Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Mgbe a mụchara Jizọs, gịnị mere Josef na Meri ji nọrọwa na Betlehem kama ịlaghachi obodo ha bụ́ Nazaret?
Baịbụl ekwughị. Mana, ihe ụfọdụ dị mkpa Baịbụl kwuru nwere ike ime ka anyị ghọta ihe mere ha alaghachighị Nazaret.
Otu mmụọ ozi gwara Meri na ọ ga-adị ime, mụọ nwa. Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara Meri ihe a, ya na Josef bi na Nazaret bụ́ obodo Josef dị na Galili. (Luk 1:26-31; 2:4) Mgbe ha mechara si Ijipt lọta, ha laghachiri Nazaret. Ọ bụ ebe ahụ ka Jizọs toro, nke mere e ji na-akpọ ya Jizọs onye Nazaret. (Mat. 2:19-23) Ọ bụ ya mere anyị ji echeta Nazaret ma a kpọọ Jizọs, Josef, na Meri.
E nwere onye ikwu Meri aha ya bụ Elizabet. O bi na Juda. Ọ bụ nwunye otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya, bụrụkwa nne Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Luk 1:5, 9, 13, 36) Meri gara leta Elizabet ma nọnyere ya ruo ọnwa atọ na Juda. Mgbe e mechara, Meri laghachiri Nazaret. (Luk 1:39, 40, 56) N’ihi ya, Meri matụ Juda.
Ka oge na-aga, Josef mere ihe iwu kwuru, nke bụ́ “ka e deba aha ya n’akwụkwọ.” Ọ bụ ya mere o ji si Nazaret gaa Betlehem, ebe bụ́ “obodo Devid,” bụrụkwa ebe e buru amụma a ga-anọ amụ Mezaya. (Luk 2:3, 4; 1 Sam. 17:15; 20:6; Maị. 5:2) Mgbe Meri mụchara Jizọs na Nazaret, Josef atụghị anya na Meri ga-eku nwa ọhụrụ ahụ laghachi Nazaret, bụ́ ebe dị ezigbo anya. Ihe ha meziri bụ ịnọrọwa na Betlehem, nke dị ihe dị ka kilomita itoolu ma e si Jeruselem gaa ya. Ọ ga-akara ha mfe isi ebe ahụ kpọrọ Jizọs gaa n’ụlọ nsọ maka ịchụ àjà Iwu Mosis kwuru ka a chụọ.—Lev. 12:2, 6-8; Luk 2:22-24.
Mmụọ ozi Chineke ebula ụzọ gwa Meri na nwa ya nwoke ga-enweta “ocheeze nna ya bụ́ Devid” nakwa na ọ ga-abụ Eze. Ọ̀ ga-abụ na Meri na Josef chere na ọ dị ezigbo mkpa na a mụrụ Jizọs n’obodo Devid? (Luk 1:32, 33; 2:11, 17) Ọ ga-abụ na ha chere na ọ dị mma ịnọrọ ebe ahụ ruo mgbe Chineke ga-agwa ha ihe ọzọ ha ga-eme.
Anyị amaghị oge Josef na ndị ezinụlọ ya nọrọla na Betlehem mgbe ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu bịarutere. Ma, n’oge ahụ, Josef na ezinụlọ ya bizi n’ụlọ. Ihe a kpọkwara Jizọs bụ “nwatakịrị,” ọ bụghị nwa ọhụrụ. (Mat. 2:11) O yiri ka Josef na ndị ezinụlọ ya hà nọrọ ogologo oge na Betlehem nke na ha jizi ya mere ebe ha bi kama ịlaghachi na Nazaret.
Herọd nyere iwu ka a gaa Betlehem “gbuo ụmụaka ndị nwoke niile, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa.” (Mat. 2:16) Mmụọ ozi Chineke dọrọ Josef aka ná ntị gbasara ya. N’ihi ya, ya na Meri kpọọrọ Jizọs gbaga Ijipt, nọrọkwa ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Josef mechara kpọrọ ezinụlọ ya laghachi Nazaret. Gịnị mere na ha alaghachighị Betlehem? Ọ bụ n’ihi na ha achọghị ka aka Akeleyọs nwa Herọd kpara ya. Akeleyọs bụ onye ọchịchị aka ike. O bikwa na Judia. Chineke gwakwara Josef ka ọ ghara ịga ebe ahụ. Josef ga-enwe ike ịnọ na Nazaret zụọ Jizọs ka ọ bụrụ ezigbo onye na-efe Chineke n’enweghị ihe ọ bụla ga-eme ya.—Mat. 2:19-22; 13:55; Luk 2:39, 52.
O yiri ka Josef ọ̀ nwụọla tupu Jizọs anwụọ mepee ụzọ ịga eluigwe. N’ihi ya, a ga-akpọlite Josef n’ọnwụ, ya adịrị ndụ n’ụwa. Ọtụtụ ndị ga-enwe ike ịhụ ya ma matakwuo ihe mere ya na Meri ji nọrọ na Betlehem mgbe a mụchara Jizọs.