ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 24
ABỤ NKE 24 Bịanụ n’Ugwu Jehova
Bụrụ Onye Ọbịa Jehova Ruo Mgbe Ebighị Ebi
“Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?”—ỌMA 15:1.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-eleba anya n’ihe anyị ga-eme ka anyị na Jehova na-abụ enyi nakwa otú ọ chọrọ ka anyị si na-emeso ndị enyi ya.
1. Olee uru ịtụle Abụ Ọma 15:1-5 ga-abara anyị?
N’ISIOKWU bu nke a ụzọ, anyị mụtara na anyị ga-abụli ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova ma anyị nyefee ya onwe anyị, anyị na ya abụrụkwa ezigbo enyi. Ma, olee ihe anyị ga-eme ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi? E nwere ọtụtụ ihe Abụ Ọma nke 15 kwuru gbasara ya. (Gụọ Abụ Ọma 15:1-5.) Abụ ọma a kwuru ihe ndị bara uru ga-enyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso.
2. Gịnị nwere ike ịbụ ihe Devid nọ na-eche mgbe o kwuru gbasara ụlọikwuu Jehova?
2 Ihe Abụ Ọma nke 15 ji malite bụ ajụjụ bụ́: “Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị? Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?” (Ọma 15:1) Mgbe Devid kwuru gbasara “ụlọikwuu” Jehova, ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche gbasara ụlọikwuu ahụ Mosis rụrụ a na-anọ efe Jehova, nke dị na Gibiọn ruo oge ụfọdụ. Devid kwukwara gbasara “ugwu nsọ” Chineke. O nwere ike ịbụ Ugwu Zayọn nke dị na Jeruselem. Ebe ahụ dị ihe dị ka kilomita ole na ole n’ebe ndịda Gibiọn. N’ebe ahụ ka Devid rụrụ ụlọikwuu ma tinye igbe ọgbụgba ndụ Jehova ruo mgbe a ga-arụ ụlọ nsọ.—2 Sam. 6:17.
3. Gịnị mere Abụ Ọma nke 15 kwesịrị iji masị anyị? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
3 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị Izrel enweghị mgbe ha jere ozi n’ụlọikwuu ahụ, ma ya fọdụzie ịba n’ime ebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Ma, ndị niile ji obi ha na-efe Jehova nwere ike ịbụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ihe atụ ya ma ha bụrụ ndị enyi ya, gharakwa ịkwụsị ịbụ ndị enyi ya. Ihe a bụ ihe anyị niile chọsiri ike. Abụ Ọma nke 15 kwuru ụfọdụ àgwà anyị kwesịrị ịmụta ma na-akpa ka anyị ghara ịkwụsị ịbụ ndị enyi Jehova.
BỤRỤ ONYE NA-ENWEGHỊ IHE A GA-EJI TAA YA ỤTA, ONYE NA-EME EZI IHE
4. Olee otú anyị si mara na ime baptizim abụghị naanị ihe Jehova chọrọ n’aka anyị? (Aịzaya 48:1)
4 N’Abụ Ọma 15:2, e kwuru na enyi Jehova bụ “onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta, onye na-eme ezi ihe.” Otú e si kwuo ya gosiri na ọ bụ ihe mmadụ ga na-eme mgbe niile. Ma, ànyị ga-abụli ndị ‘na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta?’ Ee. Ọ bụ eziokwu na e nweghị mmadụ zuru okè, ma Jehova na-ewere anyị ka ndị ‘na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta’ ma anyị na-eme ike anyị niile irubere ya isi. Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị ma mee baptizim, anyị malitere iso Chineke na-aga ije. Chetakwa na n’oge a na-ede Baịbụl, naanị ịbụ onye Izrel apụtaghị na mmadụ ruru eru ịbụ ọbịa Jehova. Ụfọdụ ndị na-efe ya, mana “o sighị ha n’obi. Ha anaghịkwa eme ezi omume.” (Gụọ Aịzaya 48:1.) Onye Izrel chọọ n’eziokwu ịbụ ọbịa Jehova, ọ ga na-amụ iwu Jehova ma na-edebe ya. Anyịnwa chọọkwa ka ihe anyị dị Chineke mma taa, ihe dị mkpa abụghị naanị ime baptizim na ịbụ Ndịàmà Jehova. Anyị kwesịrị ‘ịna-eme ezi ihe.’ Olee otú anyị nwere ike isi eme ya?
5. Gịnị ka irubere Jehova isi n’ihe niile pụtara?
5 N’anya Jehova, ịbụ “onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta” na ịbụ “onye na-eme ezi ihe” apụtaghị naanị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. (1 Sam. 15:22) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-erubere Jehova isi n’ihe niile anyị na-eme, ma mgbe anyị nọ naanị anyị. (Ilu 3:6; Ekli. 12:) Ọ dị mkpa ka anyị na-agbalịsi ike na-erubere Jehova isi ma n’ihe ndị nwere ike iyi obere ihe. Ime otú ahụ ga-egosi na anyị hụrụ ya n’anya n’eziokwu. Ọ ga-emekwa ka ọ hụkwuo anyị n’anya.— 13, 14Jọn 14:23; 1 Jọn 5:3.
6. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 6:10-12, olee ihe dị mkpa karịa ihe ọma ndị anyị mere n’oge gara aga?
6 Jehova ji ihe anyị meere ya n’oge gara aga kpọrọ ezigbo ihe. Ma, naanị na anyị mere ihe ndị dị mma n’oge gara aga apụtaghị na anyị ga-abụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova. E mere ka o doo anya ná Ndị Hibru 6:10-12. (Gụọ ya.) Jehova anaghị echefu ihe ọma ndị anyị mere n’oge gara aga. Ma, ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-efe ya “ruo ọgwụgwụ.” Ọ ga-abụ Enyi anyị ruo mgbe ebighị ebi “ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.”—Gal. 6:9.
NA-EKWU EZIOKWU N’OBI GỊ
7. Gịnị ka ikwu eziokwu n’ime obi anyị pụtara?
7 Onye chọrọ ịbụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova kwesịrị ‘ịna-ekwu eziokwu n’obi ya.’ (Ọma 15:2) Ihe ọ pụtara abụghị naanị na anyị agaghị na-agha ụgha. Jehova chọrọ ka anyị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile. (Hib. 13:18) Ihe a dị mkpa “n’ihi na Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị, ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.”—Ilu 3:32.
8. Olee àgwà anyị kwesịrị izere?
8 Ndị na-ekwu ‘eziokwu n’obi ha’ anaghị eme ka hà na-erubere Chineke isi n’ihu mmadụ ma na-emebi iwu ya na nzuzo. (Aịza. 29:13) Ha na-ezere ịghọ aghụghọ. Onye aghụghọ nwere ike ịna-eche na iwu Jehova anaghị aba uru mgbe niile. (Jems 1:5-8) O nwere ike ịna-enupụrụ Jehova isi n’ihe ndị yiri ya obere ihe. Ọ bụrụ na o yie ka o nweghị ahụhụ ọ tara maka inupụrụ iwu Jehova isi, o nweziri ike imewe nke ka njọ. Ọ bụ eziokwu na o chere na ọ na-efe Jehova, mana Jehova agaghị anabata ofufe ya. (Ekli. 8:11) Ma, anyị chọrọ ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.
9. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere n’oge mbụ Jizọs na Nataniel hụrụ? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
9 Anyị nwere ike ịmụta uru ikwu eziokwu n’obi anyị na-aba n’ihe mere n’oge mbụ Jizọs na Nataniel hụrụ. Mgbe Filip kpọ enyi ya bụ́ Nataniel bịa ka ọ hụ Jizọs, e nwere ihe pụrụ iche merenụ. Ọ bụ eziokwu na Jizọs na Nataniel ahụtụbeghị, ma Jizọs kwuru gbasara ya, sị: “Lee ezigbo onye Izrel, onye na-anaghị aghọ aghụghọ.” (Jọn 1:47) N’eziokwu, Jizọs weere ndị ọzọ na-eso ụzọ ya ka ndị na-ekwu eziokwu, mana, ihe ọ chọpụtara gbasara Nataniel pụrụ ezigbo iche. Nataniel bụkwa mmadụ na-ezughị okè ka anyị. Ma, ọ naghị eme ihu abụọ. Kama, ọ na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile ọ na-eme. Ihe a masịrị Jizọs, ya ajaa Nataniel mma maka ya. Obi ga-atọgbu anyị atọgbu ma Jizọs kwuo ụdị ihe ahụ gbasara anyị.
10. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya gbasara ihe anyị na-ekwu? (Jems 1:26)
10 Ọtụtụ n’ime ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke 15 gbasara otú anyị si emeso ndị ọzọ. Abụ Ọma 15:3 kwuru na onye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova ‘anaghị ekwutọ mmadụ. Ọ naghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ, ọ naghịkwa ekwujọ ndị enyi ya.’ Anyị kwuo ụdị okwu ndị ahụ na-adịghị mma, o nwere ike ịkpatara ndị ọzọ ezigbo nsogbu, meekwa ka anyị kwụsị ịbụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu Jehova.—Gụọ Jems 1:26.
11. Gịnị bụ ikwutọ mmadụ? Gịnị ka a na-eme ndị nkwutọ na-ekweghị echegharị?
11 N’abụ ọma a, Devid kwuru gbasara ikwutọ mmadụ. Gịnị bụ ikwutọ mmadụ? Ọ bụ ikwu ihe ndị na-abụghị eziokwu nwere ike imebi aha mmadụ. A na-achụpụ ndị na-ekwutọ mmadụ n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha ekweghị echegharị.—Jere. 17:10.
12-13. Olee mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ikwujọ ndị enyi anyị n’amaghị ama? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
12 Abụ Ọma 15:3 chetakwaara anyị na ndị ọbịa Jehova anaghị eme ndị agbata obi ha ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ na-ekwujọ ndị enyi ha. Olee otú anyị nwere ike isi kwujọọ ndị enyi anyị?
13 Anyị nwere ike ikwujọ mmadụ n’amaghị ama ma anyị na-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara ya. Dị ka ihe atụ: (1) otu nwanna nwaanyị kwụsịrị ịsụ ụzọ, (2) otu di na nwunye anaghịzi eje ozi na Betel, ma ọ bụkwanụ (3) otu nwanna nwoke abụghịzi okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Ọ̀ ga-adị mma ka anyị na-ekwu ihe anyị chere mere ihe ndị a ji mee ha ma na-agwa ya ndị ọzọ? E nwere ike inwe ihe ndị kpatara ya anyị na-amaghị. Ihe ọzọkwa bụ na onye bụ́ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova ‘anaghị ekwujọ ndị enyi ya.’
NA-AKWANYERE NDỊ NA-ATỤ EGWU JEHOVA ÙGWÙ
14. Kọwaa otú ndị enyi Jehova si ajụ “onye ọ bụla na-abaghị uru.”
14 Abụ Ọma 15:4 kwuru na ndị enyi Jehova ‘anaghị anabata onye ọ bụla na-abaghị uru.’ Olee otú anyị si ama na mmadụ bụ onye na-abaghị uru? Ebe anyị bụ mmadụ na-ezughị okè, anyị erughị eru ikwu na mmadụ bụ onye na-abaghị uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na àgwà ụfọdụ ndị nwere ike ime ka anyị na ha bụrụ enyi, e nweekwa ndị àgwà ha na-akpasu anyị iwe. N’ihi ya, ndị anyị kwesịrị izere bụ naanị ndị Jehova kwuru na ha bụ ndị “na-abaghị uru.” (1 Kọr. 5:11) Ha bụ ndị na-eme ihe ọjọọ na-ekweghị echegharị, ndị na-anaghị akwanyere ihe anyị kweere ùgwù, ma ọ bụ ndị na-agbalị ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma.—Ilu 13:20.
15. Olee otu ụzọ anyị si akwanyere “ndị na-atụ egwu Jehova ùgwù”?
15 Ihe ọzọ Abụ Ọma 15:4 kwuru bụ na anyị kwesịrị ‘ịna-akwanyere ndị na-atụ egwu Jehova ùgwù.’ N’ihi ya, anyị na-achọta ụzọ ndị anyị ga-esi na-egosi ndị enyi Jehova obiọma ma na-akwanyere ha ùgwù. (Rom 12:10) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Otu ụzọ e kwuru n’Abụ Ọma 15:4 bụ na onye bụ́ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova “na-emezu nkwa o kwere, ọ bụrụgodị na imezu ya ga-akpa ya aka ọjọọ.” Ọ bụrụ na anyị emezughị nkwa anyị kwere, o nwere ike iwute ndị ọzọ. (Mat. 5:37) Dị ka ihe atụ, Jehova chọrọ ka anyị na-emezu nkwa anyị kwere di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’ụbọchị anyị gbara akwụkwọ. Obi na-atọkwa ya ụtọ ma ọ bụrụ na ndị nne na nna ana-agbalịsi ike imezu nkwa ha kwere ụmụ ha. Otú anyị si hụ Jehova na ndị ọzọ n’anya ga-eme ka anyị na-agbalịsi ike na-emezu nkwa anyị.
16. Olee ụzọ ọzọ anyị si akwanyere ndị enyi Jehova ùgwù?
16 Ụzọ ọzọ anyị si akwanyere ndị enyi Jehova ùgwù bụ ịna-ele ha ọbịa na ịna-emesapụrụ ha aka. (Rom 12:13) Ọ bụrụ na anyị ana-ewepụta oge ka anyị na ụmụnna anyị nọrịa, o nwere ike ime ka anyị na ha nakwa Jehova na-adịkwu ná mma. Anyị leekwa ha ọbịa, anyị na-eme ka Jehova.
AHỤKWALA EGO N’ANYA
17. Gịnị mere e ji kwute okwu ego n’Abụ Ọma nke 15?
17 Baịbụl kwuru na onye bụ́ ọbịa n’ụlọikwuu Jehova “anaghị ana ọmụrụ nwa ma ọ gbazinye mmadụ ego, ọ naghịkwa ana aka azụ ka e megbuo onye aka ya dị ọcha.” (Ọma 15:5) Gịnị mere e ji kwute okwu ego n’amaokwu a? Ọ bụ n’ihi na ọ bụrụ na anyị anaghị ele ego anya otú kwesịrị ekwesị, o nwere ike ime ka anyị mejọọ ndị mmadụ, meekwa ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (1 Tim. 6:10) N’oge a na-ede Baịbụl, ụfọdụ ndị na-erigbu ụmụnne ha dara ogbenye, na-ana ha ọmụrụ nwa ma ha gbazinye ha ego. Ụfọdụ ndị ikpe na-anara aka azụ, na-ekpe ndị aka ha dị ọcha ikpe mkpegbu. Ime ụdị ihe a na-ewe Jehova iwe.—Ezik. 22:12.
18. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị iji chọpụta otú anyị si ele ego anya? (Ndị Hibru 13:5)
18 Ọ dị mma ka anyị na-echebara otú anyị si ele ego anya echiche. Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-echekarị gbasara ego na ihe a ga-eji ego azụ? Ọ bụrụ na mụ agbaziri ego, m̀ na-egbu oge ịkwụghachi ya, na-ekwu na ego ahụ adịghị onye gbazinyere m ya mkpa? Inwe ego ọ̀ na-eme ka m chee na m bara uru ma na-eme ka o siere m ike imesapụrụ ndị mmadụ aka? M̀ na-ewere ụmụnna m ka ndị hụrụ ego n’anya naanị n’ihi na ha nwere ego? M̀ na-achọkarị ka mụ na ndị bara ọgaranya bụrụ enyi ma na-eze ndị dara ogbenye eze?’ Ọ bụ nnukwu ihe ọma meere anyị na anyị nwere ohere ịbụ ndị ọbịa Jehova. Anyị nwere ike ịna-abụ ndị ọbịa Jehova ma ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ghara ịhụ ego n’anya. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, Jehova agaghị ahapụ anyị.—Gụọ Ndị Hibru 13:5.
JEHOVA HỤRỤ NDỊ ENYI YA N’ANYA
19. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị mee ihe niile e kwuru n’Abụ Ọma nke 15?
19 Ihe Abụ Ọma nke 15 ji mechie bụ nkwa sịrị: “A gaghị eme ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị a daa.” (Ọma 15:5) N’ebe a, ọbụ abụ ahụ mere ka anyị mata ihe mere Jehova ji chọọ ka anyị mee ihe niile e kwuru n’abụ ọma a. Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. N’ihi ya, ọ gwara anyị ihe ndị anyị ga-eme ka ọ gọzie anyị ma chebe anyị.—Aịza. 48:17.
20. Olee olileanya ndị ọbịa Jehova nwere?
20 Ndị ọbịa Jehova na-atụ anya ọdịnihu magburu onwe ya. Ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-aga “n’ọtụtụ ebe obibi” Jizọs kwadebeere ha n’eluigwe. (Jọn 14:2) Ndị nwere olileanya ibi n’ụwa na-atụ anya mgbe ihe e kwuru ná Mkpughe 21:3 ga-emezu. N’eziokwu, obi dị anyị niile ezigbo ụtọ na Jehova kpọrọ anyị ịbụ ndị ọbịa n’ụlọikwuu ya ruo mgbe ebighị ebi.
ABỤ NKE 39 Meere Onwe Gị Ezi Aha n’Ebe Chineke Nọ