Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Okwu ahụ bụ́ “ị ga-echebe ha” e kwuru n’Abụ Ọma 12:7, ọ̀ na-ekwu gbasara “ndị na-ata ahụhụ” (n’amaokwu nke 5) ka ọ̀ bụ “okwu Jehova” (n’amaokwu nke 6)?

Ihe ndị gbara amaokwu okwu ahụ gburugburu na-egosi na ọ na-ekwu gbasara ndị mmadụ.

Abụ Ọma 12:1-4 kwuru na “ndị a tụkwasịrị obi anọghịzi.” Abụ Ọma 12:5-7 kwuziri, sị:

“Jehova kwuru, sị: ‘Ebe ọ bụ na a na-emegbu ndị na-ata ahụhụ,

Ebe ọ bụ na ndị ogbenye na-asụ ude,

M ga-ebili kpaa ike.

M ga-azọpụta ha n’aka ndị na-ejighị ha kpọrọ ihe.’

Okwu Jehova enweghị ntụpọ.

Ha dị ka ọlaọcha a nụchara anụcha, nke a nụchara ugboro asaa n’ekwú e ji ụrọ kpụọ.

Jehova, ị ga-echebe ha.

Ị ga-echebe onye ọ bụla n’ime ha n’aka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi.”

Amaokwu nke 5 kwuru ihe Jehova ga-emere “ndị na-ata ahụhụ.” Ọ ga-azọpụta ha.

Amaokwu nke 6 kwuru na “okwu Jehova enweghị ntụpọ,” “dị ka ọlaọcha a nụchara anụcha.” Ihe a gosiri otú obi dị anyị gbasara okwu Jehova.​—Ọma 18:30; 119:140.

Lezie ihe Abụ Ọma 12:7 kwuru. Ọ sịrị: “Jehova, ị ga-echebe ha. Ị ga-echebe onye ọ bụla n’ime ha n’aka ọgbọ a ruo mgbe ebighị ebi.” Gịnị ka “ha” na-ekwu gbasara ya?

Ebe ọ bụ na e kwuru ihe dị n’amaokwu nke 7 ahụ mgbe e kwuchara “okwu Jehova,” ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na okwu ahụ bụ́ “ha” na-ekwu banyere okwu Chineke. Anyị makwa na Chineke echebela Baịbụl n’agbanyeghị mbọ ọtụtụ ndị mmegide gbara ịmachi ya ma bibie ya.​—Aịza. 40:8; 1 Pita 1:25.

Ma, ihe e kwuru n’amaokwu nke 5 bụkwa eziokwu. Jehova na-enyere “ndị na-ata ahụhụ” na ndị “a na-emegbu” aka ma na-azọpụta ha, ọ gaghị akwụsịkwa ime otú ahụ.​—Job 36:15; Ọma 6:4; 31:1, 2; 54:7; 145:20.

N’ihi ya, gịnị ka “ha” e kwuru n’amaokwu nke 7 na-ekwu gbasara ya?

Ihe ndị ọzọ e kwuru n’abụ ọma a na-egosi na “ha” na-ekwu gbasara ndị mmadụ.

Abụ Ọma 12:1 kwuru gbasara “ndị a tụkwasịrị obi” o nwere ike ịbụ na a nọ na-aghara ụgha. Abụ ọma ahụ mechara kwuo na Jehova ga-ebepụ ọnụ ndị na-ekwu okwu ọjọọ. O mere ka obi sie anyị ike na anyị ga-atụkwasịli Jehova obi na ọ ga-enyere ndị ya aka n’ihi na okwu ya bụ eziokwu.

N’ihi ya, amaokwu nke 7 na-ekwu na Jehova “ga-echebe ha,” ya bụ, ndị ndị ajọ mmadụ na-emekpọ ọnụ.

E dere okwu bụ́ “ha” n’amaokwu a n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị kacha ochie ndị e ji aka dee. Septuagint nke Grik kwuru “anyị” ugboro abụọ n’amaokwu nke 7. Ihe ọ na-egosi bụ na “anyị” na-ekwu gbasara ndị ezigbo mmadụ, bụ́ ndị na-ata ahụhụ na ndị a na-emegbu. N’ikpeazụ, amaokwu nke 7 kwuru na a ga-echebe “onye ọ bụla n’ime” ndị ahụ na-erubere Jehova isi “n’aka ọgbọ a,” ya bụ, ndị ọjọọ na-ebi ndụ rụrụ arụ. (Ọma 12:7, 8) N’otu nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru n’asụsụ Arameik, amaokwu nke 7 sịrị: “Gị, ONYENWE ANYỊ, ga-echebe ndị ezi omume. Ị ga-echebe ha ka ọgbọ ọjọọ a ghara inweta ha ruo mgbe ebighị ebi. N’ebe ọ bụla, ndị ajọ mmadụ na-agagharị ka etu na-amị ọbara ụmụ mmadụ.” Ihe a bụ ihe ọzọ gosiri na Abụ Ọma 12:7 anaghị ekwu gbasara okwu Chineke.

N’ihi ya, amaokwu a na-eme ka “ndị a tụkwasịrị obi” nwee olileanya na Chineke ga-enyere ha aka.