ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 26
ABỤ NKE 8 Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị
Mee Ka Jehova Bụrụ Oké Nkume Gị
‘O nweghị oké nkume siri ike ka Chineke anyị.’—1 SAM. 2:2.
IHE A GA-AMỤ
Anyị ga-amụta àgwà ndị Jehova nwere mere e ji kpọọ ya “Oké Nkume” nakwa otú anyị ga-esi mụta àgwà ndị ahụ.
1. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 18:46, olee ihe Devid ji Jehova tụnyere?
ANYỊ bi n’ụwa ebe nsogbu ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka ihe siere anyị ike ma ọ bụdị gbanwee ndụ anyị kpamkpam. Obi dị anyị ụtọ na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi ka o nyere anyị aka. N’isiokwu bu nke a ụzọ, e chetaara anyị na Jehova bụ Chineke dị ndụ nakwa na ọ dị njikere mgbe niile inyere anyị aka. Ọ bụrụ na Jehova enyere anyị aka, ọ na-eme ka obi sie anyị ike na “Jehova dị ndụ.” (Gụọ Abụ Ọma 18:46.) Ma, mgbe Devid kwuchara ihe a, ọ kpọrọ Chineke “Oké Nkume m.” Gịnị mere o ji jiri Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, tụnyere oké nkume, bụ́ ihe na-adịghị ndụ?
2. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe mere e ji kpọọ Jehova “Oké Nkume” na ihe ihe a a kpọrọ ya na-akụziri anyị banyere ya. Anyị ga-amụtakwa otú anyị ga-esi mee ka ọ bụrụ Oké Nkume anyị. Anyị ga-elebakwa anya n’ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-akpa àgwà ndị mere e ji kpọọ Jehova “Oké Nkume.”
IHE MERE JEHOVA JI BỤRỤ OKÉ NKUME
3. Baịbụl kpọọ Jehova “Oké Nkume,” olee ihe o nwere ike ịpụta? (Kọwaa foto.)
3 Baịbụl ji Jehova tụnyere “oké nkume” iji nyere anyị aka ịghọta ụfọdụ àgwà ndị o nwere. Ọtụtụ mgbe, mgbe ndị na-efe Jehova na-eto ya maka àgwà ya ndị magburu onwe ha, ha na-akpọ ya “Oké Nkume.” Ebe mbụ a kpọrọ Jehova “Oké Nkume” bụ na Diuterọnọmi 32:4. Mgbe Hana na-ekpe ekpere, o kwuru na ‘o nweghị oké nkume siri ike ka Chineke anyị.’ (1 Sam. 2:2) Habakọk kpọrọ Jehova “Oké Nkume m.” (Hab. 1:12) Onye dere Abụ Ọma nke 73 kpọrọ Chineke “oké nkume m nke na-eme ka obi sie m ike.” (Ọma 73:26) Jehova kpọdịrị onwe ya “Oké Nkume.” (Aịza. 44:8) Ka anyị tụlee àgwà atọ Jehova na-akpa mere e ji kpọọ ya “Oké Nkume,” mụtakwa otú anyị ga-esi mee ka ọ bụrụ “Oké Nkume anyị.”—Diut. 32:31.
4. Olee otú Jehova si bụrụ ebe mgbaba? (Abụ Ọma 94:22)
4 Jehova bụ ebe mgbaba. Otú ahụ oké nkume nwere ike ichebe onye gbabara na ya ma oké ifufe fewe, Jehova na-echebe anyị mgbe nsogbu bịaara anyị. (Gụọ Abụ Ọma 94:22.) Ọ na-echebe anyị, meekwa ka a ghara inwe ihe ga-eme anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi. O kwedịrị anyị nkwa na ọ ga-emecha wepụrụ anyị ihe niile na-eme ka anyị na-ata ahụhụ ma ọ bụ na-echegbu onwe anyị.—Ezik. 34:25, 26.
5. Olee otú Jehova nwere ike isi bụrụ Oké Nkume anyị ga-agbaba?
5 Otu ụzọ anyị si eme ka Jehova bụrụ Oké Nkume anyị ga-agbaba n’oge nsogbu bụ ikpe ekpere. Anyị kpee ekpere, Jehova na-enye anyị “udo Chineke na-enye” nke ga-echebe obi anyị na echiche anyị. (Fil. 4:6, 7) Ka anyị leba anya n’akụkọ Nwanna Artem, onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi ihe o kweere. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, a gbara ya ajụjụ ọtụtụ ugboro, mekpọọ ya ọnụ, yiekwa ya egwu. Ọ sịrị: “Mgbe ọ bụla onye ahụ na-agba m ajụjụ kpọrọ m, m na-achị obi n’aka. . . . M na-ekpe ekpere mgbe niile, na-arịọ Jehova ka o mee ka obi ruo m ala nakwa ka o nye m amamihe. N’agbanyeghị ọnụ onye ahụ na-agba m ajụjụ mekpọrọ m, obi ruru m ala. . . . Jehova nyeere m aka, ya adị m ka ebe m guzo n’akụkụ mgbidi e ji okwute rụọ.”
6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-atụkwasị Jehova obi mgbe niile? (Aịzaya 26:3, 4)
6 Anyị ga-atụkwasịli Jehova obi. Otú ahụ a na-enweghị ike ibupụ oké nkume ebupụ, Jehova nọ ya mgbe niile inyere anyị aka. Anyị ga-atụkwasịli ya obi na ọ bụ “Oké Nkume na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Gụọ Aịzaya 26:3, 4.) Ọ ga-anọ ndụ mgbe niile imezu nkwa o kwere anyị, ịnụ ekpere anyị, nakwa inyere anyị aka. Anyị ga-atụkwasịlikwa Jehova obi n’ihi na ọ naghị ahapụ ndị na-efe ya. (2 Sam. 22:26) O mekataghị chefuo ihe anyị na-eme. Ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ.—Hib. 6:10; 11:6.
7. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị tụkwasị Jehova obi? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
7 Anyị na-eme ka Jehova bụrụ Oké Nkume anyị ma anyị tụkwasị ya obi anyị niile. Obi siri anyị ike na irubere ya isi, ma mgbe ihe siiri anyị ike, ga-abara anyị uru. (Aịza. 48:17, 18) Anyị hụ otú o si enyere anyị aka, anyị na-atụkwasịkwu ya obi. Ọ ga-emekwa ka anyị dịkwuo njikere maka nsogbu ndị ga-abịara anyị, ndị ọ bụ naanị Jehova ga-enyere anyị aka idi. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị nke ọ na-enweghị onye ọzọ ga-enyeliri anyị aka na ya, anyị na-aghọta na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi mgbe niile. Nwanna Vladimir sịrị: “Oge m nọrọ n’ụlọ mkpọrọ bụ oge mụ na Jehova kacha dịrị ná mma. M mụtara ịtụkwasịkwu ya obi n’ihi na m nọ naanị m, o nweghịkwa ihe m ga-emeli gbasara nsogbu m.”
8. (a) Gịnị mere anyị nwere ike iji ekwu na Jehova anaghị agbanwe agbanwe? (b) Olee uru ọ na-abara anyị na Chineke bụ Oké Nkume anyị? (Abụ Ọma 62:6, 7)
8 Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Jehova dị ka oké nkume. Ọ naghị agbanwe agbanwe. O sikwara ezigbo ike. Ọ naghị agbanwe ụdị onye ọ bụ, nzube ya anaghịkwa agbanwe. (Mal. 3:6) Mgbe e nupụụrụ Jehova isi n’ogige Iden, ọ gbanweghị nzube ya. Pọl onyeozi dere na Jehova ‘enweghị ike ịgọnahụ onwe ya.’ (2 Tim. 2:13) Ihe ọ pụtara bụ na n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ ma ọ bụ ihe ndị mmadụ mere, Jehova agaghị agbanwe ụdị onye ọ bụ, nzube ya, ma ọ bụkwanụ iwu ya. Ebe ọ bụ na obi siri anyị ike na Chineke anyị anaghị agbanwe agbanwe, anyị na-akpọ ya ka ọ napụta anyị nakwa ka o nyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị.—Gụọ Abụ Ọma 62:6, 7.
9. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Tatyana?
9 Anyị na-eme ka Jehova bụrụ Oké Nkume anyị ma anyị na-elekwasị anya n’ụdị onye ọ bụ, gharakwa ichefu nzube ya. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ka anyị nọrọ jụụ ma rubere Jehova isi ma nsogbu bịara anyị. (Ọma 16:8) Ọ bụ ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Tatyana mere. A tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya n’ihi ihe o kweere. Ọ sịrị: “M nọ nnọọ naanị m. O siiri m ike na mbụ. O nwekwara ọtụtụ mgbe m dara mbà.” Ma mgbe ọ chọpụtara otú ọnwụnwa bịaara ya si gbasa Jehova na nzube ya, obi ruru ya ala, ya enweekwa ike ịtachi obi. Ọ sịrị: “Ịghọta ihe mere ihe a ji eme m nyeere m aka icheta na ọ bụ n’ihi Jehova ka e ji na-eme m ihe a. Ihe a nyeere m aka ịkwụsị iche gbasara onwe m.”
10. Olee otú Jehova nwere ike isi abụ Oké Nkume anyị ugbu a?
10 N’ọdịnihu, a ga-enwe ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị, ndị ga-eme ka ọ dị anyị mkpa ịtụkwasị Jehova obi otú anyị na-emetụbeghị. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị ime ka obi sie anyị ezigbo ike na Jehova ga-enye anyị ihe ọ bụla dị anyị mkpa iji die ọnwụnwa bịaara anyị ma rubere ya isi. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Na-agụ akụkọ Baịbụl nakwa akụkọ ụmụnna anyị n’oge a. Chọpụta otú Jehova sirila gosi na ya bụ Oké Nkume ma nyere ndị na-efe ya aka. Chebara akụkọ ndị a echiche nke ọma. Ime otú ahụ ga-enyere gị aka ime ka Jehova bụrụ Oké Nkume gị.
MỤTA ỊKPA ÀGWÀ KA JEHOVA
11. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị na-akpa àgwà ka Jehova? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ụmụnna Nwoke Na-eto Eto Kwesịrị Ịgba Mbọ Mee.”)
11 Anyị ahụla ụzọ ndị Jehova si egosi na ọ bụ Oké Nkume anyị. Ka anyị lebazie anya n’otú anyị nwere ike isi mụta ịkpa àgwà ka ya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, ọ ga-enyere anyị aka ime ka ụmụnna anyị sie ike. Dị ka ihe atụ, Jizọs gụrụ Saịmọn Sifas (nke a sụgharịrị “Pita”), nke pụtara “Oké Nkume.” (Jọn 1:42) Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga na-akasi ụmụnna ya obi, na-emekwa ka ha sie ike. Baịbụl kwukwara na ndị okenye ọgbakọ bụ “ndò nkume dị elu na-enye.” Ihe a na-egosi otú ha si echebe ndị nọ n’ọgbakọ. (Aịza. 32:2) N’eziokwu, ọ bụrụ na ụmụnna niile ana-akpa àgwà ka Jehova, ọ ga-abara ọgbakọ uru.—Efe. 5:1.
12. Kọwaa otú anyị nwere ike isi ghọọrọ ndị ọzọ ebe mgbaba.
12 Bụụrụ ụmụnna gị ebe mgbaba. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịkpọbata ụmụnna ka ha bịa nọrọ na nke anyị ma e nwee ihe ndị dị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha, ọgba aghara, ma ọ bụ agha. Ka “oge ikpeazụ” a na-akakwu njọ, o doro anya na anyị ga-enwekwu ohere inyere ụmụnna anyị aka. (2 Tim. 3:1) Anyị nwere ike ịkasi ụmụnna anyị obi ma gosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Otu ụzọ anyị nwere ike isi eme ya bụ ime ka obi ruo ha ala ma ha bịa ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ndị niile nọ n’ọgbakọ mara na a hụrụ ha n’anya, na-agbakwa ha ume. Anyị bi n’ụwa ọtụtụ ndị dị obi ọjọọ, na-emesikwa ibe ha ike. O nwere ike ime ka ike na-agwụ ụmụnna anyị, ha ana-echekwa na a hụghị ha n’anya. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ụmụnna anyị bịara ọmụmụ ihe, anyị chọrọ ime ike anyị niile ka ha ghọta na anyị hụrụ ha n’anya, ka obi dị ha mma, ruokwa ha ala.
13. Olee otú ndị okenye nwere ike isi aghọrọ ndị ọzọ ebe mgbaba? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
13 Ndị okenye nwekwara ike inyere ụmụnna ha aka n’oge nsogbu. E nwee ọdachi ma ọ bụ na ọrịa bịara nwanna na mberede, ndị okenye na-eme ngwa ngwa hazie otú ha ga-esi nyere ya aka. Ha na-ejikwa Okwu Chineke eduzi ụmụnna ha ma na-agba ha ume. Ọ ga-adịrị ụmụnna nọ n’ọgbakọ mfe ịgakwuru okenye kọọrọ ya otú ọ dị ha ma ọ bụrụ na ha ma na okenye ahụ dị nwayọọ, na-emetere mmadụ ebere, dịkwa njikere ige ha ntị. Àgwà ndị a na-eme ka ụmụnna mata na a hụrụ ha n’anya. Ọ ga-adịziri ha mfe ime ihe okenye si na Baịbụl gwa ha.—1 Tesa. 2:7, 8, 11.
14. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na a ga-atụkwasịli anyị obi?
14 Bụrụ onye a ga-atụkwasịli obi. Anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata na ha ga-atụkwasịli anyị obi, karịchaa n’oge ihe siiri ha ike. (Ilu 17:17) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka a mara na a ga-atụkwasịli anyị obi? Anyị nwere ike ịgbasi mbọ ike ịna-akpa àgwà ndị e ji mara Ndị Kraịst mgbe niile, dị ka ịna-emezu nkwa anyị nakwa ịna-eme ike anyị niile na-aga ihe n’oge. (Mat. 5:37) Anyị nwekwara ike inyere ndị ọzọ aka mgbe ọ dị mkpa. Ihe ọzọkwa bụ na anyị kwesịrị ijide n’aka na anyị rụchara ọrụ e nyere anyị n’ọgbakọ otú a gwara anyị si rụọ ya.
15. Olee uru ọ na-abara ọgbakọ ma ndị okenye bụrụ ndị a ga-atụkwasịli obi?
15 Ndị okenye a ga-atụkwasịli obi na-abara ọgbakọ uru. Olee otú ọ bụ? Ọ bụrụ na ndị nkwusa amata na ha nwere ike ịkpọtụrụ ndị nlekọta ìgwè ha ma ọ bụ ndị okenye ndị ọzọ mgbe ọ bụla ha chọrọ enyemaka ha, ọ na-eme ka obi na-eru ha ala. Ndị nkwusa na-amatakwa na a hụrụ ha n’anya ma ha mara na ndị okenye dị njikere inyere ha aka. Ọ bụrụkwa na ndị okenye ana-esi na Baịbụl nakwa n’akwụkwọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bipụtara na-enye ụmụnna ndụmọdụ kama ịgwa ha ihe ha chere, ọ na-eme ka ụmụnna na-atụkwasị ha obi. Ụmụnna na-atụkwasịkwa okenye obi ma ọ bụrụ na ọ naghị akọrọ ndị ọzọ ihe ha kọọrọ ya ha na-achọghị ka ndị ọzọ nụ nakwa ma ọ na-eme ihe o kwuru na ọ ga-eme.
16. Olee uru ọ na-abara anyị na ndị ọzọ ma anyị na-akwụsi ike n’ihe Jehova kwuru?
16 Na-akwụsi ike n’ihe Jehova kwuru. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi n’ihe niile ma na-eji ihe Okwu ya bụ́ Baịbụl kwuru na-eme mkpebi, ndị ọzọ ga-amụta ya. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ Baịbụl, na-emekwa ka okwukwe anyị na-esikwu ike n’ebe Jehova nọ, anyị ga na-erubere ya na iwu ya isi. Anyị agaghị abụ ndị na-amaghị ihe ha ga-eme eme, ndị na-anaghị akwụsi ike n’ihe, ma ọ bụ ndị ọ na-agaghị esi ike e jiri nkụzi ụgha ma ọ bụ echiche ụwa ghọgbuo ha. (Efe. 4:14; Jems 1:6-8) Okwukwe anyị nwere na Jehova nakwa ná nkwa ndị o kwere na-eme ka anyị nọrọ jụụ ma anyị nụ akụkọ ọjọọ. (Ọma 112:7, 8) Anyị ga-enwekwa ike inyere ndị ọnwụnwa bịaara aka.—1 Tesa. 3:2, 3.
17. Gịnị na-enyere ndị okenye aka ịkwụsi ike n’ihe ziri ezi?
17 Ndị okenye kwesịrị ịna-emeru ihe n’ókè, ịna-ele ihe anya otú dị mma, ịna-eme ihe n’usoro, na-elekwa ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ha na-enyere ndị ọzọ aka ịnọrọ jụụ ma nwee okwukwe siri ike na Jehova, meekwa ka ọgbakọ sie ike. Otú ha si eme ya bụ ‘ijidesi okwu nke eziokwu aka ike.’ (Taị. 1:9; 1 Tim. 3:1-3) Ha na-esi n’àgwà ha nakwa n’otú ha si elekọta atụrụ Chineke eme ka ndị nkwusa na-abịachi ọmụmụ ihe anya, na-agachi ozi ọma anya, na-amụkwa ihe n’onwe ha. Ọ bụrụ na nsogbu abịara ụmụnna, ndị okenye na-agba ha ume ma nyere ha aka ịtụkwasị Jehova na nkwa ya obi.
18. Gịnị mere anyị ji achọ ito Jehova ma na-abịarukwu ya nso? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Otú Ị Ga-esi Na-abịarukwu Jehova Nso.”)
18 Ugbu a anyị lebarala anya n’àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere, anyị nwere ike ikwu ihe Eze Devid kwuru. Ọ sịrị: “Ka e too Jehova bụ́ Oké Nkume m.” (Ọma 144:1) O nweghị mgbe Jehova ga-akwụsị ịbụ Chineke anyị ga-atụkwasịli obi. Ná ndụ anyị niile, ruodị n’agadi, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-asị: “Ọ bụ ya bụ Oké Nkume m,” obi esie anyị ike na ọ ga na-enyere anyị aka mgbe niile ịnọ ya nso.—Ọma 92:14, 15.
ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị
a NKỌWA FOTO: Ebe obi ruru otu nwanna nwaanyị ala ịgakwuru ndị okenye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.