ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mach 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Eprel 30 ruo Jun 3, 2018.

E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim

Olee ihe Baịbụl kwuru banyere baptizim? Olee ihe mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim? Gịnị mere Onye Kraịst na-amụrụ mmadụ ihe ga-eji buru mkpa ime baptizim dị n’obi mgbe ọ na-amụrụ nwa ya ma ọ bụ onye ọzọ ihe?

Ndị Nne na Nna, Ùnu Na-enyere Nwa Unu Aka Ka O Ruo Ime Baptizim?

Olee ihe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst chọrọ ijide n’aka tupu ụmụ ha e mee baptizim?

AJỤJỤ NDỊ NA-AGỤ AKWỤKWỌ ANYỊ NA-AJỤ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji esekarị Pọl onyeozi n’akwụkwọ ha ka onye isi nkwọcha?

Ile Ọbịa Bụ Ihe Na-eme Obi Ụtọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme

Gịnị mere Baịbụl ji gwa Ndị Kraịst ka ha na-ele ibe ha ọbịa? Olee ohere anyị nwere ike iji lee ndị ọzọ ọbịa? Olee ihe anyị ga-eme ma e nwee ihe ndị na-egbochi anyị ile ọbịa?

AKỤKỌ NDỤ

O Nwebeghị Mgbe Jehova Hapụrụ M

Erika Nöhrer Bright ejeela ozi ka ọsụ ụzọ oge niile, ọsụ ụzọ pụrụ iche, nakwa onye ozi ala ọzọ. Ọ kọrọ otú Chineke sirila nyere ya aka, gbaa ya ume ma duzie ya kemgbe ọtụtụ afọ o ji obi ya niile na-ejere ya ozi.

Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Iji Gosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị Chineke dọrọ aka ná ntị n’oge gara aga? Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jehova mgbe anyị na-adọ mmadụ aka ná ntị?

“Nụrụnụ Ịdọ Aka Ná Ntị Wee Mara Ihe”

Olee otú Chineke si akụziri anyị ịna-arụ ahụ́ anyị ụka? Olee otú anyị nwere ike isi rite uru ná aka ná ntị a dọrọ anyị n’ọgbakọ?