achụrụ ya àjà. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ahapụ onye nke ọ bụla ka o jiri ihe ndị ọ ga-ewetali chụọrọ ya àjà.—Gụọ Levitikọs 5:7, 11.
5. Mee ihe atụ gosiri na Jehova dị umeala n’obi ma na-enwe obi ebere.
5 Jehova dị umeala n’obi ma na-eme ebere. Ọ bụ ya mere o ji ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Jehova gosiri na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ chọrọ ibibi ndị ọjọọ bi na Sọdọm. O si n’ọnụ ndị mmụọ ozi ya gwa Lọt, bụ́ onye ezi omume, ka ọ gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ụjọ nọ na-atụ Lọt ịgbaga ebe ahụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka ọ hapụ ya na ndị ezinụlọ ya ka ha gbaga na Zoa, bụ́ obere obodo Jehova chọkwara ibibi. A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara agwa Lọt na ọ ga-emerịrị ihe o kwuru n’ewepụghị ya ihe ọ bụla. Kama ime otú ahụ, o mere ihe Lọt rịọrọ ya, ọ bụ eziokwu na ọ ga-eme ka ọ ghara ibibi obodo Zoa. (Jen. 19:18-22) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova meteere ndị bi na Ninive ebere. O zigara onye amụma ya bụ́ Jona ka ọ gaa gwa ha na a ga-ebibi obodo ahụ na ndị ọjọọ bi na ya n’oge na-adịghị anya. Ma ndị Ninive chegharịrị, Jehova emeere ha ebere ma hapụ ibibi ha.—Jona 3:1, 10; 4:10, 11.
6. Nye ihe atụ gosiri na Jizọs na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka Jehova.
6 Jizọs na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị ka Jehova. Ndị e zitere ya ka ọ bịa kwusaara ozi ọma n’ụwa bụ “atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel.” Ma, o gosiri na ọ na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ọ na-arụ ọrụ ahụ. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị na-abụghị onye Izrel rịọrọ ya ka ọ gwọọ nwa ya nwaanyị ‘mmụọ ọjọọ ji aka ọjọọ.’ Jizọs meteere nwaanyị ahụ ebere ma gwọọ nwa ya otú ahụ ọ rịọrọ ya. (Mat. 15:21-28) Leekwa ihe atụ ọzọ. Mgbe Jizọs na-eje ozi ya, o bula ụzọ sị: “Onye ọ bụla nke na-agọnahụ m . . . , m ga-agọnahụkwa ya.” (Mat. 10:33) Ma, ọ̀ gọnahụrụ Pita, bụ́ onye gọnahụrụ ya ugboro atọ? Mba. Jizọs ma na ihe Pita mere wutere ya nakwa na o nwere okwukwe. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu Pita. O nwere ike ịbụ ka o mee ka obi sie ya ike na ọ gbagharala ya nakwa na ọ hụrụ ya n’anya.—Luk 24:33, 34.
7. Dị ka e kwuru ná Ndị Filipaị 4:5, olee otú anyị chọrọ ka ndị mmadụ si na-ele anyị anya?
7 Anyị ahụla na Jehova Chineke na Jizọs Kraịst na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Anyịnwa kwanụ? Jehova chọrọ ka anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. (Gụọ Ndị Filipaị 4:5.) Otú Baịbụl ọzọ si sụgharịa amaokwu a bụ: “Jiri àgwà gị gosi na ị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ndị mmadụ hà na-ele m anya ka onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, onye na-anaghị esi ọnwụ ka e mee ihe ọ chọrọ mgbe niile? Ka hà na-ele m anya ka onye dị aka ike, onye na-esi ọnwụ ka e mee ihe ọ chọrọ mgbe niile? M̀ na-esi ọnwụ ka ndị ọzọ mee ihe m chere na ọ bụ otú e kwesịrị isi eme ya? Ka m̀ na-ege ndị ọzọ ntị mgbe ha na-ekwu uche ha ma mee ihe ha chọrọ mgbe o kwere omume?’ Ọ bụrụ na anyị ana-elekwu ihe anya otú kwesịrị ekwesị, anyị ga na-emekwu ka Jehova na Jizọs. Ka anyị lee ụzọ ebe abụọ anyị kwesịrị igosi na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ya bụ, mgbe ihe gbanwere ná ndụ anyị na mgbe ihe ndị ọzọ chere na ihe ndị ha kpebiri dị iche na nke anyị.
NA-ELE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ MGBE IHE GBANWERE NÁ NDỤ GỊ
8. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ihe gbanwere ná ndụ anyị? (Kwuokwa ihe e dere n’ala ala peeji.)
8 Ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị pụtara na anyị ga-adị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ anyị ma ihe gbanwee. Ihe gbanwee ná ndụ anyị, o nwere ike ime ka ihe siwere anyị ike mgbe anyị na-atụghị anya ya. Ezigbo ọrịa nwere ike ịbịa anyị na mberede. Ihe nwekwara ike gbanwee n’ọchịchị n’otu ntabi anya, nke nwere ike ime ka ihe siere anyị ike. (Ekli. 9:11; 1 Kọr. 7:31) Ọ bụrụ na a gbanweere anyị ọrụ ná nzukọ Jehova, o nwedịrị ike ime ka ihe sitụrụ anyị ike. N’agbanyeghị nsogbu bịaara gị, ị ga-edili ya ma i mee ihe anọ ndị a: (1) ghọta na ihe agbanweela, (2) chewezie gbasara ọdịnihu, (3) chọpụta ihe ọma niile na-emere gị, nakwa (4) na-enyere ndị ọzọ aka. b Ka anyị leba anya n’akụkọ ụfọdụ mere eme gosiri otú ime ihe ndị a nwere ike isi nyere anyị aka.
9. Olee otú otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ si die nsogbu ha na-atụghị anya ya bịaara ha?
9 Ghọta na ihe agbanweela. E nwere otu nwanna na nwunye ya e zigara n’obodo ọzọ ka ha bụrụ ndị ozi ala ọzọ. Aha ha bụ Emanuele na Francesca. Ozugbo ha ruru ebe ahụ bido ịmụ asụsụ ndị obodo ahụ, na-agbalịkwa ka ọgbakọ ọhụrụ ahụ ha gafere mara ha ahụ́, ọrịa koronavaịrọs bidoro, ya emee ka ha na ndị ọzọ ghara ịna-anọkọ. Mama Francesca nwụrụ na mberede. Francesca chọsiri ike ịla gaa nọnyere ndị ezinụlọ ha. Ma, ọrịa koronavaịrọs ekweghị ya laa. Olee otú o si die ihe a na-agbawa obi? Nke mbụ, Emanuele na Francesca nwunye ya kpere ekpere ka Jehova nye ha amamihe ha ga-eji were ụbọchị ọ bụla otú ha si hụ ya. Jehova zara ekpere ha. O ji ọgbakọ ya za ha ekpere ha n’oge dabara adaba. Dị ka ihe atụ, ihe otu nwanna kwuru n’otu vidio a gbara ya ajụjụ ọnụ gbara ha ume. Nwanna ahụ sịrị: “Ozugbo anyị weere ụwa anyị otú anyị si hụ ya, anyị ga-enwetaghachi ọṅụ ma ka na-eme ihe ndị anyị kwesịrị ime n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ugbu a.” c Nke abụọ, ha kpebiri na ha ga-agba mbọ mụtakwuo otú e si eji ekwentị ezi ozi ọma. Ha jidị ya malite ịmụrụ mmadụ Baịbụl. Nke atọ, ha kwere ka ụmụnna ha nyere ha aka, obi dịkwa ha ụtọ maka ya. Otu ezigbo nwanna nwaanyị na-ezigara ha otu amaokwu Baịbụl n’ụbọchị ọ bụla ruo otu afọ. Ọ bụrụ na anyịnwa aghọta na ihe agbanweela, ọ ga-eme ka obi dịrị anyị ụtọ n’ihe ndị anyị nwere ike ime.
10. Olee otú otu nwanna nwaanyị si nabata nnukwu ihe gbanwere ná ndụ ya?
10 Na-eche ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, chọpụtakwa ihe ọma ndị na-emere gị ugbu a. E nwere otu nwanna nwaanyị onye Romenia bi na Japan. Aha ya bụ Christina. O wutere ya mgbe e kposara ọgbakọ Bekee ọ nọ na ya. Ma, ọ nọghị na-eche gbasara ihe merenụ. Kama, o kpebiri na ya ga-eme ike ya niile n’ọgbakọ na-eji asụsụ Japaniiz amụ ihe ọ nọ na ya. Otú o si mee ya bụ ịna-agbasi mbọ ike n’ozi ọma nakwa n’ọgbakọ. Ọ gwara onye ya na ya na-arụkọbu ọrụ ka o nyere ya aka ịmụtakwu asụsụ Japaniiz. Nwaanyị ahụ kwetara iji Baịbụl na broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi kụziere ya asụsụ Japaniiz. Nwanna Nwaanyị Christina mụtakwuru asụsụ Japaniiz nke ọma. Ma, ihe ọzọ merenụ bụ na nwaanyị ahụ nyeere ya aka malitere nwewe mmasị ịmụ Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu nakwa ihe ọma ndị na-emere anyị, mgbanwe ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka anyị nweta ngọzi ndị anyị na-atụghị anya ha.
11. Gịnị ka otu di na nwunye mere mgbe ego kọrọ ha?
11 Na-enyere ndị ọzọ aka. E nwere otu nwanna na nwunye ya bi n’obodo a machiri anyị ikwusa ozi ọma. Ihe bịara siere ha ike mgbe ego kọrọ n’obodo ahụ. Olee ihe nyeere ha aka? Ihe mbụ ha mere bụ iselata aka n’otú ha si emefu ego. Ihe ọzọ ha mere bụ ịna-ekwusasi ozi ọma ike, si otú ahụ na-enyere ndị mmadụ aka. Ihe a mere ka ha ghara ilekwasị anya ná nsogbu ndị ha nwere. (Ọrụ 20:35) Nwanna ahụ sịrị: “Iji oge buru ibu ekwusa ozi ọma mere ka anyị ghara ịna-enwe oge anyị ga-eji na-eche gbasara ihe ndị na-adịghị mma, meekwa ka anyị nwekwuo oge anyị ga-eji na-eme ihe Jehova chọrọ.” Ọ bụrụ na ihe agbanwee, anyị kwesịrị icheta na ọ dị ezigbo mkpa ịna-enyere ndị ọzọ aka, karịchaa, ikwusara ndị mmadụ ozi ọma.
12. Olee otú ihe Pọl onyeozi mere nwere ike isi nyere anyị aka ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ozi anyị?
12 Anyị kwesịkwara ịna-adị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ozi anyị. Ndị anyị na-ahụkarị n’ozi ọma bụ ndị ebe ha si, àgwà ha, na ihe ndị ha kweere dị iche iche. Pọl onyeozi na-agbanwe ihe ụfọdụ n’ozi ya. Anyị nwekwara ike ịmụta ihe n’aka ya. Jizọs họpụtara Pọl ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 11:13) N’ihi ya, Pọl kwusaara ndị Juu, ndị Grik, ndị gụrụ oké akwụkwọ, ndị nọ n’ime obodo, ndị nọ n’ọchịchị, na ndị eze ozi ọma. Ka Pọl nwee ike izi ụdị ndị a niile ozi ọma, o mere “ihe niile iji nyere ụdị mmadụ niile aka.” (1 Kọr. 9:19-23) O chebaara omenala ha, otú e si zụọ ha, nakwa ihe ndị ha kweere echiche, zizie ha ozi ọma otú ọ ga-eru ha n’obi. Anyịnwa nwere ike ịna-emekwu nke ọma n’ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-agbanwe ihe ụfọdụ ma na-agbalị na-eche gbasara otú ka mma anyị ga-esi enyere onye nke ọ bụla aka.
ESILA ỌNWỤ NA NDỊ ỌZỌ GA-AHAPỤ IHE HA KPEBIRI
13. Gịnị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 8:9 anyị nwere ike izere ma ọ bụrụ na anyị anaghị esi ọnwụ ka ndị ọzọ hapụ ihe ha kpebiri?
13 Ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara isi ọnwụ ka ndị mmadụ hapụ ihe ha kpebiri mewe nke anyị. Dị ka ihe atụ, ọ na-amasị ụfọdụ ụmụnna anyị nwaanyị itecha ntecha. Ma, e nwere ndị ọ na-anaghị amasị. Ụfọdụ Ndị Kraịst na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, ma ha anaghị aṅụfe ya ókè. Mana, e nwere ndị nke kpebiri na ha agaghị aṅụ ya chaa chaa. Ndị Kraịst niile chọrọ ka ahụ́ na-agbasi ha ike, ma ihe ha na-ekpebi gbasara otú a ga-esi agwọ ha ọrịa na-adị iche iche. Ọ bụrụ na anyị ekwetasie ike na ihe anyị kpebiri ime kacha mma ma gbalịwa ka ndị ọzọ kweta ime ka anyị, o nwere ike ime ka ụfọdụ ụmụnna zọhie ụkwụ. O nwekwara ike ịkpata esemokwu. Anyị agaghị achọtụdị ka ụdị ihe ahụ mee. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 8:9; 10:23, 24) Ka anyị leba anya n’ihe atụ abụọ gosiri otú ime ihe Baịbụl kwuru ga-esi enyere anyị aka ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ma na-eme ka udo dịrị.
14. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-eji ejiji?
14 Ejiji. Jehova anaghị agwa anyị uwe anyị ga-eyi na nke anyị na-agaghị eyi. Kama, ọ gwara anyị ihe ga-enyere anyị aka ịhọrọ ụdị uwe anyị ga-eyi. Anyị kwesịrị ịna-eji ejiji otú gosiri na anyị bụ ndị ozi Chineke, ndị na-eche echiche nke ọma, ndị na-emeru ihe n’ókè, nakwa ndị “na-ele ihe anya otú dị mma.” (1 Tim. 2:9, 10; 1 Pita 3:3) N’ihi ya, anyị anaghị achọ ka ndị mmadụ lewe anyị n’ihi ụdị uwe anyị yi. Ihe Baịbụl kwuru na-enyekwara ndị okenye aka ka ha ghara inye iwu gbasara ụdị uwe mmadụ ga-eyi, ma ọ bụ ụdị isi mmadụ ga-eme ma ọ bụkwanụ ụdị isi mmadụ ga-akpụ. Dị ka ihe atụ, ndị okenye nọ n’otu ọgbakọ chọrọ inyere ụfọdụ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ ha aka. Ndị na-eto eto ahụ na-akpụ ụdị isi na-ewuru ndị na-eto eto ibe ha. Ha na-akpụda isi ha akpụda, ma ọ naghị adị mma n’anya. Olee otú ndị okenye ga-esi enyere ha aka ma ghara imere ha iwu? Onye nlekọta sekit tụụrụ ndị okenye ahụ aro ka ha gwa ụmụnna nwoke ahụ, sị: “Ọ bụrụ na ị na-eme ihe omume, ndị mmadụ ana-ele otú ị dị kama ige ntị n’ihe ị na-ekwu, ọ pụtara na ejiji gị adịghị mma.” Obere ihe a ha kọwaara ụmụnna ahụ mere ka nsogbu ahụ kwụsị, meekwa ka ndị okenye ghara imere ha iwu. d
15. Olee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka mgbe anyị na-ahọrọ otú a ga-esi agwọ anyị? (Ndị Rom 14:5)
15 Otú e si agwọ ọrịa. Onye Kraịst ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme ka ahụ́ na-agbasi ya ike. (Gal. 6:5) Ọ bụ naanị iwu ole na ole ka Baịbụl nyere gbasara otú Onye Kraịst ga-esi kpebie otú a ga-esi agwọ ya ọrịa, dị ka izere ọbara na mgbaasị. (Ọrụ 15:20; Gal. 5:19, 20) Ihe ndị ọzọ bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya ekpebiri onwe ya. Ụfọdụ ndị rịawa ọrịa, naanị ndị ha na-agakwuru ka ha gwọọ ha bụ ndị dọkịta. Ma, e nwere ndị ọ na-akara mma ka e si n’ụzọ ndị ọzọ gwọọ ha. N’agbanyeghị otú anyị si kwetasie ike na e nwere otú kacha mma e si agwọ ọrịa, anyị kwesịrị ịhapụ ụmụnna anyị ka ha jiri aka ha kpebie otú a ga-esi agwọ ha ọrịa. Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe a bụ: (1) Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha kpamkpam ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 33:24) (2) Obi kwesịrị isi Onye Kraịst ọ bụla “ezigbo ike” na otú ọ họọrọ a ga-esi agwọ ya bụ otú kaara ya mma. (Gụọ Ndị Rom 14:5.) (3) Anyị anaghị ekpe ndị ọzọ ikpe ma ọ bụkwanụ mee ihe ga-eme ka ha kpọbie ụkwụ. (Rom 14:13) (4) Ndị Kraịst na-ahụ ibe ha n’anya. Ha na-aghọtakwa na ọgbakọ ịdị n’otu dị mkpa karịa ime ihe ha chọrọ. (Rom 14:15, 19, 20) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe ndị a n’obi, ọ ga-eme ka anyị na ụmụnna anyị na-adị n’ezigbo mma, meekwa ka ọgbakọ na-adị n’udo.
16. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ha na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ha na ndị okenye ibe ha na-emekọ ihe? (Kọwaakwa ihe e sere na foto ndị e ji kọwaa paragraf a.)
16 Ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị e ji ama atụ n’ihe gbasara ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị. (1 Tim. 3:2, 3) Dị ka ihe atụ, okenye ekwesịghị ịna-atụ anya na ndị ọzọ ga-anabata aro ọ tụrụ naanị n’ihi na ọ bụ ya tọrọ ndị okenye ndị ọzọ. Kama, ọ na-aghọta na mmụọ nsọ Jehova nwere ike ime ka okenye ọ bụla kwuo ihe ga-eme ka e kpebie ihe bara uru. Ọ bụrụkwa na ihe ọtụtụ ndị kwadoro emegideghị iwu Baịbụl, ndị okenye ma ihe na-eji obi ha na-akwado ihe ọtụtụ ndị okenye kpebiri, ọ bụrụgodị na ha gaara achọ ka e mee ihe dị iche.
URU ILE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ NA-ABA
17. Olee uru Ndị Kraist na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị na-erite?
17 Ọ bụrụ na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, e nwere ọtụtụ uru ọ na-abara anyị. Ọ na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị ná mma, meekwa ka ọgbakọ dịrị n’udo. Ọ na-eme ka obi dị anyị ụtọ na e nwere ụdị mmadụ dị iche iche na ndị si n’ebe dị iche iche n’ọgbakọ Jehova dị n’otu. Nke kachanụ bụ na obi na-adị anyị ezigbo ụtọ n’ihi na anyị ma na anyị na-eme ka Chineke anyị bụ́ Jehova, onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị.
ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume
a Jehova na Jizọs na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ha chọkwara ka anyị mụta àgwà ahụ. Ọ bụrụ na anyị na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị, ọ ga-adịrị anyị mfe ịnabata ihe ndị gbanwere ná ndụ anyị, dị ka mgbe ọrịa jidere anyị ma ọ bụ mgbe ego kọrọ anyị. Ọ ga-emekwa ka udo dịrị n’ọgbakọ, ọgbakọ adịrịkwa n’otu.
b Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị.” Ọ gbara na Teta! Nke 4, 2016.
c Lee vidio aha ya bụ Ajụjụ Ọnụ A Gbara Nwanna Dmitriy Mikhaylov. Ị ga-ahụ ya n’isiokwu bụ́ “Jehova Na-eme Ka Mkpagbu A Na-akpagbu Ndị Ya Ghọọ Ohere Ọma Iji Zie Ozi Ọma” n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke Mach ruo Eprel 2021.
d Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ gbasara ejiji, gụọ isi nke 52 n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi.