Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24

“Mee Ka Obi M Dị n’Otu Ịtụ Egwu Aha Gị”

“Mee Ka Obi M Dị n’Otu Ịtụ Egwu Aha Gị”

“Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị. M ji obi m dum na-eto gị, Jehova Chineke m.”​—ỌMA 86:​11, 12.

ABỤ NKE 7 Jehova Bụ Ike Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị bụ ịtụ egwu Chineke? Gịnịkwa mere ndị hụrụ Jehova n’anya kwesịrị iji na-atụ egwu ya?

NDỊ KRAỊST hụrụ Chineke n’anya, na-atụkwa egwu ya. Ụfọdụ nwere ike iche na ihe a agaghị ekwe omume. Ma, ụdị egwu anyị na-ekwu okwu ya abụghị ụdị egwu mmadụ na-atụ onye nwere ike ime ya ihe ọjọọ. Anyị ga-ekwu gbasara ụdị egwu pụrụ iche. Ndị na-atụ Chineke ụdị egwu a na-akwanyere ya ezigbo ùgwù. Ha anaghị achọ ịkpasu Nna ha nke eluigwe iwe n’ihi na ha achọghị ihe ọ bụla ga-eme ka ha na ya ghara ịdị ná mma.​—Ọma 111:10; Ilu 8:13.

2. N’ihi ihe Eze Devid kwuru n’Abụ Ọma 86:​11, olee ihe abụọ anyị ga-atụle?

2 Gụọ Abụ Ọma 86:11. Ka ị na-echebara ihe ndị e kwuru n’amaokwu a echiche, ị ga-achọpụta na Eze Devid ma na ọ dị ezigbo mkpa ịna-akwanyere Jehova ùgwù. Ka anyị lee otú anyị nwere ike isi mee ihe a Devid kwuru. Nke mbụ, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ mere anyị ji kwesị ịna-akwanyere aha Chineke ezigbo ùgwù. Nke abụọ, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi gosi na anyị na-akwanyere aha Chineke ùgwù n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-AKWANYERE AHA JEHOVA EZIGBO ÙGWÙ?

3. Olee ihe Mozis hụrụ nyeere ya aka ịnọgide na-akwanyere aha Chineke ùgwù?

3 Chegodị otú obi dị Mozis mgbe ọ nọ n’otu ọgba dị n’oké nkume ma hụ ọhụụ ka ebube Jehova na-agafe. Ihe a bụ ihe kacha dị ebube mmadụ hụtụrụla tupu Jizọs abịa n’ụwa. Mozis nụrụ ka Jehova na-agwa ya okwu. Ọ ga-abụ na o si n’ọnụ mmụọ ozi gwa ya, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke na-eme ebere, na-emekwa amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-eme ka obiọma ya ruoro ọtụtụ puku ọgbọ, na-agbaghara njehie na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 33:​17-23; 34:​5-7) Ọ ga-abụ na Mozis na-echeta ihe ahụ merenụ ma ọ kpọọ aha Jehova. Ọ bụ ya mere Mozis ji gwa ụmụ Izrel ka ha “tụọ egwu aha a nke dị ebube ma dị egwu.”​—Diut. 28:58.

4. Olee àgwà Jehova ndị anyị nwere ike ichebara echiche ga-eme ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù?

4 Anyị chewe banyere aha ahụ bụ́ Jehova, anyị kwesịkwara iche banyere ụdị onye Jehova bụ. Anyị kwesịrị icheta àgwà ya ndị dị ka, ike, amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya. Iche gbasara àgwà ya ndị a na àgwà ya ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù.​—Ọma 77:​11-15.

5-6. (a) Gịnị ka aha Chineke pụtara? (b) Dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 3:​13, 14 na Aịzaya 64:​8, olee ụzọ ndị Jehova si eme ka nzube ya mezuo?

5 Gịnị ka anyị ma gbasara ihe aha Chineke pụtara? Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwetara na aha Jehova nwere ike ịpụta “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ọ na-echetara anyị na o nweghị ihe ọ bụla ga-akwụsịli Jehova ime uche ya. Ọ ga-emeli ka ihe ọ bụla ọ chọrọ mee. Olee otú o si bụrụ eziokwu?

6 Jehova na-abụ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mezuo ihe o bu n’obi. (Gụọ Ọpụpụ 3:​13, 14.) A na-echetara anyị ọtụtụ mgbe ka anyị na-echebara ihe aha Chineke pụtara echiche. Jehova nwekwara ike ime ka ndị ohu ya na-ezughị okè bụrụ ihe ọ bụla ọ chọrọ iji mezuo nzube ya. (Gụọ Aịzaya 64:8.) Jehova na-esi otú a emezu ihe ọ bụla ọ chọrọ ime. O nweghị ihe ọ bụla ga-egbochili ya imezu nzube ya.​—Aịza. 46:​10, 11.

7. Olee otú anyị nwere ike isi na-akwanyekwuru Nna anyị nke eluigwe ùgwù?

7 Iche gbasara ihe ndị Jehova mere na ihe ndị o nyeerela anyị aka ime ga-eme ka anyị hụkwuo Nna anyị nke eluigwe n’anya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị echee gbasara ihe ndị dị ịtụnanya Jehova kere, ọ ga-eme ka anyị na-atụkwu egwu ya. (Ọma 8:​3, 4) Ọ bụrụkwa na anyị echee gbasara ihe ndị Jehova nyeere anyị aka ime n’ozi ya, ọ ga-emekwa ka anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù. Aha ahụ bụ́ Jehova dị ebube. Ihe ọ pụtara bụ ihe niile gbasara Nna anyị, ihe niile o merela, nakwa ihe niile ọ ka ga-eme.​—Ọma 89:​7, 8.

“M GA-AKPỌSA AHA JEHOVA”

Ihe Mozis kụziri na-agba ume. Ọ kụziri gbasara Jehova Chineke na aha ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Gịnị ka Diuterọnọmi 32:​2, 3 mere ka anyị mara gbasara otú Jehova si were aha ya?

8 Obere oge tupu ụmụ Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova kụziiri Mozis otu abụ. (Diut. 31:19) Ọ gwakwara Mozis ka ọ kụziere ya ụmụ Izrel. (Gụọ Diuterọnọmi 32:​2, 3.) Ka anyị na-eche gbasara ihe e kwuru n’amaokwu nke abụọ na nke atọ, anyị ga-achọpụta na Jehova achọghị ka e zochie aha ya ma ọ bụ were ya ka ihe dị oké nsọ mmadụ na-ekwesịghị ịkpọ. Ọ chọrọ ka onye ọ bụla mara aha ya. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ụmụ Izrel ịnụ ka Mozis na-akụziri ha gbasara Jehova na aha ya dị ebube. Ihe Mozis kụziiri ha gbara ha ume, meekwa ka okwukwe ha sikwuo ike otú ahụ mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa na-eme ka ahịhịa na-eto nke ọma. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ dị otú ahụ?

9. Olee otú anyị nwere ike isi soro na-eme ka e doo aha Jehova nsọ?

9 Anyị nọrọ n’ozi ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, anyị nwere ike iji Baịbụl gosi ndị mmadụ aha Chineke bụ́ Jehova. Anyị nwere ike inye ha ọmarịcha akwụkwọ anyị, gosi ha vidio, nakwa ihe ndị ọzọ dị na jw.org ndị ga-eme ka ha mata gbasara Jehova. Anyị nọrọ n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụkwanụ mewe njem, anyị nwere ike iji ohere ahụ gwa ndị mmadụ gbasara Chineke anyị anyị hụrụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị mmadụ gbasara nzube Jehova maka ụmụ mmadụ na ụwa, anyị na-eme ka ha mata ụdị onye Jehova bụ, nke nwekwara ike ịbụ nke mbụ ha na-anụ ya. Ọ bụrụ na anyị ana-agwa ndị ọzọ gbasara Nna anyị hụrụ anyị n’anya, anyị so eme ka e doo aha ya nsọ. Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịmata na ọtụtụ ihe a na-akụziri ha banyere Chineke bụ ụgha. Ihe anyị si na Baịbụl akụziri ndị mmadụ bụ ihe kacha eme obi ụtọ ha nwere ike ịmụta.​—Aịza. 65:​13, 14.

10. Gịnị mere ihe anyị ga-eme ma anyị mụwara mmadụ ihe abụghị naanị ịkụziri ya iwu Chineke?

10 Ọ bụrụ na anyị ana-akụziri ndị mmadụ Baịbụl, anyị kwesịrị ime ka ha mata aha Jehova ma na-akpọkwa ya. Anyị kwesịkwara inyere ha aka ịmata Jehova nke ọma. Ànyị ga-eme ihe a ma anyị na-akụziri ha naanị iwu ndị dị na Baịbụl? Onye anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịmụta iwu ndị Chineke nyere anyị, ha amasịkwa ya. Ma, ọ̀ ga-amụta irubere Jehova isi n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya? Cheta na Iv ma iwu Chineke, ma ọ hụghị Onye nyere iwu ahụ n’anya. Otú ahụ ka ọ dịkwa Adam. (Jen. 3:​1-6) N’ihi ya, ihe anyị ga na-eme abụghị naanị ịkụziri ndị anyị na-amụrụ ihe iwu Chineke.

11. Anyị kụziwere ndị anyị na-amụrụ ihe iwu Chineke, olee otú anyị nwere ike isi nyere ha aka ịhụ Onye nyere iwu ndị ahụ n’anya?

11 Iwu Jehova na-abara anyị uru mgbe niile. (Ọma 119:​97, 111, 112) Ma, o nwere ike ndị anyị na-amụrụ ihe agaghị ele ya anya otú ahụ ruokwa mgbe ha ghọtara na ihe mere Jehova ji nye anyị iwu ndị ahụ bụ na ọ hụrụ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ ndị anyị na-amụrụ ihe, sị: “Gịnị ka i chere mere Jehova ji gwa anyị mee ihe a ma ọ bụ emela ihe a? Olee ụdị onye ihe a na-egosi na Jehova bụ?” Ọ bụrụ na anyị enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịna-eche gbasara Jehova na ịhụ aha ya dị ebube n’anya, o nwere ike ime ka ihe anyị na-akụziri ha ruo ha n’obi. Ha ga-amụta ịhụ ma iwu ahụ ma Onye nyere ya n’anya. (Ọma 119:68) Okwukwe ha ga-esi ike, ha ga-enwekwa ike idi nsogbu ndị siri ezigbo ike nwere ike ịbịara ha.​—1 Kọr. 3:​12-15.

“ANYỊ ONWE ANYỊ GA NA-EJEGHARỊ N’AHA JEHOVA”

E nwere mgbe obi Devid niile na-adịghị n’ife Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12)

12. N’otu oge, olee otú Devid si ghara iji obi ya niile na-efe Jehova, gịnịkwa ka ọ kpataara ya?

12 Otu ihe dị mkpa e dere n’Abụ Ọma 86:11 bụ “mee ka obi m dị n’otu.” Ọ bụ Eze Devid si n’ike mmụọ nsọ dee ihe a. Mgbe ọ dị ndụ, ọ hụrụ na ọ dị ezigbo mfe mmadụ ịkwụsị iji obi ya niile na-efe Jehova. E nwere mgbe ọ nọ n’elu ụlọ ya hụ nwunye nwoke ọzọ ka ọ na-asa ahụ́. Devid ò ji obi ya niile na-eme ihe Jehova chọrọ mgbe ahụ? Ọ ma na iwu Jehova sịrị: “Agụụ nwunye mmadụ ibe gị . . . agụla gị.” (Ọpụ. 20:17) Ma, o wepụghị anya ya n’ebe nwaanyị ahụ nọ. O nweweziri obi abụọ ma ọ̀ ga-akpọrọ nwaanyị ahụ ka ọ̀ ga-erubere Jehova isi. Ọ bụ eziokwu na Devid hụrụ Jehova n’anya ma na-atụ egwu ya kemgbe ọtụtụ afọ, o mehiere Chineke. O mere ka a kọchaa aha Jehova. Ọ kpatakwaara ndị aka ha dị ọcha nsogbu, ma ndị ezinụlọ ya.​—2 Sam. 11:​1-5, 14-17; 12:​7-12.

13. Olee otú anyị si mara na obi Devid mechara dị n’otu?

13 Jehova dọrọ Devid aka ná ntị, ya na ya emechaakwa dị ná mma. (2 Sam. 12:13; Ọma 51:​2-4, 17) Devid chetara nsogbu ndị bịaara ya mgbe obi ya pụrụ n’ime ihe dị Jehova mma. Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 86:11 bụ: “Nye m obi a na-ekewaghị ekewa.” Jehova ò nyeere Devid aka mee ka obi ya dịrị n’otu? Ee. Ihe anyị ji mara bụ na Okwu Chineke mechara kwuo na Devid bụ nwoke ‘obi ya dum dị n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ.’​—1 Eze 11:4; 15:3.

14. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnịkwa?

14 Ihe mere Devid na-akụziri anyị ihe, na-agbakwa ume. Ihe ọjọọ o mere na-akụziri ndị ohu Chineke taa ezigbo ihe. Ma ànyị ka malitere ife Chineke ọhụrụ ma ọ̀ dịla anya anyị fewere ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị, ‘M̀ na-agbalị ka Setan ghara ime ka obi m pụọ n’ebe Jehova nọ?’

Setan ga-achọ ime ihe niile o nwere ike ime ka ị ghara iji obi gị niile na-efe Chineke. Ekwekwala ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Olee otú ịtụ egwu Chineke ga-esi nyere anyị aka ma anyị hụ ihe ndị nwere ike ime ka agụụ mmekọahụ gụwa anyị?

15 Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ị hụ ihe ndị nwere ike ime ka mmekọahụ gụwa gị n’Ịntanet ma ọ bụ na tiivi? I nwere ike ịgwa onwe gị na foto ahụ ma ọ bụ fim ahụ anaghị egosi ndị gba ọtọ. Ma, ò nwere ike ịbụ na Ekwensu ji ya na-eme ka obi gị pụọ n’ebe Chineke nọ? (2 Kọr. 2:11) E nwere ike iji foto ahụ tụnyere nwoke ji anyụike akpọwa nkụ buru ibu. Na mbụ, ihe ọ na-eme bụ igbunye ọnụ ọnụ ya ná nkụ ahụ. Ka ọ na-egbuba ya n’ime nkụ ahụ, ka nkụ ahụ na-ekewa. Foto ma ọ bụ fim ahụ ò nwere ike ime ka ọnụ ọnụ anyụike ahụ? Ihe nwere ike iyi ihe na-enweghị ihe o mere nwere ike ime ka mmadụ mehie Jehova. N’ihi ya, ekwekwala ka ihe ọ bụla na-adịghị mma baa n’ime obi gị. Mee ka obi gị dịrị n’otu ịtụ egwu aha Jehova.

16. Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

16 E wezụga foto na fim ndị nwere ike ime ka mmekọahụ gụwa mmadụ, e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ Setan na-eji anwa anyị ka anyị mejọọ Chineke. Gịnị ka anyị na-eme banyere ha? Ọ dị mfe iche na ihe ndị ahụ adịghị oké njọ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘M mee ihe a, a gaghị achụ m n’ọgbakọ. N’ihi ya, o nweghị oké ihe o mere.’ Ọ dịghị mma iche otú ahụ. Ọ ga-akara anyị mma ịjụ onwe anyị, sị: ‘Setan ọ̀ chọrọ iji ihe a mee ka m ghara iji obi m niile na-efe Jehova? Ọ bụrụ na m mee ihe a, ọ̀ ga-eme ka a kọchaa aha Jehova? Ime ihe a ọ̀ ga-eme ka mụ na Jehova dị ná mma, ka ọ̀ ga-eme ka mụ ya ghara ịdị ná mma?’ Chebara ajụjụ ndị a echiche. Kpee ekpere ka Chineke nyere gị aka ịgwa onwe gị nke bụ́ eziokwu. (Jems 1:5) Ime ihe a nwere ike ichebe gị. O nwere ike inyere gị aka izere ọnwụnwa otú ahụ Jizọs mere mgbe ọ gwara Setan, sị: “Si ebe a pụọ, Setan!”​—Mat. 4:10.

17. Gịnị mere na obi kewara ekewa enweghị uru ọ bụla ọ bara? Kọwaa.

17 Obi kewara ekewa anaghị aba uru. Chegodị otú ihe ga-adị ma ọ bụrụ na ndị nọ n’otu òtù egwuregwu na ibe ha adịghị ná mma. E nwere ndị chọrọ ka a na-eto naanị ha, nwee ndị nke na-anaghị erube isi n’iwu egwuregwu ahụ, nweekwa ndị nke na-anaghị ege onye na-akụziri ha egwuregwu ahụ ntị. Ọ ga-esiri ha ike imeri ma ha gaa asọmpi. Ma, ọ bụrụ na ndị nọ n’otu òtù egwuregwu ana-emekọ ihe ọnụ, ha nwere ike imeri. Ọ bụrụ na ihe ị na-eche, otú obi na-adị gị na ihe na-agụ gị agụụ abụrụ ihe ndị gbasara ofufe Jehova, obi gị ga-adị ka ndị òtù egwuregwu ahụ mere nke ọma. Cheta na Setan chọrọ ime ka ị ghara iji obi gị niile na-efe Chineke. Ọ chọrọ ka ị ghara ịma ma ị̀ ga-eme ihe ị chọrọ ma ọ̀ bụkwanụ ihe Jehova chọrọ. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ife Jehova, ị kwesịrị iji obi gị niile na-efe ya. (Mat. 22:​36-38) Ekwekwala ka Setan mee ka ị ghara iji obi gị niile na-efe Chineke.

18. Gịnị ka i kpebiri ime n’ihi ihe e kwuru na Maịka 4:5?

18 Na-ekpe ụdị ekpere ahụ Devid kpere. Ọ sịrị: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” Kpebisie ike ịna-eme ihe ahụ ị na-ekpe n’ekpere ná ndụ gị. N’ụbọchị ọ bụla, kpebisie ike na ihe ọ bụla ị ga-eme, ma nnukwu ihe ma obere ihe, ga-egosi na ị na-atụ egwu aha Jehova. Ebe ị bụ Onyeàmà Jehova, i mee otú ahụ, ị na-eme ihe dabara n’aha ị na-aza. (Ilu 27:11) Anyị niile ga-enwekwa ike iso Maịka onye amụma kwuo, sị: “Anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi.”​—Maị. 4:5.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Devid kpere n’ekpere e dere n’Abụ Ọma 86:​11, 12. Gịnị ka ịtụ egwu aha Jehova pụtara? Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ aha ukwu ya? Oleekwa otú ịtụ egwu Chineke nwere ike isi mee ka anyị ghara ịdaba n’ọnwụnwa?

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Mozis kụziiri ụmụ Izrel abụ e ji eto Jehova.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Iv ajụghị ime ihe ọjọọ na-agụ ya. Ma, anyịnwa na-ajụ ile ma ọ bụ ịgụ ihe ndị nwere ike ime ka anyị chọọ ime ihe ndị ga-eme ka e kwutọọ aha Chineke.