ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jun 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọgọst 1 ruo 28, 2016.

‘Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi’

Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe banyere gị na-emetụ Chineke n’obi? Tụlee ihe ga-eme ka obi sie gị ike.

Otú Ị Ga-esi Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ na Jehova Na-akpụzi Anyị

Olee otú Chineke si ahọrọ ndị ọ ga-akpụzi? Gịnị mere o ji akpụzi ha? Olee otú o si akpụzi ha?

Ị̀ Na-ekwe Ka Jehova Kpụzie Gị?

Olee àgwà ndị ga-eme ka ị dị ka ụrọ na-ekwe ọkpụkpụ n’aka Chineke?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ole ndị ka nwoke ahụ jí mpi ink odeakwụkwọ na ndị ikom isii ahụ jí ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ nọchiri anya ha?

“Jehova Bụ́ Chineke Anyị Bụ Otu Jehova”

Baịbụl kwuru na Chineke bụ “otu.” Gịnị ka ọ pụtara? Olee otú anyị ga-esi na-efe ya iji gosi na anyị ghọtara na ọ bụ otu?

Ekwela Ka Ihe Ndị Ọzọ Na-emejọ Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ

N’oge ochie, ndị jí obi ha niile fee Chineke kwuru ma ọ bụ mee ihe wutere ndị ọzọ. Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ndị a Baịbụl kọrọ akụkọ ha?

Àgwà Dị́ Chineke Mma Nke Bara Uru Karịa Dayamọnd

Onye na-akwụwa aka ọtọ akpatala akụ̀ bara ezigbo uru.

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya? Lee ma è nwere ihe ndị ị ga-echeta.