Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njide Onwe Onye Dị Anyị Mkpa Ka Ihe Anyị Na-amasị Jehova

Njide Onwe Onye Dị Anyị Mkpa Ka Ihe Anyị Na-amasị Jehova

Otu nwoke aha ya bụ Paul kwuru, sị: “Mgbe nwa nwanne mama m lụsoro m ọgụ, m tọgidere ya n’akpịrị, chọọ ịtọgbu ya.”

Otu nwoke aha ya bụ Marco kwuru, sị: “N’ụlọ, obere ihe na-ewe m iwe, mụ akụwasịwa ihe ọ bụla ruru m aka, ma oche ma ihe ndị e ji egwu egwu.”

O nwere ike anyị agaghị emerucha ka ndị a e kwuru okwu ha. Ma, o nwere mgbe ọ na-esiri onye ọ bụla n’ime anyị ike ijide onwe ya. Ihe kpatara ya bụ ezughị okè anyị ketara n’aka nwoke mbụ bụ́ Adam. (Rom 5:12) E nwere ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha ma iwe bịa ha dị ka Paul na Marco, nweekwa ndị ọ na-esiri ike iwepụ echiche na-adịghị mma batara ha n’obi. Ha na-echegbu onwe ha gbasara ihe ndị na-emenye ha egwu na ihe ndị na-akụda ha obi. E nwekwara ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha n’ihe gbasara ịkwa iko, ịṅụbiga mmanya okè, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ.

Ndị ọ na-esiri ike ijide onwe ha n’ihe ha na-eche, n’ihe na-agụ ha agụụ na ihe ha na-eme nwere ike ịkpatara onwe ha ezigbo nsogbu. Ma, anyị nwere ike izere ya. Olee otú anyị nwere ike isi zere ya? Ọ bụ ịmụta ijide onwe anyị. Ka anyị tụlee ajụjụ atọ ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị: (1) Gịnị bụ njide onwe onye? (2) Gịnị mere o ji dị mkpa? (3) Olee otú anyị nwere ike isi mụta àgwà a so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”? (Gal. 5:​22, 23) Anyị ga-atụlekwa ihe anyị nwere ike ime ma e nwee mgbe ụfọdụ anyị na-ejidelighị onwe anyị.

GỊNỊ BỤ NJIDE ONWE ONYE?

Onye na-ejide onwe ya anaghị eme ihe ọ bụla obi ya gwara ya mee. Kama, ọ na-ejide onwe ya ka ọ ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe na-adịghị Jehova mma.

Jizọs mere ka anyị mata ihe bụ́ mmadụ ijide onwe ya

Jizọs kụziiri anyị ihe mmadụ ijide onwe ya bụ. Baịbụl sịrị: “Mgbe a na-ekwujọ ya, ọ dịghị ekwujọgwara. Mgbe ọ na-ata ahụhụ, o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.” (1 Pita 2:23) Jizọs mere ihe a mgbe ndị na-emegide ya kparịrị ya mgbe ọ nọ n’osisi ịta ahụhụ. (Mat. 27:​39-44) Tupu mgbe ahụ, o gosiri na ya na-ejide onwe ya mgbe ndị ndú okpukpe chọrọ ijide ya n’okwu ọnụ ya. (Mat. 22:​15-22) Ihe o mere mgbe ndị Juu iwe ji chọrọ ịtụ ya okwute bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Kama iweso ha iwe, o “zoro wee pụọ n’ụlọ nsọ ahụ.”​—Jọn 8:​57-59.

Ànyị nwere ike ime ka Jizọs? Ee, otú anyị nwere ike. Pita onyeozi kwuru, sị: “Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu, wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.” (1 Pita 2:21) Ọ bụ eziokwu na anyị ezughị okè, ma anyị nwere ike isochi nzọụkwụ Jizọs anya. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee otú ahụ?

GỊNỊ MERE NJIDE ONWE ONYE JI DỊ MKPA?

Anyị kwesịrị ịna-ejide onwe anyị ka ihe anyị nwee ike ịdị Jehova mma. Ọ bụrụgodị na anyị efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ, anyị na ya nwere ike gharazie ịdị ná mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị ejide onwe anyị ma n’okwu ọnụ ma n’omume.

Chegodị gbasara Mozis, onye dị “umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala” n’oge ya. (Ọnụ Ọgụ. 12:3) Mozis nọgidere na-edi ntamu ụmụ Izrel na-atamu ruo ọtụtụ afọ. Ma, otu ụbọchị, o jidelighị onwe ya. Iwe were ya mgbe ụmụ Izrel kwuru ọzọ na ha enweghị mmiri ga-ezuru ha. O ji olu ike gwa ha, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nnupụisi! Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?”​—Ọnụ Ọgụ. 20:​2-11.

Mozis ejidelighị onwe ya. O kwughị na ọ bụ Jehova ji ọrụ ebube nye ha mmiri. (Ọma 106:​32, 33) Ihe a o mere mere ka Jehova ghara ikwe ka ọ banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) Ọ ga-abụ na ihe ahụ o mere wutegidere ya ruo mgbe ọ nwụrụ.​—Diut. 3:​23-27.

Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ọ bụrụgodị na anyị efeela Jehova ruo ọtụtụ afọ, anyị ekwesịghị ịkparị ndị kpasuru anyị iwe ma ọ bụ ndị anyị chọrọ ịgbazi. (Efe. 4:32; Kọl. 3:12) Nke bụ́ eziokwu bụ na ka anyị na-eme okenye ka o nwere ike ịna-esikwuru anyị ike inwe ndidi. Ma, cheta Mozis. Anyị agaghị achọ ka ejideghị onwe anyị mee ka ozi anyị jeere Jehova ọtụtụ afọ laa n’iyi. Gịnị ka anyị ga-eme iji mụta àgwà a dị ezigbo mkpa?

OTÚ ANYỊ GA-ESI MỤTA IJIDE ONWE ANYỊ

Rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ. N’ihi gịnị? N’ihi na njide onwe onye so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Jehova na-enyekwa ndị ọ bụla rịọrọ ya mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Jehova na-eji mmụọ nsọ ya enye anyị ike anyị ga-eji na-ejide onwe anyị. (Fil. 4:13) Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmụta àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, dị ka, ịhụnanya, bụ́kwanụ ihe ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị.​—1 Kọr. 13:5.

Zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka o siere gị ike ijide onwe gị

Zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka o siere gị ike ijide onwe gị. Dị ka ihe atụ, zere ebe ndị a na-eme omume ndị na-adịghị mma n’Ịntanet na ntụrụndụ ndị ọzọ na-adịghị mma. (Efe. 5:​3, 4) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe na-adịghị mma. (Ilu 22:3; 1 Kọr. 6:12) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdị mkpa ka onye ọ na-esiri ike ịgbara omume rụrụ arụ ọsọ zere akwụkwọ ma ọ bụ fim na-ekwu gbasara ịhụnanya nwoke na nwaanyị.

O nwere ike isiri anyị ike ime ihe a. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ, Jehova ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị. (2 Pita 1:​5-8) Ọ ga-enyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị ka anyị ghara ịna-eche, na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-adịghị mma. Ihe mere Paul na Marco anyị kwuburu okwu ha gosiri na nke a bụ eziokwu. Ha kwụsịrị iwe iwe ọkụ. Cheekwa gbasara otu nwanna na-anya ụgbọala. Ọ na-ewesokarị ndị ọzọ na-anya ụgbọala iwe, na-esesakwa ha okwu. Gịnị ka o mere gbasara ya? Ọ sịrị: “M na-ekpesi ekpere ike maka ya kwa ụbọchị. M mụrụ isiokwu ndị na-ekwu gbasara njide onwe onye, butekwa amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere m aka n’isi. Ọ bụ eziokwu na m na-agbalị ijide onwe m kemgbe ọtụtụ afọ, ihe na-enyere m aka bụ ichetara onwe m kwa ụtụtụ na m kwesịrị ịgbalị na-ejide onwe m. M na-apụkwa n’oge gawa ebe m chọrọ ịga ka ọ ghara ịna-adị m ngwa ngwa.”

E NWEE MGBE ANYỊ NA-EJIDELIGHỊ ONWE ANYỊ

E nwere mgbe ụfọdụ anyị na-agaghị ejideli onwe anyị. Ya dị otú ahụ, ihere nwere ike imewe anyị ikpe ekpere. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka ekpere kacha dịrị anyị mkpa. N’ihi ya, kpee ekpere ozugbo. Rịọ Jehova ka ọ gbaghara gị ma nyere gị aka. Kpebiekwa na ị gaghị eme ya ọzọ. (Ọma 51:​9-11) Echela na Jehova agaghị anụ arịrịọ ị na-arịọ ka o meere gị ebere. (Ọma 102:17) Jọn onyeozi chetaara anyị na ọbara Ọkpara Chineke “na-asachapụ anyị mmehie niile.” (1 Jọn 1:7; 2:1; Ọma 86:5) Cheta na Jehova na-agwa ndị na-efe ya ka ha na-agbaghara ugboro ugboro. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-emekwara anyị otú ahụ.​—Mat. 18:​21, 22; Kọl. 3:13.

O wutere Jehova mgbe Mozis na-ejideghị onwe ya n’ala ịkpa. Ma, Jehova gbaghaara ya. Okwu Chineke kwuru na Mozis nwere ezigbo okwukwe. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya. (Diut. 34:10; Hib. 11:​24-28) Jehova ekweghị ka ọ banye n’Ala Nkwa ahụ, ma ọ ga-ekwe ka o biri na Paradaịs ma nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị nwekwara ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-ejide onwe anyị.​—1 Kọr. 9:25.