Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Iji Gosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya

Chineke Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Iji Gosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya

“Onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.”—HIB. 12:6.

ABỤ: 123, 86

1. Olee otú Baịbụl si akọwakarị ịdọ aka ná ntị?

OLEE ihe na-agbata gị n’obi ma ị nụ “ịdọ aka ná ntị”? Ihe na-agbata gị n’obi ozugbo nwere ike ịbụ ịta ahụhụ. Ma, ọ bụghị naanị ihe ọ pụtara. Baịbụl kwuru na ịdọ aka ná ntị na-abara anyị uru. Mgbe ụfọdụ, ebe o kwuru okwu ya, ka o kwukwara banyere amamihe, ịhụnanya na ndụ. (Ilu 1:2-7; 4:11-13) Nke a bụ n’ihi na Chineke na-adọ anyị aka ná ntị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi. (Hib. 12:6) Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, Chineke nwere ike ịta anyị ahụhụ iji dọọ anyị aka ná ntị, ma ọ naghị eji obi ọjọọ eme ya. N’eziokwu, ihe “ịdọ aka ná ntị” pụtara bụ ịkụzi ihe otú ahụ nne ma ọ bụ nna si akụziri nwa ọ hụrụ n’anya ihe.

2, 3. Olee otú ịdọ aka ná ntị nwere ike isi bụrụ ma ịkụzi ihe ma inye ntaramahụhụ? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Chegodị banyere ihe atụ a: Otu nwata nwoke aha ya bụ John nọ na-atụli bọl elu n’ime ụlọ. Mama ya sịrị ya: “Ị ma na i kwesịghị iji bọl na-egwu egwuregwu n’ime ụlọ. I nwere ike ịkụwa ihe.” Ma, o geghị mama ya ntị, ọ nọ na-atụli bọl elu ma kụwaa ihe e ji etinye okooko osisi. Olee otú mama ya ga-esi adọ ya aka ná ntị? O nwere ike ịkụziri ya ihe ma tatụ ya ahụhụ. Mgbe ọ na-akụziri ya ihe, o nwere ike ịgwa John ihe mere na ihe o mere adịghị mma. Ọ chọrọ ime ka ọ ghọta na ọ ga-abara ya uru ma ọ na-erubere ndị mụrụ ya isi, meekwa ka ọ ghọta na ihe ha gwara ya mee dị mkpa ma bụrụ ihe kwesịrị ekwesị. O nwere ike inye ya ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị ka ọ ghọta na ihe ọ na-ekwu dị ezigbo mkpa. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịnara ya bọl ahụ ruo oge ụfọdụ. Nke ahụ nwere ike ime ka ọ ghọta na inupụrụ ndị mụrụ ya isi ga-akpatara ya nsogbu.

3 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị so n’ezinụlọ nke Chineke. (1 Tim. 3:15) Ọ bụ ya mere Nna anyị bụ́ Jehova ji bụrụ onye ọ dị n’aka ikpebi ihe dị mma na ihe na-adịghị mma, nakwa ịdọ anyị aka ná ntị ma anyị nupụrụ ya isi n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụkwa na ihe anyị mere akpatara anyị nsogbu, aka ná ntị Jehova na-adọ anyị ga-echetara anyị na anyị kwesịrị ige Nna anyị nke eluigwe ntị. (Gal. 6:7) Chineke hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, ọ chọghịkwa ka anyị taa ahụhụ.—1 Pita 5:6, 7.

4. (a) Olee ụdị ọzụzụ Jehova na-agọzi? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Ọ bụrụ na anyị ejiri Baịbụl dụọ nwa anyị ma ọ bụ onye anyị na-amụrụ Baịbụl ọdụ, ọ ga-enyere ya aka iru eru ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst. Okwu Chineke bụ ihe bụ́ isi anyị na-eji akụzi ihe. Ọ na-enyere anyị aka ‘inye ọzụzụ n’ezi omume.’ Ọ na-enyekwara nwa anyị ma ọ bụ onye anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta na ‘idebe ihe niile Jizọs nyere anyị n’iwu.’ (2 Tim. 3:16; Mat. 28:19, 20) Jehova na-agọzi ụdị ọzụzụ a n’ihi na ọ na-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Gụọ Taịtọs 2:11-14.) Ka anyị tụlee azịza ajụjụ atọ dị mkpa: (1) Olee otú aka ná ntị Chineke na-adọ anyị si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya? (2) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ndị Chineke dọrọ aka ná ntị n’oge gara aga? na (3) Mgbe anyị na-adọ mmadụ aka ná ntị, olee otú anyị ga-esi eṅomi Jehova na Ọkpara ya?

CHINEKE NA-ADỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ MAKA NA Ọ HỤRỤ ANYỊ N’ANYA

5. Olee otú aka ná ntị Jehova na-adọ anyị si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

5 Jehova na-agbazi anyị, na-akụziri anyị ihe ma na-azụ anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe mere o ji na-eme ya bụ ka anyị na ya nọgide na-adị ná mma, nakwa ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi. (1 Jọn 4:16) Ọ naghị eleda anyị anya ma ọ bụ na-eme ka anyị chewe na anyị abaghị uru. (Ilu 12:18) Kama, ọ na-elekwasị anya n’ebe anyị na-eme nke ọma, na-enyekwa anyị ohere iji aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ewere aka ná ntị Chineke na-adọ anyị, ma ò si n’Okwu ya, n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, n’aka ndị mụrụ anyị, ma ọ bụ n’aka ndị okenye? N’eziokwu, ọ bụrụ na ndị okenye emeda obi gbazie anyị ma anyị ‘zọhie ụkwụ’ n’amaghị ama, ha na-egosi na ha hụrụ anyị n’anya ka Jehova.—Gal. 6:1.

6. Mgbe a kwụsịrị mmadụ ime ihe ụfọdụ n’ọgbakọ, olee otú o si egosi na Chineke hụrụ onye ahụ n’anya?

6 Ma, mgbe ụfọdụ, ịdọ aka ná ntị abụghị naanị inye mmadụ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ, o nwere ike ime ka ọ ghara iru eru ime ihe ụfọdụ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ọ na-egosi na Chineke hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere onye ahụ aka ịghọta na o kwesịrị ịna-ewepụtakwu oge na-amụ Baịbụl, na-echebara ihe ọ na-amụ echiche ma na-ekpe ekpere. Ime otú ahụ ga-eme ka adịm ná mma ya na Jehova sikwuo ike. (Ọma 19:7) Ka oge na-aga, o nwekwara ike iru eru ime ihe ndị ahụ ọ na-emebu. Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-egosikwa na Jehova hụrụ onye ahụ n’anya n’ihi na ọ ga-eme ka ndị nọ n’ọgbakọ ghara ịmụta àgwà ọjọọ ahụ. (1 Kọr. 5:6, 7, 11) Ebe Chineke na-adọ anyị aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị, ịchụ mmadụ n’ọgbakọ na-enyere onye ahụ aka ịghọta otú ihe o mere jọruru ná njọ, nyekwara ya aka ichegharị.—Ọrụ 3:19.

Ọ MỤTARA IHE N’AKA NÁ NTỊ JEHOVA DỌRỌ YA

7. Ònye bụ Shebna? Oleekwa àgwà ọjọọ ọ malitere ịkpa?

7 Iji mata otú ịdọ aka ná ntị si dị mkpa, ka anyị tụlee gbasara mmadụ abụọ Jehova dọrọ aka ná ntị. Ha bụ, Shebna, onye dịrị ndụ n’oge Eze Hezekaya, na otu nwanna n’oge anyị a aha ya bụ Graham. Shebna nwere ikike n’ihi na ọ bụ onye “na-elekọta ụlọ” Eze Hezekaya. (Aịza. 22:15) Ma, ọ dị mwute na ọ malitere ịdị mpako, chọọ ka e towe ya. O gwudịịrị onwe ya ili ndị oké ozu ma gbaa ‘ụgbọ ịnyịnya dị ebube.’—Aịza. 22:16-18.

Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi ma gbanwee otú anyị si akpa àgwà, Chineke ga-agọzi anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 10)

8. Olee otú Jehova si dọọ Shebna aka ná ntị? Oleekwanụ otú anyị si mara na ọ ga-abụ na aka ná ntị ahụ a dọrọ ya baara ya uru?

8 Chineke ‘kwaturu Shebna n’ọkwá’ ma jiri Elayakim dochie ya n’ihi na ọ na-achọrọ onwe ya otuto. (Aịza. 22:19-21) Ihe a mere mgbe Senakerib Eze Asiria chọrọ ịlụso Jeruselem ọgụ. Eze Asiria mechara zipụ ndị isi ya na ìgwè ndị agha ya ka ha yie Ndị Juu egwu ma mee ka Hezekaya chịliere ya aka elu. (2 Eze 18:17-25) E zipụrụ Elayakim ka ọ gaa gwa ndị isi ahụ okwu. Ma, ọ bụghị naanị ya so gaa. Ya na mmadụ abụọ ọzọ so. Otu n’ime ha bụ Shebna, onye bụzi odeakwụkwọ. Nke a, ò gosighị na Shebna eweghị iwe, kama o weturu onwe ya ala ma kweta ịrụ ọrụ dị ala? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Shebna? Ka anyị tụlee atọ n’ime ha.

9-11. (a) Olee ihe dị ezigbo mkpa anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere Shebna? (b) Olee otú obi dị gị maka otú Jehova si meso Shebna?

9 Nke mbụ, a napụrụ Shebna ọkwá ya. Ihe a mere ya na-egosi na “nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.” (Ilu 16:18) Ọ bụrụ na e nwere ọrụ ndị e nyere gị n’ọgbakọ nke nwere ike ime ka ndị mmadụ mara gị, ị̀ na-agbalị ka isi ghara ibuwe gị? Ị̀ na-eto Jehova maka ihe i nwere ike imeli ma ọ bụ ihe ndị ị rụzuru? (1 Kọr. 4:7) Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche; kama ka ọ na-eche echiche iji nwee uche zuru okè.”—Rom 12:3.

10 Nke abụọ, aka ná ntị Jehova dọrọ Shebna nwere ike igosi na o leghị Shebna anya ka onye na-agaghị agbanweli. (Ilu 3:11, 12) Ndị a napụrụ ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ taa nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere Shebna. Kama iwewe iwe, ha kwesịrị iji obi ha niile nọgide na-efe Chineke ma were aka ná ntị ahụ a dọrọ ha ka ihe na-egosi na Jehova hụrụ ha n’anya. Cheta na Nna anyị agaghị ele anyị anya ka ndị na-agaghị agbanweli ma anyị weda onwe anyị ala. (Gụọ 1 Pita 5:6, 7.) Aka ná ntị Jehova na-adọ anyị maka na ọ hụrụ anyị n’anya bụ ụzọ o si na-akpụzi anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikwe ka ọ na-akpụzi anyị.

11 Nke atọ, ndị nne na nna na ndị okenye nwere ike ịmụta ihe n’otú Jehova si dọọ Shebna aka ná ntị. Gịnị ka ha nwere ike ịmụta? Ọ bụ eziokwu na Jehova kpọrọ mmehie asị, ma ọ ka hụkwara onye ahụ mere ihe ọjọọ n’anya. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ okenye chọrọ ịdọ nwa gị ma ọ bụ nwanna aka ná ntị, ị̀ ga-eṅomi Jehova, kpọọ ihe ahụ o mere asị, ma lekwasị anya n’ebe ọ na-eme nke ọma?—Jud 22, 23.

12-14. (a) Olee otú ụfọdụ si eme ma Jehova dọọ ha aka ná ntị? (b) Olee otú Okwu Chineke si nyere otu nwanna aka ịgbanwe àgwà ya? Oleekwa uru ọ baara ya?

12 Ọ dị mwute na a dọọ ụfọdụ ndị aka ná ntị, ha ewee iwe hapụ Jehova na ọgbakọ ya. (Hib. 3:12, 13) Ma, ọ̀ pụtara na e nweghị ike inyere ndị ọ dị otú ahụ aka? Mba. Dị ka ihe atụ, a chụrụ Graham n’ọgbakọ ma mechaa nabata ya. Ma, mgbe a nabatachara ya, ọ kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Otu okenye gbalịrị imeta Graham enyi, ya emechaa gwa okenye ahụ ka ọ mụwara ya Baịbụl.

13 Okenye ahụ kwuru, sị: “Nsogbu Graham bụ na ọ dị mpako. Ọ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara ndị okenye kpere ya ikpe, a chụọ ya n’ọgbakọ. N’ihi ya, n’ọmụmụ ihe ndị mbụ anyị mụrụ, anyị ji oge ahụ mụọ ihe Baịbụl kwuru banyere mpako na nsogbu o nwere ike ịkpata. Graham bịara jiri Okwu Chineke leruo onwe ya anya, ihe ọ chọpụtara adịghị ya mma. Ihe mechara mee dị ịtụnanya. Mgbe ọ ghọtara na ọ dị mpako, nakwa na ihe bụ nsogbu ya bụ ịhụta ebe ndị ọzọ na-emejọ, ọ malitere ịgbanwe ozugbo. O bidoro ịgachi ọmụmụ ihe anya, jiri obi ya niile na-amụ Baịbụl ma na-ekpe ekpere kwa ụbọchị. Ebe ọ bụ onyeisi ezinụlọ, o nyekwaara ndị ezinụlọ ya aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. Ihe a o mere tọgburu nwunye ya na ụmụ ya atọgbu.”—Luk 6:41, 42; Jems 1:23-25.

14 Okenye ahụ kwukwara, sị: “Otu ụbọchị, Graham gwara m ihe metụrụ m n’obi. Ọ sịrị: ‘Amarala m eziokwu kemgbe ọtụtụ afọ, sụọkwa ụzọ. Ma ọ bụ ugbu a ka m nwere ike ikwu na m hụrụ Jehova n’anya.’ Ọ dịghị anya, e nye Graham ọrụ inye ndị mmadụ maịkrofon n’ọmụmụ ihe. O jikwa obi ụtọ na-arụ ọrụ ahụ. Ihe mere ya kụziiri m na ọ bụrụ na mmadụ adị umeala n’obi ma nabata aka ná ntị a dọrọ ya, Jehova ga-agọzi ya mmaji kwuru mmaji.”

NA-EṄOMI CHINEKE NA KRAỊST MA Ị DỌWA MMADỤ AKA NÁ NTỊ

15. Anyị chọọ ka ndị mmadụ nabata aka ná ntị anyị na-adọ ha, gịnị ka anyị ga-eme?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ezigbo ndị nkụzi, anyị ga-ebu ụzọ bụrụ ezigbo ụmụ akwụkwọ. (1 Tim. 4:15, 16) Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Jehova nyere ikike ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị. Ha kwesịrị ịnọgide na-adị umeala n’obi ma kwe ka Jehova na-eduzi ha ná ndụ. Ndị ọzọ hụ na ha dị umeala n’obi, ha ga na-akwanyere ha ùgwù. Ọ ga-adịkwara ha mfe ịnabata aka ná ntị ha na-adọ ha. Ka anyị tụlee gbasara Jizọs.

16. Olee ihe ụfọdụ anyị ga-amụta n’aka Jizọs banyere ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị na ịkụzi ihe nke ọma?

16 Jizọs gere Nna ya ntị mgbe niile, ma mgbe ime otú ahụ na-adịghịrị ya mfe. (Mat. 26:39) O toro Nna ya maka ihe ndị ọ kụziri na amamihe o nyere ya. (Jọn 5:19, 30) Otú Jizọs si dị umeala n’obi nakwa otú o si rube isi mere ka ndị mmadụ bịakwute ya. O mekwara ka ọ bụrụ onye nkụzi na-eme ebere. (Gụọ Luk 4:22.) Okwu o ji obiọma na-agwa ndị mmadụ gbara ha ume ma mee ka ndị dara mbà n’obi nwee ume. (Mat. 12:20) Ma mgbe ndịozi ya mere ihe kwesịrị iwe ya iwe, o ji obiọma meso ha ihe iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ otú o si gbazie ha mgbe ha na-arụrịta ụka gbasara onye ka ibe ya.—Mak 9:33-37; Luk 22:24-27.

17. Olee àgwà ọma ndị ga-enyere ndị okenye aka ilekọta ọgbakọ nke ọma?

17 Ndị niile e nyere ikike iji Baịbụl dọọ mmadụ aka ná ntị kwesịrị iṅomi Kraịst. N’eziokwu, ime otú ahụ na-egosi na ha chọrọ ka Chineke na Ọkpara ya na-eduzi ha. Pita onyeozi kwuru, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta, ọ bụghị ná mmanye, kama jirinụ obi unu na-azụ ha; ọ bụghị n’ihi na unu hụrụ uru aghụghọ n’anya, kama n’ịnụ ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa ime ndị bụ́ ihe nketa nke Chineke dị ka ọ̀ bụ unu nwe ha, kama ghọọrọnụ ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (1 Pita 5:2-4) Ọ bụrụ na ndị okenye ejiri obi ụtọ na-erubere Chineke na Kraịst, bụ́ onyeisi ọgbakọ isi, ọ ga-abara ma hanwa ma ndị ha na-elekọta uru.—Aịza. 32:1, 2, 17, 18.

18. (a) Olee ihe Jehova chọrọ ka ndị nne na nna mee? (b) Olee otú Chineke si enyere ndị nne na nna aka ịrụ ọrụ o nyere ha?

18 Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ezinụlọ. Jehova gwara ndị isi ezinụlọ, sị: “Unu emela ụmụ unu ihe iwe, kama na-azụlitenụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Olee otú ihe a dịruru ná mkpa? Ihe Ilu 19:18 kwuru gosiri na ndị nne na nna na-anaghị adọ ụmụ ha aka ná ntị nwere ike ịkpatara ụmụ ha ọnwụ. N’eziokwu, Jehova nyere ndị nne na nna ọrụ ịdọ ụmụ ha aka ná ntị. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, ha ga-aza ya ajụjụ. (1 Sam. 3:12-14) Ma, Jehova na-enye ndị nne na nna amamihe na ike ma ha rịọ ya n’ekpere ma kwe ka Okwu ya na mmụọ nsọ na-eduzi ha.—Gụọ Jems 1:5.

ỊMỤTA OTÚ Ị GA-ESI NA-EBI N’UDO RUO MGBE EBIGHỊ EBI

19, 20. (a) Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị nabata aka ná ntị Chineke na-adọ anyị? (b) Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

19 Ọ bụrụ na anyị anabata aka ná ntị Jehova na-adọ anyị ma ṅomie otú ya na Jizọs si adọ anyị aka ná ntị, ha ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji. Ma enweghị ihe ọzọ, ezinụlọ anyị na ọgbakọ anyị ga-adị n’udo. Ha ga-ama na a hụrụ ha n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe. Ihe a bụ uru ole na ole n’ime uru ndị anyị ga-erite n’ọdịnihu. (Ọma 72:7) Aka ná ntị Jehova na-adọ anyị na-akụziri anyị otú anyị na ụmụnna anyị ga-esi ebi n’udo ruo mgbe ebighị ebi ka ezinụlọ Jehova na-elekọta. (Gụọ Aịzaya 11:9.) Ọ bụrụ na anyị ana-ele aka ná ntị Jehova na-adọ anyị anya otú a, anyị ga-aghọta na ọ bụ ụzọ magburu onwe ya Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya.

20 N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-amụtakwu banyere ịdọ aka ná ntị n’ezinụlọ, nakwa n’ọgbakọ. Anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi rụọ ahụ́ anyị ụka, nakwa otú anyị nwere ike isi zere ihe dị njọ karịa mwute anyị nwere ike inwe ma a dọọ anyị aka ná ntị.