Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

A Kasiri M Obi ná Nsogbu M Niile

A Kasiri M Obi ná Nsogbu M Niile

A mụrụ m n’abalị itoolu n’ọnwa Nọvemba afọ 1929, n’obodo a na-akpọ Sukọ, nke dị n’ikpere mmiri Indus. Obodo a dị n’ebe a na-akpọ Pakịstan ugbu a. N’oge ahụ, papa m na mama m nwetara akwụkwọ ndị mara ezigbo mma n’aka otu onye ozi ala ọzọ, bụ́ onye na-asụ asụsụ Bekee. Akwụkwọ ndị ahụ e ji amụ Baịbụl mere ka m ghọọ Onyeàmà Jehova.

MGBE m lebara akwụkwọ ndị ahụ anya, m hụrụ ihe osise ndị mere ka m chesie echiche ike. Ọ bụ ya mere na malite mgbe m dị obere, m chọsiri ike ịmụ Baịbụl, ka m nwee ike ịmụta ihe ndị ahụ e dere n’akwụkwọ ndị ahụ.

Ka Agha Ụwa nke Abụọ chọrọ ibiri ọkụ n’India, nsogbu bịara zuo m ahụ́. Papa m na mama m kewara ma mechaa gbaa alụkwaghịm. Aghọtaghị m ihe mere mmadụ abụọ m hụrụ n’anya ga-eji ahapụ ibe ha. O mere ka ike ụwa gwụ m, ya adị m ka à jụrụ m ajụ. Abụ m otu mkpụrụ nwa, enwetaghịkwa m onye na-akasi m obi ma na-enyere m aka otú m chọrọ.

Mụ na mama m bi n’obodo Karachi n’oge ahụ. Otu ụbọchị, otu dọkịta katarala ahụ́ aha ya bụ Fred Hardaker bịara n’ụlọ anyị. Ya na onye ozi ala ọzọ ahụ nyere papa m na mama m akwụkwọ ndị ahụ bụ Ndịàmà Jehova. Ọ gwara mama m ka ya na ya mụwa Baịbụl. Mama m ekweghị, ma ọ gwara ya na m nwere ike inwe mmasị. Mụ na Nwanna Hardaker malitere ịmụ Baịbụl n’izu ọzọ.

Mgbe izu ole na ole gachara, m malitere ịga ọmụmụ ihe n’ụlọ ọgwụ Nwanna Hardaker. Ihe dị ka Ndịàmà Jehova iri na abụọ katarala ahụ́ na-abịa ọmụmụ ihe ebe ahụ. Ha kasiri m obi ma lekọta m ka nwa ha. M ka na-echeta otú mụ na ha si nọrọ ọdụ, ha ana-ele m anya n’anya, na-agwa m okwu ka ezigbo enyi, bụ́kwanụ ihe m chọrọ n’oge ahụ.

Ọ dịghị anya, Nwanna Hardaker agwa m ka m soro ya gaa ozi ọma. Ọ kụziiri m otú e si akpọ gramafon ka anyị nwee ike ịna-akpọrọ ndị anyị na-ezi ozi ọma okwu ndị dị nkenke si na Baịbụl. Ụfọdụ okwu ndị ahụ na-ewe ụfọdụ n’ime ha iwe n’ihi na ha enweghị mmasị na ha. Ma, obi dị m ụtọ na m ziri ndị ọzọ ozi ọma. M na-anụ ọkụ n’obi n’ihi eziokwu ndị m mụtara na Baịbụl, ọ na-atọkwa m ụtọ ịkụziri ya ndị ọzọ.

Ka ndị agha Japan na-akwado ịlụso ndị India agha, ndị ọchịchị Briten nyesiwere Ndịàmà Jehova nsogbu ike. N’ikpeazụ, n’ọnwa Julaị afọ 1943, nsogbu ahụ rutere m aka. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị, bụ́ onyeisi na chọọchị Anglịkan, chụpụrụ m n’ụlọ akwụkwọ ahụ n’ihi na ọ sị na m bụ “onye àgwà ọjọọ.” Ọ gwara mama m na mkpakọrịta mụ na Ndịàmà Jehova na-eme ka ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ na-akpa àgwà ọjọọ. Obi gbawara mama m, ya akwụsị m iso Ndịàmà Jehova. O mechara kpọga m na nke papa m n’obodo Peshawa. Obodo a dị ihe dị ka otu puku kilomita na narị atọ na iri asaa ma e si ebe anyị bi gawa ya. Ebe ọ bụ na m naghịzi aga ọmụmụ ihe, o mere ka adị m ná mma mụ na Jehova gharazie isi ike.

MỤ NA JEHOVA DỊGHACHIRI NÁ MMA

N’afọ 1947, m laghachiri na Karachi ka m chọọ ọrụ. Mgbe m nọ ebe ahụ, m gara n’ụlọ ọgwụ Nwanna Hardaker. Ọ nabatara m nke ọma.

O chere na ahụ́ adịghị m, ya ajụọ m, sị: “Olee ihe na-arịa gị?”

M zara ya, sị: “Ahụ́ dị m, kama m chọrọ ịmụ Baịbụl.”

Ọ jụrụ m, sị: “Olee mgbe ị ga-achọ ibido?”

M zara ya, sị: “Ugbu a, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume.”

Anyị mụrụ Baịbụl nke ọma n’abalị ahụ. Obi bịara ruo m ala n’ihi na mụ na ndị Jehova amalitekwala ịkpa. Mama m gbalịrị ka mụ na Ndịàmà Jehova kwụsị ịkpa. Ma na nke ugbu a, m kpebisiri ike na m ga-efe Jehova. N’abalị iri atọ na otu n’ọnwa Ọgọst afọ 1947, e mere m baptizim iji gosi na mụ enyefeela Jehova onwe m. Ọ dịghị anya, mgbe m dị afọ iri na asaa, m ghọrọ ọsụ ụzọ oge niile.

ỊSỤ ỤZỌ MERE M OBI ỤTỌ

Ebe mbụ m sụrụ ụzọ bụ n’obodo Kweta. Ogige ndị agha Briten dịbu na ya. N’afọ 1947, e kewara India ụzọ abụọ. Otu bụ India, nke ọzọ abụrụ Pakịstan. * Ihe a mere ka e nwee tigbuo zọgbuo n’etiti ndị okpukpe, ya emee ka ọtụtụ ndị gbaa ọsọ ndụ a na-ahụtụbeghị ụdị ya mbụ. Ihe dị ka nde mmadụ iri na anọ gbara ọsọ ndụ. Ndị Alakụba nọ n’India kwagara Pakịstan, ebe ndị Hindu na ndị Sik nọ na Pakịstan kwagara India. N’oge ọgba aghara ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ, m banyere ụgbọ okporo ígwè si Karachi na-aga Kweta. M kwụ ọtọ ma jide ihe aka ruo mgbe ọ fọrọ obere ka anyị ruo Kweta.

Mgbe m gara mgbakọ sekit n’India n’afọ 1948

Na Kweta, m hụrụ otu ọsụ ụzọ pụrụ iche aha ya bụ George Singh. Ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na ise. O nyere m ígwè ochie m ga-eji na-aga ozi ọma n’ebe ugwu. Ọtụtụ mgbe, naanị m na-arụ n’ozi ọma. N’ime ọnwa isii, m malitere ịmụrụ mmadụ iri na asaa Baịbụl, ụfọdụ n’ime ha batakwara n’ọgbakọ. Otu n’ime ha bụ onyeisi ndị amị aha ya bụ Sadiq Masih. O nyeere mụ na Nwanna George aka ịsụgharị ụfọdụ akwụkwọ anyị n’asụsụ Urdu, bụ́ asụsụ a na-asụkarị na Pakịstan. Ka oge na-aga, Sadiq ghọrọ nwanna ji ozi ọma kpọrọ ihe.

Mgbe m nọ n’ụgbọ mmiri a na-akpọ Queen Elizabeth na-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied

M mechara laghachi Karachi ma soro Nwanna Henry Finch na Nwanna Harry Forrest na-eje ozi. Ha bụ ndị ozi ala ọzọ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied e zitere ọhụrụ na Karachi. Ha mere ka m mara nke a na-akọ n’ọgbakọ. M so Nwanna Finch gaa ozi ọma otu ugboro n’ebe ugwu Pakịstan. N’ala ala ugwu ndị dịkọtara ọnụ, anyị hụrụ ọtụtụ ndị na-asụ asụsụ Urdu chọsiri ike ịmụta eziokwu Baịbụl. Mgbe afọ abụọ gachara, m gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Mgbe m gụchara, m laghachiri Pakịstan ma ghọọ onye na-enyere onye nlekọta sekit aka. Mụ na ụmụnna atọ ndị bụ́ ndị ozi ala ọzọ bi n’ebe ndị ozi ala ọzọ na-ebi na Lahore.

OTÚ M SI MALITEGHACHI OZI

Ọ dị mwute na n’afọ 1954, ndị ozi ala ọzọ nọ na Lahore malitere ise okwu. Ebe ọ bụ na e nwere ndị m dụnyeere úkwù, a dọsiri m aka ná ntị ike. O wutere m, ya adị m ka mụ arụghị ọrụ m nke ọma. M laghachiri Karachi ma si ya gawa Lọndọn dị n’Ịngland, bụ́ ebe m chọrọ ịnọ malitekwa ije ozi.

Na Lọndọn, mụ na ọtụtụ ndị na-eje ozi na Bethel nọ n’ọgbakọ. Nwanna Pryce Hughes, bụ́ onye na-elekọta alaka ụlọ ọrụ medara obi kụziere m ihe. Otu ụbọchị, ọ gwara m na o nwere mgbe Nwanna Joseph F. Rutherford dọsiri ya aka ná ntị ike. N’oge ahụ, Nwanna Rutherford na-elekọta ozi ọma anyị na-ekwusa n’ụwa niile. Mgbe Nwanna Hughes chọrọ ịzọrọ isi ya, Nwanna Rutherford baara ya ezigbo mba. O juru m anya ịhụ na Nwanna Hughes nọ na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe ọ na-akọrọ m akụkọ a. Ọ gwara m na ihe ahụ were ya iwe na mbụ. Ma, o mechara ghọta na e kwesịrị ịdọsi ya aka ná ntị ike, nakwa na ọ bụ ihe na-egosi na Jehova hụrụ ya n’anya. (Hib. 12:6) Ihe ahụ ọ gwara m metụrụ m n’obi, ma nyere m aka ijikwa ọṅụ na-eje ozi.

Ọ bụ n’oge ahụ ka mama m kwatara Lọndọn ma kweta ka Nwanna John E. Barr mụwara ya ihe. Nwanna Barr mechara soro n’Òtù Na-achị Isi. Mama m mewere nke ọma n’ọgbakọ, e mee ya baptizim n’afọ 1957. M mechara mata na tupu papa m anwụọ, na ya na Ndịàmà Jehova mụkwara Baịbụl.

N’afọ 1958, m lụrụ Nwanna Nwaanyị Lene, onye Denish bi na Lọndọn. N’afọ 1959, anyị mụrụ nwa anyị nwaanyị aha ya bụ Jane. Ọ bụ nwa mbụ n’ime ụmụ ise anyị mụrụ. A họpụtara m ka m bụrụ okenye n’ọgbakọ Fulham. Ma, ka oge na-aga, ahụ́ bịara nyewe nwunye m nsogbu, ya emee ka anyị kwaga ebe ka ekpo ọkụ. N’ihi ya, n’afọ 1967, anyị kwagara n’obodo Adelaịde, dị n’Ọstrelia.

NSOGBU NA-AGBAWA OBI DAPỤTARANỤ

E nwere ụmụnna iri na abụọ katarala ahụ́ e tere mmanụ nọ n’ọgbakọ anyị na Adelaịde. Ha na-eji ịnụ ọkụ n’obi eje ozi ọma. O teghị aka, anyị amalitekwa ime ihe ndị anyị na-eme n’ofufe Chineke.

N’afọ 1979, anyị mụrụ nwa anyị nke ise aha ya bụ Daniel. Ọ na-arịa ọrịa a na-akpọ Down syndrome. * Anyị ma na Daniel ga-anwụ ngwa ngwa. M ka na-echeta otú obi si gbawaa anyị n’oge ahụ. Anyị gbalịrị lekọta ya, lekọtakwa ụmụ anyị anọ ndị ọzọ. Mgbe ụfọdụ, Daniel na-acha anụnụ anụnụ maka na ọ naghị ekute ikuku ndụ n’ihi oghere abụọ dị n’obi ya. Ọ chawa anụnụ anụnụ, anyị na-akpọ ya aga ụlọ ọgwụ ozugbo. N’agbanyeghị na ọrịa ya anaghị ekwe ya megharịa ahụ́, ụbụrụ na-aghọ ya nkọ, ọ hụrụ mmadụ ibe ya n’anya. Ọ hụkwara Jehova n’anya nke ukwuu. Ezinụlọ anyị kpewe ekpere tupu anyị eriwe nri, ọ na-ejikọta ntakịrị aka ya abụọ, kwee n’isi ma jiri obi ya sị, “Amen.” Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-eri nri ya.

Mgbe Daniel dị afọ anọ, ọ rịawara ọrịa kansa na-adị n’ọbara. Ike ụwa gwụrụ mụ na nwunye m. Ọ bịara dị m ka ọ̀ fọrọ obere ka uche m ghasasịa. Ma, mgbe anyị bịara daa ezigbo mbà, onye nlekọta sekit anyị aha ya bụ Neville Bromwich bịara n’ụlọ anyị. N’abalị ahụ, o ji anya mmiri makụọ anyị. Anyị niile bere ákwá. Otú o si meda obi gwa anyị okwu kasiri anyị ezigbo obi. Ọ lawara n’ihe dị ka elekere anya mbụ n’ime abalị. Ọ dịghị anya ọ lawara, Daniel anwụọ. Ọnwụ ya bụ ihe kacha gbawaa anyị obi. N’agbanyeghị ya, anyị diri ya, obi esiekwa anyị ike na ọnwụ agaghị ekewapụ Daniel n’ịhụnanya Jehova. (Rom 8:38, 39) Anyị na-atụsi anya ike mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke, anyị na ya anọrịakwa.—Jọn 5:28, 29.

INYERE NDỊ ỌZỌ AKA NA-ATỌ M ỤTỌ

Taa, m ka bụ okenye ọgbakọ, n’agbanyeghị na m rịala ọrịa strok ugboro abụọ. Ihe ndị mere m emeela ka m na-emetere ndị ọzọ ebere, nke ka nke, ndị ha na nsogbu na-alụ. Anaghị m akatọ ha. Kama, m na-ajụ onwe m, sị: ‘Olee otú ihe ndị merela ha ná ndụ si kpaa otú obi na-adị ha na otú ha si eche echiche aka? Olee otú m ga-esi egosi ha na m hụrụ ha n’anya? Olee otú m ga-esi agba ha ume ka ha na-eme uche Jehova?’ Ọ na-atọ m ụtọ ịga nleta ọzụzụ atụrụ. N’eziokwu, mgbe m na-akasi ndị ọzọ obi ma jiri Baịbụl na-agba ha ume, m na-agba onwe m ume, na-akasikwa onwe m obi.

Ịga nleta ọzụzụ atụrụ ka na-atọ m ụtọ

Ọ na-adị m otú ahụ ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye kwuru, sị: “Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala.” (Ọma 94:19) Jehova enyerela m aka mgbe m nwere nsogbu ezinụlọ, mgbe e nwere ọgba aghara okpukpe, mgbe ihe na-agazighịrị m, na mgbe m dara mbà n’obi. N’eziokwu, Jehova bụ ezigbo Nna m kemgbe.

^ para. 19 Oge mbụ, Pakịstan nwere Ebe Ọdịda Anyanwụ, nke bụ́ Pakịstan ugbu a, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ, nke a na-akpọ Bangladesh ugbu a.

^ para. 29 Gụọ isiokwu bụ́ “Raising a Child With Down Syndrome—The Challenge and the Reward.” Ọ gbara na Teta! June 2011, nke Bekee.