Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26

“Lọghachikwutenụ M”

“Lọghachikwutenụ M”

“Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.”​—MAL. 3:7.

ABỤ NKE 102 ‘Nyere Ndị Na-adịghị Ike Aka’

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú obi na-adị Jehova ma ọ bụrụ na otu n’ime ndị ohu ya kpafuru akpafu alọghachi?

DỊ KA anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jehova ji onwe ya tụnyere ezigbo onye ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ya n’anya. Ọ na-aga chọọ nke ọ bụla kpafurunụ. Jehova gwara ụmụ Izrel hapụrụ ya, sị: “Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwutekwa unu.” Anyị ma na ọ ka chọkwara ime otú ahụ n’ihi na ọ sịrị: “Adịghị m agbanwe agbanwe.” (Mal. 3:​6, 7) Jizọs kwuru na obi na-adị Jehova na ndị mmụọ ozi ụtọ ma ọ bụrụgodị otu n’ime ndị ohu ya kpafuru akpafu lọghachiri.​—Luk 15:​10, 32.

2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ka anyị tụlee ihe atụ atọ Jizọs ji kụziere anyị otú anyị ga-esi nyere ndị hapụrụ Jehova aka. Anyị ga-ekwu gbasara ụfọdụ àgwà anyị kwesịrị inwe iji nyere ha aka ịlọghachikwute Jehova. Anyị ga-amụtakwa na ịgba mbọ nyere ụdị ndị ahụ aka ịlọghachikwute Jehova na-aba uru.

ỊCHỌ MKPỤRỤ EGO FURU EFU

3-4. Gịnị mere nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya na Luk 15:​8-10 ji gbaa ezigbo mbọ chọọ mkpụrụ ego drakma ahụ furu efu?

3 Anyị kwesịrị ịgba ezigbo mbọ ka anyị chọta ndị chọrọ ịlọghachikwute Jehova. N’ihe atụ ahụ Jizọs mere na Luk, o kwuru otú otu nwaanyị si chọọ mkpụrụ ego drakma funahụrụ ya. Ihe kacha mkpa n’ihe atụ a bụ mbọ nwaanyị ahụ gbara ịchọ ya.​—Gụọ Luk 15:​8-10.

4 Jizọs kọwara otú obi dị nwaanyị ahụ mgbe ọ chọtara mkpụrụ ego drakma ahụ funahụrụ ya. N’oge Jizọs, ụfọdụ ndị nne na-enye nwa ha nwaanyị mkpụrụ ego drakma iri n’ụbọchị ọ na-agba akwụkwọ. O nwere ike ịbụ na mkpụrụ ego drakma ahụ nwaanyị ahụ na-achọ so ná ndị nne ya nyere ya. Nwaanyị ahụ weere ya na mkpụrụ ego ahụ dafuru n’ala, ya amụnye mpanaka chọwa ya. Ma, ọ hụghị ya. O nwere ike ịbụ na ọ gaghị ejili ọkụ mpanaka ahụ chọta obere mkpụrụ ego ahụ. N’ikpeazụ, o ji nwayọọ zaa ụlọ ahụ niile. Ọ hụrụ ka obere mkpụrụ ego drakma ahụ na-egbuke n’ihe ndị ọ zapụtara n’ụlọ ahụ. Obi tọrọ ya ụtọ, ya akpọọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya gwa ha na ya achọtala mkpụrụ ego ọ na-achọ achọ.

5. Gịnị mere o nwere ike iji sie ike ịchọta ndị hapụrụ ọgbakọ?

5 Ihe atụ a Jizọs mere gosiri na mmadụ ga-agba ezigbo mbọ iji chọta ihe ya furu efu. O nwekwara ike ịdị mkpa ka anyị gbaa ezigbo mbọ iji chọta ndị hapụrụ ọgbakọ. O nwere ike ịbụ na ọtụtụ afọ agaala ha hapụrụ ọgbakọ. O nwekwara ike ịbụ na ha akwagala n’ebe ụmụnna na-amaghị ha. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na ugbu a, ụfọdụ n’ime ha ejirila obi ha chọọ ịlọghachikwute Jehova. Ha chọrọ iso ụmụnna ha fewekwa Jehova. Ma, anyị kwesịrị inyere ha aka.

6. Olee otú onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ike isi nye aka chọta ndị na-adịghị ejekwa ozi?

6 Ole ndị kwesịrị iso nye aka na-achọ ndị hapụrụ ọgbakọ? Anyị niile, ma ndị okenye, ndị ọsụ ụzọ, ndị ezinụlọ onye ahụ na ndị nkwusa niile nọ n’ọgbakọ. È nwere enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ unu na-adịghị ejekwa ozi? È nweela onye na-adịghị ejekwa ozi ị hụrụ mgbe ị na-eje ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ mgbe ị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị? Gwa onye ahụ na ọ bụrụ na ọ chọrọ ka mmadụ bịa na nke ya, ị ga-achọ inye ndị okenye ọgbakọ unu adres ya ma ọ bụ akara ekwentị ya.

7. Gịnị ka ị mụtara n’ihe otu okenye aha ya bụ Thomas kwuru?

7 Olee ihe ụfọdụ ndị okenye nwere ike ime iji chọta ndị chọrọ ịlọghachikwute Jehova? Legodị ihe otu okenye bi na Spen aha ya bụ Thomas * kwuru. O nyerela ihe karịrị mmadụ iri anọ aka ịlọghachi n’ ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ihe mbụ m na-eme bụ ịjụ ụmụnna ma hà ma ebe ụmụnna ndị kwụsịrịla ije ozi bi ugbu a, ma ọ bụkwanụ mụ ajụọ ha ma è nwere onye ha chetara na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ na-enwe obi ụtọ inye aka n’ihi na ha chọrọ ka ụmụnna ndị ahụ lọghachi n’ọgbakọ. M gaa na nke onye nkwusa kwụsịrịla ije ozi, m na-ajụ ya maka ụmụ ya na ndị ezinụlọ ya ndị ọzọ. Ụfọdụ n’ime ha na-akpọbu ụmụ ha abịa ọmụmụ ihe. O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ụmụ ha ndị ahụ bụbu ndị nkwusa. E nwekwara ike inyere ha aka ịlọghachikwute Jehova.”

NYERE NDỊ OHU JEHOVA FURU EFU AKA ỊLỌGHACHI N’ỌGBAKỌ

8. N’ihe atụ ahụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu dị na Luk 15:​17-24, olee otú nwoke ahụ si meso nwa ya ahụ chegharịrịnụ?

8 Olee àgwà ndị anyị kwesịrị inwe ma anyị chọọ inyere ndị chọrọ ịlọghachikwute Jehova aka? Ka anyị lee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere gbasara nwa mmefu ahụ pụrụ n’ụlọ. (Gụọ Luk 15:​17-24.) Jizọs kọwara otú nwa ahụ si mechaa ghọta onwe ya ma kpebie ịlaghachi n’ụlọ ha. Nna ya gbaara ọsọ gaa makụọ ya otú mere ka ọ ghọta na ọ hụrụ ya n’anya. Obi nwa ahụ na-ama ya ikpe, ya echee na o rughịzi eru ka nna ya were ya ka nwa ya. Nna ya meteere ya ebere mgbe ọ na-akọrọ ya otú obi dị ya. Nna ya meziri ihe ụfọdụ iji gosi ya na ọ nabatala ya, nakwa na ọ gaghị abụ odibo, kama nwa ya ọ hụrụ n’anya. O meere ya oriri ma yiwe ya uwe mara ezigbo mma.

9. Olee àgwà ndị anyị kwesịrị ịna-akpa iji nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịlọghachi n’ọgbakọ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Anyị Ga-esi Nyere Ndị Chọrọ Ịlọghachikwute Jehova Aka.”)

9 Jehova yiri nna ahụ e ji mee ihe atụ. Ọ hụrụ ụmụnna anyị kwụsịrịla ije ozi n’anya, chọọkwa ka ha lọghachikwute ya. Anyịnwa kwesịkwara inyere ha aka ka ha lọghachi n’ọgbakọ, otú ahụ Jehova na-eme. Iji nwee ike ime ya, anyị kwesịrị inwere ha ndidi, nweere ha ọmịiko, hụkwa ha n’anya. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe àgwà ndị a? Oleekwa otú anyị nwere ike isi na-akpa ha?

10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nweere ndị chọrọ ịlọghachikwute Jehova ndidi?

10 Anyị kwesịrị inwere ha ndidi n’ihi na ọ na-ewe oge tupu mmadụ alọghachikwute Jehova. Ọtụtụ ndị kwụsịburu ije ozi kwuru na ndị okenye na ndị ọzọ bịara na nke ha ọtụtụ ugboro tupu ha alọghachi n’ọgbakọ. Otu nwanna nwaanyị bi n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia aha ya bụ Nancy kwuru, sị: “Otu ezigbo enyi m nọ n’ọgbakọ nyeere m ezigbo aka. O weere m ka nwanne ya nke nta. O chetaara m ihe ndị anyị mere n’oge gara aga mere anyị obi ụtọ. Ọ na-ege m ntị nke ọma ma m gwawa ya otú obi dị m, na-enyekwa m ndụmọdụ. Nwanna nwaanyị ahụ ghọọrọ m ezigbo enyi, ọ dịkwa njikere inyere m aka mgbe ọ bụla.”

11. Gịnị mere inwe ọmịiko ji dị mkpa iji nyere onye a kpasuru iwe aka?

11 A kpasuo mmadụ iwe, o nwere ike ịdị ya ka ọnyá na-afụ ụfụ. Ọmịiko dị ka ọgwụ ga-eme ka ọnyá ahụ kwụsị ịfụ ya ụfụ. E nwere ụfọdụ na-adịghị ejekwa ozi n’ihi na e nwere nwanna kpasuru ha iwe kemgbe ọtụtụ afọ gara aga, ihe ahụ ka na-ewekwa ha ezigbo iwe. Iwe ahụ mere ka ọ na-esiri ha ike ịlọghachikwute Jehova. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-eche na e mere ha ihe ọjọọ. Ihe nwere ike ịdị ha mkpa bụ onye ga-ege ha ntị ma ghọta otú ọ dị ha. (Jems 1:19) E nwere otu nwanna nwaanyị nwere mgbe ọ kwụsịrị ije ozi. Aha ya bụ María. Ọ sịrị: “Ihe m chọrọ bụ onye ga-ege m ntị, kasie m obi ma nye m ezigbo ndụmọdụ.”

12. Nye ihe atụ gosiri otú Jehova si enyere ndị kwụsịrịla ife ya aka ịlọghachikwute ya.

12 Baịbụl ji ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ya nọ tụnyere ụdọ. Olee otú ịhụnanya Chineke si yie ụdọ? Chegodị gbasara ihe atụ a. Ka e were ya na mmiri chọrọ iri gị n’osimiri jụrụ oyi ebili mmiri na-enugharị, mmadụ esi n’ụgbọ dị gị nso tụọrọ gị ihe ga-enyere gị aka ise n’elu mmiri. Obi ga-adị gị ụtọ. Ma, e nwekwara ihe ọzọ dị mkpa. I kwesịrị isi ná mmiri ahụ pụta. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ tụọrọ gị ụdọ ga-enyere gị aka ịbata n’ime ụgbọ mmiri ha. Mgbe Jehova na-ekwu banyere ndị Izrel kpafuru akpafu, ọ sịrị: ‘M ji ụdọ ịhụnanya na-adọ ha.’ (Hos. 11:4) Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị Jehova n’ebe ndị kwụsịrịla ife ya nọ, bụ́ ndị nsogbu na-ezoro ka mmiri, ha ana-echegbukwa onwe ha. Ọ chọrọ ka ha mara na ọ hụrụ ha n’anya, chọọkwa inyere ha aka. Jehova nwekwara ike iji gị mee ka ha ghọta na ọ hụrụ ha n’anya.

13. Olee otú ihe a kọrọ gbasara Nwanna Pablo si gosi na igosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya nwere ike inyere ha aka ịlọghachikwute Jehova?

13 Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-agwa ndị na-adịghị ejekwa ozi na Jehova hụrụ ha n’anya, na-egosikwa ha na anyịnwa hụrụ ha n’anya. Nwanna Pablo anyị kwuru okwu ya n’isiokwu bu nke a ụzọ kwụsịrị ije ozi ruo ihe karịrị iri afọ atọ. O kwuru, sị: “N’otu ụtụtụ m si n’ụlọ m na-apụ, otu nwanna nwaanyị mere agadi bịakwutere m, jiri olu ọma gwa m okwu. M malitere ibe ákwá ka nwata. M gwara ya na ọ dị ka ọ̀ bụ Jehova zitere ya ka ọ bịa gwa m okwu. Ọ bụ mgbe ahụ ka m kpebiri ịlọghachikwute Jehova.”

JIRI ỊHỤNANYA NA-ENYERE HA AKA

14. N’ihe atụ ahụ dị na Luk 15:​4, 5, gịnị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ mere ozugbo ọ hụrụ atụrụ ahụ furu efu?

14 Anyị ekwesịghị ịkwụsị inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka. Dị ka nwa mmefu ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, o nwere ike ịbụ na e nwere ihe na-enye ha nsogbu n’obi. O nwekwara ike iwe oge tupu ha enweta onwe ha. O nwere ike ịbụ na okwukwe ha esighịzi ike n’ihi ihe ụwa Ekwensu a merela ha. Anyị kwesịrị inyere ha aka mee ka okwukwe ha sie ike ọzọ. N’ihe atụ atụrụ ahụ furu efu, Jizọs kọwara otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ si buru nwa atụrụ ahụ n’ubu ya laghachi n’igwe atụrụ ya. O were onye ọzụzụ atụrụ ahụ oge, ya agbaakwa ezigbo mbọ iji chọta atụrụ ahụ furu efu. N’agbanyeghị ya, ọ ma na o kwesịrị ikuru nwa atụrụ ahụ laghachi n’igwe atụrụ ya n’ihi na ike agaghị adị nwa atụrụ ahụ ịlaghachi n’onwe ya.​—Gụọ Luk 15:​4, 5.

15. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-adịghị ike chọrọ ịlọghachikwute Jehova aka? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Akwụkwọ Bara Ezigbo Uru.”)

15 Anyị nwere ike iji oge buru ibu, gbaakwa ezigbo mbọ iji nyere onye na-adịghị ejekwa ozi aka ịmaliteghachi fewe Jehova. Ma, mmụọ nsọ, Okwu Chineke na ihe ndị nzukọ a na-ewepụta ga-eme ka anyị nyere ha aka ime ka ha na Chineke dịrịghachi ná mma. (Rom 15:1) Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Otu okenye bụ́ aka ochie kwuru, sị: “Ọ dị mkpa ka a mụọrọ ọtụtụ ndị na-adịghị ejekwa ozi kpebiri ịlọghachi n’ọgbakọ Baịbụl.” * N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị okenye asị gị mụwara onye na-adịghị ejekwa ozi ihe, jiri obi ụtọ mee ya. Okenye ahụ kwukwara, sị: “Onye nkwusa na-amụrụ onye na-adịghị ejekwa ozi ihe kwesịrị ime ka ha bụrụ ezigbo enyi, ya bụ, onye o nwere ike ịna-akọrọ ihe ụfọdụ n’ezoghị ọnụ.”

ỌṄỤ NA-ADỊ MA N’ELUIGWE MA N’ỤWA

16. Olee otú anyị si mara na ndị mmụọ ozi ga-enyere anyị aka?

16 E nwere ọtụtụ akụkọ mere eme gosiri na ndị mmụọ ozi na-enyere anyị aka ịchọta ndị na-adịghị ejekwa ozi chọrọ ịlọghachikwute Jehova. (Mkpu. 14:6) Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Silvio bi n’Ekwedọ kpesiri ekpere ike ka Jehova nyere ya aka ịlọghachi n’ọgbakọ. Ka ọ nọ na-ekpe ekpere, ndị okenye abụọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. Obi dị ha ụtọ inyewere ya aka.

17. Olee ngọzi ndị anyị na-enweta ma anyị nyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ịlọghachi n’ọgbakọ?

17 Obi ga-adị anyị ezigbo ụtọ ma anyị nyere ndị hapụrụ Jehova aka ịlọghachikwute ya. Legodị ihe otu ọsụ ụzọ na-agbalịsi ike inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka aha ya bụ Salvador kwuru. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, obi ụtọ m na-enwe maka ndị na-adịghi ejekwa ozi lọghachiri n’ọgbakọ na-eme ka anya mmiri gbawa m. Obi na-adị m ụtọ na Jehova ji m na-enyere ndị ohu ya aka isi n’ụwa Setan a pụta ma lọghachi n’ọgbakọ.”​—Ọrụ 20:35.

18. Ọ bụrụ na ị naghịzi aga ọmụmụ ihe na ozi ọma, gịnị ka obi kwesịrị isi gị ike na ya?

18 Ọ bụrụ na ị naghịzi aga ọmụmụ ihe na ozi ọma, obi sie gị ike na Jehova ka hụrụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka ị lọghachikwute ya. O nwere ihe ndị ị ga-eme ka i nwee ike ịlọghachi. Dị ka nna ahụ n’ihe atụ Jizọs, Jehova na-atụ anya ka ị lọghachi. Ọ ga-eji obi ụtọ nabatakwa gị.

ABỤ NKE 103 Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ Onyinye Jehova Nyere Anyị

^ par. 5 Jehova chọrọ ka ndị na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe na ozi ọma lọghachikwute ya. Jehova na-agwa ha, sị: “Lọghachikwutenụ m.” E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji gbaa ndị chọrọ ịza òkù a Jehova kpọrọ ha ume. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi nyere ha aka ịza òkù a.

^ par. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 15 Iji nyere onye na-adịghị ejekwa ozi aka, anyị na ya nwere ike ịmụ ụfọdụ ebe n’akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” E nweekwala ndị nke ịmụ isi ụfọdụ n’akwụkwọ Bịaruo Jehova Nso baara ezigbo uru. Ọ bụ Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ga-ekpebi onye nkwusa kacha ruo eruo iduzi ọmụmụ Baịbụl a.

^ par. 68 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna atọ nyeere otu nwanna chọrọ ịlọghachikwute Jehova aka ịlọghachi. Otú ha si mee ya bụ ịna-akpọtụrụ ya, ịna-eme ka ọ mara na ha hụrụ ya n’anya, nakwa ịna-ege ya ntị iji ghọta ya nke ọma.