Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ka Anyị Niile Dịrị n’Otu Otú Jehova na Jizọs Si Dịrị n’Otu

Ka Anyị Niile Dịrị n’Otu Otú Jehova na Jizọs Si Dịrị n’Otu

“M na-arịọ arịrịọ . . . ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu.”—JỌN 17:20, 21.

ABỤ: 24, 99

1, 2. (a) Olee ihe Jizọs rịọrọ n’ekpere ikpeazụ ya na ndịozi ya kpere? (b) Gịnị nwere ike ịbụ ya mere Jizọs ji na-echegbu onwe ya banyere ịdị n’otu?

NÁ NRI ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya riri, ihe nọ na-echegbu ya bụ otú ndịozi ya ga-esi adị n’otu. Mgbe ya na ha na-ekpe ekpere, ọ sịrị na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị n’otu otú ahụ ya na Nna ya si dịrị n’otu. (Gụọ Jọn 17:20, 21.) Ha dịrị n’otu, ọ ga-eme ka o doo ndị mmadụ anya na ọ bụ Jehova zitere Jizọs n’ụwa ka o mee uche Chineke. Ọ bụ ịhụnanya ka a ga-eji mara ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ ga-emekwa ka ha dịrịkwuo n’otu.—Jọn 13:34, 35.

2 E nwere ihe mere Jizọs ji kwusie okwu ike banyere ịdị n’otu. Ná nri ikpeazụ ya na ndịozi ya riri, ọ chọpụtara na ha na ibe ha adịghị n’otu. Dị ka ha si eme, ha nọ na-arụrịta ụka n’etiti onwe ha banyere “onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24-27; Mak 9:33, 34) N’oge ọzọ, Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka o nye ha ọkwá ndị dị mkpa n’Alaeze ya.—Mak 10:35-40.

3. Olee ihe ọ ga-abụ ya mere ndị na-eso ụzọ Jizọs adịghị n’otu? Oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya?

3 Ihe mere ndị na-eso ụzọ Jizọs adịghị n’otu abụghị naanị na ha chọrọ ịnọ n’ọkwá ukwu. N’oge Jizọs, ndị mmadụ na ibe ha adịghị n’otu n’ihi ịkpọasị. Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịkwụsị àgwà ndị a. N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị ka Jizọs mere banyere ịkpọasị? Olee otú o si nyere ndị na-eso ụzọ ya aka ka ha ghara ịkpọ ndị ọzọ asị, ha adịrịkwa n’otu? Olee otú ihe ọ kụziri ga-esi enyere anyị aka ịna-adị n’otu?

OTÚ E SI KPỌỌ JIZỌS NA NDỊ NA-ESO ỤZỌ YA ASỊ

4. Kọọ ụdị asị a kpọrọ Jizọs.

4 Ndị mmadụ kpọrọ Jizọs asị. Mgbe Filip gwara Nataniel na ya ahụla Mesaya, Nataniel sịrị ya: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?” (Jọn 1:46) Ọ ga-abụ na Nataniel ma amụma e buru na Maịka 5:2 ma chee na Nazaret erughị eru ịbụ ebe a ga-amụ Mesaya. Ndị a ma ama na Judia kpọrọ Jizọs asị n’ihi na ọ bụ onye Galili. (Jọn 7:52) O nweghị ihe ndị Judia ji ndị Galili kpọrọ. Ndị Juu ndị ọzọ chọrọ otú ha ga-esi akparị Jizọs, ha akpọọ ya onye Sameria. (Jọn 8:48) Ndị Sameria si mba ọzọ, okpukpe ha dịkwa iche na nke ndị Juu. Ma ndị Judia ma ndị Galili ejichaghị ndị Sameria kpọrọ ihe. Ha na ha anaghịkwa emekọ ihe.—Jọn 4:9.

5. Olee asị a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?

5 Ndị isi okpukpe ndị Juu kpọkwara ndị na-eso ụzọ Jizọs asị. Ndị Farisii weere ha ka “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:47-49) Ha weere onye na-agaghị ụlọ akwụkwọ ndị rabaị ma ọ bụ onye na-anaghị eme omenala ha ka onye na-abaghị uru na onye nkịtị. (Ọrụ 4:13) A kpọrọ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya asị n’ihi na ndị mmadụ n’oge ahụ ji okpukpe ha, ọkwá ha, nakwa agbụrụ ha eme ọnụ. Ndị na-eso ụzọ Jizọs nwekwara ndị ha kpọrọ asị. Ka ha nwee ike ịdị n’otu, ha ga-agbanwe otú ha si eche echiche.

6. Nye ihe atụ iji gosi otú anyị nwere ike isi kpọọ ndị ọzọ asị.

6 Taa, ịkpọasị juru ebe niile. E nwere ike ịkpọ anyị asị, anyịnwa nwekwara ike ịkpọ ndị ọzọ asị. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ n’Ọstrelia kwuru, sị: “Ihe mere m ji kpọkwuo ndị ọcha asị bụ n’ihi na m lekwasịrị anya n’otú e si megbuo ndị nwe obodo Ọstrelia n’oge gara aga, nakwa otú e si na-emegbu ha taa. Ihe mere ịkpọ asị ahụ ji kakwuo njọ bụ n’ihi otú ha si megbuo m.” Otu nwanna si Kanada kwuru otú o sibu kpọọ ndị ọzọ asị n’ihi asụsụ ha. Ọ sịrị: “M chere na ndị na-asụ French ka ndị ọzọ mma. Ọ bụ ya mere m ji kpọọ ndị na-asụ Bekee asị.”

7. Olee ihe Jizọs mere gbasara ịkpọasị?

7 Ịkpọasị gbara mgbọrọgwụ n’obi ndị mmadụ taa otú ahụ ọ dị n’oge Jizọs. Olee ihe Jizọs mere banyere ya? Nke mbụ, ọ kpọghị ndị mmadụ asị, ọ naghịkwa ele mmadụ anya n’ihu. O ziri ndị ọgaranya, ndị ogbenye, ndị Farisii, ndị Sameria, ndị ọnaụtụ, nakwa ndị mmehie ozi ọma. Nke abụọ, Jizọs si n’ihe ndị ọ kụziri na ihe ndị o mere gosi ndị na-eso ụzọ ya na ha ekwesịghị inyo ndị ọzọ enyo ma ọ bụ kpọọ ha asị.

JIRI ỊHỤNANYA NA UMEALA N’OBI MERIE ỊKPỌASỊ

8. Olee ihe dị mkpa mere Ndị Kraịst ji dịrị n’otu? Kọwaa.

8 Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe dị mkpa mere anyị ji na-adị n’otu. Ọ sịrị: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Gụọ Matiu 23:8, 9.) Otu ihe mere anyị niile ji bụrụ “ụmụnna” bụ n’ihi na anyị niile bụ ụmụ Adam. (Ọrụ 17:26) E nwekwara ihe ọzọ. Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya bụ ụmụnna n’ihi na ha niile ghọtara na Jehova bụ Nna ha nke eluigwe. (Mat. 12:50) Ha niile so n’ezinụlọ Chineke, ma dịrị n’otu n’ihi otú ha si hụ ibe ha n’anya, nakwa okwukwe ha. Ọ bụ ya mere n’akwụkwọ ozi ndịozi Jizọs dere, ha kpọrọ Ndị Kraịst ibe ha “ụmụnna.”—Rom 1:13; 1 Pita 2:17; 1 Jọn 3:13. *

9, 10. (a) Gịnị mere ndị Juu ekwesịghị ikwe ka agbụrụ ha na-ebu ha isi? (b) Olee otú Jizọs si kụzie na ọ dịghị mma ka ndị mmadụ na-akpọ ndị si agbụrụ ọzọ asị? (Lee ihe nke mbụ e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Mgbe Jizọs gwachara ndị na-eso ụzọ ya ka ha were ibe ha ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị, ọ gwasiri ha okwu ike ka ha dị umeala n’obi. (Gụọ Matiu 23:11, 12.) Dị ka anyị kwuburu, mpako mere ka ndịozi Jizọs ghara ịdị n’otu mgbe ụfọdụ. Ihe ọzọ bụ na n’oge ahụ, agbụrụ ndị mmadụ si na ya na-ebu ha isi. Ndị Juu, hà kwesịrị ịdị mpako n’ihi na ha bụ ụmụ Ebreham? Ọtụtụ ndị Juu bu ụdị ihe a n’obi. Ma Jọn Onye Na-eme Baptizim gwara ha, sị: “Chineke nwere ike ime ka Ebreham nweta ụmụ site na nkume ndị a.”—Luk 3:8.

10 Jizọs achọghị ka agbụrụ mmadụ na-ebu ya isi. O mere ka nke a doo anya mgbe otu odeakwụkwọ jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Iji zaa ya ajụjụ ahụ, Jizọs meere ya ihe atụ gbasara onye Sameria nke lekọtara otu onye Juu na-eme njem ndị ohi kụrụ ezigbo ihe. Ụfọdụ ndị Juu hụrụ ya gafere, ma onye Sameria nweere ya ọmịiko ma nyere ya aka. Jizọs gwaziri odeakwụkwọ ahụ ka ọ na-eme ka onye Sameria ahụ. (Luk 10:25-37) Jizọs gosiri na onye Sameria nwere ike ịkụziri ndị Juu otú ha ga-esi na-ahụ mmadụ niile n’anya.

11. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ịkpọ ndị mba ọzọ asị? Olee otú Jizọs si nyere ha aka ịghọta ya?

11 Ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nwee ike ịrụ ọrụ Jizọs nyere ha, ha kwesịrị ịkwụsị ịdị mpako, nakwa ịkpọ ndị ọzọ asị. Tupu Jizọs alaghachi eluigwe, ọ gwara ha ka ha kwusaa ozi ọma “na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Jizọs gwara ha banyere àgwà ọma ndị mba ọzọ nwere, si otú ahụ kwadebe ha maka nnukwu ọrụ a. Ọ jara otu onyeisi ndị agha na-abụghị onye Juu mma maka ezigbo okwukwe o nwere. (Mat. 8:5-10) N’obodo ya bụ́ Nazaret, Jizọs kwuru otú Jehova si nyere ndị na-abụghị ndị Juu aka, dị ka otu nwaanyị onye Finishia di ya nwụrụ si Zarefat, nakwa Neaman onye ekpenta si Siria. (Luk 4:25-27) Ọ bụghị naanị na Jizọs ziri nwaanyị Sameria ozi ọma, kama ọ nọkwara abalị abụọ na Sameria n’ihi na ndị obodo ahụ nwere mmasị n’ozi ọma ọ na-ezi ha.—Jọn 4:21-24, 40.

OTÚ NDỊ KRAỊST OGE OCHIE SI KWỤSỊ ỊKPỌASỊ

12, 13. (a) Gịnị ka ndịozi Jizọs mere mgbe Jizọs nọ na-ezi nwaanyị Sameria ozi ọma? (Lee ihe nke abụọ e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe gosiri na Jems na Jọn aghọtachaghị ihe Jizọs na-akụziri ha?

12 Ọ dịghịrị ndịozi Jizọs mfe ịkwụsị ịkpọasị. O juru ha anya ịhụ na Jizọs kụziiri nwaanyị Sameria ihe. (Jọn 4:9, 27) Ndị isi okpukpe ndị Juu anaghị agwa nwaanyị okwu n’ihu ọha, ma ya fọdụzie ịgwa nwaanyị Sameria àgwà ya na-adịghị mma okwu. Ndịozi Jizọs gwara ya ka o rie nri. Ma, ihe ọ gwara ha gosiri na ozi ọma ọ na-ezi nwaanyị ahụ dị ya mkpa karịa iri nri. Ozi ọma Jizọs ziri, ma nke o ziri nwaanyị Sameria ahụ, bụ uche Nna ya. Ọ dị ya ka nri.—Jọn 4:31-34.

13 Jems na Jọn aghọtaghị ihe Jizọs na-akụziri ha. Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eme njem ma rute na Sameria, ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ebe ha ga-ehi ụra n’abalị ahụ n’obodo dị na Sameria. Ndị Sameria ekweghị anabata ha, n’ihi ya, Jems na Jọn were iwe ma tụọ aro ka ọkụ si n’eluigwe bịa repịa obodo ahụ. Jizọs baara ha ezigbo mba. (Luk 9:51-56) Anyị nwere ike ịna-eche ma Jems na Jọn hà gaara ekwu ihe a ha kwuru ma a sị na ọ bụ ndị obodo ha bụ́ ndị Galili jụrụ inye ha ebe ha ga-ehi ụra. Ọ ga-abụ na ihe mere ha ji wee ezigbo iwe bụ n’ihi asị ndị obodo ha kpọrọ ndị Sameria. O nwere ike ịbụ na ihe ahụ Jọn onyeozi mere wutere ya, n’ihi na mgbe o mechara gaa zie ndị Sameria ozi ọma, ọtụtụ n’ime ha gere ya ntị.—Ọrụ 8:14, 25.

14. Olee otú e si dozie nsogbu o nwere ike ịbụ na ọ bụ asụsụ kpatara ya?

14 Obere oge Pentikọst afọ 33 gachara, a bịara nwee ịkpa ókè n’ọgbakọ. Mgbe ụmụnna nọ na-ekesara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ọ na-enweghị ka ọ hà ha nri, e leghaara ndị nke na-asụ Grik anya. (Ọrụ 6:1) Ọ ga-abụ na ihe kpatara ya bụ asụsụ. Ndịozi mere ihe ozugbo dozie nsogbu ahụ. Otú ha si mee ya bụ na ha họpụtara ụmụnna ndị ruru eru ka ha na-ekesa nri ndị ahụ. Ụmụnna ndị ahụ niile nwere aha Grik. Ọ ga-abụ na ihe a ha mere kasiri ụmụ nwaanyị ndị ahụ e leghaara anya obi.

15. Olee otú Pita si kwụsị ịkpa ókè? (Lee ihe nke atọ e sere ná mmalite isiokwu a.)

15 N’afọ 36, ndị na-eso ụzọ Jizọs malitere ikwusara ndị si mba dị iche iche ozi ọma. Tupu mgbe ahụ, ọ bụ naanị ndị Juu ka ha na Pita onyeozi na-anọkarị. Ma mgbe Chineke mechara ka o doo anya na Ndị Kraịst ekwesịghị ịkpa ókè, Pita ziri Kọnịliọs onye agha Rom ozi ọma. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:28, 34, 35.) Mgbe nke ahụ gachara, Pita so Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu rie nri. Ma mgbe afọ ụfọdụ gachara, Pita kwụsịrị iso Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu bi n’Antiọk eri nri. (Gal. 2:11-14) Pọl gbaziri Pita, Pita anabatakwa aka a o nyeere ya. N’akwụkwọ ozi mbụ Pita degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu nọ n’Eshia Maịnọ, ọ gwara ha ka hụ òtù ụmụnna dum n’anya.—1 Pita 1:1; 2:17.

16. Olee ihe e ji mara Ndị Kraịst oge mbụ?

16 O doro anya na ndịozi Jizọs mụtara ịhụ “ụdị mmadụ niile” n’anya n’aka Jizọs. (Jọn 12:32; 1 Tim. 4:10) Ha gbanwere otú ha si eche echiche, n’agbanyeghị na o were ha oge. Nke bụ́ eziokwu bụ na a ma Ndị Kraịst oge mbụ ama dị ka ndị hụrụ ibe ha n’anya. Ihe dị ka n’afọ 200, onye na-ede akwụkwọ aha ya bụ Tetọlian kwuru ihe ndị mmadụ kwuru banyere Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “Ha hụrụ nnọọ ibe ha n’anya . . . Ha dịkwa njikere ịnwụchitere ibe ha ọnwụ.” Ndị Kraịst oge mbụ yikwasịrị “mmadụ ọhụrụ ahụ,” ya emee ka ha were mmadụ niile ka ndị hà otu n’anya Chineke.—Kọl. 3:10, 11.

17. Olee otú anyị ga-esi wepụ ịkpọasị n’obi anyị? Nye ihe atụ.

17 Taa, o nwekwara ike iwe anyị oge iwepụ ụdị ịkpọasị ọ bụla n’obi anyị. Otu nwanna nwaanyị bi na Frans kwuru otú o si siere ya ike iwepụ ịkpọasị n’obi ya. Ọ sịrị: “Jehova akụzierela m ihe ịhụnanya pụtara, ihe inye mmadụ ihe pụtara, ihe ịhụ ụdị mmadụ niile n’anya pụtara. M ka na-amụ otú m ga-esi kwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị, ma, ọ naghị adịrị m mfe mgbe niile. Ọ bụ ya mere m ji na-ekpe ekpere banyere ya.” Otu nwanna nwaanyị bi na Spen nwekwara ụdị nsogbu ahụ. Ọ sịrị: “E nwere agbụrụ ọ na-esiri m ike mgbe ụfọdụ ịkwụsị ịkpọ asị, ma ọtụtụ mgbe m na-ewepụ ya n’obi m. M ma na m ka ga na-agba mbọ ịkwụsị ya. M na-ekele Jehova, obi dịkwa m ụtọ na m so n’ezinụlọ dị n’otu.” Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ileru onwe ya anya. Ànyị nwere ike ịgba mbọ wepụ ịkpọasị n’obi anyị otú ahụ ụmụnna nwaanyị abụọ ndị a mere?

E NWEE ỊHỤNANYA, ỊKPỌASỊ NA-AKWỤSỊ

18, 19. (a) Olee ihe mere anyị ji anabata mmadụ niile? (b) Olee otú anyị nwere ike isi eme ya?

18 Ọ dị mma ka anyị cheta na o nwere mgbe anyị bụ “ndị mba ọzọ,” ma ọ bụ ndị mbịarambịa nọ Chineke n’ebe dị anya. (Efe. 2:12) Ma, Jehova ji “ụdọ ịhụnanya” dọta anyị n’ebe ọ nọ. (Hos. 11:4; Jọn 6:44) Kraịst nabatakwara anyị. E nwere ike ịsị na o megheere anyị ụzọ ka anyị soro n’ezinụlọ Chineke. (Gụọ Ndị Rom 15:7.) Ebe ọ bụ na Jizọs ji obi ya niile nabata anyị n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị kwesịkwara ịnabata mmadụ niile.

Ndị ohu Jehova na-achọ amamihe nke si n’elu, ma dịrị n’otu n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19 Ka anyị na-eru ọgwụgwụ ụwa ochie a nso, o doro anya na adịghị n’otu, ịkpọasị, na tigbuo zọgbuo ga na-arị ibe ha elu. (Gal. 5:19-21; 2 Tim. 3:13) Ma, ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, anyị na-achọ amamihe nke si n’elu nke ga-enyere anyị aka ka anyị na-enwekwu udo ma ghara ịkpọ ndị mmadụ asị. (Jems 3:17, 18) Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị enyi si ná mba dị iche iche, na-anabata otú ha si eme ihe, na-amụdị asụsụ ha ma o kwe omume. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, udo anyị ga-asọ ka osimiri, ikpe ziri ezi anyị adịkwa ka ebili mmiri nke oké osimiri.—Aịza. 48:17, 18.

20. Olee ihe na-emenụ ma ịhụnanya gbanwee otú anyị si eche echiche na otú anyị si ele ihe anya?

20 Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuburu okwu ya bi n’Ọstrelia kwuru, sị: “E megheere m ọnụ ụzọ mmiri nke amamihe.” O kwuru otú ịmụ Baịbụl si nyere ya aka. Ọ sịrị: “M gbanwere otú m si eche echiche na otú m si ele ihe anya. N’ihi ya, m ji nwayọọ nwayọọ kwụsị asị m kpọrọ ndị mmadụ.” Nwanna ahụ si Kanada kwuru na ya aghọtala ugbu a na ihe mere ndị mmadụ ji na-akpọ mmadụ ibe ha asị bụ n’ihi na ha amaghị ndị ha bụ. Ọ mụtara na “ebe a mụrụ mmadụ abụghị ya ga-eme ka mmadụ na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ.” Nwanna a lụrụ nwanna nwaanyị na-asụ asụsụ Bekee. Mgbanwe ụmụnna ndị a mere gosiri na ịhụ ibe anyị n’anya ga-eme ka anyị kwụsị ịkpọ ha asị. Ọ na-emekwa ka anyị dịrị n’otu n’enweghị ihe ga-ekewa anyị.—Kọl. 3:14.

^ para. 8 A kpọọ “ụmụnna,” ụmụnna nwaanyị sokwa na ha. Mgbe Pọl degaara ndị Rom akwụkwọ ozi, ọ bụ “ụmụnna” ka o degaara ya. O doro anya na ụmụnna nwaanyị so na ha. Ọ kpọrọ ụfọdụ n’ime ha aha. (Rom 16:3, 6, 12) Kemgbe ụwa n’Ụlọ Nche, a na-akpọ Ndị Kraịst ‘ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị.’