AKỤKỌ NDỤ
Ihe Ndị Tụrụ Anyị n’Anya na Ihe Ndị Anyị Mụtara n’Ife Jehova
MGBE m bụ nwata, m hụ ka ụgbọelu na-efefe, ọ na-agụsi m agụụ ike ịba ụgbọelu gaa obodo ọzọ. Ihe ahụ yiri m ihe na-agaghị ekwe omume.
Mama m na papa m si Estonia kwaga Jamanị n’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. N’ebe ahụ ka a nọ mụọ m. Mgbe a mụchara m, ha jikewere ịkwaga Kanada. Mgbe anyị kwagara Kanada, ebe mbụ anyị biri bụ obere ụlọ a na-anọkwa azụ ọkụkọ. Ọ dị nso n’Ọtawa. Anyị ahụdịghị tụrụ rachaa. Mana, ma é nweghị ihe ọzọ, anyị na-ahụ àkwá anyị na-ata n’ụtụtụ.
Otu ụbọchị, Ndịàmà Jehova gụụrụ mama m Mkpughe 21:3, 4. Ihe ọ nụrụ tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya amalite ibe ákwá. Mama m na papa m nọgidere na-amụ Baịbụl. O teghịkwa aka, ha adị njikere ka e mee ha baptizim.
Mama m na papa m amachaghị Bekee, ma ha ji eziokwu ha na-amụta kpọrọ ihe. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ Satọdee ọ bụla, papa m na-akpọrọ mụ na nwanne m nwaanyị nke m tọrọ aha ya bụ Sylvia na-aga ozi ọma, ma mgbe ọ rụrụ ọrụ abalị Fraịdee niile n’ebe a na-agbaze ígwè na Sọdberi, dị n’Ọnterio. Izu ọ bụla kwa, ezinụlọ anyị niile na-amụkọ Ụlọ Nche ọnụ. Mama m na papa m kụziiri m ịhụ Jehova n’anya. O mere ka m nyefee Jehova onwe m n’afọ 1956, mgbe m dị afọ iri. Otú ha si hụ Jehova n’anya emeela ka m nọsie ike n’ofufe Jehova.
Mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ejighịzi m ife Jehova kpọrọ ezigbo ihe. M bịara chewe na ọ bụrụ na mụ amalite ịsụ ụzọ, agaghị m enweta ego ga-ezuru m ime ihe na-agụ m kemgbe ụwa, nke bụ́ iji ụgbọelu gaa ebe dị iche iche n’ụwa. M chọtara ọrụ n’otu ụlọ ọrụ redio. M nọ na-akpọrọ ha egwú ebe ahụ. Ọrụ ahụ na-atọgbukwa m atọgbu. Ma, m na-arụ ọrụ ná mgbede. N’ihi ya, anaghị m agakarị ọmụmụ ihe, mụ na ndị na-anaghị efe Chineke na-akpakọrịtakwa. Ma, akọnuche m e ji Baịbụl zụọ mechara mee ka m gbanwee ndụ m.
M kwagara Ọshawa, dị n’Ọnterio. N’ebe ahụ, m hụrụ Nwanna Ray Norman, nwanne ya nwaanyị Lesli, na ndị ọsụ ụzọ oge niile ndị ọzọ. Ha niile mere ka ahụ́ ruo m ala. Ịhụ otú obi si na-atọ ha ụtọ nyeere m aka ichebara ihe m ji ndụ m eme echiche. Ha gbara m ume ka m malite ịsụ ụzọ. M malitere ịsụ ụzọ na Septemba afọ 1966. Obi dị m ezigbo ụtọ, ihe niile nọkwa na-aga nke ọma. Ma, ihe ụfọdụ ga-agbanwe ndụ m m na-atụghị anya ha ka ga-eme.
Ọ BỤRỤ NA JEHOVA ASỊ GỊ MEE IHE, GBALỊA MEE YA
Mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m tinyere akwụkwọ ije ozi na Betel dị na Toronto, Kanada. Mgbe m mechara sụwa ụzọ, a kpọrọ m ka
m bịa jee ozi ebe ahụ afọ anọ. Ma, ihe Lesli masịrị m nke ukwuu. Ụjọ tụkwara m na ọ bụrụ na mụ agawa Betel, agaghịzi m ahụ ya anya ọzọ. Mgbe m kpechara ekpere si m n’obi ruo ogologo oge, m mechara kweta ịga Betel. Ma, obi adịghị m mma na m na-ahapụ Lesli.M rụrụ ọrụ n’ebe a na-asụ ákwà na Betel, mechaakwa ghọọ odeakwụkwọ. Ma, Lesli ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche na Gatino dị na Kwebek. Ọ na-abụ m nọrọ, mụ ana-eche ihe ọ na-eme, nakwa ma ihe m kpebiri ime ọ̀ dị mma. Otu ụbọchị, otu n’ime ihe ndị kacha tọọ m ụtọ nke tụrụ m n’anya mere ná ndụ m. A kpọrọ Ray nwanne Lesli ka ọ bịa jewe ozi na Betel, mụ na ya ebirikwa n’otu ọnụ ụlọ. Ihe ahụ mere ka mụ na Lesli na-akparịtakwa ọzọ. Anyị gbara akwụkwọ n’ụbọchị afọ anọ ahụ m rụrụ ọrụ na Betel kụụrụ ọnụ, ya bụ, n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa Febụwarị, afọ 1971.
E zigara mụ na Lesli nwunye m ka anyị gaa jewe ozi n’ọgbakọ na-eji French amụ ihe na Kwebek. Mgbe afọ ole na ole gachara, o juru m anya na a gwara m ka m ghọọ onye nlekọta sekit mgbe m dị afọ iri abụọ na asatọ. M chere na etorubeghị m, nakwa na amaghị m otú m ga-esi arụ ya. Ma, ihe e dere na Jeremaya 1:7, 8 gbara m ume. Nwunye m enweela ihe mberede okporo ụzọ ugboro ugboro. Ihi ụra na-esikwara ya ike. Oleekwanụ otú anyị ga-esi arụ ọrụ sekit a? Ma, nwunye m sịrị m, “Ọ bụrụ na Jehova asị anyị mee ihe, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalị mee ya?” Anyị kwetara ịrụ ọrụ ahụ. Obi dịkwa anyị ụtọ n’ime afọ iri na asaa anyị rụrụ ya.
Mgbe m bụ onye nlekọta sekit, e nwere ọtụtụ ọrụ m na-arụ. Ọ bụghịkwa mgbe niile ka m na-ewepụtara nwunye m ezigbo oge. E nwere ihe ọzọ m mụtara. N’isi ụtụtụ otu Mọnde, a kụrụ aka n’ụlọ anyị. Mgbe m mepere ụzọ, e nweghị onye m hụrụ. Naanị ihe m hụrụ bụ nkata e tinyere ákwà tebụl, mkpụrụ osisi, chiiz, bred, otu karama mmanya, iko, na ihe e dere n’akwụkwọ a na-edeghị aha onye dere ya. Ihe e dere na ya bụ, “Kpọrọ nwunye gị gaa mkpapụ.” Ụbọchị ahụ mara ezigbo mma n’ihi otú ihu eluigwe dị. Ma m kọwaara nwunye m na m nwere okwu m ga-akwadebe n’ụbọchị ahụ, nakwa na agaghị m agali. Ọ ghọtara ihe m kwuru. Ma, obi adịchaghị ya mma. Ka m nọọrọ ọdụ n’oche m, akọnuche m bidoro pịawa m ụtarị. M chere gbasara ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:25, 28. M weere ebe ahụ ka otú Jehova si na-agwa m ka m na-eche ihe ga-eme nwunye m obi ụtọ. Mgbe m kpechara ekpere, m sịrị nwunye m, “Ka anyị gaa.” Ọ tọgburu ya atọgbu. Anyị ji ụgbọala anyị gaa n’otu ebe n’akụkụ mmiri, tọọ ákwà tebụl n’ala, mụ na ya anọrịakwa. Ụbọchị ahụ so n’ụbọchị kacha tọgbuo anyị atọgbuo mụ na ya nọrịrị. M ka mechakwara kwadebe okwu m.
Sekit ndị anyị jere ozi na ha tọrọ anyị ụtọ, dịkwa ọtụtụ, malite na British Kolombia ruo na Niufaụndland. Ugbu a, m na-agazi ebe dị iche iche, bụ́ ihe na-agụ m agụụ kemgbe ụwa. E nweela mgbe
m chọburu itinye akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied, mana etinyeghị m n’ihi na achọghị m ịga mba ọzọ. Ọ dị m ka ndị ozi ala ọzọ bụ ndị pụrụ iche. Echeghị m na m ruru eru. Ihe ọzọkwa bụ na ụjọ nọ na-atụ m na a ga-eziga anyị n’otu obodo dị n’Afrịka ebe agha dị ma ọ bụkwanụ ebe m ga-ebute ọrịa. Obi dị m ụtọ n’ebe m nọ eje ozi.O JURU ANYỊ ANYA NA A KPỌRỌ ANYỊ KA ANYỊ GAA ESTONIA, LATVIA, NA LITUENIA
N’afọ 1992, Ndịàmà Jehova nweziri ike ikwusara ndị mmadụ ozi ọma ọzọ n’ụfọdụ obodo ndị sobu na Sọviet Yuniọn. N’ihi ya, a jụrụ anyị ma ànyị ga-achọ ịga bụrụ ndị ozi ala ọzọ n’Estonia. O juru anyị anya. Ma anyị kpere ekpere gbasara ya. Anyị sịkwara, ‘Ọ bụrụ na Jehova gwara anyị mee ihe, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbalị mee ya?’ Anyị kwetara ịga. Obi dịkwa m ụtọ na ọ bụghị Afrịka ka e zigara anyị.
Anyị malitere ịmụ asụsụ Estonia ozugbo. Mgbe anyị nọrọ obodo ahụ ọnwa ole na ole, e zigara anyị ọrụ sekit. Anyị ga na-eleta ọgbakọ iri anọ na isii, obere ìgwè ndị dị n’Estonia, Latvia, na Lituenia, nakwa ndị dị na Kaliningrad dị na Rọshịa. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-agbalị mụtatụ asụsụ Latvian, Lituenian, na Rọshịan. O siiri anyị ike. Ma, mbọ anyị na-agba ịmụta asụsụ ndị ahụ na-atọgbu ụmụnna anyị atọgbu, ha nyekwaara anyị aka. N’afọ 1999, e mepere alaka ụlọ ọrụ n’Estonia. A gwakwara m ka m gaa soro na Kọmitii Alaka ha, mụ na Nwanna Toomas Edur, Nwanna Lembit Reile, nakwa Nwanna Tommi Kauko.
Anyị matara ọtụtụ ụmụnna ndị e sibu Sọviet Yuniọn buga Saịberịa. N’agbanyeghị otú e si mekpọọ ha ọnụ n’ụlọ mkpọrọ nakwa na ha na ndị ezinụlọ ha anọghị, ọsụkọsụ nwa mkpi anọghị na-asụgbu ha. Ha ka ji obi ụtọ na-ekwusasi ozi ọma ike. Ihe a ha mere kụziiri anyị na anyị ka nwere ike iji obi ụtọ na-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị.
Anyị rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ. Anyị enweghị oge buru ibu anyị ji zuo ike, ya emee ka ezigbo ike na-agwụ nwunye m. Anyị amataghị ozugbo na ọ bụ n’ihi na e nwere ọrịa ọ na-arịa na-eme ka ezigbo ike na-agwụ ya. Anyị nọ na-echesi echiche ike ịlaghachi Kanada. Ma, a kpọrọ anyị ka anyị gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Kọmitii Alaka na Nwunye Ha na Patasịn dị na Niu Yọk dị n’Amerịka. Echeghị m na anyị ga-agali. Ma, mgbe anyị kpesichara ekpere ike, anyị kwetara ịga. Jehova gọzikwara ihe ahụ anyị kpebiri. Ọ bụzi mgbe anyị gara ụlọ akwụkwọ ahụ ka a chọpụtara ihe na-arịa nwunye m ma gwọọ ya. Anyị mechakwara malite ozi anyị otú anyị na-emebu.
IHE ỌZỌ JURU ANYỊ ANYA BỤ IJEWE OZI NÁ MPAGHARA ỤWA ỌZỌ
N’otu mgbede n’afọ 2008 mgbe anyị nọ n’Estonia, e si n’isi ụlọ ọrụ anyị kpọọ m n’ekwentị, jụọ m ma ànyị ga-achọ ịga jewe ozi na Kongo. O juru m anya, karịchaa, mgbe m chọpụtara na m kwesịrị ịzaghachi ha n’echi ya. Na mbụ, agwaghị m nwunye m n’ihi na m ma na ọ gaghị ekwe ya hie ụra n’abalị ahụ. Ma, ọ bụzi mụnwa bụ onye na-ehighị ụra abalị. M nọ na-ekpe ekpere banyere ihe ndị na-echu m ụra gbasara Afrịka.
N’echi ya, mgbe m gwara nwunye m gbasara ya, anyị chere, sị: “Jehova na-agwa anyị gaa Afrịka. Ọ bụrụ na anyị agaghị, olee otú anyị ga-esi mara na
anyị agaghị emeli ya, nakwa na ọ gaghị atọ anyị ụtọ?” Anyị baziri ụgbọelu gawa Kinshasa dị na Kongo. Anyị anọọla n’Estonia ihe dị ka afọ iri na isii n’oge ahụ. Ọmarịcha okooko osisi ndị a kụrụ n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kongo mere ka ọ maa ezigbo mma ma dị jụụ. Otu n’ime ihe ndị mbụ nwunye m tinyere n’ime ụlọ anyị bụ kaadị o ji si na Kanada pụta. Ihe e dere na ya bụ “Na-enwe obi ụtọ n’ebe ọ bụla ị nọ.” Mgbe anyị rutere n’obodo ahụ, mata ụmụnna anyị, bidokwa ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl, ma hụ otú ije ozi ala ọzọ si atọ ka mmanụ aṅụ, obi bịara bụrụ anyị sọ aṅụrị. Ka oge na-aga, isi ụlọ ọrụ anyị zigara anyị ka anyị gaa leta mba iri na atọ ndị ọzọ dị n’Afrịka. O mere ka anyị mata ụdị ndị dị iche iche e nwere n’Afrịka, nakwa àgwà ọma ndị ha nwere. M kwụsịrị ịtụ ụjọ Afrịka. Obi dịkwa anyị ụtọ na Jehova zigara anyị ka anyị gaa jee ozi n’Afrịka.Na Kongo, e nweghị ụdị ihe a na-enyeghị anyị ka anyị rie, ma ndị dị ka ụmụ ahụhụ. M chekwara na anyị agaghị erili ya. Ma, mgbe anyị hụrụ ebe ụmụnna anyị na-eri ya, ya ana-atọ ha, anyị riri ya, ọ tọkwara anyị ụtọ.
Anyị gara n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo ahụ ịga gbaa ụmụnna anyị ume, wegakwara ha ihe ndị dị ha mkpa. Ndị ọlụọ ọgbalaga na-akpa ike n’obodo ndị dị n’ebe ahụ, na-emerụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka ahụ́. Ọtụtụ ụmụnna anyị ebe ahụ dara ogbenye. Ma, ihe gbara anyị ume bụ na okwukwe ha siri ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha hụrụ Jehova n’anya, ha ejighịkwa ọgbakọ ya egwu egwu. O mere ka anyị chee echiche gbasara ihe mere anyị ji efe Jehova, meekwa ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. Ndị ọlụọ ọgbalaga ahụ mere ka ụfọdụ ụmụnna anyị gharazie inwe ụlọ, mebisịakwa ihe ndị ha kụrụ n’ubi. O chetaara m na ihe ndị anyị nwere nwere ike ifu n’otu ntabi anya, nakwa na ihe kacha mkpa bụ adịm ná mma anyị na Jehova. N’agbanyeghị otú ihe si siere ụmụnna anyị ndị a ike, ha anọghị na-atamu ntamu. Otú obi si adị ha mma gbara anyị ume, meekwa ka anyị nwee obi ike mgbe nsogbu bịaara anyị nakwa mgbe anyị na-arịa ọrịa.
E ZIGARA ANYỊ ESHIA
Ihe ọzọ juru anyị anya mere. E zigara anyị n’alaka ụlọ ọrụ dị na Họng Kọng. E nwetụbeghị mgbe anyị chere echiche ibi n’Eshia. Ma, mgbe anyị hụrụ otú Jehova si na-enyere anyị aka n’ebe ndị ọzọ niile anyị
jere ozi, anyị kwetara ịga. N’afọ 2013, o wutere anyị na anyị hapụrụ ụmụnna anyị na ọmarịcha ihe ndị dị n’Afrịka. Anyị amaghị otú ihe ga-adịrị anyị n’ebe ọhụrụ anyị na-aga.Họng Kọng bụ obodo na-ekwo ekwo n’ihi na ndị si ebe dị iche iche n’ụwa bi na ya. Anyị ebitụbeghị ụdị ebe ahụ. Ịmụta asụsụ Chaịniiz sikwaara anyị ike. Ma, ụmụnna anyị ji obi ha niile nabata anyị. Nri ha tọkwara anyị ụtọ. Ọrụ a na-arụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ bịara na-ebukwu ibu, ego ala na ụlọ ana-agbagokwa n’ike n’ike. N’ihi ya, Òtù Na-achị Isi kpebiri ire ọtụtụ ala na ụlọ alaka ụlọ ọrụ ahụ nwere. Mgbe obere oge gachara, n’afọ 2015, e zigara anyị Saụt Koria, bụ́ ebe anyị ka nọ na-eje ozi. N’ebe a kwa, o siiri anyị ike ịmụta asụsụ ha. Ma, obi dị anyị ụtọ na n’agbanyeghị na anyị amụtachabeghị asụsụ ha, ụmụnna anyị na-agwa anyị na anyị na-agbalị ịmụta asụsụ ha.
IHE NDỊ ANYỊ MỤTARA
Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adị mfe imeta ndị enyi ọhụrụ. Ma, anyị achọpụtala na ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka anyị na ha nọrịa na-eme ka anyị mata ha ngwa ngwa. Anyị ahụkwala na ebe àgwà ụmụnna anyị yiri karịrị ebe àgwà ha dị iche, nakwa na Jehova kere anyị ka anyị nwee ike imeta ọtụtụ ndị enyi ma hụ ha n’anya.—2 Kọr. 6:11.
Anyị ahụla na ọ dị mkpa ka anyị nabata ndị ọzọ otú Jehova nabatara ha nakwa ka anyị na-achọpụta ihe gosiri na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-eduzikwa anyị. Mgbe ọ bụla ike gwụrụ anyị ma ọ bụkwanụ anyị ana-eche ma ndị ọzọ hà hụkwara anyị n’anya, anyị na-agụgharị kaadị na akwụkwọ ozi ụfọdụ ndị enyi anyị ziteere anyị. Jehova na-aza ekpere anyị, na-eme ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya, na-emekwa ka anyị nọsie ike n’ozi ya.
Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na Lesli nwunye m amụtala na ọ bara uru ịna-ewepụtara ibe anyị oge n’agbanyeghị otú anyị si jiri ọrụ n’aka. Anyị aghọtakwala na ọ dị mkpa ịna-achị onwe anyị ọchị ma anyị mejọọ ihe, karịchaa ma anyị na-amụ asụsụ ọhụrụ. N’abalị ọ bụla, anyị na-agbalị ịchọpụta otu ihe tọrọ anyị ụtọ anyị ga-ekele Jehova maka ya.
N’eziokwu, m cheburu na agaghị m abụli onye ozi ala ọzọ ma ọ bụ biri n’obodo ọzọ. Ma, ahụla m otú Jehova si eme ka ihe niile kwe omume. Ọ na-emekwa m obi ụtọ. M na-echeta ihe Jeremaya onye amụma kwuru. Ọ sịrị: “Jehova, i meela ihe tụrụ m n’anya.” (Jere. 20:7) N’eziokwu, o meela ọtụtụ ihe tụrụ anyị n’anya, tọọkwa anyị ụtọ. O sikwala n’ọtụtụ ụzọ anyị na-atụghị anya ya gọzie anyị. O mekwara ka m jiri ụgbọelu gaa ebe dị iche iche, bụ́ ihe na-agụ m agụụ kemgbe m bụ nwata. Ebe ndị anyị jirila ụgbọelu gaa karịrị ebe ndị m chere n’echiche mgbe m bụ nwata. Isi ụlọ ọrụ anyị ezigakwala anyị ka anyị gaa leta alaka ụlọ ọrụ dị n’ọtụtụ mba. Obi dị m ezigbo ụtọ na Lesli nwunye m kwadoro m n’ozi niile anyị jere.
Anyị na-echetara onwe anyị mgbe niile onye anyị na-ejere ozi a na ihe mere anyị ji na-eje ya. Ihe ọma niile meerela anyị taa na-egosi otú ịdị ndụ ebighị ebi ga-esi magbuo onwe ya mgbe Jehova ‘ga-asaghe aka ya, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.’—Ọma 145:16.