Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

M Na-ebute Jehova Ụzọ ná Mkpebi Ọ Bụla M Na-eme

M Na-ebute Jehova Ụzọ ná Mkpebi Ọ Bụla M Na-eme

N’OTU ụtụtụ n’afọ 1984, m si n’ụlọ anyị dị n’ebe ndị bara ọgaranya bi na Karakas dị na Venezuela na-aga ọrụ. Mgbe m nọ n’ụzọ, m nọ na-eche gbasara ihe dị n’Ụlọ Nche ọhụrụ. Ọ bụ gbasara otú ndị agbata obi anyị si ele anyị anya. Mgbe m na-ele ụlọ ndị dị ebe ahụ anya, m nọ na-ajụ onwe m, sị: ‘Ihe ndị agbata obi anyị ji mara m ọ̀ bụ naanị onye na-arụ n’ụlọ akụ̀ na-eme nke ọma? Ka hà na-ahụ m ka onye na-ejere Chineke ozi na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀ iji nyere ndị ezinụlọ ya aka?’ Ihe o yiri m ka ọ̀ bụ azịza ya adịghị m mma. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-eme ihe maka ya.

A mụrụ m n’abalị iri na itoolu n’ọnwa Mee afọ 1940 n’obodo Amion dị na Lebanọn. Mgbe afọ ole na ole gachara, anyị kwagara Tripoli, ebe m nọ too. Ezinụlọ anyị hụrụ ibe ha n’anya, na-enwe obi ụtọ, marakwa Jehova ma hụ ya n’anya. Nne na nna m mụrụ ụmụ ise, ụmụ nwaanyị atọ na ụmụ nwoke abụọ. Ọ bụ mụnwa bụ nwa ikpeazụ. Ọ bụghị ịkpa afọ ezinụlọ anyị bụ ihe kacha ndị mụrụ m mkpa ná ndụ ha. Ihe kacha anyị mkpa bụ ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na inyere ndị ọzọ aka ịmata Chineke.

E nwere ụfọdụ Ndị Kraịst e tere mmanụ n’ọgbakọ anyị. Otu n’ime ha bụ Nwanna Michel Aboud. Ọ bụ ya na-eduzi ọmụmụ ihe anyị na-akpọ ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ n’oge ahụ. Ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova na Niu Yọk, malite ikwusa ozi ọma na Lebanọn n’afọ 1921. M na-echeta otú o si akwanyere ụmụnna nwaanyị abụọ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied ùgwù ma na-enyere ha aka. Aha ha bụ Anne na Gwen Beavor. Ha ghọrọ ezigbo ndị enyi anyị. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m hụrụ Nwanna Nwaanyị Anne n’Amerịka. Mgbe oge ụfọdụ gafekwara, m hụrụ Nwanna Nwaanyị Gwen. Mgbe ahụ, ya na Nwanna Wilfred Gooch alụọla. Ha na-ejekwa ozi na Betel dị na Lọndọn n’Ịngland.

IKWUSA OZI ỌMA NA LEBANỌN

Mgbe m dị obere, Ndịàmà Jehova nọ na Lebanọn ebuchaghị ibu. Ma, anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị ọzọ ihe anyị mụtara na Baịbụl. Anyị na-eme ihe a n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị isi okpukpe na-emegide anyị. E nwere ụfọdụ ihe ha mere anyị m ka na-echeta.

Otu ụbọchị, mgbe mụ na nwanne m nwaanyị aha ya bụ Sana nọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’otu ụlọ, otu ụkọchukwu bịara n’ebe ahụ anyị nọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ ga-abụ na e nwere onye kpọrọ ya. Ụkọchukwu ahụ malitere ịkparị nwanne m nwaanyị. O mechakwara kwaa ya aka na steepụ, ya adaa merụọ ahụ́. E nwere onye kpọrọ ndị uwe ojii, ha abịa nyere nwanne m nwaanyị aka. Ha kpụụrụ ụkọchukwu ahụ gawa n’ụlọ ọrụ ha. Ha mechara chọpụta na o ji égbè. Onye isi ndị uwe ojii ahụ jụrụ ya, sị: “Ònyedị ka ị bụ? Ị̀ bụ ụkọchukwu ka ị̀ bụ onyeisi ndị omempụ?”

Ihe ọzọ m na-echeta bụ mgbe ndị ọgbakọ anyị ji bọs gaa ikwusa ozi ọma n’otu obodo dịpụrụ adịpụ. Ihe niile nọkwa na-aga ọfụma ruo mgbe otu ụkọchukwu nọ ebe ahụ nụrụ ihe anyị na-eme ma kpọkọta ìgwè mmadụ ka ha bịa nyewe anyị nsogbu. Ha tụdịrị anyị nkume ma merụọ papa m ahụ́. M na-echeta na m hụrụ papa m ka ihu ya niile bụ ọbara ọbara. Ya na mama m so gaghachi na bọs ahụ, anyị niile esorokwa ha. Ma, agaghị m echefu na ka mama m nọ na-ehicha papa m ọbara ahụ, ọ sịrị: “Jehova biko gbaghara ha n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”

N’oge ọzọkwa, mgbe anyị gara ileta ndị ikwu anyị n’obodo anyị, anyị hụrụ otu bishọp a ma ama n’ụlọ papa nnukwu m. Bishọp ahụ ma na ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova. Ọ kpọpụtara m n’agbanyeghị na m dị naanị afọ isii jụọ m, sị: “Gịnwa, gịnị mere i mebeghị baptizim?” M gwara ya na m ka dị obere, nakwa na tupu mụ emee baptizim, m kwesịrị ịmụkwu Baịbụl, okwukwe m esiekwa ike. Ihe m zara ya adịghị ya mma, ya agwa papa nnukwu m na m na-akparị mmadụ.

Ihe ndị a na-adịghị mma merenụ dị ole na ole. Ihe e ji mara ndị Lebanọn bụ na ha na-anabata ndị ọbịa nke ọma, na-emetakwa ha enyi. Ọ bụ ya mere anyị ji nwee ọtụtụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl.

ANYỊ KPEBIRI ỊKWAGA OBODO ỌZỌ

Mgbe m ka na-aga akwụkwọ, e nwere otu nwanna na-eto eto si Venezuela bịa Lebanọn. Ọ na-abịa ọmụmụ ihe n’ọgbakọ anyị. Ya na nwanne m nwaanyị Wafa matakwara. Ka oge na-aga, ha lụrụ ma gaa biri na Venezuela. Nwanne m nwaanyị Wafa detawara anyị akwụkwọ ozi, ọ na-agwa papa m ka anyị kwafeta Venezuela. Ihe mere o ji eme ihe a bụ na ọ chọrọ ka anyị na ya nọrọ. Anyị mechakwara kwaga ebe ahụ.

Anyị bịarutere Venezuela n’afọ 1953 ma biri na Karakas, n’ebe dị nso n’ebe onyeisi ala obodo ahụ bi. Ebe m ka na-eto eto, ọ na-atọgbu m atọgbu ịhụ onyeisi ala mgbe ọ nọ n’ụgbọala ndị oké ozu na-agbafe. Ma, ọ dịrịghị nne na nna m mfe n’ihi na obodo ahụ, asụsụ ha, nri ha, na omenala ha amaraghị ha ahụ́. Ọ bụdị mgbe obodo ahụ bidoro ịmara ha ahụ́ ka otu ihe dị ezigbo njọ mere.

Papa m. Mama m. Mụnwa n’afọ 1953, mgbe mụ na ezinụlọ m kwagara Venezuela

IHE DỊ EZIGBO NJỌ MERE

Ọrịa jidere papa m. Ihe a juru anyị anya n’ihi na ahụ́ gbasiri ya ike. Anyị agadịghị echetali ma ọ̀ rịatụla ọrịa mbụ. A chọpụtara na ọ na-arịa kansa, ya agaakwa ka a waa ya ahụ́. Ọ dị mwute na ọ nwụrụ mgbe otu izu gachara.

Ihe ahụ merenụ gbawara anyị obi. M dị afọ iri na atọ mgbe ahụ. Ọnwụ papa anyị bịara anyị na mberede. Anyị chekwa na anyị agaghị enweli obi ụtọ ọzọ. Ruo oge ụfọdụ, o siiri mama m ike ikweta na di ya anwụọla. Anyị chọpụtara na anyị ekwesịghị ikwe ka ọnwụ ya gbochie anyị ịna-enwe ọṅụ. Jehova nyekwaara anyị aka. Mgbe m gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndịrị dị na Karakas n’oge m dị afọ iri na isii, m chọsiri ike inyere ndị ezinụlọ anyị aka.

Nwanne m nwaanyị Sana na di ya Rubén nyeere m ezigbo aka ime nke ọma n’ọgbakọ

N’oge ahụ, nwanne m nwaanyị Sana lụrụ otu nwanna aha ya bụ Rubén Araujo. Ọ ka gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied ma lọta Venezuela. Ha kpebiri ịkwaga Niu Yọk. Ezinụlọ anyị kpebiri na m ga-aga mahadum. N’ihi ya, ha kwuru ka m gaa Niu Yọk ka m nwee ike ịnọ na nke nwanne m nwaanyị na di ya na-aga akwụkwọ. Nwanne m nwaanyị na di ya nyeere m ezigbo aka ime nke ọma n’ọgbakọ n’oge ahụ mụ na ha bi. Ihe ọzọkwa bụ na e nwere ọtụtụ ụmụnna nwoke ma nke a na-akọ nọ n’ọgbakọ Spanish dị na Bruklin. Obi dị m ụtọ na m matara mmadụ abụọ n’ime ha, ya bụ, Nwanna Milton Henschel na Nwanna Frederick Franz. Ha abụọ jere ozi na Betel dị na Bruklin.

Mgbe m mere baptizim n’afọ 1957

Mgbe ọ fọrọ obere ka o ruo otu afọ m banyere mahadum na Niu Yọk, m malitere ịna-enwe obi abụọ banyere ihe m ji ndụ m na-eme. Agụọla m ọtụtụ isiokwu dị n’Ụlọ Nche kwuru gbasara Onye Kraịst inwe ezigbo ihe ndị ọ chọrọ iji ndụ ya eme, chebakwara ha echiche. M hụrụ ụdị obi ụtọ ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị na-eje ozi na Betel nọ n’ọgbakọ anyị na-enwe. M chọkwara ịdị ka ha. Ma, emebeghị m baptizim. N’oge na-adịghị anya, m chọpụtara na ọ dị ezigbo mkpa ka m nyefee Jehova onwe m. M mere otú ahụ ma mee baptizim n’abalị iri atọ n’ọnwa Mach, afọ 1957.

MKPEBI NDỊ DỊ MKPA M MERE

Mgbe m mechara baptizim, m nọ na-eche gbasara ịbụ ọsụ ụzọ. M chọsiri ike ịbụ ọsụ ụzọ. Mana, m chọpụtara na ime otú ahụ agaghị adịchara m mfe. Ihe m nọ na-eche bụ otú m ga-esi na-asụ ụzọ, na-agakwa mahadum. M degaara mama m na ụmụnne m ọtụtụ akwụkwọ ozi, na-agwa ha na m chọrọ ịkwụsị ịga mahadum lọta Venezuela ghọọ ọsụ ụzọ, hanwa ana-edetakwara m. 

M laghachiri Karakas na Jun afọ 1957. Ma, m chọpụtara na ihe na-esiri ndị ezinụlọ anyị ike. Ha chọrọ onye ọzọ ga na-enyere ha aka n’ego. Olee otú m ga-esi enye aka? M nwetara ọrụ n’otu ụlọ akụ̀. Ma, m ka chọsikwara ike ịbụ ọsụ ụzọ n’ihi na ọ bụ ya mere m ji lọta. M kpebisiri ike na m ga-eme ha abụọ. Ruo afọ ụfọdụ, m rụrụ ọrụ n’ụlọ akụ̀, na-asụkwa ụzọ. Ọ bụ n’oge ahụ ka m kacha jiri ọrụ n’aka, kachakwa nwee obi ụtọ.

Ihe ọzọ mere m obi ụtọ bụ na m matara otu nwanna nwaanyị mara mma bụ́ onye Jamanị aha ya bụ Sylvia. Mụ na ya lụkwara. Ọ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ya na mama ya na papa ya kwafetara Venezuela. Ka oge na-aga, anyị mụrụ ụmụ abụọ, otu nwoke aha ya bụ Michel (ya bụ́ Mike), na otu nwaanyị aha ya bụ Samira. Mama m bịakwara anyị na ya ebiri ka m lekọtawa ya. Ọ bụ eziokwu na m kwụsịrị ịsụ ụzọ n’oge ahụ ka m nwee ike ilekọta ndị ezinụlọ m, m ka na-ekwusasikwa ozi ọma ike. Mụ na nwunye m na-asụ ụzọ inyeaka mgbe ọ bụla anyị nwere ike n’oge ezumike anyị.

MKPEBI ỌZỌ DỊ EZIGBO MKPA

Ụmụ anyị ka nọ n’ụlọ akwụkwọ mgbe ihe ahụ m kwuru ná mmalite isiokwu a mere. Anyị na-eriju afọ n’oge ahụ. Ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ụlọ akụ̀ na-akwanyekwara m ùgwù. Ma, ihe m chọrọ ka e jiri mara m bụ onye na-efe Jehova. M nọ na-echesi echiche ike ihe m ga-eme ka ndị mmadụ mara m ka onye na-efe Chineke. N’ihi ya, mụ na nwunye m nọrọ kpaa gbasara otú anyị ga-esi na-emefu ego. Ọ bụrụ na mụ akwụsị ọrụ n’ụlọ akụ ahụ, ha ga-akwụ m ezigbo ụgwọ. Ebe ọ bụ na e nweghị ụgwọ anyị ji, anyị chọpụtara na ọ bụrụ na anyị anaghị ebi ndụ okomoko, ego anyị nwere ga-ezuru anyị ruo ogologo oge.

Ime ihe a adịghị mfe, ma nwunye ọma m na nne m kwadoro m. M ga-abụ ọsụ ụzọ ọzọ. Ihe a tọgburu m atọgbu. O yiri ka ihe niile ọ̀ ga-aga nnọọ otú e si kwuo ya. Ma, n’oge na-adịghị anya, a gwara anyị ihe anyị na-atụghị anya ya.

IHE ỌMA ANYỊ NA-ATỤGHỊ ANYA YA

Nwa anyị nke atọ bụ́ Gabriel anyị na-atụghị anya ya

Otu ụbọchị, dọkịta anyị gwara anyị na nwunye m dị ime. Ihe a tụrụ anyị abụọ n’anya. O mere anyị obi ụtọ. Ma, m chetara ihe ahụ m kpebiri ime, ya bụ, ịsụ ụzọ. M̀ ka ga-enwelikwa ike ịsụ ụzọ? Anyị mechara tụwa anya nwa ọhụrụ a ga-amụ n’ezinụlọ anyị. Ma, m na-eche ma m̀ ka ga-asụlikwa ụzọ.

Mgbe anyị lebachara anya n’ihe anyị chọrọ ime, anyị kpebiri na m ka ga-asụ ụzọ. Anyị mụrụ nwa anyị aha ya bụ Gabriel n’ọnwa Eprel afọ 1985. M kwụsịrị ịrụ n’ụlọ akụ̀ ahụ ma malite ịsụ ụzọ n’ọnwa Jun afọ 1985. Ka oge na-aga, a họpụtara m ka m soro na Kọmitii Alaka. Ma, alaka ụlọ ọrụ ahụ adịghị na Karakas. Ihe ọ pụtara bụ na m ga na-eme njem gaa ihe dị ka kilomita iri asatọ ugboro abụọ ma ọ bụ atọ n’izu.

ỊKWAGA EBE ỌZỌ

Ebe alaka ụlọ ọrụ anyị dị bụ na La Viktoria. N’ihi ya, anyị kpebiri na ezinụlọ anyị ga-akwaga La Viktoria n’ihi na ọ dị nso na Betel. Mgbanwe a anyị mere abụghị obere ihe. M hụrụ ndị ezinụlọ m n’anya nke ukwuu, m jikwa ha kpọrọ ihe. Àgwà ha nyeere m aka. Nwanne m nwaanyị aha ya bụ Baha wepụtara onwe ya ilekọta mama anyị. Mike alụọla nwaanyị. Ma anyị na Samira na Gabriel ka bi. Ihe ọ pụtara bụ na nkwaga anyị kwagara La Viktoria ga-eme ka ha hapụ ndị enyi ha nọ na Karakas. Ihe ọzọkwa bụ na nwunye m ga-emekwa ka obere obodo a mara ya ahụ́ n’ihi na ebe anyị bibu bụ nnukwu obodo. Anyị niile ga-ebizi n’obere ụlọ. N’eziokwu, isi Karakas kwaga La Viktoria abụghị obere ihe.

E nwekwara ihe ọzọ gbanwerenụ. Gabriel lụrụ nwaanyị, Samira agaakwa biri nke ya. A kpọziri mụ na nwunye m ka anyị bịa jewe ozi na Betel n’afọ 2007. Anyị ka na-eje ozi na Betel ruo ugbu a. Ọkpara m bụ Mike bụ okenye. Ya na nwunye ya Monica na-asụkwa ụzọ. Gabriel bụkwa okenye. Ya na nwunye ya Ambra na-eje ozi n’Ịtali. Samira na-asụ ụzọ, na-anọkwa n’ụlọ arụ ọrụ Betel.

Ebe mụ na nwunye m Sylvia nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Venezuela. Ọkpara anyị bụ́ Mike na Monica nwunye ya. Ada anyị bụ́ Samira. Nwa anyị Gabriel na Ambra nwunye ya

M GA-EKPEBIKWA IME ỤDỊ IHE A ỌZỌ

E nweela ọtụtụ mkpebi gbara ọkpụrụkpụ m mere ná ndụ m. Ma, anaghị m akwara ha mmakwaara. M ga-achọkwa ime ụdị mkpebi ahụ ọzọ. Obi dị m ụtọ n’ihi ihe ndị m merela n’ozi Jehova. Kemgbe ọtụtụ afọ, achọpụtala m na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na Jehova dịrị n’ezigbo mma. Ma mkpebi anyị chọrọ ime ọ̀ dị obere ma ò buru ibu, o nwere ike inye anyị udo “karịrị nghọta mmadụ.” (Fil. 4:​6, 7) Ozi mụ na nwunye m na-eje na Betel na-atọ anyị ụtọ. Anyị makwa na Jehova agọziela anyị n’ihi na anyị na-ebute ya ụzọ ná ndụ anyị.