Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 27

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?

Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-atụ Egwu Jehova?

Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi bụ ndị na-atụ egwu ya.”—ỌMA 25:14.

ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 25:14, olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na Jehova bụrụ ezigbo enyi?

 OLEE àgwà ndị i chere i kwesịrị inwe ka gị na onye ọzọ nwee ike ịbụ ezigbo enyi? I nwere ike ikwu na ndị bụ́ ezigbo enyi kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya ma na-akwado ibe ha. O nwere ike ị gaghị eche na ịtụ egwu bụ àgwà dị mkpa ga-eme ka gị na onye ọzọ bụrụ ezigbo enyi. Ma, dị ka amaokwu Akwụkwọ Nsọ e si nweta isiokwu a si kwuo, ndị chọrọ ka ha na Jehova bụrụ ezigbo enyi kwesịrị ‘ịna-atụ egwu ya.’—Gụọ Abụ Ọma 25:14.

2 N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị niile kwesịrị ịna-atụ egwu ya. Ma, gịnị ka ịtụ egwu Chineke pụtara? Olee otú anyị ga-esi mụta ịtụ egwu Jehova? Oleekwa ihe anyị ga-amụta gbasara ịtụ egwu Chineke n’aka Obedaya bụ́ onye na-elekọta ụlọ eze, Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà, na Eze Jehoash?

GỊNỊ KA ỊTỤ EGWU CHINEKE PỤTARA?

3. Kọwaa otú ụjọ nwere ike isi chebe anyị.

3 Ụjọ nwere ike ịna-atụ anyị ma anyị chee na ihe ọjọọ na-aga ime anyị. Ụdị ụjọ a nwere ike ịdị mma n’ihi na o nwere ike inyere anyị aka ịgbara nsogbu ọsọ. Ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ugwu, ụjọ nwere ike ime ka anyị ghara ịga n’ọnụ ọnụ ya ka anyị ghara ịda. Ụjọ imerụ ahụ́ nwere ike ime ka anyị gbaara ihe ga-emerụ anyị ahụ́ ọsọ. Ịtụ ụjọ ka anyị na enyi anyị ghara ise okwu ga-eme ka anyị ghara ikwu ma ọ bụ mee ihe na-adịghị ya mma.

4. Olee ụdị egwu Ekwensu chọrọ ka anyị na-atụ Jehova?

4 Setan chọrọ ka anyị na-atụ Jehova egwu na-adịghị mma. Setan na-eme ka ndị mmadụ kweta ihe Elifaz kwuru. Elifaz kwuru na Jehova bụ onye iwe, na ọ na-achọ ịta anyị ahụhụ, nakwa na anyị emekataghị mee ya obi ụtọ. (Job 4:18, 19) Ekwensu chọrọ ka anyị na-atụ Jehova ụjọ nke ga-eme ka anyị kwụsị ife ya. Ihe ga-eme ka anyị ghara ịtụ Chineke ụdị ụjọ ahụ bụ ịmụta ịtụ Chineke egwu otú kwesịrị ekwesị.

5. Gịnị ka ịtụ egwu Chineke pụtara?

5 Onye na-atụ Chineke egwu otú kwesịrị ekwesị hụrụ ya n’anya. Ọ naghịkwa achọ ime ihe ọ bụla ga-eme ka ya na ya ghara ịdị ná mma. Jizọs tụkwara ụdị “egwu Chineke” ahụ. (Hib. 5:7) Ọ tụghị Jehova ụjọ na-ekwesịghị ekwesị. (Aịza. 11:2, 3) Kama, o ji obi ya niile hụ Chineke n’anya, chọọkwa irubere ya isi. (Jọn 14:21, 31) Dịkwa ka Jizọs, anyị na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù ma na-atụ egwu ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, dịkwa ike. Anyị makwa na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ọ na-achọkwa ịma otú anyị si eme ihe ndị ọ na-akụziri anyị. Anyị nwere ike ime ka obi Jehova ṅụrịa ma ọ bụ mee ka obi gbawaa ya.—Ọma 78:41; Ilu 27:11.

ỊMỤTA ỊTỤ EGWU CHINEKE

6. Olee otu ụzọ anyị ga-esi mụta ịtụ egwu Chineke? (Abụ Ọma 34:11)

6 Anyị ebughị ịtụ egwu Chineke pụta ụwa. Anyị ga-agba mbọ mụta ya. (Gụọ Abụ Ọma 34:11.) Otu ụzọ anyị ga-esi mụta ya bụ ileru ihe ndị Chineke kere eke anya. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na Chineke ma ihe, dịrị ike, nakwa na “ihe ndị o kere” gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, anyị ga-esi n’ala ala obi anyị na-akwanyekwuru ya ùgwù ma hụkwuo ya n’anya. (Rom 1:20) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Adrienne sịrị: “Otú ihe ndị Jehova kere eke si egosi na o nwere amamihe na-atụ m n’anya. Ọ na-enyekwara m aka ịghọta na Jehova ma ihe ga-akacha abara m uru.” Ichebara ihe Chineke kere eke echiche mere ka o kwuo, sị: “Gịnị mekwaranụ m ga-eji chọọ ime ihe ọ bụla ga-esere mụ na Jehova, Onye nyere m ndụ?” Ì nwere ike iwepụta oge n’izu a chee banyere ihe ụfọdụ Jehova kere? Ime otú ahụ ga-eme ka ị na-akwanyekwuru Jehova ùgwù ma hụkwuo ya n’anya.—Ọma 111:2, 3.

7. Olee otú ekpere nwere ike isi enyere anyị aka ịtụ egwu Jehova?

7 Ụzọ ọzọ anyị si amụta ịtụ egwu Chineke bụ ikpe ekpere mgbe niile. Ka anyị na-ekpekwu ekpere ka anyị ga na-amatakwu Jehova nke ọma. Mgbe ọ bụla anyị rịọrọ ya ka o nye anyị ike anyị ga-eji edi nsogbu, anyị na-echeta na Jehova siri ezigbo ike. Mgbe ọ bụla anyị kelere ya maka Ọkpara ya o nyere anyị, anyị na-echeta na ọ hụrụ anyị n’anya. Mgbe ọ bụla anyị rịọkwara Jehova ka o nyere anyị aka ná nsogbu bịaara anyị, anyị na-aghọta na o nwere amamihe. Ụdị ekpere a na-eme ka anyị na-akwanyekwuru Jehova ùgwù. Ọ na-emekwa ka anyị kpebisie ike izere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na ya ghara ịdị ná mma.

8. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị nwee ike ịna-atụ egwu Chineke?

8 Ihe ga-enyere anyị aka ịna-atụ egwu Chineke bụ ịna-amụ Baịbụl, buru n’obi ịmụta ihe n’ihe ọma ndị mmadụ mere nakwa n’ihe ọjọọ ndị mmadụ mere a kọrọ na ya. Ka anyị leba anya n’akụkọ mmadụ abụọ ji obi ha fee Jehova, ya bụ, Obedaya bụ́ onye na-elekọta ụlọ Eze Ehab, nakwa Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe anyị ga-amụta n’aka Eze Jehoash nke Juda, onye mere ihe ọma ná mmalite ma mechaa hapụ Jehova.

NA-AKATA OBI KA OBEDAYA, NWOKE NA-ATỤ EGWU CHINEKE

9. Olee otú ịtụ egwu Jehova si nyere Obedaya aka? (1 Ndị Eze 18:3, 12)

9 Oge mbụ Baịbụl kwuru okwu Obedaya, b ọ sịrị: “Obedaya na-atụ nnọọ egwu Jehova.” (Gụọ 1 Ndị Eze 18:3, 12.) Olee otú ịtụ egwu Jehova si nyere Obedaya aka? O mere ka ọ na-akwụwa aka ọtọ, bụrụkwa onye a tụkwasịrị obi. Ihe a mere ka eze mee ya onye na-elekọta ụlọ ya. (I nwere ike ịtụle Nehemaya 7:2.) Ịtụ egwu Chineke mekwara ka Obedaya nwee ezigbo obi ike, bụ́ ihe dị ya ezigbo mkpa. O biri ndụ n’oge eze ọjọọ bụ́ Ehab na-achị. Ehab “mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova karịa ndị niile bu ya ụzọ.” (1 Eze 16:30) Nwunye Ehab bụ́ Jezibel na-efekwa Bel. Ọ kpọrọ Jehova asị nke na ọ gbalịrị ime ka mmadụ niile nọ n’alaeze ebe ugwu Izrel kwụsị ife Jehova. O gbudịrị ọtụtụ ndị amụma Chineke. (1 Eze 18:4) O doro anya na oge ahụ Obedaya fere Jehova bụ oge tara akpụ.

10. Olee otú Obedaya si gosi na o nwere ezigbo obi ike?

10 Olee otú Obedaya si gosi na o nwere ezigbo obi ike? Mgbe Jezibel malitere ịchọ ndị amụma Chineke ma na-egbu ha, Obedaya kpọọrọ otu narị ndị amụma ma zoo ha “n’ọgba, mmadụ iri ise mmadụ iri ise, na-enyekwa ha nri na mmiri.” (1 Eze 18:13, 14) A sị na a chọpụtara ihe a ọ katara obi mee, a gaara egbu ya. N’eziokwu, Obedaya bụ mmadụ. Ọ chọghịkwa ịnwụ. Ma, ọ hụrụ Jehova na ndị na-efe ya n’anya karịa onwe ya.

N’agbanyeghị na a machiri ozi ọma anyị iwu, otu nwanna nwoke ji obi ike na-ebugara ụmụnna anyị akwụkwọ e ji amụ Baịbụl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) c

11. Olee otú ndị ohu Jehova n’oge anyị a si eme ka Obedaya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Taa, ọtụtụ ndị na-efe Jehova bi n’obodo a machiri ozi ọma anyị iwu. Ha na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Ma, dịkwa ka Obedaya, ụmụnna anyị ndị a na-ewere ife Jehova ka ihe kacha mkpa. (Mat. 22:21) Ha na-erubere Chineke isi karịa mmadụ iji gosi na ha na-atụ egwu Chineke. (Ọrụ 5:29) Otú ha si eme ya bụ na ha anaghị ekwe akwụsị ikwusa ozi ọma na iji akọ agbakọta maka ọmụmụ ihe. (Mat. 10:16, 28) Ha na-agbasi mbọ ike ịhụ na ụmụnna ha nwetara ihe ndị dị ha mkpa ga-eme ka ha na Chineke na-adị ná mma. Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Henri. O bi n’otu obodo dị n’Afrịka, ebe a machiburu anyị ikwusa ozi ọma. N’oge ahụ, Henri wepụtara onwe ya ịna-ewegara ụmụnna akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. O dere, sị: “Abụ m onye ihere. Ma, ekwetasiri m ike na ọ bụ otú m si akwanyere Jehova ùgwù mere ka m nwee obi ike n’oge ahụ.” Ị̀ ga-enweli ụdị obi ike Henri nwere? Ị ga-enweli ya ma ọ bụrụ na ị na-atụ egwu Chineke.

DỊ KA JEHOYADA BỤ́ NNUKWU ONYE NCHỤÀJÀ, NA-ERUBERE CHINEKE ISI

12. Olee otú Jehoyada, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, na nwunye ya si gosi na ha na-erubere Jehova isi?

12 Jehoyada, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, tụrụ egwu Jehova. Egwu ahụ mere ka o rubere Jehova isi, meekwa ka ọ gbaa ndị ọzọ ume ịna-efe Jehova. Ihe a doro anya mgbe nwa Jezibel aha ya bụ Atalaya weghaara ọchịchị, ghọzie eze nwaanyị na Juda. E nwere ihe mere ndị mmadụ nwere ike iji na-atụ Atalaya ụjọ. Ọ dị obi ọjọọ. Ọ chọsikwara ike inweta ọchịchị, nke mere ka ọ gbalịa igbuchapụ ụmụ eze niile, ya bụ, ụmụ ụmụ ya. (2 Ihe 22:10, 11) Mana, o gbutalighị Jehoash, bụ́ otu n’ime ụmụ ụmụ ya, n’ihi na Jehoshabịat nwunye Jehoyada chebere ya. Ya na di ya zoro nwa ahụ ma lekọta ya. Jehoyada na Jehoshabịat si otú ahụ mee ka e nwee onye si n’agbụrụ Devid nwere ike ịbụ eze. Jehoyada rubeere Jehova isi. O kweghị ka ịtụ Atalaya ụjọ mee ka ọ ghara ime ihe dị mma.—Ilu 29:25.

13. Mgbe Jehoash gbara afọ asaa, olee ihe ọzọ Jehoyada mere gosiri na ọ na-erubere Chineke isi?

13 Mgbe Jehoash dị afọ asaa, Jehoyada mere ihe ọzọ gosiri na ọ na-erubere Jehova isi. Ọ kpara nkata. Nkata ahụ gazie, Jehoash, onye si n’agbụrụ Devid kwesịrị ịbụ eze, ga-aghọ eze. Mana, ọ kụọ afọ n’ala, e nwere ike igbu Jehoyada. Ma Jehova mere ka ọ gaa nke ọma. Ndị isi na ndị Livaị kwadoro Jehoyada, ya emee Jehoash eze ma gbuo Atalaya. (2 Ihe 23:1-5, 11, 12, 15; 24:1) Jehoyada “mekwara ka Jehova na eze na mmadụ niile gbaa ndụ na ha agaghị akwụsị ịbụ ndị Jehova.” (2 Eze 11:17) Jehoyada “dowekwara ndị nche ọnụ ụzọ ámá n’ọnụ ụzọ ámá ndị dị n’ụlọ Jehova, ka onye ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụzọ ọ bụla ghara ịbanye.”—2 Ihe 23:19.

14. Olee otú e si kwanyere Jehoyada ùgwù maka na ọ na-akwanyere Jehova ùgwù?

14 Jehova ebula ụzọ kwuo, sị: “Ọ bụ ndị na-akwanyere m ùgwù ka m ga-akwanyere ùgwù.” N’eziokwu, Jehova kwụrụ Jehoyada ụgwọ ihe o mere. (1 Sam. 2:30) Dị ka ihe atụ, o mere ka e dee ihe nnukwu onye nchụàjà a mere ka e jiri ya kụziere anyị ihe. (Rom 15:4) Mgbe Jehoyada nwụrụ, a kwanyeere ya ùgwù pụrụ iche, lie ya “n’Obodo Devid n’ebe a na-eli ndị eze, n’ihi na o mere ihe ọma n’Izrel n’ihe gbasara ezi Chineke na ụlọ nsọ ya.”—2 Ihe 24:15, 16.

Ka anyị na-eme ka Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà, na-atụ egwu Chineke ma na-enyere ụmụnna anyị aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15) d

15. Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Jehoyada? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Akụkọ Jehoyada ga-enyere anyị niile aka ịna-atụ egwu Jehova. Ndị okenye ọgbakọ kwesịkwara ịna-eme ka Jehoyada, na-achọ ụzọ ha ga-esi na-echebe atụrụ Chineke. (Ọrụ 20:28) Ihe ndị agadi ga-amụta n’aka Jehoyada bụ na ọ bụrụ na ha ana-atụ egwu Jehova ma na-erubere ya isi, o nwere ike iji ha emezu uche ya. Ọ gaghị ajụ ha. Ndị na-eto eto nwere ike ichebara otú Jehova si meso Jehoyada echiche ma gbalịa na-akwanyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ ùgwù ma na-asọpụrụ ha, karịchaa, ndị jeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ. (Ilu 16:31) Anyị niile ga-amụtakwa ihe n’aka ndị isi nakwa ndị Livaị ahụ kwadoro Jehoyada. Ka anyị na-erubere ‘ndị na-eduzi anyị’ isi, si otú ahụ na-akwado ha.—Hib. 13:17.

EMELA KA EZE JEHOASH

16. Olee ihe gosiri na Eze Jehoash akwụsighị ike n’ihe ziri ezi?

16 Jehoyada nyeere Eze Jehoash aka ịbụ ezigbo mmadụ. (2 Eze 12:2) Ihe a mere ka eze ahụ ka na-eto eto chọọ ime ihe dị Jehova mma. Ma, mgbe Jehoyada nwụrụ, Jehoash gewere ndị isi na-anaghị efe Jehova ntị. Gịnị ka ọ kpatara? O mere ka ya na ndị ọ na-achị “malite ife arụsị na ogwe osisi arụsị.” (2 Ihe 24:4, 17, 18) Ihe a gbawara Jehova obi, ya ‘ana-ezigara ha ndị amụma iji mee ka ha lọghachikwute ya. Ma ha egeghị ha ntị.’ Ha egeghịdị nwa Jehoyada bụ́ Zekaraya ntị. Zekaraya bụ onye amụma Jehova na onye nchụàjà, bụrụkwa nwa nwanne nna Jehoash. Jehoash nyere iwu ka e gbuo Zekaraya. N’eziokwu, ihe a o mere gosiri na e nweghị ihe o ji ihe ọma ezinụlọ Jehoyada meere ya kpọrọ.—2 Ihe 22:11; 24:19-22.

17. Olee otú ihe si gaara Jehoash?

17 Jehoash kwụsịrị ịtụ egwu Chineke. Ihe a ghọkwara ya ahịa. Jehova ebula ụzọ kwuo, sị: “M gaghị akwanyere ndị na-eleda m anya ùgwù.” (1 Sam. 2:30) Ndị agha Siria dị obere mechara merie “imirikitiimi ndị agha” Jehoash, ‘merụọkwa ya ezigbote ahụ́.’ Mgbe ndị Siria lara, ndị na-ejere Jehoash ozi gburu ya n’ihi na o gburu Zekaraya. Ndị mmadụ weere Eze Jehoash ka onye ọjọọ a na-ekwesịghị ili “ebe a na-eli ndị eze.”—2 Ihe 24:23-25.

18. Dị ka e kwuru na Jeremaya 17:7, 8, olee otú anyị ga-esi zere ime ka Jehoash?

18 Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Jehoash mere? Jehoash dị ka osisi na-agbanyesighị mgbọrọgwụ ike n’ala, nke e ji osisi dụgide ka ọ ghara ịda. Mgbe Jehoyada, bụ́ onye na-akwado Jehoash, nwụrụ, Jehoash egewekwa ndị kwụsịrị ife Jehova ntị, ọ kwụsịrị irubere Jehova isi. Ihe a gosiri na ihe mere anyị ji na-atụ egwu Chineke ekwesịghị ịbụ naanị maka àgwà ọma ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpa. Anyị chọọ ka anyị na Jehova na-adị ná mma, anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ya n’anya ma na-atụ egwu ya. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịna-amụchi ihe anya, ịna-atụgharị uche, na ịna-ekpe ekpere.—Gụọ Jeremaya 17:7, 8; Kọl. 2:6, 7.

19. Olee ihe Jehova chọrọ n’aka anyị?

19 Jehova anaghị agwa anyị mee ihe karịrị anyị. A chịkọtara ihe Jehova chọrọ n’aka anyị n’Ekliziastis 12:13, ebe sịrị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa iwu ya, n’ihi na ọ bụ ihe kacha mkpa mmadụ kwesịrị ime.” Ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Chineke, anyị ga na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ọ bụla mere n’ọdịnihu ma kwụsie ike ka Obedaya na Jehoyada. E nweghị ihe ga-eme ka anyị na Jehova kwụsị ịdị ná mma.

ABỤ NKE 3 Ị Bụ Ike Anyị, Olileanya Anyị, na Obi Ike Anyị

a Na Baịbụl, okwu bụ́ “egwu” nwere ọtụtụ ihe ọ pụtara. O nwere ike ịpụta ụjọ, nkwanye ùgwù, ma ọ bụ ihe ịtụ mmadụ n’anya. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmụta ụdị egwu ga-eme ka anyị na-akata obi ma jiri obi anyị niile na-ejere Nna anyị nke eluigwe ozi.

b Obedaya nke a dị iche n’Obedaya onye amụma. Obedaya onye amụma dịrị ndụ mgbe ọtụtụ afọ gachara. Ọ bụkwa ya dere akwụkwọ Baịbụl zara aha ya.

 

c NKỌWA FOTO: Foto a na-egosi ebe otu nwanna na-ebugara ụmụnna akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’oge a machiri ozi ọma anyị iwu.

d NKỌWA FOTO: Otu nwanna nwaanyị bụ́ nwa agbọghọ si n’aka nwanna nwaanyị ọzọ katarala ahụ́ na-amụta otú e si eji ekwentị ezi ozi ọma. Nwanna nwoke katarala ahụ́ ji obi ike na-ekwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, si otú ahụ na-egosi na o nwere obi ike; ebe otu nwanna ma otú e si arụzi ihe ndị mebiri n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-azụ ndị ọzọ.