Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu” Ka E Too Jehova

“Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu” Ka E Too Jehova

“Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha  . . . wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.”—MAT. 5:16.

ABỤ: 77, 59

1. Olee ezigbo ihe mere anyị ji na-enwe obi ụtọ?

OBI na-atọ anyị ezigbo ụtọ ịnụ na ndị ohu Jehova na-amụba n’ike n’ike. N’afọ gara aga, anyị mụụrụ ihe karịrị nde mmadụ iri Baịbụl. Nke a gosiri n’eziokwu na ndị ohu Chineke na-eme ka ìhè ha na-enwu. Chegodị banyere ọtụtụ nde ndị nwere mmasị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha mụtara na Chineke ji Ọkpara ya chụọ àjà iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya.—1 Jọn 4:9.

2, 3. (a) Olee ihe na-anaghị eme ka anyị ghara ịna-enwu “dị ka ndị na-enye ìhè”? (b) N’ihi ihe Jizọs kwuru na Matiu 5:14-16, olee ihe anyị ga-atụle?

2 Ndị Jehova n’ụwa niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ma, nke a anaghị eme ka anyị ghara iji otu obi na-eto Nna anyị, bụ́ Jehova. (Mkpu. 7:9) N’agbanyeghị asụsụ anyị na-asụ ma ọ bụ ebe anyị bi, anyị nwere ike ịna-enwu “dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.”—Fil. 2:15.

3 Otú anyị si na-amụba, otú anyị si dịrị n’otu, nakwa otú anyị si eche nche, na-eme ka e too Jehova. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú ihe ndị a si eme ka ìhè anyị na-enwu.—Gụọ Matiu 5:14-16.

NYERE NDỊ ỌZỌ AKA KA HA FEE JEHOVA

4, 5. (a) E wezụga ikwusa ozi ọma, olee otú ọzọ anyị ga-esi eme ka ìhè anyị na-enwu? (b) Olee uru o nwere ike ịba ma anyị kpaso ndị mmadụ àgwà ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 E nwere ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Ìhè n’Ime Ọchịchịrị,” nke gbara n’Ụlọ Nche nke June 1, 1925. Ọ sịrị: “O nweghị onye nwere ike ime ihe Onyenwe anyị chọrọ n’oge ikpeazụ a . . . ọ gwụkwala ma o mere ka ìhè ya na-enwu.” Isiokwu ahụ kwukwara, sị: “Otú ọ ga-esi na-eme ka ìhè ya na-enwu bụ izi ndị mmadụ ozi ọma, nakwa ịkpa àgwà ka onye nọ n’ìhè.” O doro anya na otu ụzọ anyị si eme ka ìhè anyị na-enwu bụ ịna-ekwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Àgwà anyị na-emekwa ka e too Jehova. Ndị anyị na-ezi ozi ọma na ndị na-agafe agafe na-ahụ àgwà anyị. Otú anyị si amụmụ ọnụ ọchị na otú anyị si ekele ndị mmadụ na-egosi ụdị ndị anyị bụ, nakwa ụdị Chineke anyị na-efe.

5 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ.” (Mat. 10:12) N’ebe Jizọs na ndịozi ya kwusara ozi ọma, ndị mmadụ na-anabatakarị ndị ha na-amaghị n’ụlọ ha. Ọ dịghị otú ahụ n’ọtụtụ ebe taa. Ma, otú i si meda obi na otú i si mesapụ ihu kwuo ihe mere i ji bịa nwere ike ime ka ahụ́ ruo onyenwe ụlọ ala. Otú kacha mma ị ga-esi malite izi mmadụ ozi ọma bụ ịmụmụ ọnụ ọchị. Ụmụnna anyị na-emekwa otú ahụ ma ha jiri ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma. I jiri ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma, i nwere ike ịchọpụta na ị mụmụọrọ ndị mmadụ ọnụ ọchị ma ọ bụ kelee ha, o nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe ịbịa were otu n’ime akwụkwọ anyị. Otú i si kpaso ha àgwà nwere ike ime ka gị na ha kwurịta okwu.

6. Olee otú otu di na nwunye katarala ahụ́ si na-ekwusa ozi ọma?

6 Otu di na nwunye katarala ahụ́ bi n’Ịngland anaghị ejecha ozi ụlọ n’ụlọ n’ihi ọrịa. Ha kpebiri na ha ga-eme ka ìhè ha na-enwu n’ihu ụlọ ha. Ha na-edosa akwụkwọ anyị na tebụl mgbe ndị nne na nna na-abịa akpọrọ ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ dị nso n’ụlọ ha. Ọtụtụ ndị nne na nna agaala ebe ahụ were akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1 na Nke 2, nakwa broshọ, n’ihi na ha chọrọ ịmata ihe ha na-ekwu. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ n’ọgbakọ ha na-esokwa ha anọ ebe ahụ. Otú o si na-emesapụ ihu, nakwa otú di na nwunye ahụ si chọọ inyere ndị mmadụ aka mere ka otu nna kweta ka a mụwara ya Baịbụl.

7. Olee otú ị ga-esi nyere ndị gbatara ọsọ ndụ n’obodo unu aka?

7 N’oge na-adịbeghị anya, e nweela ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ gbaga n’ọtụtụ mba. Olee ihe ị ga-eme ka i nyere ha aka ịmata Jehova na ihe o bu n’obi imere ụmụ mmadụ? Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịmụta otú e si ekele mmadụ n’asụsụ ha. Ihe a na-akpọ JW Language ga-enyere gị aka ime otú ahụ. I nwekwara ike ịmụ okwu ụfọdụ nwere ike ime ka ha nwee mmasị. I nweziri ike isi na jw.org gosi ha vidio na akwụkwọ anyị ndị dị n’asụsụ ha.—Diut. 10:19.

8, 9. (a) Olee otú Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ si enyere anyị aka? (b) Olee otú ndị nne na nna ga-esi enyere ụmụ ha aka ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe?

8 Jehova mere ka anyị nwee Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ ka anyị nwee ike ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. Ihe ndị anyị na-amụta n’ọmụmụ ihe a na-enyere ọtụtụ ndị aka ịkata obi ịga nletaghachi na ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl.

9 Ọtụtụ ndị ọhụrụ na-abịa ọmụmụ ihe anyị achọpụtala na ụmụ anyị na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Ndị nne na nna, kụzierenụ ụmụ unu ka ha na-aza ajụjụ otú ha si ekwu okwu, si otú ahụ mee ka ìhè ha na-enwu. Ajụjụ dị nkenke ụmụaka si n’ala ala obi ha zaa emeela ka ụfọdụ ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị bata n’ọgbakọ.—1 Kọr. 14:25.

MEE KA A NA-ADỊKWU N’OTU

10. Olee otú Ofufe Ezinụlọ si eme ka ezinụlọ na-adị n’otu?

10 Otú ọzọ ị ga-esi eme ka ìhè gị na-enwu bụ ịna-eme ka ezinụlọ gị nakwa ọgbakọ unu na-adịkwu n’otu. Otu ụzọ ndị nne na nna ga-esi eme ya bụ ịhazi otú ha na ụmụ ha ga-esi na-enwechi Ofufe Ezinụlọ anya. Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova so n’ihe ọtụtụ ezinụlọ na-eji enwe Ofufe Ezinụlọ n’oge ụfọdụ n’ọnwa. Ha lechaa ihe omume a, ha na-ekwurịta otú ha ga-esi eme ihe ndị ha mụtara. Mgbe nna ma ọ bụ nne na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ, o kwesịrị icheta na ihe a ga-akụziri obere nwa dị iche n’ihe a ga-akụziri onye na-eto eto. Gbalịa hụ na onye nke ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ritere uru n’Ofufe Ezinụlọ unu.—Ọma 148:12, 13.

Inwe mmasị n’ebe ndị agadi nọ na-agba anyị ezigbo ume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11-13. Olee otú mmadụ niile ga-esi eme ka ọgbakọ dịrị n’otu ma nyere ndị ọzọ aka ka ìhè ha na-enwu?

11 Olee otú ndị na-eto eto ga-esi eme ka udo na-adịkwu n’ọgbakọ ma si otú ahụ na-agba ndị ọzọ ume ime ka ìhè ha na-enwu? Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka ị na-enwe mmasị n’ebe ndị agadi nọ? I nwere ike iwetu obi gwa ha ka ha kọọrọ gị ihe ndị merela ná ndụ ha kemgbe ọtụtụ afọ ha na-ejere Jehova ozi. Ihe ha ga-akọrọ gị ga-agba gị ume. Ọ ga-emekwa ka gị na ha na-eme ka ìhè nke eziokwu na-enwukwu. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-agbalị na-anabata ndị bịara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị na-adịkwu n’otu. O nwekwara ike ime ka ndị ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe anyị chọọ ime ka ìhè ha na-enwu. Ihe ndị ị ga-agbalị mee bụ iji ọnụ ọchị kelee ha, inyere ha aka nweta oche, na ime ka ha mata ndị ọzọ. Ime otú ahụ ga-eme ka ahụ́ ruo ha ala.

12 Ọ bụrụ na a gwara gị duzie nzukọ ozi ubi, gbalịa nyere ndị agadi aka ka ha soro na-aga ozi ọma. Hà nwere ebe ga-adịrị ha mfe ịna-ezi ozi ọma? Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịgwa ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ ka ha na ha rụọ ka ha nwee ike inyere ha aka. I nwekwara ike igosi ndị ọrịa na ndị ọnọdụ ha na-anaghị ekwecha gaa ozi ọma na ị hụrụ ha n’anya. N’agbanyeghị afọ ndụ ha ma ọ bụ afọ ole ha nọrọla n’ọgbakọ, otú i si na-enyere ha aka ga-eme ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.—Lev. 19:32.

13 Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!” (Gụọ Abụ Ọma 133:1, 2.) Obi na-atọ ndị Izrel ụtọ ma ha na ibe ha zukọta ife Chineke. Ọ dị ka mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ, bụ́ nke na-esi ísì ụtọ na nke na-eme ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi. Gbalịa ka ị na-akpaso ụmụnna gị àgwà ọma. Ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrịkwuo n’otu. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, anyị na-aja gị mma. Ì nwere ike ịgba mbọ na-amatakwu ụmụnna gị na ha nọ n’ọgbakọ?—2 Kọr. 6:11-13.

14. Olee ihe i nwere ike ime ka ìhè gị na-enwu n’ebe i bi?

14 I kwesịkwara ịgbakwu mbọ mee ka ìhè nke eziokwu Baịbụl na-enwu n’ebe i bi. Otú i si eji olu ọma agwa ndị mmadụ okwu n’ebe i bi na ihe ọma ndị ị na-emere ha nwere ike ime ka onye agbata obi gị bata n’ọgbakọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ndị agbata obi m si ele m anya? Ụlọ m na gburugburu ya, ọ̀ na-adị ọcha? Ọ̀ na-eme ka ebe m bi dịkwuo mma n’anya? M̀ na-enyere ndị ọzọ aka?’ Ọ bụrụ na gị na ụmụnna ndị ọzọ ekwurịtawa okwu, i nwere ike ịjụ ha otú àgwà ọma ha si baara ndị ọzọ uru. O nwere ike ịbụ ndị agbata obi ha, ndị ọrụ ha, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha. I nwere ike ịnụ ihe ndị nwere ike ịgba gị ume.—Efe. 5:9.

NA-ECHENỤ NCHE

15. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-eche nche?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme ka ìhè anyị na-enwu nke ọma, anyị kwesịrị ịghọta na anyị bi n’oge ikpeazụ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ugboro ugboro, sị: “Na-echenụ nche.” (Mat. 24:42; 25:13; 26:41) Ọ bụrụ na anyị ana-eche na “oké mkpagbu” ka dị anya, na ọ ga-abịa mgbe anyị nwụrụ, ọ ga-eme ka anyị ghara iji ozi ọma kpọrọ ihe. (Mat. 24:21) Kama ime ka ìhè anyị na-enwu n’ebe anyị bi, ìhè anyị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ ma ọ bụdị nyụchaa.

16, 17. Olee ihe ị ga-eme ka ị nọgide na-eche nche?

16 Ka oge ikpeazụ a na-akakwu njọ, anyị niile kwesịrị ịna-eche nche. Jehova ga-ebibi ndị ọjọọ ma oge ọ chọrọ iji ebibi ha zuo. A naghị agbagha ya agbagha. (Mat. 24:42-44) Ma ka ọ dị ugbu a, na-enwe ndidi, na-echekwa nche. Na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-ekpesikwa ekpere ike. (1 Pita 4:7) Mụta ihe n’aka ụmụnna, bụ́ ndị obi na-atọ ụtọ n’ihi na ha na-eche nche ma na-eme ka ìhè ha na-enwu. Dị ka ihe atụ, i nwere ike gụọ akụkọ ndụ isiokwu ya bụ “M Jidela Uwe Mwụda nke Onye Juu Ruo Afọ Iri Asaa.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2012, peeji nke 18-21.

17 Jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. Na-emere ndị ọzọ ihe ọma, na-ewepụtakwa oge ka gị na ụmụnna gị na-anọrị. Ime ihe ndị a ga-eme ka obi na-atọ gị ụtọ. Ọ ga-emekwa ka ọ dị gị ka oge ọ̀ na-agba ọsọ. (Efe. 5:16) Ihe karịrị otu narị afọ gara aga, ụmụnna anyị rụrụ ọtụtụ ihe. Ma, ihe anyị na-arụ ugbu a karịrị nke ha rụrụ. Ọ bụ Jehova na-enyekwara anyị aka ịna-arụ ha. Anyị na-eme ka ìhè anyị na-enwu ugbu a karịa otú anyị chetụrụla n’echiche.

Ndị okenye ịbịa nleta ọzụzụ atụrụ n’ụlọ anyị na-eme ka anyị mụta ihe n’Okwu Chineke (A ga-akọwa ya na paragraf nke 18 na nke 19)

18, 19. Olee otú ndị okenye ga-esi enyere anyị aka ịna-eche nche na ịna-anụ ọkụ n’obi? Kọwaa.

18 Okwukwe anyị na-esi ike ma anyị mata na ezughị okè anyị anaghị eme ka anyị ghara ife Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, obi kwesịrị ịna-atọ gị ụtọ na Jehova nyere anyị “onyinye n’ụdị mmadụ,” ya bụ, ndị okenye ọgbakọ. (Gụọ Ndị Efesọs 4:8, 11, 12.) Oge ọzọ okenye bịara ileta gị, were ohere ahụ mụta ihe n’ihe ndị ọ ga-akọrọ gị, nakwa ndụmọdụ ọ ga-enye gị.

19 Mgbe otu di na nwunye bi n’Ịngland nwere nsogbu, ha kpọrọ ndị okenye abụọ ka ha bịa nyere ha aka, ha bịakwara. Ọ na-adị nwunye nwanna ahụ ka di ya ejighị ofufe Chineke kpọrọ ihe. Di ya kwetara na ya amaghị ihe akụzi, nakwa na ya ahazighị ka ya na ndị ezinụlọ ya na-enwechi ofufe ezinụlọ anya. Ndị okenye ahụ kọọrọ ha ihe Jizọs mere ha kwesịrị ịna-eme. Jizọs lekọtara ndị na-eso ụzọ ya, ma gbooro ha mkpa ha. Ndị okenye gbara nwanna ahụ ume ka ọ na-eṅomi Jizọs, gbaakwa nwunye ya ume ka ọ na-enwe ndidi ka Jizọs. Ha gwakwara ha otú ha ga-esi agbakọta aka ka ha na ụmụ ha abụọ na-enwe ofufe ezinụlọ. (Efe. 5:21-29) Ndị okenye mechaziri jaa nwanna ahụ mma maka ime ihe ha gwara ya. Ha gwara ya ka ọ ghara ịda mbà n’obi, nakwa ka ọ rịọ Jehova ka o nye ya mmụọ nsọ ya ịbụ onye isi ezinụlọ ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Otú ndị okenye ahụ si hụ ezinụlọ a n’anya, nakwa aka ha nyeere ha emeela ka ìhè ha na-enwu.

20. Olee uru ọ ga-abara gị ma ị na-eme ka ìhè gị na-enwu?

20 Otu ọbụ abụ kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova, onye na-eje ije n’ụzọ ya.” (Ọma 128:1) Ihe ị ga-eme ka ìhè gị na-enwu bụ ịkụziri ndị ọzọ banyere Chineke, ịna-akpa àgwà otú ga-eme ka ezinụlọ gị nakwa ọgbakọ dịrị n’otu, na ịna-eche nche. Ime ihe ndị a ga-eme ka ịna-enwe obi ụtọ. Ndị ọzọ ga-ahụ ihe ọma ndị ị na-eme ma chọọ inye Nna anyị, bụ́ Jehova otuto.—Mat. 5:16.