Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịza Òkù E Ji Opi Akpọ n’Oge Anyị A

Ịza Òkù E Ji Opi Akpọ n’Oge Anyị A

ANYỊ niile kweere na ọ bụ Jehova na-eduzi ndị ya ma na-enyere ha aka ife ya “n’oge ikpeazụ” a. (2 Tim. 3:1) Ma, anyị niile kwesịrị ịna-erubere Jehova isi. Anyị nwere ike iji oge anyị a tụnyere oge ndị Izrel nọ n’ala ịkpa. E nwere ihe ha kwesịrị ime ma ha nụ ụda opi.

Jehova gwara Mozis ka ọ kpụọ opi ọlaọcha abụọ ọ ga-eji “na-akpọkọta nzukọ ahụ, na-emekwa ka ha kwalie.” (Ọnụ Ọgụ. 10:2) Ndị nchụàjà ga na-afụ opi ahụ n’ụzọ dị iche iche iji gwa ụmụ Izrel ihe a chọrọ ka ha mee. (Ọnụ Ọgụ. 10:​3-8) Taa, a na-esi n’ụzọ dị iche iche agwa ndị Chineke ihe ha ga-eme. Ka anyị tụlee ụzọ atọ e si agwa anyị ihe anyị ga-eme, nakwa otú ha si yie opi a fụụrụ ndị Izrel. Ụzọ atọ ndị ahụ bụ, ịkpọ ndị Chineke taa ka ha gaa mgbakọ dị iche iche, ịkpọ ndị okenye ka ha gaa ọzụzụ, na ihe ụfọdụ a na-agbanwe n’otú e si eme ihe ná nzukọ Jehova.

MGBAKỌ DỊ ICHE ICHE

Jehova chọọ ka “nzukọ ahụ dum” zukọta n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ndị nchụàjà na-afụ opi abụọ ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 10:3) Ebo niile mara ụlọikwuu ha n’akụkụ anọ nke ụlọikwuu ahụ na-anụ ụda opi ahụ. Ndị ụlọikwuu ha dị nso n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ nwere ike irute ná nkeji ole na ole. Ndị nke ha nọ ebe dị anya nwere ike igbutụ oge ma gaa ogologo ije tupu ha erute. Nke ọ bụla ọ bụ, Jehova chọrọ ka ha niile zukọta ma nụrụ ihe ọ chọrọ ịgwa ha.

Taa, anyị anaghị ezukọta n’ụlọikwuu. Ma, a na-akpọ anyị òkù ka anyị bịa nzukọ ndị Chineke dị iche iche. Nzukọ ndị a bụ mgbakọ ukwu na mgbakọ ndị ọzọ pụrụ iche a na-anọ agwa anyị ihe ndị anyị ga-eme. N’ụwa niile, ndị Jehova na-amụ otu ihe. Ndị zara ụdị òkù a na-enwe obi ụtọ ma ha na ụmụnna ha nọrọ. Ụfọdụ nwere ike isi ebe dị anya karịa ibe ha. N’agbanyeghị ya, ndị zara òkù ahụ anaghị akwa mmakwaara.

Olee otú ụmụnna ndị bi n’ebe dịpụrụ adịpụ si erite uru ná mgbakọ ndị a? Ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ emeela ka ụmụnna ndị a nwee ike irite uru n’ihe omume ndị a na-eme ná mgbakọ ndị a, ya adịkwa ha ka hà so ụmụnna ha nọrọ ebe ahụ. Dị ka ihe atụ, n’otu oge onye na-anọchite anya isi ụlọ ọrụ anyị bịara n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Bene Rịpọblik, e mere ka ụmụnna anyị nọ n’Alit bụ́ obodo a na-egwupụta ihe na Nijie Rịpọblik lee ihe omume ahụ. Obodo ahụ dị n’Ọzara Sahara. Mmadụ iri abụọ na otu lere ya, ma ụmụnna anyị ma ndị nwere mmasị. N’agbanyeghị na ha nọ n’ebe dị anya, ọ dị ha ka hà so ụmụnna ha dị puku iri anọ na anọ, otu narị na iri atọ na otu nọrọ. Otu nwanna dere, sị: “Eji m obi m niile na-ekele unu maka ime ka anyị lee ihe omume a. O gosiri anyị na anyị dị unu n’obi.”

ỊZỤ NDỊ OKENYE

Ọ bụrụ na ndị nchụàjà Izrel afụọ otu opi, ọ bụ naanị “ndị isi bụ́ ndị isi nke puku kwuru puku” ga-ezukọta n’ụlọikwuu nzute. (Ọnụ Ọgụ. 10:4) Ọ bụ n’ebe ahụ ka Mozis na-anọ azụ ha, na-agwakwa ha ihe ha ga-eme. Ihe ndị a ga-enyere ha aka ịrụ ọrụ ha n’ebo ha dị iche iche nke ọma. A sị na ị bụ otu n’ime ndị isi ahụ, ọ̀ bụ na ị gaghị agbalị ike gị ịhụ na ị gara nzukọ ahụ ma nụrụ ihe a na-ekwu?

Taa, ndị okenye ọgbakọ abụghị “ndị isi,” ha anaghịkwanụ eme ka ọ̀ bụ ha nwe atụrụ Chineke. (1 Pita 5:​1-3) Ma ha na-eme ike ha niile ilekọta ha. Ọ bụ ya mere ha ji adị njikere ịga mgbe ọ bụla a kpọrọ ha ka ha bịa ọzụzụ, dị ka ịga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze. N’ụlọ akwụkwọ a, ndị okenye na-amụta otú ha ga-esi na-arụ ọrụ ọgbakọ nke ọma. Ihe a na-eme ka ndị niile nọ n’ọgbakọ na Jehova dịkwuo ná mma. Ọ bụrụgodị na ị gabeghị otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị a, o nwere ike ịbụ na ị na-amụta ihe n’aka ndị garala ya.

MGBANWE NDỊ A NA-EME NÁ NZUKỌ JEHOVA

E nwere mgbe ụfọdụ ndị nchụàjà Izrel na-afụ opi, ya dasitụ ike, ya adalatatụ. Ọ na-egosi na Jehova chọrọ ka ha kwalie. (Ọnụ Ọgụ. 10:​5, 6) Otú ha si apụ na-egosi na a haziri ha nke ọma. Ma, ọ naghị adịrị ha mfe. E nwere ụfọdụ n’ime ha ọ na-eme obi abụọ ịkwapụ mgbe ụfọdụ. N’ihi gịnị?

O nwere ike ịbụ na ụfọdụ chere na ha akwalikarịala nakwa na ọ na-abụkarị na mberede. Baịbụl sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ígwé ojii ahụ na-adịgide malite n’anyasị ruo n’ụtụtụ.” N’oge ndị ọzọ, “ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ otu ọnwa ma ọ bụ karị.” (Ọnụ Ọgụ. 9:​21, 22) Ma, ugboro ole ka ha kwaliri? Ọnụ ọgụgụ isi nke iri atọ na atọ kwuru ebe iri anọ ndị Izrel mara ụlọikwuu.

Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ n’ime ha na-ama ụlọikwuu n’ebe ndò dị. Ọ ga-abụ na ụdị ebe ahụ tọgburu ha atọgbu n’ime “nnukwu ala ịkpa ahụ . . . nke dị egwu.” (Diut. 1:19) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ha chere na o nweghị ebe ọzọ ha ga-aga ga-aka ebe ahụ mma.

Ha kwapụwa, o nwere ike isiri ụfọdụ ndị ike ichere ka o ruoro ha ịpụ. Ha niile na-anụ ụda opi ahụ n’otu oge, ma ha niile agaghị apụli otu mgbe. Ọ bụrụ na a fụọ opi, ya adasitụ ike, ya adalatatụ, ebo ndị mara ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ, ya bụ, ebo Juda, Ịsaka, na Zebulọn, ga-akwali. (Ọnụ Ọgụ. 2:​3-7; 10:​5, 6) Ha pụchaa, ndị nchụàjà ahụ ga-afụkwa ụdị opi ahụ nke ugboro abụọ ka ndị nke mara ụlọikwuu n’ebe ndịda kwalie. Ihe a ka ndị nchụàjà ahụ ga-emegide ruo mgbe mmadụ niile pụchara.

O nwere ike ịbụ na e nweela mgbe ụfọdụ o siiri gị ike ịnabata mgbanwe ụfọdụ e mere ná nzukọ Jehova. O nwere ike ịbụ na ị nọ na-eche na mgbanwe a na-eme karịrị akarị ma ọ bụkwanụ na ihe a na-emebu dị mma na e kwesịghị ịgbanwe ya. O nwere ike ịbụ na o siiri gị ike inwe ndidi tupu mgbanwe e mere amara gị ahụ́. Ọ bụrụ na anyị anabata mgbanwe e mere, anyị ga-achọpụta na ọ baara anyị uru nakwa na Jehova na-agọzi anyị.

N’oge Mozis, Jehova duru ọtụtụ nde ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka n’ala ịkpa. Ma ọ́ bụghị ya, ha gaara anwụ. Taa, Jehova na-edu anyị n’oge ikpeazụ a dị oké egwu. Ọ na-enyere anyị aka ka anyị na ya dịrị ná mma, na-emekwa ka okwukwe anyị sie ike. N’ihi ya, ka anyị niile kpebisie ike ịna-eme ka ụmụ Izrel ma na-aza òkù e ji opi na-akpọ.