AKỤKỌ NDỤ
Jehova Ṅara Ntị n’Ekpere M
MGBE m dị afọ iri, m leliri anya hụ kpakpando ndị juru n’eluigwe n’abalị. M gbusara ikpere n’ala ozugbo ma kpee ekpere. Ọ dịbeghị anya m mụtara gbasara Jehova. Ma, m gwara ya otú ọ dị m nnọọ n’obi. Ekpere ahụ m kpere bụ otú mụ na Jehova Chineke bụ́ “Onye na-anụ ekpere” si malite ịdị ná mma ná ndụ m niile. (Ọma 65:2) Ka m kọọ ihe mere m ji kpee ekpere ahụ n’agbanyeghị na ọ dịbeghị anya m matara Jehova.
NLETA E LETARA ANYỊ NKE GBANWERE NDỤ M
A mụrụ m n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Disemba afọ 1929, na Novil bụ́ otu obere obodo nwere ebe itoolu a na-akọ ugbo. Ọ dị nso na Baston, n’otu oké ọhịa dị na Beljọm. Oge m na-eto n’ebe ahụ mụ na nne na nna m bi tọgburu m atọgbu. Mụ na nwanne m nwoke m tọrọ, aha ya bụ Raymond, na-eji aka anyị apịpụta mmiri ara ehi kwa ụbọchị, na-enyekwa aka ebulata ihe ndị e wetara n’ubi. N’obodo anyị, onye ọ bụla na-enyere ibe ya aka.
Aha papa m bụ Emile, aha mama m abụrụ Alice. Ha ji okpukpe Katọlik kpọrọ ihe, na-agakwa Mas na Sọnde ọ bụla. Ma, n’ihe dị ka afọ 1939, ndị ọsụ ụzọ si Ịngland bịara n’obodo anyị, jụọ papa m ma ọ̀ ga-achọ ịtụ ọda magazin Consolation (nke a na-akpọ Teta! ugbu a), papa m ekweta. Papa m chọpụtara ozugbo na ihe magazin ahụ na-ekwu bụ eziokwu, ya amalite ịgụ Baịbụl. Mgbe ọ kwụsịrị ịga Mas, ndị agbata obi anyị anyị na ha dịbu ná mma bidoro imegide ya. Ha nyewere papa m nsogbu ka ọ ghara ịhapụ Chọọchị Katọlik. Ihe a mere ka ha rụọ ezigbo ụka gbasara ya ọtụtụ mgbe.
O wuteruru m n’ọkpụkpụ mgbe m hụrụ ka a na-emegide papa m. Ọ bụ ihe mere m ji jiri obi m niile kpee ekpere ka Chineke nyere m aka. Ọ bụ ya bụ ekpere ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Mgbe mmegide ndị agbata obi anyị ji nwayọọ nwayọọ nyụọ ka ọkụ, obi bịara sie m ike na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.”
OGE AGHA
Ndị agha Jamanị batara Beljọm n’abalị iri n’ọnwa Mee afọ 1940. Ihe a mere ka ọtụtụ ndị si n’obodo ahụ gbapụ. Ezinụlọ anyị gbagara ebe ndịda Frans. Mgbe anyị nọ n’ụzọ, e nwere oge ndị anyị nọrọ n’ebe ndị agha Jamanị na ndị agha Frans na-akwa mgbọ.
Mgbe anyị laghachiri n’ụlọ anyị, anyị chọpụtara na e zurula ọtụtụ ihe anyị. Ọ bụ naanị nkịta
anyị aha ya bụ Bobbie ka anyị hụrụ. Ihe a mere ka m na-eche, sị, ‘Gịnị mere e ji alụ agha, ndị mmadụ ana-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ?’N’oge ahụ, obi dị anyị ezigbo ụtọ mgbe Nwanna Emile Schrantz, a bụ́ ọsụ ụzọ na okenye, bịara leta anyị. O ji Baịbụl kọwaa nke ọma ihe kpatara ahụhụ, zaakwa ajụjụ ndị ọzọ m nwere gbasara ndụ. Mụ na Jehova bịara na-adịkwu n’ezigbo mma, obi ana-esikwa m ike na ọ bụ Chineke hụrụ anyị n’anya.
Tupudị agha ahụ ebie, ndị ezinụlọ anyị na-ahụ ụmụnna ndị ọzọ, anyị na ha ana-akparịtakwa. N’ọnwa Ọgọst afọ 1943, Nwanna José-Nicolas Minet bịara n’ugbo anyị ma kwuo okwu. Ọ jụrụ, sị, “Olee ndị chọrọ ime baptizim?” Papa m weliri aka, mụnwa eweliekwa. E mere anyị baptizim n’obere osimiri dị nso n’ugbo anyị.
N’ọnwa Disemba afọ 1944, ndị agha Jamanị malitere ọgụ ikpeazụ kpụ ọkụ n’ọnụ ha lụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ n’ebe ọdịda anyanwụ Yurop. Ọ bụ ọgụ ndị Jamanị chọrọ iji kụghasịa atụmatụ ndị agha Amerịka. Anyị bi nso n’ebe a lụrụ agha ahụ. Anyị nọkwa n’ọnụ ụlọ anyị ndị dị n’okpuru ala ruo ihe dị ka otu ọnwa. Otu ụbọchị, mgbe m pụrụ ka m gaa nye anụ ụlọ anyị nri, a tụrụ bọmbụ n’ugbo anyị, ya emebisịa elu ọba anyị. Otu onye agha Amerịka nọ n’ebe anụ ụlọ anyị na-anọ tiri mkpu, sị, “Makpuru ala!” M gbara ọsọ ma makpuru ala n’akụkụ ya. O kpuwere m okpu agha ya ka ihe ghara ime m.
IHE ỌMA NDỊ MERE MGBE M NA-ABỊARUKWU JEHOVA NSO
Mgbe a lụchara agha ahụ, anyị jisiri ike mee ka anyị na ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị na Liij na-akparịta mgbe niile. Ọgbakọ ahụ dị ihe dị ka kilomita iri itoolu ma e si n’ebe anyị bi gawa n’ebe ugwu. Ka oge na-aga, anyị malitere inwe ọmụmụ ihe nke anyị na Baston. M bidoro ọrụ n’ebe a na-anakọta ụtụ isi, nwetakwa ohere ịmụ gbasara iwu. M mechara rụwa ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti. N’afọ 1951, anyị haziri obere mgbakọ sekit na Baston. Ihe dị ka otu narị mmadụ bịara ya. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na-anụ ọkụ n’obi aha ya bụ Elly Reuter bịakwara. O ji ígwè gbaa kilomita iri ise bịa mgbakọ ahụ. Ọ dịghị anya, mụ na ya
adịwa ná mma, kwekọrịtakwa na anyị ga-alụ. A kpọrọ ya ka ọ bịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’Amerịka. O degaara isi ụlọ ọrụ anyị akwụkwọ, kọwaara ha ihe mere o ji chee na ya agaghị abịali. Nwanna Knorr, bụ́ onye na-eduzi ọrụ ndị Jehova n’oge ahụ, medara obi gwa ya na otu ụbọchị, ya na di ya nwere ike ịbịa Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Anyị lụrụ n’ọnwa Febụwarị afọ 1953.N’otu afọ ahụkwa, mụ na nwunye m Elly gara Mgbakọ Òtù Ụwa Ọhụrụ n’Ámá Egwuregwu Yanki, dị na Niu Yọk. N’ebe ahụ, m hụrụ otu nwanna chọrọ inye m ezigbo ọrụ, gwakwa m ka m kwafeta Amerịka. Mgbe mụ na nwunye m kpechara ekpere gbasara ya, anyị kpebiri na anyị agaghị anara ọrụ ahụ nakwa na anyị ga-alaghachi Beljọm ịkwado obere ìgwè e nwere na Baston ndị nkwusa nọ na ya dị ihe dị ka mmadụ iri. N’afọ na-eso ya, Jehova ji nwa nwoke gọzie anyị. Aha ya bụ Serge. Ma, ọ dị mwute na mgbe ọnwa asaa gara, Serge rịawara ọrịa, mechaa nwụọ. Anyị besaara Jehova ákwá n’ekpere, olileanya mbilite n’ọnwụ e ji n’aka kasikwara anyị obi.
OZI OGE NIILE
N’ọnwa Ọktoba afọ 1961, m chọtara ọrụ m ga na-arụ ụbọchị ole na ole n’izu ga-enye m ohere ịna-asụ ụzọ. Ma, n’ụbọchị ahụ, ohu alaka si na Betel dị na Beljọm kpọọ m na telefon. Ọ jụrụ m ma m̀ ga-achọ ịbụ ohu sekit (nke a na-akpọ onye nlekọta sekit ugbu a). M jụrụ ya, sị, “Ọ̀ bụ na anyị agaghị ebu ụzọ bụrụ ndị ọsụ ụzọ tupu anyị arụwa ọrụ sekit?” Alaka ụlọ ọrụ kwetara. Mgbe anyị sụchara ụzọ ọnwa asatọ, anyị malitere ileta sekit n’ọnwa Septemba afọ 1962.
Mgbe anyị rụrụ ọrụ ilekọta sekit afọ abụọ, a kpọrọ anyị ka anyị bịa jewe ozi na Betel dị na Brọsels. Anyị malitere ije ozi ebe ahụ n’ọnwa Ọktoba afọ 1964. Anyị nwetara ọtụtụ ngọzi n’ọrụ ọhụrụ ahụ e nyere anyị. Obere oge Nwanna Knorr letachara alaka ụlọ ọrụ anyị n’afọ 1965, ọ tụrụ m n’anya na a họpụtara m ịbụ ohu alaka. E mechakwara kpọọ mụ na nwunye m ka anyị gaa klas nke iri anọ na otu nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied. Ihe ahụ Nwanna Knorr kwuru afọ iri na atọ gara aga mezuru. Mgbe anyị gụchara akwụkwọ, anyị laghachiri n’alaka ụlọ ọrụ dị na Beljọm.
ỊGBACHITERE NDỊ JEHOVA N’ỤLỌIKPE
Kemgbe ọtụtụ afọ, m na-eji ihe m ma gbasara iwu enye aka agbachitere ndị Jehova n’ụlọikpe ka e kwe ka anyị na-efe Jehova ma na Yurop ma n’ebe ndị ọzọ. (Fil. 1:7) Ihe a mere ka m mata ndị na-anọchite anya gọọmenti, ndị si n’ihe karịrị mba iri ise na ise, bụ́ ebe a machiri anyị ime ihe ụfọdụ ma ọ bụkwanụ machie anyị iwu kpamkpam. Kama ịna-agwa ndị na-anọchite anya gọọmenti ihe ndị m ma gbasara iwu, m na-agwa ha na m bụ onye ozi Chineke. M na-ekpe ekpere mgbe niile ka Jehova duzie m n’ihi na m ma na “obi eze dị ka iyi n’aka Jehova. Ọ na-eme ka ọ gaa ebe ọ bụla ọ chọrọ.”—Ilu 21:1.
Otu ihe m na-agaghị echefu echefu bụ ụka mụ na otu onye so ná Ndị Omeiwu Yurop kparịtara. Eziela m ya ozi ọtụtụ ugboro ka mụ na ya Ndị Rom 13:4. Ndị chọọchị ya ejighị Baịbụl egwu egwu. N’ihi ya, amaokwu Baịbụl ahụ masịrị ya. Gịnị meziri? O kwere ka mụ na ya kwuo okwu ruo nkeji iri atọ. Mụ na ya kparịtara nke ọma. O kwudịrị na ya na-akwanyere Ndịàmà Jehova ùgwù maka ọrụ ha na-arụ.
hụ. O mechara kweta. Ọ sịrị m, “M ga-enye gị nkeji ise. Agaghị m atụkwasị ya otu nkeji.” M hụlatara isi m malite ikpe ekpere. Ihe a gbagwojuru ya anya, ya ajụọ m ihe m na-eme. Mgbe m welitere ihu m, m sịrị ya, “M kelere Chineke maka na ị bụ otu n’ime ndị ozi ya.” Ọ jụrụ m, sị, “Gịnị mere i ji kwuo ya?” M gosiri yaKemgbe ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova agaala ụlọikpe ọtụtụ ugboro na Yurop n’okwu gbasara etinyeghị aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịga agha, onye a ga-enye ikike ịkpọrọ nwa, ịtụ ụtụ isi, nakwa ihe ndị ọzọ. Obi dị m ụtọ na m so ná ndị ọkàiwu n’ọtụtụ n’ime ha, jirikwa anya m hụ otú Jehova si mee ka anyị merie. Ndịàmà Jehova emeriela n’ikpe karịrị otu narị na iri anọ (140) n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.
OZI ỌMA MALITERE ỊGA N’IHU NA KUBA
Mgbe e mechara, mụ na Nwanna Philip Brumley, onye si n’isi ụlọ ọrụ anyị, nakwa Nwanna Valter Farneti, onye si n’Ịtali, rụkọrọ ọrụ mee ka e kwe ka ụmụnna anyị nọ na Kuba na-efe Jehova, n’ihi na a machiri Ndịàmà Jehova iwu n’ebe ahụ. M degaara ụlọ ọrụ na-anọchite anya obodo Kuba nke dị na Beljọm akwụkwọ ozi, mụ na onye a họpụtara ka anyị na ya kwurịta okwu ekwurịta okwu. Ná nnọkọ ndị mbụ anyị nwere, anyị edozilighị okwu ahụ mere ka a machie anyị iwu n’obodo ahụ.
Mgbe anyị kpechara ekpere rịọ Jehova ka o duzie anyị, anyị rịọrọ ka e nye anyị ikike ibubata puku Baịbụl ise (5,000) na Kuba, e nyekwa anyị ikike ime ya. Baịbụl ndị ahụ rutere n’enweghị aka kpara ha, anyị ekesakwaara ha ụmụnna anyị. N’ihi ya, o doro anyị anya na Jehova na-agọzi ọrụ anyị. Anyị gakwara ọzọ ka e nye anyị ikike ibubata puku Baịbụl iri abụọ na asaa na narị ise (27,500) n’ebe ahụ. Ha kwetakwara. Inyere ụmụnna anyị nọ na Kuba aka inwe Baịbụl nke ha mere m ezigbo obi ụtọ.
Agaala m Kuba ọtụtụ ugboro nye aka mee ka ndị ọchịchị kwụsịtụ inye ụmụnna anyị nsogbu. N’oge ndị ahụ, mụ na ọtụtụ ndị na-anọchite anya gọọmenti ghọrọ enyi.
INYERE ỤMỤNNA ANYỊ NỌ NA RỤWANDA AKA
N’afọ 1994, e gburu ihe karịrị otu nde mmadụ (1,000,000) mgbe e gbukpọrọ ndị Tutsi nọ na Rụwanda. Ọ dị mwute na e gbukwara ụfọdụ ụmụnna anyị. N’oge na-adịghị anya, a gwara ụfọdụ
ụmụnna ka ha hazie otú a ga-esi gbatara ụmụnna anyị ọsọ enyemaka n’obodo ahụ.Mgbe anyị rutere Kigali, bụ́ isi obodo ahụ, anyị hụrụ na e ji mgbọ gbakasịa ahụ́ ụlọ ọfis ndị nsụgharị na ebe a na-edosa akwụkwọ. Anyị nụrụ ọtụtụ akụkọ na-awụ akpata oyi gbasara ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị e ji mma gbuo. Ma, anyị nụkwara otú ụmụnna anyị si nyere ibe ha aka. Dị ka ihe atụ, anyị hụrụ otu nwanna bụ́ onye Tutsi. Otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị Hutu zoro ya n’otu olulu ruo abalị iri abụọ na asatọ. Mgbe anyị na ụmụnna nọ na Kigali nwere nnọkọ, anyị ji Baịbụl gbaa ihe karịrị narị ụmụnna itoolu (900) ume.
Anyị mechara gafee ókèala Rụwanda, banye Zaire, (nke a na-akpọzi Kongo Kinshasa), ịchọ ọtụtụ ụmụnna anyị bụ́ ndị Rụwanda, ndị gbagara n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị nso n’obodo Goma. Anyị achọtaghị ha. N’ihi ya, anyị kpere ekpere rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịchọta ha. Anyị hụziri otu onye na-abịa n’ihu anyị. Anyị jụrụ ya ma è nwere Ndịàmà Jehova ọ ma. Ọ sịrị anyị, “Ee. Abụ m Onyeàmà Jehova. Unu chọọ, mụ agaa gosi unu kọmitii na-agbatara ụmụnna ọsọ enyemaka.” Mgbe anyị na ụmụnna nọ na kọmitii ahụ nwechara nnọkọ gbara onye ọ bụla ume, anyị na otu puku mmadụ na narị isii (1,600) gbara ọsọ ndụ nwere nnọkọ, anyị esi n’Okwu Chineke gbaa ha ume ma kasie ha obi. Anyị gụkwaara ha otu akwụkwọ ozi si n’aka Òtù Na-achị Isi. N’akwụkwọ ozi ahụ, Òtù Na-achị Isi sịrị: “Anyị na-echeta unu n’ekpere anyị mgbe niile. Anyị ma na Jehova agaghị agbakụta unu azụ.” Mgbe ụmụnna ndị ahụ nụrụ okwu ahụ, obi tọgburu ha atọgbu. Ihe ahụ Òtù Na-achị Isi kwuru mezuru. Taa, ihe karịrị puku ụmụnna iri atọ (30,000) ji obi ụtọ na-efe Jehova na Rụwanda.
M KPEBISIRI IKE NA AGAGHỊ M AKWỤSỊ IRUBERE JEHOVA ISI
Mgbe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise na asatọ anyị lụrụ, nwunye ọma m bụ́ Elly nwụrụ n’afọ 2011. Jehova kasiri m obi ka m na-ekpe ekpere na-agwa ya otú obi dị m. Izi ndị agbata obi m ozi ọma kasikwara m obi.
Ọ bụ eziokwu na mụ akarịala afọ iri itoolu ugbu a, m ka na-ekwusa ozi ọma kwa izu. Obi dịkwa m ezigbo ụtọ na m na-enyere Ngalaba Na-ahụ Maka Okwu Ikpe n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Beljọm ebe a aka, na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị m hụrụla ná ndụ, na-agbakwa ndị bịara ọhụrụ na Betel ume.
N’ihe dị ka afọ iri asatọ na anọ gara aga, m kpere ekpere mbụ m kpere. Ọ bụ otú ahụ ka m si malite njem magburu onwe ya mere ka mụ na Jehova na-adịkwu ná mma. Obi dị m ezigbo ụtọ na ná ndụ m niile, Jehova ṅara ntị n’ekpere m.—Ọma 66:19. b