ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24
Jehova Bụ Onye Kacha Agbaghara Mmehie
“Gịnwa bụ́ Jehova dị mma, dịkwa njikere ịgbaghara mmehie. Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.”—ỌMA 86:5.
ABỤ NKE 42 Ekpere Ohu Chineke
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Gịnị ka Eze Solomọn ji ihe o dere n’Ekliziastis 7:20 na-akụziri anyị?
EZE Solomọn kwuru, sị: “E nweghị onye ezi omume nọ n’ụwa nke na-eme naanị ihe dị mma, nke na-anaghịkwa emehie.” (Ekli. 7:20) Ihe a o kwuru bụ eziokwu. Anyị niile bụ ndị mmehie. (1 Jọn 1:8) N’ihi ya, ọ dị anyị niile mkpa ka Chineke na ndị ọzọ na-agbaghara anyị.
2. Olee otú obi dị gị mgbe ezigbo enyi gị gbaghaara gị ihe i mejọrọ ya?
2 O doro anya na i chetara mgbe i mejọrọ ezigbo enyi gị. Ị chọrọ ka gị na ya dịkwa ná mma ọzọ. N’ihi ya, i si n’obi gị rịọ ya ka ọ gbaghara gị. Olee otú obi dị gị mgbe ọ gbaghaara gị? Ọ̀ kwa obi bịara ruo gị ala? Ee. O mekwara ka obi tọọ gị ụtọ.
3. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?
3 Anyị chọrọ ka Jehova bụrụ ezigbo Enyi anyị. Ma, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ikwu ma ọ bụ mee ihe kpasuru ya iwe. Gịnị nwere ike ime ka obi sie anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị? Gịnị dị iche n’otú Jehova si agbaghara anyị na otú anyị si agbaghara ndị ọzọ? Oleekwa onye Jehova na-agbaghara?
JEHOVA DỊ NJIKERE ỊGBAGHARA
4. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara?
4 Jehova si n’Okwu ya na-eme ka obi sie anyị ike na ọ dị njikere ịgbaghara anyị. Mgbe Jehova si n’ọnụ mmụọ ozi na-akọwara Mosis onwe ya n’Ugwu Saịnaị, ọ sịrị: “Jehova, Jehova, Chineke nwere ọmịiko ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya na eziokwu ya dị ukwuu, onye na-egosi puku kwuru puku ọgbọ na ọ hụrụ ha n’anya, onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu na mmehie.” (Ọpụ. 34:6, 7) Jehova dị obiọma, na-eme ebere, dịrịkwa njikere mgbe niile ịgbaghara onye mmehie ọ bụla chegharịrị echegharị.—Nehe. 9:17; Ọma 86:15.
5. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 103:13, 14, olee ihe otú a Jehova si mara anyị nke ọma na-eme ka o mee?
5 Ebe ọ bụ Jehova kere anyị, ọ ma ihe niile gbasara anyị. Cheedị ihe a. Jehova ma ihe niile gbasara onye ọ bụla nọ n’ụwa a. (Ọma 139:15-17) N’ihi ya, ọ ma ihe niile ezughị okè anyị ketara n’aka nne na nna anyị mbụ nwere ike ịkpatara anyị. Ọ makwa ihe niile merela ná ndụ anyị mere anyị ji bụrụ ụdị mmadụ anyị bụ. Olee ihe otú a Jehova si mara anyị nke ọma na-eme ka o mee? Ọ na-eme ka ọ gbaghara anyị.—Ọma 78:39; gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.
6. Olee otú Jehova sirila gosi na ọ dị njikere ịgbaghara anyị?
6 Jehova egosila na ọ dị njikere ịgbaghara ndi mmehie. Ọ ma na mmehie Adam na Iv mere ka anyị niile bụrụ ndị mmehie, nakwa na anyị ga-emecha nwụọ. (Rom 5:12) Anyị agaghị emeli ka anyịnwa ma ọ bụ onye ọzọ ghara ime mmehie, ma ọ bụkwanụ ghara ịnwụ. (Ọma 49:7-9) Ma, Chineke anyị hụrụ anyị n’anya meteere anyị ebere, meekwa ihe ga-eme ka anyị nwere onwe anyị. Gịnị ka o mere? Jọn 3:16 kwuru na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị. (Mat. 20:28; Rom 5:19) Jizọs nwụchiteere anyị ọnwụ iji gbapụta onye ọ bụla nwere okwukwe na ya. (Hib. 2:9) Ọ ga-abụrịrị na o wutere Jehova nke ukwuu mgbe ọ hụrụ ka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya tara ahụhụ ma nwụọ ọnwụ ihere. N’eziokwu, Jehova agaraghị ekwe ka Ọkpara ya nwụọ ma a sị na ọ chọghị ịgbaghara anyị.
7. Olee ndị ụfọdụ Baịbụl kọrọ akụkọ ha Jehova gbaghaara kpamkpam?
7 Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị Jehova gbaghaara kpamkpam. (Efe. 4:32) Olee onye gbatara gị n’obi? O nwere ike ịbụ Eze Manase. Nwoke ọjọọ ahụ mehiere Jehova nke ukwuu. O fere arụsị dị iche iche, gbaakwa ndị ọzọ ume ka ha mee otú ahụ. O gburu ụmụ ya, jirikwa ha chụọrọ arụsị dị iche iche àjà. O dowedịrị arụsị n’ime ụlọ nsọ Jehova. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: “Ihe ọjọọ o mere, nke kpasuru Jehova iwe, karịrị akarị.” (2 Ihe 33:2-7) Ma, mgbe Manase ji obi ya niile chegharịa, Jehova gbaghaara ya kpamkpam. Chineke medịrị ka ọ bụrụkwa eze ọzọ. (2 Ihe 33:12, 13) O nwekwara ike ịbụ na i chetara Eze Devid. Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ, dị ka ịkwa iko na igbu mmadụ. Ma, mgbe o ji obi ya niile chegharịa ma kweta na o mehiere, Jehova gbaghaara ya. (2 Sam. 12:9, 10, 13, 14) N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị. Anyị ga-ahụkwa na otú Jehova si agbaghara dị iche n’otú ụmụ mmadụ si agbaghara.
OTÚ JEHOVA SI AGBAGHARA DỊ ICHE
8. Gịnị mere o ji bụrụ Jehova kacha ruo eruo ịgbaghara anyị?
8 Jehova bụ “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe.” (Jen. 18:25) Ezigbo onyeikpe kwesịrị ịma iwu nke ọma. Jehova bụ Onyeikpe anyị. Ọ makwa iwu nke ọma n’ihi na ọ bụ Onye na-enye anyị iwu. (Aịza. 33:22) O nweghị onye ka Jehova mara ihe dị mma na ihe dị njọ. Olee ihe ọzọ ezigbo onyeikpe kwesịrị ịna-eme? O kwesịrị ịma ihe niile gbasara okwu tupu ya ekpebie ya. N’ihi ya, Jehova bụ Onyeikpe kachanụ n’ihi na ọ ma ihe niile.
9. Olee ihe ndị Jehova ma na-eme ka ọ gbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya?
9 Jehova adịghị ka ụmụ mmadụ. Ọ ma ihe niile gbasara okwu ọ bụla. (Jen. 18:20, 21; Ọma 90:8) Ọ bụghị naanị ihe ọ na-ahụ na ihe ọ na-anụ ka ọ ma. Ọ ma ihe mere mmadụ nwere ike iji kpaa àgwà ụfọdụ. Ọ ma na o nwere ike ịbụ n’ihi àgwà ndị onye ahụ bu pụta ụwa, otú e si zụọ ya, ebe o bi ma ọ bụdị ọrịa ọ na-arịa. Jehova na-enyochakwa obi. Ọ ghọtara nke ọma ihe mere mmadụ ji mee ihe ọ bụla. E nweghị ihe ọ bụla mmadụ nwere ike izochiri Jehova. (Hib. 4:13) N’ihi ya, mgbe ọ bụla Jehova gbaghaara mmadụ, ọ bụ n’ihi na ọ ma ihe niile gbasara ihe onye ahụ mere.
10. Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile? (Diuterọnọmi 32:4)
10 Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe niile. Ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Ihe na-eme ka ọ gbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya abụghị otú onye ahụ dị n’ihu, ma ọ̀ bụ ọgaranya, ma ọ̀ bụ onye a ma ama, ma ọ bụkwanụ nkà ndị o nwere. (1 Sam. 16:7; Jems 2:1-4) O nweghị onye ga-amanyeli Jehova ime ihe ọ bụla ma ọ bụ nye ya aka azụ. (2 Ihe 19:7) Ọ naghị eji iwe ekpebi ihe ọ ga-eme ma ọ bụ kpebie ihe n’ihi na ọ chọrọ imenyere mmadụ. (Ọpụ. 34:7) Jehova bụ Onyeikpe kachanụ n’ihi na ọ ma ihe niile gbasara anyị na otú ihe si dịrị anyị.—Gụọ Diuterọnọmi 32:4.
11. Gịnị mere otú Jehova si agbaghara ji pụọ iche?
11 Ndị dere Akwụkwọ Nsọ Hibru chọpụtara na otú Jehova si agbaghara dị iche. Otu akwụkwọ kwuru na n’ebe ụfọdụ, “okwu Hibru a na-eji akọwa otú Jehova si agbaghara anyị dị iche n’okwu e ji akọwa otú mmadụ si agbaghara ibe ya.” Ọ bụ naanị Jehova nwere ikike ịgbaghara onye mmehie kpamkpam. Gịnị na-eme ma Jehova gbaghara anyị?
12-13. (a) Olee otú obi na-adị mmadụ ma Jehova gbaghara ya? (b) Jehova gbaghara mmadụ, mgbaghara ahụ ọ̀ na-adịru ole mgbe?
12 Ọ bụrụ na anyị ekweta na Jehova agbagharala anyị, ‘obi na-eru anyị ala.’ Ihe ọ pụtara bụ na akọnuche anyị agaghịzi na-apịa anyị ụtarị. Naanị mgbe obi ga-adị anyị otú a bụ ma ọ bụrụ “Jehova” gbaghaara anyị. (Ọrụ 3:19) Ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, anyị na ya ga-adị ná mma, ya adịkwa ka anyị emehietụbeghị ya.
13 Jehova gbaghara anyị, ọ gaghịzi na-ekwu na anyị mere ihe ahụ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ maka ya. (Aịza. 43:25; Jere. 31:34) Jehova na-eme ka mmehie anyị dịrị ezigbo anya “otú ọwụwa anyanwụ si dị ezigbo anya n’ọdịda anyanwụ.” * (Ọma 103:12) Ọ bụrụ na anyị echebara otú Jehova si agbaghara anyị echiche, ọ ga-eme ka obi dị anyị ezigbo ụtọ, anyị ana-akwanyekwuru ya ùgwù. (Ọma 130:4) Ma, ònye ka Jehova ga-agbaghara?
ÒNYE KA JEHOVA GA-AGBAGHARA?
14. Gịnị ka anyị mụtarala gbasara ihe na-eme ka Jehova gbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya?
14 Dị ka anyị hụrụla, ihe na-eme ka Jehova gbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya abụghị otú mmehie ya hà. Anyị amụtakwala na ebe ọ bụ Jehova kere anyị, bụrụ Onye na-enye anyị iwu na Onyeikpe anyị, ọ na-eji ihe ndị ọ ma ekpebi ma ọ̀ ga-agbaghara mmadụ ma ọ bụ ghara ịgbaghara ya. Olee ihe ndị Jehova na-echebara echiche tupu ya ekpebie nke ọ ga-eme?
15. Dị ka e kwuru na Luk 12:47, 48, olee otu ihe Jehova na-echebara echiche tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-agbaghara mmadụ ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara ya?
15 Otu ihe Jehova na-echebara echiche bụ ma onye ahụ ọ̀ ma na ihe ahụ ọ na-aga ime bụ mmehie. Jizọs ji ihe o kwuru na Luk 12:47, 48 mee ka ihe a doo anya. (Gụọ ya.) Ọ bụrụ na mmadụ kpachaara anya mee ihe gosiri na obi kpọrọ ya nkụ, nakwa ihe ọ ma ga-ewe Jehova iwe, onye ahụ mere mmehie dị oké njọ. Jehova nwere ike ikpebi na ọ gaghị agbaghara ya. (Mak 3:29; Jọn 9:41) Ma anyị ga-ekweta na mgbe ụfọdụ, anyị na-eme ihe anyị ma na ọ dịghị mma. Anyị mee ụdị ihe ahụ, Jehova ò nwere ike ịgbaghara anyị? Ee. Jehova nwere ike ịgbaghara anyị n’ihi na e nwere ihe ọzọ ọ na-echebara echiche tupu ya ekpebie ma ọ̀ ga-agbaghara ma ọ bụ na ọ gaghị agbaghara.
16. Gịnị bụ nchegharị, gịnịkwa mere o ji dị ezigbo mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova gbaghara anyị?
16 Ihe ọzọ Jehova na-echebara echiche bụ ma onye ahụ mere mmehie ò ji obi ya niile chegharịa. Gịnị bụ nchegharị? Nchegharị pụtara na mmadụ “agbanweela ihe ọ na-eche, àgwà ya, na ihe ọ chọrọ ime.” Ọ pụtakwara na onye ahụ kwara mmakwaara maka ihe ahụ o mere ma ọ bụkwanụ ihe o kwesịrị ime ọ na-emeghị. O wuteruru ya n’ọkpụkpụ. Ọ bụghị naanị ihe ọjọọ onye ahụ mere na-ewute ya, ọ na-ewutekwa ya na ya na Jehova adịghịzi ná mma, nke mere ka o mee ihe ọjọọ ahụ o mere. Cheta na Eze Manase na Eze Devid mere mmehie ndị dị oké njọ. Ma, Jehova gbaghaara ha n’ihi na ha ji obi ha niile chegharịa. (1 Eze 14:8) N’eziokwu, naanị ihe ga-eme ka Jehova gbaghara anyị bụ ma ọ hụ na anyị echegharịala. Ma, ihe ọjọọ anyị mere iwute anyị abụghị naanị ihe Jehova chọrọ. Anyị kwesịrị ime ihe gosiri na anyị echegharịala. * Ka anyị leba anya n’ihe ọzọ Jehova na-echebara echiche.
17. Olee ihe ọzọ Jehova na-echebara echiche tupu ya agbaghara mmadụ? Gịnị mere na anyị ekwesịghị imeghachi ihe ọjọọ anyị mere na mbụ? (Aịzaya 55:7)
17 Ihe ọzọ dị mkpa Jehova na-echebara echiche bụ ma onye ahụ ọ̀ ga-alọghachikwute ya. Ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ ga-ahapụ ihe ọjọọ ahụ ọ na-eme, mewezie ihe dị Jehova mma. (Gụọ Aịzaya 55:7.) Onye ahụ kwesịrị ịgbanwe otú o si eche echiche, na-echezi echiche ka Jehova. (Rom 12:2; Efe. 4:23) O kwesịrị ikpebisi ike ịhapụ otú na-adịghị mma o sibu eche echiche na ihe ọjọọ ọ na-emebu. (Kọl. 3:7-10) N’eziokwu, ihe ga-eme ka Jehova gbaghara anyị ma sachapụ mmehie anyị bụ ma anyị nwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. Jehova ga-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na ọ hụ na anyị na-agbalịsi ike ịgbanwe àgwà ọjọọ anyị.—1 Jọn 1:7.
OBI SIE GỊ IKE NA JEHOVA GA-AGBAGHARA GỊ
18. Olee ihe ndị anyị tụlerela gbasara otú Jehova si agbaghara anyị?
18 Ka anyị tụleghachi ihe ụfọdụ anyị mụtara n’isiokwu a. Ọ bụ Jehova kacha agbaghara ma n’eluigwe ma n’ụwa. Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Nke mbụ, ọ dị njikere mgbe niile ịgbaghara anyị. Nke abụọ, ọ ma ihe niile gbasara anyị, ọ bụkwa ya ga-akacha amata ma ànyị echegharịala n’eziokwu. Nke atọ, ọ bụrụ na Jehova agbaghara anyị, ọ na-adịzi ka e nweghị mgbe anyị mere mmehie ahụ. Ọ bụ ihe a na-eme ka obi anyị ghara ịna-ama anyị ikpe, ihe anyị ana-amasịkwa ya.
19. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na anyị ezughị okè nakwa na anyị na-eme mmehie?
19 Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ na anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, anyị ka ga na-eme mmehie. Ma ihe e dere n’akwụkwọ Insight on the Scriptures, mpịakọta nke 2, peeji nke 771, ga-akasi anyị obi. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na Jehova dị obi ebere, marakwa na ndị na-efe ya ezughị okè, ha ekwesịghị ịna-akwa mmakwaara mgbe niile maka na ha ezughị okè, nakwa na ha na-emejọ ihe. (Ọma 103:8-14; 130:3) Ọ bụrụ na ha ana-agbalịsi ike ịna-eme ihe Jehova chọrọ, ha nwere ike ịna-enwe obi ụtọ. (Fil. 4:4-6; 1 Jọn 3:19-22).” Ihe a o kwuru na-akasi anyị nnọọ obi.
20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
20 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova dị njikere ịgbaghara anyị ma ọ bụrụhaala na ihe ọjọọ ahụ anyị mere ewute anyị nke ukwuu. Ma, olee otú anyị nwere ike isi na-agbaghara ka Jehova? Olee otú mgbaghara anyị na nke Jehova si yie? Ma, olee ihe dị iche na ha? Gịnị mere ịghọta ihe dị iche n’otú anyị si agbaghara na otú Jehova si agbaghara ji dị mkpa? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.
ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche
^ Jehova si n’Okwu ya bụ́ Baịbụl gwa anyị na ọ dị njikere ịgbaghara onye mmehie chegharịrị echegharị. Ma, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche na anyị erughị eru ka Jehova gbaghara anyị. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova dị njikere mgbe ọ bụla ịgbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa n’eziokwu.
^ Gụọ akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso, isi nke 26, paragraf nke 9.
^ NKỌWAKWU: “Nchegharị” pụtara mmadụ ịgbanwe ihe ọ na-eche, jirikwa obi ya niile kwaa mmakwaara maka otú o sibu ebi ndụ, ihe ọjọọ o mere ma ọ bụ ihe o kwesịrị ime ọ na-emeghị. Onye ji obi ya niile chegharịa na-eme ihe gosiri na o chegharịala.