ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jun 2020

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọgọst 3 ruo 30, 2020.

“Ka E Doo Aha Gị Nsọ”

Isiokwu a na-amụ amụ nke 23: Ọgọst 3-9, 2020. Olee ihe dị ndị mmadụ na ndị mmụọ ozi ezigbo mkpa? Olee ihe mere o ji dị ezigbo mkpa, oleekwa otú o si gbasa anyị? Ịghọta azịza ajụjụ ndị a na ajụjụ ndị yiri ya ga-eme ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma.

“Mee Ka Obi M Dị n’Otu Ịtụ Egwu Aha Gị”

Isiokwu a na-amụ amụ nke 24: Ọgọst 10-16, 2020. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Devid kpere n’ekpere e dere n’Abụ Ọma 86:​11, 12. Gịnị ka ịtụ egwu aha Jehova pụtara? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ aha ukwu ahụ? Oleekwa otú ịtụ egwu Chineke nwere ike isi mee ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ bụ naanị àgwà ndị ahụ dị ná Ndị Galeshia 5:​22, 23 so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”?

“Mụ Onwe M Ga-achọta Atụrụ M”

Isiokwu a na-amụ amụ nke 25: Ọgọst 17-23, 2020. Gịnị mere ụfọdụ ndị ferela Jehova ọtụtụ afọ ji akwụsị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma? Olee otú obi na-adị Chineke maka ha? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a. Isiokwu a lebakwara anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jehova si nyere ndị kwụsịtụrụ ife ya aka n’oge ochie.

“Lọghachikwutenụ M”

Isiokwu a na-amụ amụ nke 26: Ọgọst 24-30, 2020. Jehova chọrọ ka ndị na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe na ozi ọma lọghachikwute ya. Jehova na-agwa ha, sị: “Lọghachikwutenụ m.” E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji gbaa ndị chọrọ ịza òkù a Jehova kpọrọ ha ume. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi nyere ha aka ịza òkù a.