Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi’

‘Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi’

GỊNỊ mere obi kwesịrị iji sie gị ike na Jehova na-eche banyere gị n’eziokwu? Otu n’ime ihe mere obi ji kwesị isi gị ike bụ na ọ bụ ihe Baịbụl kwuru. Pita nke Mbụ 5:7 sịrị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike na ihe banyere gị na-emetụ Chineke n’obi?

CHINEKE NA-EGBORO NDỊ MMADỤ MKPA HA

Jehova gosiri àgwà ọma anyị ga-eṅomi. Ọ dị obiọma ma na-emesapụ aka

Otu n’ime ihe ndị na-egosi na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi bụ na o nwere àgwà ndị anyị ga-achọ ka ezigbo enyi anyị nwee. Ndị na-egosi ibe ha obiọma ma na-emesapụrụ ibe ha aka na-abụkarị ezigbo enyi. O doro anya na Jehova dị obiọma, na-emesapụkwara ndị mmadụ aka kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, “ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Mat. 5:45) Olee uru anwụ na mmiri ozuzo bara? Otu n’ime uru ha bara bụ na Chineke na-eji ha ‘enye ndị mmadụ nri n’ụba, na-emekwa ka ha nwee obi ụtọ.’ (Ọrụ 14:17) N’eziokwu, Jehova na-eme ka ụwa na-emepụta nri n’ụba. Ezigbo nri sokwa n’ihe ndị kacha eme anyị obi ụtọ.

Oleezi ihe mere agụụ ji agụgbu ọtụtụ ndị? Ọ bụ n’ihi na anyaukwu emeela ka inwetakwu ikike na akụnụba dị́ ndị ọchịchị mkpa karịa ime ka ihe dịrị ndị mmadụ mma. Ma, n’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eme ka nsogbu ahụ kwụsị. Ọ ga-eji ọchịchị ya dị́ n’eluigwe, nke Ọkpara ya bụ Eze ya, dochie ọchịchị ndị e nwere taa. N’oge ahụ, o nweghịzi onye agụụ ga na-agụgbu. Ka ọ dị ugbu a, Chineke na-elekọta ndị jí obi ha niile na-efe ya. (Ọma 37:25) Ọ̀ bụ na ihe ndị a anaghị egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

JEHOVA NA-EWEPỤTARA ANYỊ OGE

Jehova gosiri àgwà ọma anyị ga-eṅomi. Ọ na-ewepụtara anyị oge

Ezigbo enyi gị ga na-ewepụtara gị oge. Gị na ya nwere ike iji ọtụtụ awa kwurịta ihe na-amasị unu abụọ. Ezigbo enyi ga-egekwa ntị nke ọma mgbe ị na-akọrọ ya nsogbu gị na ihe ndị na-echu gị ụra. Jehova ọ̀ na-ege anyị ntị otú ahụ? À na-ajụkwa ajụ? Ọ na-anụ ekpere anyị. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere,’ ‘na-ekpekwa ya n’akwụsịghị akwụsị.’—Rom 12:12; 1 Tesa. 5:17.

Awa ole ka Jehova ga-achọ iji gee ntị n’ekpere gị? Ihe Jizọs mere mgbe ọ chọrọ ịhọta ndị ga-abụ ndịozi ya zara ajụjụ a. Baịbụl kwuru na ọ ‘nọgidere n’abalị ahụ dum na-ekpeku Chineke ekpere.’ (Luk 6:12) N’ekpere ahụ, o nwere ike ịbụ na Jizọs kpọrọ ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya aha n’otu n’otu, chebara àgwà ọma ha na ihe ha na-anaghị emeta echiche, rịọkwa Nna ya ka o nyere ya aka ịhọta ndị ga-abụ ndịozi ya. Mgbe chi bọrọ, Jizọs ma na ya ahọtala ndị kacha ruo eruo ga-abụ ndịozi ya. Ebe Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere,” ọ na-atọ ya ụtọ ịnụ ekpere niile sí ndị mmadụ n’obi. (Ọma 65:2) Ọ bụrụgodị na mmadụ ejiri ọtụtụ awa kpee ekpere banyere ihe na-echu ya ụra, Jehova anaghị agụkọ awa ole onye ahụ ji kpee ya.

CHINEKE NA-AGBAGHARA MMEHIE

Jehova gosiri àgwà ọma anyị ga-eṅomi. Ọ na-agbaghara mmehie

Ọ na-esidịrị ndị bụ́ ezigbo enyi ike mgbe ụfọdụ ịgbaghara ibe ha. Mgbe ụfọdụ, ndị bụrụla enyi ọtụtụ afọ na-etisa n’ihi na o siiri ha ezigbo ike ịgbaghara ibe ha. Jehova adịghị otú ahụ. Baịbụl gwara ndị niile chọrọ ife Chineke ka ha na-arịọ ya mgbaghara, ‘n’ihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha n’ụzọ dị ukwuu.’ (Aịza. 55:6, 7) Gịnị mere Chineke ji agbaghara mmehie otú ahụ?

Ihe kpatara ya bụ na ịhụnanya Chineke enweghị atụ. Otú o si hụ ụwa n’anya mere ka o zite Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ka ọ bịa gbapụta ndị mmadụ n’aka mmehie na nsogbu ọ na-akpatara ha. (Jọn 3:16) Ma e nwere uru ọzọ àjà ahụ Jizọs chụrụ bara. Ọ na-eme ka Chineke gbaghara ndị ọ hụrụ n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, o kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, nke mere na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị.” (1 Jọn 1:9) N’ihi otú Jehova si agbaghara ndị mmadụ, anyị nwere ike ịna-abụ ndị enyi ya. Ihe a e kwuru ebe a na-emetụ anyị n’ahụ́.

Ọ NA-AGBATARA GỊ ỌSỌ ENYEMAKA

Jehova gosiri àgwà ọma anyị ga-eṅomi. Ọ na-agbatara anyị ọsọ enyemaka

Ezigbo enyi na-agbatara ndị ọzọ ọsọ enyemaka. Jehova ọ̀ na-eme otú ahụ? Baịbụl kwuru banyere ohu Chineke, sị: “Ọ bụrụgodị na ọ daa, ọ gaghị akụ afọ n’ala, n’ihi na Jehova ji ya aka.” (Ọma 37:24) E nwere ụzọ dị́ iche iche Jehova si enyere ndị na-efe ya aka. Chegodị banyere otu ihe mere n’agwaetiti a na-akpọ Sent Krọị, nke dị́ n’Oké Osimiri Karibian.

E nwere otu nwata nwaanyị ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ na-enye nsogbu n’ihi na ọ naghị eso ha egbupụrụ ọkọlọtọ maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka, kpebizie ịgwa ha ihe mere na ọ naghị egbupụrụ ọkọlọtọ. N’oge ọzọ e nyere ya ohere ịgwa ndị klas ha okwu, o kwuru banyere igbupụrụ ọkọlọtọ. O ji Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible kọwaa otú ihe Shedrak, Mishak, na Abednego mere si mee ka o kpebie na ọ gaghị egbupụrụ ọkọlọtọ. Ọ sịrị: “Jehova chebere ndị Hibru atọ ahụ n’ihi na ha ekweghị akpọrọ ihe oyiyi isiala.” O gosiri ụmụ klas ha niile akwụkwọ ahụ. Mmadụ iri na otu n’ime ha anara ya. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ n’ihi na ọ matara na ọ bụ Jehova nyere ya ike na amamihe o ji kọwaara ha ihe ahụ na-adịghị mfe.

O mewe gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya, tụgharịa uche n’ebe ụfọdụ na Baịbụl, dị́ ka Abụ Ọma 34:17-19; 55:22; na 145:18, 19. Jụọ ndị nọterela aka n’ọgbakọ otú Jehova sirila gosi na ọ hụrụ ha n’anya. I nwee nsogbu, kọọrọ ya Jehova. Ihe ndị a ga-eme ka ị hụ ihe gosiri na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’