Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Kwe Ka Iwu na Ụkpụrụ Chineke Na-azụ Akọnuche Gị

Kwe Ka Iwu na Ụkpụrụ Chineke Na-azụ Akọnuche Gị

“M na-atụgharị uche n’ihe ncheta gị.”—ỌMA 119:99.

ABỤ: 127, 88

1. Olee otu ihe mere ụmụ mmadụ ji ka ụmụ anụmanụ?

OTU ihe mere ụmụ mmadụ ji ka ụmụ anụmanụ bụ na Chineke nyere ụmụ mmadụ akọnuche. Ụmụ mmadụ nwere akọnuche kemgbe ụwa. Mgbe Adam na Iv nupụchaara Jehova isi, ha gara zoo onwe ha. Nke a gosiri na akọnuche ha na-ama ha ikpe.

2. Olee otú akọnuche anyị si yie ihe e ji akwọ ụgbọ mmiri? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 E nwere ike iji ndị na-azụghị akọnuche ha nke ọma tụnyere ụgbọ mmiri ihe e ji akwọ ya na-adịghị mma. Iji ihe e ji akwọ ụgbọ mmiri nke na-anaghị arụ ọrụ nke ọma akwọ ụgbọ mmiri nwere ike ịkpata ọdachi. Ikuku ma ọ bụ mmiri na-asọ asọ nwere ike iburu ụgbọ mmiri ahụ gaa ebe ụzọ. Ihe e ji akwọ ụgbọ mmiri a rụziri nke ọma ga-enyere onye na-akwọ ya aka ịga ebe ọ na-aga. E nwere ike iji akọnuche anyị tụnyere ihe ahụ e ji akwọ ụgbọ mmiri. Akọnuche anyị na-agwa anyị ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ ma na-eduzi anyị ime ihe ziri ezi. Ma, ka akọnuche anyị nwee ike iduzi anyị, anyị ga-azụ ya nke ọma.

3. Olee ihe nwere ike ime ma anyị azụghị akọnuche anyị nke ọma?

3 Ọ bụrụ na mmadụ azụghị akọnuche ya nke ọma, ọ gaghị agwa ya na ihe ọ chọrọ ime dị njọ. (1 Tim. 4:1, 2) Ụdị akọnuche ahụ nwedịrị ike ime ka anyị kweta na “ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịza. 5:20) Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ.” (Jọn 16:2) Otú ahụ ka ndị gburu Stivin onye na-eso ụzọ Jizọs chere. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ọzọ. (Ọrụ 6:8, 12; 7:54-60) Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị bú okpukpe ha n’isi na-eme ihe jọgburu onwe ha, dị ka igbu ọchụ, ma na-eche na ọ bụ Chineke ka ha meere ya. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe a ha mere megidere iwu Chineke. (Ọpụ. 20:13) O doro anya na akọnuche ha duhiere ha.

4. Gịnị ka anyị ga-eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma?

4 Gịnị ka anyị ga-eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma? Iwu na ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke ‘bara uru iji zie ihe, iji dọọ mmadụ aka ná ntị, iji mee ka ihe guzozie, na iji nye ọzụzụ n’ezi omume.’ (2 Tim. 3:16) N’ihi ya, anyị ga na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche ma na-eme ha eme. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-azụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ịna-eche echiche otú Chineke si eche. Ọ ga-emekwa ka akọnuche anyị na-eduzi anyị nke ọma. Ka anyị tụlee otú iwu na ụkpụrụ Jehova ga-esi enyere anyị aka ịzụ akọnuche anyị.

KWE KA IWU CHINEKE NA-AZỤ GỊ

5, 6. Olee otú iwu Chineke si abara anyị uru?

5 Ka iwu Chineke nwee ike ịbara anyị uru, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgụ ha ma ọ bụ ịmata ha. Kama, anyị ga-eji ha kpọrọ ihe. Okwu Chineke kwuru, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.” (Emọs 5:15) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị ga-amụta ile ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọ na-esiri gị ike ihi ụra nke ọma. Dọkịta agwa gị ụdị nri ị ga na-eri, otú ị ga-esi na-emega ahụ́, na ihe ndị ọzọ ị ga-agbanwe ná ndụ gị. Mgbe i mechara ihe ndị a, gị achọpụta na o nyeere gị aka. O doro anya na ị ga-ekele dọkịta ahụ n’ihi otú o si nyere gị aka ka ahụ́ dị gị mma.

6 Onye kere anyị enyekwala anyị iwu ndị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu, meekwa ka ndụ anyị ka mma. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịgha ụgha, ịghọ aghụghọ, izu ohi, ịkwa iko, ime ihe ike, na ime mgbaasị. Chegodị uru ọ ga-abara anyị ma anyị gbaara ihe ndị a ọsọ. (Gụọ Ilu 6:16-19; Mkpu. 21:8) Ọ bụrụ na Jehova agọzie anyị n’ihi na anyị rubeere ya isi, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, jirikwa iwu ya kpọrọkwuo ihe.

7. Olee ihe ịgụ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na ichebara ha echiche ga-enyere anyị aka ime?

7 Anyị ekwesịghị ibu ụzọ taa ahụhụ n’ihi imebi iwu Chineke tupu anyị amụta ihe. Anyị ga-amụta ihe n’aka ndị mere mmehie n’oge gara aga e dere banyere ha n’Okwu Chineke. Ilu 1:5 kwuru, sị: “Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka.” N’eziokwu, anyị na-amụta ihe n’aka Chineke mgbe anyị na-agụ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma na-echebara ha echiche. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi si gbawaa Eze Devid mgbe ya na Bat-shiba kwara iko ma si otú ahụ nupụrụ Jehova isi. (2 Sam. 12:7-14) Anyị gụọ akụkọ a ma chebara ya echiche, anyị nwere ike jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú Eze Devid gaara esi gbaara nsogbu a ọsọ? Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa a abịara m, m̀ ga-akatali obi gbaara ya ọsọ? M̀ ga-agba ọsọ ka Josef, ka m̀ ga-eme ka Devid?’ (Jen. 39:11-15) Anyị chebara nsogbu mmehie nwere ike ịkpatara anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị kata obi ‘kpọọ ihe ọjọọ asị.’

8, 9. (a) Olee ihe akọnuche anyị na-enyere anyị aka ime? (b) Olee otú ụkpụrụ Jehova na akọnuche anyị si arụkọ ọrụ?

8 Anyị kwesịrị ịgbara ihe Chineke kpọrọ asị ọsọ. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ Baịbụl na-enyeghị anyị iwu banyere ha. Olee otú anyị ga-esi amata ihe Chineke chọrọ ka anyị mee? Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Baịbụl zụọ akọnuche anyị, anyị ga-eme mkpebi dị mma.

9 Ebe Jehova hụrụ anyị n’anya, o nyere anyị ụkpụrụ ndị ga na-eduzi akọnuche anyị. O kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” (Aịza. 48:17, 18) Ọ bụrụ na anyị echebakwuoro ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl echiche ma kwe ka o ruo anyị n’obi, anyị ga na-eduzi akọnuche anyị nke ọma. Nke a ga-enyekwara anyị aka ime mkpebi dị mma.

KWE KA ỤKPỤRỤ NDỊ DỊ NA BAỊBỤL NA-EDUZI GỊ

10. Gịnị bụ ụkpụrụ, oleekwa otú Jizọs si jiri ya kụzie ihe?

10 Ụkpụrụ bụ eziokwu dị mkpa na-eduzi otú anyị si eche echiche, na-enyekwara anyị aka ime mkpebi dị mma. Ịghọta ụkpụrụ Jehova na-enyere anyị aka ịmata otú o si eche echiche, nakwa ihe mere o ji nye anyị iwu ụfọdụ. N’oge niile Jizọs jere ozi n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya eziokwu ndị dị mkpa ga-enyere ha aka ịmata uru ma ọ bụ ọghọm dị n’ịkpa àgwà ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ kụziri na iwe nwere ike ịkpata esemokwu, nakwa na iche echiche rụrụ arụ nwekwara ike ime ka mmadụ kwaa iko. (Mat. 5:21, 22, 27, 28) Ka anyị nwee ike inwe akọnuche a zụrụ nke ọma, anyị kwesịrị ikwe ka ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl na-eduzi anyị ma si otú ahụ mee ka e too Chineke.—1 Kọr. 10:31.

Onye Kraịst tozuru okè na-echebara akọnuche ndị ọzọ echiche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)

11. Olee otú akọnuche Onye Kraịst nwere ike isi dị iche na nke Onye Kraịst ọzọ?

11 A bịa n’okwu ụfọdụ, ihe Onye Kraịst ji Baịbụl zụọ akọnuche ya kpebiri ime nwere ike ịdị iche n’ihe Onye Kraịst ọzọ kpebiri. Chegodị banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Baịbụl ekwughị na ịṅụ ya dị njọ. Ma, ọ gwara anyị aṅụbigala ya ókè. (Ilu 20:1; 1 Tim. 3:8) Ma, ọ̀ pụtara na ọ bụrụhaala na Onye Kraịst anaghị aṅụbiga mmanya ókè na o nweghị ihe ọzọ ọ ga-echebara echiche mgbe ọ chọrọ ịṅụ mmanya? Mbanụ. Ọ bụrụgodị na akọnuche ya enyeghị ya nsogbu, o kwesịrị ichebara akọnuche nke ndị ọzọ echiche.

12. Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Rom 14:21 ga-esi enyere anyị aka ịkwanyere akọnuche ndị ọzọ ùgwù?

12 Pọl kwuru na Onye Kraịst kwesịrị ichebara akọnuche ndị ọzọ echiche. Ọ sịrị: “Ọ dị mma ka ị ghara iri anụ ma ọ bụ ịṅụ mmanya ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.” (Rom 14:21) Ị̀ dị njikere ịhapụ ime ihe ụfọdụ iwu na-ejighị gị ime ma ọ bụrụ na o nwere ike inye nwanna akọnuche ya dị iche na nke gị nsogbu? O doro anya na ị ga-ahapụ ha. Tupu ụfọdụ ụmụnna anyị amụta eziokwu Baịbụl, ha na-aṅụbiga mmanya ókè. Ma ugbu a, ha ekpebiela na ha agaghịzi aṅụ mmanya. N’eziokwu, o nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ime ka nwanna mewe ihe ndị ahụ ọ kwụsịrị ime. (1 Kọr. 6:9, 10) N’ihi ya, ọ gaghị adị mma ka nwanna manye nwanna bịara na nke ya ka ọ ṅụọ mmanya ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịṅụ.

13. Olee otú Timoti si kwanyere akọnuche ndị ọzọ ùgwù iji mee ka ha gee ntị n’ozi ọma?

13 Mgbe Timoti ka bụ okorobịa, o kwere ka e bie ya úgwù n’agbanyeghị na ọ fụrụ ya ụfụ. Ihe mere o ji kwere bụ ka ndị Juu ọ na-aga izi ozi ọma nwee ike ige ya ntị. Ihe a o mere yiri ihe Pọl onyeozi mere. (Ọrụ 16:3; 1 Kọr. 9:19-23) Ị̀ dị njikere ịhapụ ihe ụfọdụ iji nyere ndị ọzọ aka otú ahụ Timoti mere?

“JISIE IKE RUO NTOZU OKÈ”

14, 15. (a) Olee ihe mmadụ ga-eme ka o tozuo okè? (b) Olee otú Onye Kraịst igosi na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya si gbasa itozu okè?

14 Ndị Kraịst niile kwesịrị ‘ịhapụ ozizi ndị mbụ banyere Kraịst’ ma “jisie ike ruo ntozu okè.” (Hib. 6:1) Na anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ agaghị eme ka anyị bụrụ Ndị Kraịst tozuru okè. Anyị kwesịrị ‘ijisi ike,’ ma ọ bụ na-arụsi ọrụ ike. Ka anyị nwee ike ịbụ ndị tozuru okè, anyị ga-anọgide na-enwe amamihe na nghọta. Ọ bụ ya mere e ji na-agba anyị ume ka anyị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. (Ọma 1:1-3) Ì kpebiela ị na-eme otú ahụ? Ime otú ahụ ga-eme ka ị ghọtakwuo iwu Jehova na ụkpụrụ ya, ghọtakwuokwa Okwu ya.

15 Ịhụnanya bụ iwu kachanụ e nyere Ndị Kraịst. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Jems nwanne Jizọs kpọrọ ịhụnanya, “iwu nke eze nyere.” (Jems 2:8) Pọl kwuru na “ịhụnanya bụ idebezu iwu ahụ.” (Rom 13:10) Otú a e si kwusie okwu ike banyere ịhụnanya ejughị anyị anya, n’ihi na Baịbụl gwara anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Chineke anaghị ekwu naanị n’ọnụ na ya hụrụ anyị n’anya. Ọ na-eme ihe ndị na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Jọn kwuru, sị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.” (1 Jọn 4:9) N’eziokwu, Chineke mere ihe iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị hụrụ Jehova, Ọkpara ya, ụmụnna anyị, nakwa ndị ọzọ n’anya, anyị na-egosi na anyị bụ Ndị Kraịst tozuru okè.—Mat. 22:37-39.

Ka anyị na-eme ihe Chineke na-akụziri anyị, akọnuche anyị ga na-eduzi anyị nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Gịnị mere ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl ga-eji dị anyị ezigbo mkpa ka anyị na-etozu okè?

16 Ka ị na-etozu okè, ị ga-amata na ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl baara gị uru. Nke a bụ n’ihi na iwu nwere ihe a kpọrọ aha mee ya, ma ụkpụrụ nwere ike ịbara mmadụ uru n’ọtụtụ ihe a na-enyeghị anyị iwu na ha. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị amaghị nsogbu ọ ga-abanye na ya ma ya na ndị ọjọọ na-akpa, ọ bụ ya mere ndị mụrụ ya ga-eji nye ya iwu iji chebe ya. (1 Kọr. 15:33) Ma, ka nwa ahụ na-eto, ọ ga-amụta otú ọ ga-esi na-echebara ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl echiche. Nke a ga-enyere ya aka ịhọrọ ezigbo ndị enyi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 13:11; 14:20.) Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl echiche, akọnuche anyị ga na-eduzi anyị nke ọma, anyị ana-echekwa echiche otú Chineke si eche.

17. Gịnị mere anyị ga-eji kwuo na anyị nwere ihe ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi?

17 Ànyị nwere ihe niile ga-enyere anyị aka ime mkpebi ndị dị Jehova mma? À na-ajụkwa ajụ? Ọ bụrụ na anyị ana-erubere iwu na ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke isi, anyị ga-eru ‘eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ ndị a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.’ (2 Tim. 3:16, 17) N’ihi ya, chọpụta ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl ka i nwee ike ‘ịghọta ihe uche Jehova bụ.’ (Efe. 5:17) Jiri ihe ndị a nzukọ Jehova wepụtara na-amụ Baịbụl. Ha bụ Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, Watchtower Library, Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET, na JW Library. E wepụtara ihe ndị a ka ịmụ ihe n’onwe anyị na ọmụmụ ihe ezinụlọ bakwuoro anyị uru.

AKỌNUCHE E JI BAỊBỤL ZỤỌ NA-ABARA ANYỊ URU

18. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-erubere iwu Jehova na ụkpụrụ ya isi?

18 Ndụ anyị ga-akakwu mma ma anyị na-erubere iwu Jehova na ụkpụrụ ya isi. Abụ Ọma 119:97-100 kwuru, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum. Ihe i nyere n’iwu na-eme ka m mara ihe karịa ndị iro m, n’ihi na ọ bụ nke m ruo mgbe ebighị ebi. Enwewo m nghọta karịa ndị nkụzi m niile, n’ihi na m na-atụgharị uche n’ihe ncheta gị. Ana m eji nghọta eme ihe karịa ndị okenye, n’ihi na edebewo m iwu gị.” Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge “na-atụgharị uche” n’iwu na ụkpụrụ Jehova, ihe ndị anyị na-eme ga-egosi na anyị nwere amamihe na nghọta karị. Anyị kwe ka iwu na ụkpụrụ Chineke zụọ akọnuche anyị, anyị ga-agbalịsi ike ịna-eto “ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.”—Efe. 4:13.