Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ike Ekele Na-akpa

Ike Ekele Na-akpa

“NDEEWO, olee otú i mere taa?”

O doro anya na i keletụla mmadụ ụdị ekele a. O nwedịrị ike ịbụ na i kwetụla mmadụ n’aka ma ọ bụ makụọ ya mgbe ị na-ekele ya. Omenala na otú obodo dị iche iche si ekele ekele nwere ike ha agaghị abụ otu, ma ihe mere e ji ekele ekele bụ otu ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na mmadụ anaghị ekele ekele ma ọ bụkwanụ na ọ naghị azaghachi onye kelere ya, e nwere ike iwere ya na ọ hụghị ndị ọzọ n’anya ma ọ bụkwanụ na ọ bụ onye àgwà ọjọọ.

Ma ọ bụghị mmadụ niile na-ekele ekele. Ihe nwere ike ịkpata ya bụ ihere ma ọ bụ mmadụ iche na o nweghị uru ọ bara. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikele ndị ha na ha na-esighị n’otu agbụrụ, ndị omenala ha dị iche, ma ọ bụ ndị ha na ha na-ahaghị. Ma, ekele dị nkenke nwere ike ịbara mmadụ ezigbo uru.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee uru ekele nwere ike ịba? Olee ihe Okwu Chineke na-akụziri m banyere ikele ekele?’

NA-EKELE “ỤDỊ MMADỤ NIILE”

Mgbe Pita onyeozi nabatachara Kọnịliọs, bụ́ onye Jentaịl mbụ ghọrọ Onye Kraịst n’ọgbakọ, ọ sịrị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ 10:34) Pita mechakwara kwuo na Chineke “chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) Anyị lee amaokwu ndị a anya, anyị nwere ike ikwu na ha na-ekwu gbasara onye na-amụ eziokwu. Ma Pita gwakwara Ndị Kraịst, sị: “Sọpụrụnụ ụdị mmadụ niile, hụnụ òtù ụmụnna dum n’anya.” (1 Pita 2:17) Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka anyị na-ekele ndị ọzọ, n’agbanyeghị agbụrụ ha, omenala ha, ma ọ bụ ebe ha si? Nke a so n’ihe na-egosi na anyị na-akwanyere ha ùgwù ma hụ ha n’anya.

Pọl onyeozi gwara ndị nọ n’ọgbakọ, sị: “Na-anabatanụ ibe unu, dị nnọọ ka Kraịst nabatara anyị.” (Rom 15:7) Pọl kpọrọ aha ụmụnna ndị ‘na-eme ka ọ dị ike.’ Ụmụnna anyị chọkwara ka anyị na-eme ka ha dị ike karịa ebe ọ bụ na Setan na-alụso ndị Chineke ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ.—Kọl. 4:11; Mkpu. 12:12, 17.

Ihe atụ ndị dị na Baịbụl na-egosi na e nwere uru ndị ọzọ ekele na-aba, ọ bụghị naanị ime ka ahụ́ ruo mmadụ ala.

URU EKELE NA-ABA

Mgbe oge ruru ka Chineke bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa Meri, o dunyere otu mmụọ ozi ka ọ gaa gwa Meri okwu. Ihe mmụọ ozi ahụ ji bido okwu ya bụ, “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.” Okwu a nyere Meri “nsogbu nke ukwuu.” Ọ maghị ihe mere mmụọ ozi a ji na-agwa ya okwu. Mgbe mmụọ ozi ahụ chọpụtara na okwu ahụ nyere Meri nsogbu, ọ sịrị ya, “Atụla egwu, Meri, n’ihi na Chineke meere gị amara.” Ọ gwara ya na ọ bụ nzube Chineke na ọ ga-amụ Mesaya. Kama Meri ga-anọ na-echegbu onwe ya, o medara obi gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova! Ka o mee dị ka i kwuru.”—Luk 1:26-38.

Ọ bụghị obere ihe na Jehova dunyere mmụọ ozi a ozi. Ma, n’agbanyeghị nke ahụ, o wereghị ya na ịgwa mmadụ na-ezughị okè okwu bụ iweda onwe ya ala. O bu ụzọ kelee Meri tupu ya agwawa ya okwu. Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe a mmụọ ozi a mere? Ọ bụ na anyị kwesịrị ịdị njikere ikele ndị ọzọ ma na-agba ha ume. Okwu ole na ole anyị gwara ha ga-enyere ha aka, meekwa ka obi sie ha ike na ha so ná ndị ohu Jehova.

Pọl matara ọtụtụ ndị n’ọgbakọ ndị dị n’Eshia Maịnọ nakwa Yurop. Ọ kpọrọ aha ụfọdụ ndị ma kelee ha n’akwụkwọ ozi ya. Anyị na-ahụ ndị ọ kpọrọ aha ná Ndị Rom isi iri na isii. Pọl kelere ọtụtụ Ndị Kraịst ibe ya. Ọ kpọrọ Fibi “nwanna anyị nwaanyị,” ma gwa ụmụnna ka ha ‘nabata ya n’ime Onyenwe anyị dị ka e kwesịrị ịnabata ndị nsọ, ka ha nyekwara ya aka n’ihe ọ bụla enyemaka ha pụrụ ịdị ya mkpa.’ Pọl kelekwara Priska na Akwịla ndị ọ na-abụghị ‘naanị ya na-ekele ha, kama ọgbakọ niile nke ndị mba ọzọ na-ekelekwa ha.’ O kelere ụfọdụ ndị anyị na-amachaghị gbasara ha taa. Dị ka ihe atụ, o kelere ‘onye ọ hụrụ n’anya bụ́ Epinetọs,’ nakwa “Traịfina na Traịfosa, bụ́ ụmụ nwaanyị na-arụsi ọrụ ike n’ime Onyenwe anyị.” Pọl kelekwara ụmụnna ya ndị nwoke na ndị nwaanyị.—Rom 16:1-16.

Chegodị ụdị obi ụtọ ha nwere mgbe ha matara na a na-echeta ha nakwa na a hụrụ ha n’anya. Ọ ga-abụ na nke a mere ka ha hụkwuo Pọl na ụmụnna ha ndị ọzọ n’anya. O doro anya na mgbe Ndị Kraịst ndị ọzọ nụrụ gbasara ya, ọ gbara ha ume, meekwa ka ha nọsie ike n’okwukwe. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ekelee ndị mmadụ iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya ma na-aja ha mma, ọ ga-eme ka anyị na ha bụrụ ezigbo enyi, meekwa ka ndị Chineke dịrị n’otu.

Mgbe Pọl kpara ụkwụ na Putiolaị ma tinye isi na Rom, ụmụnna ndị bi na Rom bịara n’ebe ndịda ka ha hụ ya. Mgbe Pọl nọ n’ebe dị anya hụ ha, “o kelere Chineke ma nwee obi ike.” (Ọrụ 28:13-15) Mgbe ụfọdụ, naanị ihe anyị nwere ike ime iji kelee mmadụ bụ ịmụmụrụ ya ọnụ ọchị ma ọ bụ ifere ya aka. Ma, ihe a nwedịrị ike ime ka onye dara mbà n’obi ma ọ bụ onye obi na-adịghị mma dị ike.

IHE MBỤ I KWESỊRỊ IME

Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems nwere ndụmọdụ kpụ ọkụ n’ọnụ ọ ga-enye Ndị Kraịst ibe ya. Ụfọdụ Ndị Kraịst anaghịzi efe Chineke otú ọ chọrọ, kama ha malitere ịbụ enyi nke ụwa. (Jems 4:4) Ma, lee otú Jems si malite akwụkwọ ozi ya:

“Jems, ohu Chineke na ohu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-edetara ebo iri na abụọ ahụ bi n’ebe dị iche iche akwụkwọ: Ana m ekele unu!” (Jems 1:1) O doro anya na otú a o si malite mere ka ọ dịrị ndị na-agụ ya mfe ịnabata ndụmọdụ ya mgbe ha hụrụ na otú o si kelee ha gosiri na ha niile bụ otu n’ebe Chineke nọ. Otú anyị si meda obi kelee ndị mmadụ ga-eme ka ọ dị mfe anyị na ha ikwurịta ihe ndị dị ezigbo mkpa.

Ka ekele anyị nwee ike iru mmadụ n’obi, anyị kwesịrị isi n’obi anyị kelee ya ma gosi na anyị hụrụ ya n’anya n’agbanyeghị na o nwere ike ịdị nkenke. Otú ahụ ka anyị kwesịrị isi na-ekele ndị mmadụ ọ bụrụgodị na o yie ka ha ejighị ya kpọrọ ihe. (Mat. 22:39) Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị bi n’Ayaland rutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe a chọrọ ịmalite ọmụmụ ihe. Mgbe o ji ọsọ bata, otu nwanna tụgharịrị, mụmụọ ọnụ ọchị sị ya: “Ndeewo. Obi dị m ụtọ ịhụ gị.” Nwanna nwaanyị ahụ gara nọrọ ọdụ n’ekwughị okwu ọ bụla.

Mgbe izu ole na ole gara, nwanna nwaanyị ahụ gakwuuru nwanna ahụ ma gwa ya na e nwere nsogbu dị n’ụlọ ọ na-edi. Nwanna nwaanyị ahụ gwara ya, sị: “Obi adịghị m mma ná mgbede ahụ nke na ọ fọrọ obere ka m ghara ịbịa ọmụmụ ihe. Enweghị m ike ichetacha ihe ndị a mụrụ n’ụbọchị ahụ, ma m ka na-echeta otú i si kelee m. O mere ka obi ruo m ala. I meela.”

Nwanna ahụ amaghị na obere ekele ahụ kpara ike dị egwu. O kwuru, sị: “Mgbe ọ gwara m uru obere ekele ahụ baara ya, obi tọrọ m ụtọ na m gbara mbọ kelee ya. Mgbe m matara otú obi dị nwanna nwaanyị ahụ, obi tọkwara m ụtọ.”

Sọlọmọn kwuru, sị: “Zipụ achịcha gị n’elu mmiri, n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya ọzọ.” (Ekli. 11:1) Ọ bụrụ na anyị amata uru ekele anyị na-abara ndị mmadụ, karịchaa ụmụnna anyị, obi ga na-atọ ma anyị ma hanwa ụtọ. N’ihi ya, ka anyị ghara iwere ekele ka ihe na-abaghị uru.