Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Gaara Enweta Ngọzi Chineke

Ọ Gaara Enweta Ngọzi Chineke

ANYỊ na-efe Jehova ma chọọ ka ọ gọzie anyị, ọ̀ bụghị eziokwu? Ma, ònye ka Chineke ga-agọzi? N’oge Baịbụl, e nwere ndị ha na Chineke mechara dị ná mma n’agbanyeghị na e nwere mgbe ha mere mmehie dị oké njọ n’oge gara aga. E nwekwara ndị nwere àgwà ọma, ma n’ikpeazụ ha na Chineke adịkwaghị ná mma. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị: “Olee ihe Jehova na-achọ n’aka onye ọ bụla n’ime anyị?” Ihe Rehoboam, eze Juda mere ga-enyere anyị aka ịmata azịza ya.

OTÚ O SI MALITE ADỊGHỊ MMA

Nna Rehoboam, bụ́ Sọlọmọn chịrị Izrel afọ iri anọ. (1 Eze 11:42) Sọlọmọn nwụrụ n’afọ 997 Tupu Oge Ndị Kraịst. Mgbe ọ nwụchara, Rehoboam si Jeruselem gaa Shikem ka e chie ya eze. (2 Ihe 10:1) Ụjọ ọ̀ na-atụ ya ime ihe nna ya mere, bụ́ onye nwere amamihe pụrụ iche? Olee otú Rehoboam ga-esi amata n’oge na-adịghị anya ma ọ̀ ga-enwe amamihe ọ ga-eji edozi nsogbu tara akpụ dapụtaranụ?

Ọ ga-abụ na Rehoboam chọpụtara na obi adịghị ndị Izrel mma n’ihi na e mekpọrọ ha ọnụ. Ka oge na-aga, ndị Izrel zipụrụ ndị mmadụ ka ha gaa gwa ya ihe ha chọrọ ka o meere ha. Ha gwara ya, sị: “Nna gị mere ka yok anyị sie ike; mee ka ọrụ siri ike nna gị nyere anyị na yok dị arọ nke o boro anyị dị mfe, anyị ga-ejekwara gị ozi.”—2 Ihe 10:3, 4.

O nwere ike ịbụ na Rehoboam amaghị ihe ọ ga-eme eme. Ọ bụrụ na o meere ndị Izrel ihe ndị ha kwuru, yanwa, ndị ezinụlọ ya, na ndị nọ n’obí ya agaghịzi na-ekpori ndụ otú ha sibu ekpori. Ọ jụkwanụ imere ndị Izrel ihe ha kwuru, ha agaghịzi na-erubere ya isi. Gịnịzi ka ọ ga-eme? Ihe mbụ Rehoboam mere bụ ịga kọọrọ ya ndị okenye, bụ́ ndị ndụmọdụ Sọlọmọn. Ma, o mechakwara gaa kọọrọ ya ndị ọgbọ ya ka ha gwa ya ihe ọ ga-eme. N’ihi ihe ndị ọgbọ ya gwara ya, o kpebiri na ya ga-emekpọ ndị Izrel ọnụ. Ọ gwara ha, sị: “M ga-eme ka yok unu dịkwuo arọ, mụ onwe m ga-atụkwasị ihe na ya. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma mụ onwe m ga-apịa unu ụtarị akpụkpọ anụ.”—2 Ihe 10:6-14.

Ò nwere ihe anyị ga-amụta n’ihe a? À na-ajụkwa ajụ? Ige ụmụnna ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ ntị bara uru. Ebe ọ bụ na ha ma nke a na-akọ, ha nwere ike ịma uru ma ọ bụ ọghọm dị n’ihe anyị chọrọ ime, ma gwa anyị ihe anyị ga-eme, ya abaara anyị uru.—Job 12:12.

‘HA RUBERE ISI N’IHE JEHOVA KWURU’

Rehoboam kpọkọtara ndị agha ya ka ha gaa buso ndị nupụụrụ ya isi agha. Ma, Jehova zigara Shemaya onye amụma ka ọ gwa ha, sị: “Unu agbagola ibuso ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Izrel agha. Laghachinụ onye ọ bụla n’ụlọ ya, n’ihi na ihe a na-emenụ si m n’aka.”—1 Eze 12:21-24. *

Ọ̀ dịịrị Rehoboam mfe ige Jehova ntị? Chegodị otú ihe a si nye Rehoboam nsogbu n’obi. Olee ihe i chere ndị mmadụ ga-ekwu banyere eze a yiri ndị ọ na-achị egwu na ọ ga-eji “ụtarị akpụkpọ anụ” pịa ha, ma o nweghị ihe o mere n’isi a ha nupụụrụ ya? (Tụlee 2 Ihe E Mere 13:7.) Ma, eze ahụ na ndị agha ya ‘rubere isi n’ihe Jehova kwuru, wee laghachi n’ụlọ ha dị ka okwu Jehova si dị.’

Olee ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a? Ọ bara uru ka anyị rubere Chineke isi, a sịgodị na ndị mmadụ ga-achị anyị ọchị maka ya. Irubere Chineke isi ga-eme ka ọ gọzie anyị, anyị na ya adịrịkwa ná mma.—Diut. 28:2.

Olee uru isi a Rehoboam rubere baara ya? Ọ hapụrụ ịga buso alaeze ọhụrụ a agha, ma gaa na-ewu obodo ndị dị na Juda na Benjamin, bụ́ ndị ọ ka na-achị. O mekwara ka obodo ụfọdụ “sikwuo ike nke ukwuu.” (2 Ihe 11:5-12) Nke ka nke, o rubeere Jehova isi ruo oge ụfọdụ. Ka alaeze ebo iri Jeroboam na-achị malitere ife chi ọzọ, ọtụtụ n’ime ha gara Jeruselem ka ha fee Chineke, ma si otu ahụ ‘kwado Rehoboam.’ (2 Ihe 11:16, 17) N’ihi ya, ọchịchị Rehoboam bịara sikwuo ike n’ihi na o rubeere Jehova isi.

MMEHIE REHOBOAM MERE NA OTÚ O SI CHEGHARỊA

Mgbe ọchịchị Rehoboam bịara sie ezigbo ike, o mere ihe a na-atụghị anya ya. Ọ kwụsịrị irubere Jehova isi ma malite ife chi ọzọ. Maka gịnị? Ọ̀ bụ nne ya, bụ́ nwaanyị Amọn mere o ji fewe chi ọzọ? (1 Eze 14:21) N’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya, ndị niile ọ na-achị sooro ya fewe chi ọzọ. N’ihi ya, Jehova kwere ka Eze Shaịshak nke Ijipt merie ọtụtụ obodo ndị dị na Juda, n’agbanyeghị na Rehoboam mere ka ha sikwuo ike.—1 Eze 14:22-24; 2 Ihe 12:1-4.

Egwú bịara dagharịa mgbe Shaịshak rutere Jeruselem, bụ́ ebe Rehoboam nọ na-achị. Ma ugbu a, Shemaya onye amụma ziri Rehoboam na ndị isi Izrel ozi Chineke ziri ha. Ọ gwara ha, sị: “Unu onwe unu ahapụwo m, mụ onwe m ahapụwokwa unu n’aka Shaịshak.” Olee ihe Rehoboam mere n’ozi a e ji dọọ ya aka ná ntị? O mere ihe dị mma. Baịbụl kwuru, sị: “Ndị isi Izrel na eze wee weda onwe ha ala wee sị: ‘Jehova bụ onye ezi omume.’” N’ihi ya, Jehova napụtara Rehoboam, ma mee ka a ghara ibibi Jeruselem.—2 Ihe 12:5-7, 12.

Rehoboam nọgidere na-achị alaeze Juda. Tupu ya anwụọ, o nyere ụmụ ya ọtụtụ onyinye. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji mee ya bụ ka ha ghara inye nwanne ha Abaịja nsogbu, bụ́ onye ga-anọchi ya. (2 Ihe 11:21-23) Na nke ugbu a, Rehoboam kpara àgwà ka onye ma ihe karịa otú ọ kpara ná mbụ.

REHOBOAM Ọ̀ BỤ EZE ỌMA KA Ọ̀ BỤ EZE ỌJỌỌ?

N’agbanyeghị ihe ọma ụfọdụ Rehoboam mere, ihe ya adịghị Chineke mma. Baịbụl kwuru banyere ọchịchị ya, sị: “O mere ihe ọjọọ.” Maka gịnị? Maka na “o tinyeghị obi ya n’ịchọ Jehova.”—2 Ihe 12:14.

Rehoboam na Jehova adịghị n’ezigbo mma, o meghị ka Eze Devid

Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe Rehoboam mere? O rubeere Chineke isi mgbe ụfọdụ. O mekwaara ndị Jehova ụfọdụ ihe ọma. Ma, ya na Jehova adịghị n’ezigbo mma, o jighịkwa obi ya niile fee ya. N’ihi ya, o mere ihe ọjọọ, feekwa chi ọzọ. I nwere ike na-eche, sị: ‘Mgbe Rehoboam mechara rubere Jehova isi, ọ̀ bụ ndị ọzọ gwara ya mee otú ahụ, ka ọ̀ bụ na o ji obi ya niile chegharịa ma mewe ihe dị Chineke mma?’ (2 Ihe 11:3, 4; 12:6) O mechara mewekwa ihe na-adịghị mma. O meghị ka nna nna ya, bụ́ Eze Devid. Ọ bụ eziokwu na Devid mere mmehie, ma o ji obi ya niile chegharịa. Ọ hụkwara Jehova n’anya, ma jiri ndụ ya niile fee ya.—1 Eze 14:8; Ọma 51:1, 17; 63:1.

Anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka Rehoboam. Anyị kwesịrị ịna-akpa afọ ezinụlọ anyị ma na-arụsi ọrụ ike n’ozi Jehova. Anyị chọọ ka Chineke gọzie anyị, anyị ga-efe ya otú ọ chọrọ, ma gbalịa ka anyị na ya na-adị ná mma.

Ka anyị nwee ike ime otú ahụ, anyị ga-agbalị jiri obi anyị niile hụ Jehova n’anya. Otú ahụ anyị na-esi etinye nkụ n’ọkụ ka ọ na-enwu ka anyị kwesịkwara ịgbasi mbọ ike ka anyị na-ahụ Chineke n’anya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, na-echebara ihe ndị anyị na-agụ echiche, ma na-ekpe ekpere. (Ọma 1:2; Rom 12:12) Otú anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị chọọ ime ihe dị ya mma n’ihe niile anyị na-eme. Ọ ga-emekwa ka anyị jiri obi anyị niile chegharịa ma anyị mehie. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị adị ka Rehoboam, kama anyị ga-anọgide na-efe Jehova.—Jud 20, 21.

^ para. 9 Chineke ebula ụzọ kwuo na ya ga-ekewa alaeze Izrel ụzọ abụọ n’ihi na Sọlọmọn nupụụrụ ya isi.—1 Eze 11:31.