Ì Chetara?
Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a:
Olee ihe anọ anyị ga-eme ka olu abụ anyị kakwuo mma?
Anyị kwesịrị iguzoro nke ọma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iweli akwụkwọ abụ anyị elu. Anyị kwesịkwara ikuru ezigbo ume. Ọ bụrụ na anyị emeghee ọnụ anyị nke ọma bụọ abụ, olu anyị ga-adasikwu ụda ike.—w17.11, peeji nke 5.
Olee ihe na-amasị anyị banyere ebe obodo mgbaba ndị ahụ e nwere n’Izrel dị na ụzọ e si agbaga na ha?
E nwere obodo mgbaba isii n’Izrel, a rụzikwara ụzọ e si agbaga na ha arụzi. Ọ ga-adịrị onye gburu mmadụ mfe ịgbaga n’otu n’ime ha ngwa ngwa.—w17.11, peeji nke 14.
Gịnị mere ihe mgbapụta ahụ Chineke si n’aka Jizọs nye anyị ji bụrụ onyinye kacha mma anyị nwere ike inweta?
O mezuru ihe na-agụ anyị, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi. O gbokwara mkpa anyị, nke bụ́ ime ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ ụmụ Adam n’anya, o nyere anyị Jizọs mgbe anyị ka bụ ndị mmehie.—wp17.6, peeji nke 6 na nke 7.
Olee otú amụma e buru n’Abụ Ọma 118:22 si gbasa mbilite n’ọnwụ Jizọs?
Ndị Juu ekweghị na Jizọs bụ Mesaya. Ha gbukwara ya. Ka o nwee ike ịbụ “isi nkuku,” a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—w17.12, peeji nke 9 na nke 10.
Ọ̀ bụ iwu na ọ bụ onye e nyere ihe ruuru ọkpara ka a ga-esi n’ezinụlọ ya mụta Mesaya?
Mgbe ụfọdụ, ezinụlọ e si na ya mụta Jizọs, bụ ezinụlọ ọkpara, ma ọ bụghị mgbe niile ka o si n’ezinụlọ ọkpara. Devid abụghị ọkpara Jesi, ma e si n’ezinụlọ ya mụta Mesaya.—w17.12, peeji nke 14 na nke 15.
Olee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru gbasara ahụ́ ike?
Iwu Mozis kwuru ka a na-akpọpụ ndị na-arịa ụdị ọrịa ụfọdụ iche. Ndị mmadụ ga-asa ahụ́ ma ha metụ ozu aka. Iwu ahụ kwukwara ka onye chọrọ ịnyụ nsị gwuo ala nyụọ ya ma kpochie ya. A ga-ebi nwa nwoke ọ bụla a mụrụ úgwù n’ụbọchị nke asatọ. Nke a ga-eme ka ọbara kwụsị ịgba nwa a mụrụ ọhụrụ.—wp18.1, peeji nke 7.
Gịnị mere Onye Kraịst kwesịrị iji hụ onwe ya n’anya otú kwesịrị ekwesị?
Anyị kwesịrị ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya otú anyị hụrụ onwe anyị. (Mak 12:31) Ndị bụ́ di ga “na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha.” (Efe. 5:28) Ma, anyị nwere ike ịhụ onwe anyị n’anya gabiga ókè.—w18.01, peeji nke 23.
Olee ihe ụfọdụ anyị ga-eme ka anyị jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe?
Anyị kwesịrị ịna-amụchi Okwu Chineke anya, na-echebakwara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Anyị kwesịkwara ikwe ka mmụọ nsọ Chineke na-eduzi anyị ma nabata aka ndị ọzọ na-enyere anyị.—w18.02, peeji nke 26.
Gịnị mere anyị ekwesịghị isi n’aka ndị na-agụ kpakpando na ndị na-akọ ọdịnihu mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?
E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya. Ma nke kachanụ bụ na Baịbụl kwuru na ha adịghị mma.—wp18.2, peeji nke 4 na nke 5.
Olee otú anyị kwesịrị isi ele ịga na nke onye gwara anyị bịa rie nri n’ụlọ ya anya?
Ọ bụrụ na anyị ekweta ịga na nke onye kpọrọ anyị ka anyị bịa na nke ya, anyị kwesịrị ime ihe anyị kwuru. (Ọma 15:4) Anyị ekwesịghị ịkagbu ya n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ. O nwere ike ịbụ na onye kpọrọ anyị akwadebechaala ihe ọ chọrọ iji ele anyị ọbịa.—w18.03, peeji nke 18.
Olee ihe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nwere ike ịmụta n’aka Timoti?
Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ Timoti n’obi. O jikwa ikwusa ozi ọma kpọrọ ihe. Ọ gbasiri mbọ ike n’ozi ndị ọ na-ejere Jehova ma mee ihe ndị ọ mụtara. Ọ nọgidere na-azụ onwe ya ma kwere ka mmụọ nsọ Jehova duzie ya. Ndị okenye na ndị ọzọ kwesịrị ime ka ya.—w18.04, peeji nke 13 na nke 14.