Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ile Ọbịa Bụ Ihe Na-eme Obi Ụtọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme

Ile Ọbịa Bụ Ihe Na-eme Obi Ụtọ Anyị Kwesịrị Ịna-eme

“Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.”—1 PITA 4:9.

ABỤ: 100, 87

1. Olee nsogbu ndị bịaara Ndị Kraịst n’oge ndịozi?

N’AGBATA afọ 62 na afọ 64, Pita onyeozi degaara “ndị bi nwa oge n’ebe dị iche iche n’ime Pọntọs, Galeshia, Kapadoshia, Eshia, na Bitinia,” akwụkwọ ozi. (1 Pita 1:1) Ụmụnna ndị a si ebe dị iche iche. Ọnwụnwa ndị tara akpụ na-ere ka ọkụ, bịaara ha, n’ihi ya, e kwesịrị ịgba ha ume ma duzie ha. Ha bikwa n’oge ihe siri ezigbo ike. Pita gwara ha, sị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso.” A ga-ebibi Jeruselem n’ihe na-erughị afọ iri. Olee ihe ga-enyere Ndị Kraịst nọ ebe niile aka idi oge ọjọọ ndị ahụ?—1 Pita 4:4, 7, 12.

2, 3. Olee ihe mere Pita ji gwa Ndị Kraịst ibe ya ka ha na-ele ibe ha ọbịa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

2 Pita gwara ụmụnna ya sị: “Na-elenụ ibe unu ọbịa n’atamughị ntamu.” (1 Pita 4:9) Ihe okwu Grik e si sụgharịa “ile ọbịa” pụtara bụ “ịhụ ndị anyị na-amaghị n’anya, ma ọ bụ imere ha ihe ọma.” Cheta na Pita gwara ndị Kraịst ibe ya ka ha na-ele ‘ibe ha’ ọbịa, n’agbanyeghị na ha ma ibe ha nke ọma, sokwara ibe ha emekọ ihe. Olee uru ile ndị ọzọ ọbịa ga-abara ha?

3 Ọ ga-eme ka ha dịrị n’otu. Oleekwanụ maka gịnwa? Mmadụ ọ̀ gwatụla gị bịa n’ụlọ ya? Ọ̀ bụ na e nweghị ihe ndị unu mere n’ụlọ onye ahụ nke ọ na-abụ i cheta, obi atọọ gị ụtọ? Mgbe i lere ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ unu ọbịa, ọ̀ bụ na o meghị ka gị na ha dịkwuo ná mma? Ọ bụrụ na anyị na-ele ụmụnna anyị ọbịa, anyị ga-amata ha nke ọma karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ndị Kraịst nọ n’oge Pita na ibe ha kwesịrị ịna-akpachikwu anya ka ihe na-akakwu njọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ndị Kraịst bi ‘n’oge ikpeazụ a.’—2 Tim. 3:1.

4. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

4 Olee ohere anyị nwere ike iji lee ‘ibe anyị ọbịa’? Olee ihe anyị ga eme ma e nwee ihe ndị nwere ike igbochi anyị ile ndị ọzọ ọbịa? Gịnị ga-enyere anyị aka ịbụ ezigbo ndị ọbịa?

OHERE NDỊ ANYỊ NWERE IKE IJI LEE NDỊ ỌZỌ ỌBỊA

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-ele ndị ọzọ ọbịa ma anyị gaa ọmụmụ ihe?

5 N’ọmụmụ ihe: Jehova na nzukọ ya kpọrọ anyị ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ahụ́ ruo onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe anyị ala, karịchaa ndị ọhụrụ. (Rom 15:7) Ọ bụ Jehova kpọkwara ha, n’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka ahụ́ ruo ha ala n’agbanyeghị otú ha dị ma ọ bụ ụdị uwe ha yi bịa. (Jems 2:1-4) Ọ bụrụ na onye ọhụrụ bịara ọmụmụ ihe anyị enweghị onye ya na ya nọ n’oche, ì nwere ike ịgwa ya ka gị na ya nọrọ? Obi ga-adị ya ụtọ ma i nyere ya aka ịghọta ihe a na-amụ ma ọ bụkwanụ ịchọta ebe a na-agụ na Baịbụl. Ime otú ahụ ga-abụ ụzọ dị mma anyị ga-esi ‘na-ele ọbịa.’—Rom 12:13.

6. Olee ndị anyị kwesịrị ịkacha akpọ ka ha bịa rie nri na nke anyị?

6 Iso anyị rie nri n’ụlọ anyị: N’oge Baịbụl, otu n’ime ụzọ ndị mmadụ si ele ndị ọzọ ọbịa bụ ịgwa ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ ha. (Jen. 18:1-8; Ikpe 13:15; Luk 24:28-30) Mmadụ kpọọ ibe ya ka ọ bịa rie nri n’ụlọ ya, o gosiri na ọ chọrọ ka ya na onye ahụ bụrụ enyi ma dịrị n’udo. Olee ndị anyị kwesịrị ịkacha akpọ ka ha bịa rie nri na nke anyị? O kwesịrị ịbụ ụmụnna ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ihe e siwere anyị ike, ọ̀ bụghị ha ka anyị ga-achọ ka ha bịa nyere anyị aka? Anyị na ha kwesịrị ịbụ ezigbo enyi ma na-adị n’udo. N’afọ 2011, Òtù Na-achị Isi gbanwere oge ndị ezinụlọ Betel n’Amerịka ji enwe Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ka ọ bụrụzie mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere isii nke mgbede, kama ịbụ mgbe ọ fọrọ nkeji iri na ise ka ọ kụọ elekere asaa nke mgbede. Gịnị mere ha ji mee mgbanwe a? E kwuru na ihe mere e ji mee ya bụ na o nwere ike ime ka ndị ezinụlọ Betel nwee ohere ile ibe ha ọbịa ma ọ bụ ịga na nke ndị chọrọ ile ha ọbịa ma a gbasaa ọmụmụ ihe ahụ n’oge. Alaka Ụlọ Ọrụ ndị ọzọ mekwara mgbanwe a. Ihe a emeela ka ndị ezinụlọ Betel dịrịkwuo n’otu karịa mgbe ọ bụla ọzọ.

7, 8. Olee otú anyị nwere ike isi lee ndị si esi bịa kwuo okwu n’ọgbakọ anyị ọbịa?

7 Oge ndị si n’ọgbakọ ọzọ, ndị nlekọta sekit, ma ọ bụkwanụ mgbe ụfọdụ, ndị si n’alaka ụlọ ọrụ bịa n’ọgbakọ anyị kwuo okwu, bụ oge anyị ga-eji lee ụmụnna ndị a ọbịa. (Gụọ 3 Jọn 5-8.) Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịkpọ ha ka ha bịa rie nri n’ụlọ anyị. Ì nwere ike ime ya?

8 Otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka kwuru, sị: “Kemgbe ọtụtụ afọ, mụ na di m na-ele ndị si esi bịa kwuo okwu n’ọgbakọ anyị na ndị nwunye ha ọbịa n’ụlọ anyị. Mgbe ọ bụla anyị na ha nọkọrọ, obi na-atọ anyị ụtọ, okwukwe anyị ana-esikwu ike. Anyị akwatụbeghị mmakwaara maka ya.”

9, 10. (a) Olee ndị nwere ike ịnọtụ na nke anyị ma ha bịa? (b) Ndị ụlọ ha na-ebughị ibu, hà nwere ike inye ụlọ ha? Nye ihe atụ.

9 Ndị ọbịa na-agaghị ala ozugbo: N’oge ochie, ụzọ a na-esikarị ele ndị mmadụ ọbịa bụ inye ha ebe ha ga-ebi. (Job 31:32; Faị. 22) Taa, anyị nwekwara ike ime otú ahụ. Ọtụtụ mgbe, a na-achọtara ndị nlekọta sekit ụlọ ha ga-anọ ma ha bịa ileta ọgbakọ. Ndị bịara ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova na ndị na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka nwekwara ike ịchọ ebe ha ga-ebi. Ọdachi ndị na-emere onwe ha nwere ike gbawa ezinụlọ ụfọdụ aka ụlọ, mee ka ha chọọ ebe ha ga-anọ ruo mgbe a rụzichaara ha ụlọ ha. Anyị ekwesịghị iche na ọ bụ naanị ndị ụlọ ha buru ibu bụ ndị nwere ike inye ụlọ ha, o nwere ike ịbụ na ha enyela ụlọ ha ọtụtụ ugboro. Ì nwere ike inye ụlọ gị ọ bụrụgodị na o bughị ibu?

10 Otu nwanna nwoke bi na Saụt Koria na-echeta mgbe o nyere ndị bịara ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova ụlọ. O kwuru, sị: “Obi akachaghị m ná mmalite n’ihi na mụ na nwunye m ka lụrụ ọhụrụ, ụlọ anyị dịkwa obere. Ma, obi tọrọ anyị ụtọ na anyị nyere ha ụlọ anyị. Mụ na nwunye m hụrụ otú obi si atọ di na nwunye ụtọ ma ha na-efe Jehova ma na-eme ihe ha kpebiri ime n’ozi Jehova.”

11. Olee ihe mere anyị ji kwesi ile ndị bịara ọhụrụ n’ọgbakọ anyị ọbịa?

11 Ndị bịara ọhụrụ n’ọgbakọ anyị: Ndị ụfọdụ ma ọ bụ ezinụlọ ụfọdụ nwere ike ịkwafeta n’ebe anyị bi. Ụfọdụ nwere ike ịbụ ndị bịara ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. E nwere ike izite ndị ọsụ ụzọ ụfọdụ ka ha bịa nye aka n’ọgbakọ anyị. Ha niile ahapụla ụlọ ha bịa n’obodo ọhụrụ, n’ọgbakọ ọhụrụ, n’ebe a na-asụ asụsụ ọhụrụ ma ọ bụkwanụ n’ebe e nwere omenala dị iche na nke ha. Ịkpọ ha ka ha soro anyị rie nri ma ọ bụ gaa legharịa anya nwere ike ime ka ha nweta ndị enyi ọhụrụ, meekwa ka ebe ọhụrụ a mara ha ahụ́.

12. Olee ihe gosiri na ọ bụghị naanị mgbe anyị siri elu na ala ka anyị kwesịrị ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa na nke anyị rie nri?

12 Ọ bụghị naanị mgbe anyị siri elu na ala ka anyị kwesịrị ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa na nke anyị. (Gụọ Luk 10:41, 42.) Otu nwanna chetara ihe mere mgbe ya na nwunye ya ka malitere ozi ala ọzọ. O kwuru, sị: “Anyị akatabeghị ahụ́ mgbe ahụ, ịhụ ndị ụlọ na-agụsikwa anyị agụụ ike. N’otu mgbede, ịhụ ndị ụlọ gụsiri nwunye m agụụ ike, m mere ihe niile m nwere ike ime ka m nyere ya aka, ma o nweghị isi. N’ihe dị ka elekere anya asaa na ọkara nke mgbede, a kụrụ aka n’ọnụ ụzọ anyị. Anyị meghere ụzọ hụ otu onye a na-amụrụ Baịbụl ka o ji oroma atọ o wetaara anyị. Ọ bịara ikele ndị ozi ala ọzọ bịara ọhụrụ. Anyị kpọbatara ya n’ime ụlọ, nye ya mmiri, meziere ya tii na chọkọlet dị ọkụ. Anyị amaghị asụsụ Swahili mgbe ahụ, yanwa amaghịkwanụ Bekee. Ma, ihe a merenụ mere ka anyị na ụmụnna anyị ndị obodo ahụ malite ịbụ ezigbo enyi.”

IMERI IHE NDỊ NWERE IKE IGBOCHI ANYỊ ILE NDỊ ỌZỌ ỌBỊA

13. Olee uru mmadụ na-erite ma ọ na-ele ọbịa?

13 Ò nwetụla mgbe o siiri gị ike ile ndị ọzọ ọbịa? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na ohere gị na ndị ọzọ gaara eji enwe obi ụtọ, metakwa ezigbo ndị enyi ga-adị mgbe ebighị ebi, funahụrụ gị. Ile ọbịa bụ otu n’ime ihe ndị e ji achụ owu ọmụma ọsọ. Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị, ‘Gịnị mere ile ọbịa ji esiri ụfọdụ ndị ike?’ E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya.

14. Olee ihe anyị nwere ike ime ma anyị enwechaghị oge na ike anyị ga-eji ele ọbịa ma ọ bụ ịga na nke ndị chọrọ ile anyị ọbịa?

14 Oge na ike: Ndị ohu Jehova anaghị enwecha ohere, ha nwere ọtụtụ ọrụ ha na-arụ. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike na-eche na ha enweghị oge ma ọ bụ ike ha ga-eji lee ọbịa. Ọ bụrụ otú ahụ ka ọ dị gị, i nwere ike ilebagharị anya n’oge ị haziri i ji na-eme ihe ndị ị na-eme ugbu a. Ì nwere ike ime mgbanwe ụfọdụ ka i nwee ike inwe oge na ume ị ga-eji ele ọbịa ma ọ bụ gaa na nke ndị chọrọ ile gị ọbịa? Akwụkwọ Nsọ gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-ele ọbịa. (Hib. 13:2) Ọ dịghị njọ iwepụta oge lee ndị ọzọ ọbịa. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ịna-eme. Ka i nwee ike ime ya, i nwere ike ịhapụtụ ihe ụfọdụ na-adịchaghị mkpa ị na-eme.

15. Olee ihe nwere ike ịna-echegbu ụfọdụ ndị ma ha chọọ ile ndị ọzọ ọbịa?

15 Otú i si ele onwe gị anya: Ò nwetụla mgbe ị chọrọ ile mmadụ ọbịa, ya adị gị ka ị gaghị emeli ya? Ụfọdụ ndị na-eme ihere ma na-echegbu onwe ha na ha amaghị ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ mee ka obi tọọ ndị ọbịa ha ụtọ. Ụfọdụ ndị na-enwechaghị ego na-eche na ha agaghị eleli ndị ọzọ ọbịa otú ụmụnna ndị ọzọ si ele. Cheta na ihe kacha mkpa abụghị otú ụlọ maruru ná mma, kama ọ bụ ka ọ dịrị ọcha, a haziekwa ihe ndị dị na ya ahazie.

16, 17. Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị ma anyị chọọ ile ndị mmadụ ọbịa?

16 Ọ bụrụ na ị na-echegbukarị onwe gị na ị gaghị eleli ndị ọzọ ọbịa, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Otu okenye nọ na Briten kwuru, sị: “Ụjọ nwere ike na-atụtụ gị ma ị kwadowe ile ndị ọzọ ọbịa. Uru ndị ị ga-erite ma ị na-ele ndị ọzọ ọbịa abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, otú ahụ anyị na-erite n’ihe ọ bụla anyị na-eme n’ozi Jehova. E nweela mgbe mụ na ndị ọbịa m ṅụrụ naanị kọfị, obi tọkwara m ụtọ.” Cheta na ime ihe ndị gosiri na ị hụrụ ndị ọbịa gị n’anya na-enyekarị aka. (Fil. 2:4) Ọ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ ịkọ ihe ndị merela ha ná ndụ. Oge kacha mma anyị ga-eji anụ ihe ndị ahụ bụ ma anyị na ha nọrịa. Okenye ọzọ kwuru, sị: “Ịkpọ ụmụnna mụ na ha nọ n’ọgbakọ ka ha bịa n’ụlọ m na-eme ka m matakwuo ha, karịchaa otú ha si bata n’ọgbakọ.” Ime ihe ga-abara ndị ọbịa gị uru ga-eme ka obi tọọ ha niile ụtọ.

17 Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ na-enyekarị ndị bịara ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova ụlọ ya. O kwuru, sị: “Ná mmalite, m nọ na-echegbu onwe m n’ihi na o nweghị oké ihe dị n’ụlọ m. Oche dị na ya bụ oche ochie. Nwunye otu onye na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ ndị ahụ mere ka ahụ́ ruo m ala. Ọ gwara m na mgbe ya na di ya na-eleta ọgbakọ dị iche iche, izu kacha atọ ha ụtọ bụ izu ha gara na nke onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na o nwechaghị ego, ọ naghịkwa ebi ndụ okomoko otú ahụ hanwa na-anaghị ebi. Nke a chetaara m ihe mama m na-agwa anyị mgbe anyị bụ ụmụaka. Ọ na-agwa anyị, sị: ‘Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya.’” (Ilu 15:17) Ọ baghị uru ichegbu onwe anyị n’ihi na ihe bụ́ mkpa bụ ka anyị gosi ndị ọbịa anyị na anyị hụrụ ha n’anya.

18, 19. Olee otú ile ndị ọzọ ọbịa nwere ike isi mee ka anyị gbanwee otú anyị si ele ndị ọzọ anya?

18 Otú i si ele ndị ọzọ anya: Ò nwere onye nọ n’ọgbakọ unu na-akpasu gị iwe? O nwere ike ịbụ na obi anaghị adị gị mma gbasara onye ahụ. Ọ bụrụ na ị gbanweghị otú i si ele ya anya, ị ga na-eburu ya iwe n’obi. Ihe a nwere ike ime ka ị ghara ile ya ọbịa. O nwekwara ike ịbụ na mmadụ mejọrọ gị n’oge gara aga, ya ana-esiri gị ike ichefu ya.

19 Baịbụl kwuru na ile ọbịa nwere ike ime ka anyị na ndị mmadụ na-adị ná mma, ma ndị iro anyị. (Gụọ Ilu 25:21, 22.) Ile mmadụ ọbịa nwekwara ike ime ka ị kwụsị iburu ya iwe n’obi, meekwa ka gị na ya dịkwuo ná mma. O nwere ike ime ka ị hụ àgwà ọma onye ahụ nwere, nke mere ka Jehova kpọbata ya n’ọgbakọ. (Jọn 6:44) Ọ bụrụ na anyị akpọọ mmadụ ka ọ bịa na nke anyị mgbe ọ na-atụghị anya ya maka na anyị hụrụ ya n’anya, o nwere ike ime ka anyị na ya malite ịdị ná mma. Olee ihe ị ga-eme iji gosi na ihe mere i ji kpọọ ya bụ n’ihi na ị hụrụ ya n’anya n’eziokwu? Otu ụzọ i nwere ike isi eme ya bụ ime ihe Pọl kwuru ná Ndị Filipaị 2:3. Ọ sịrị: “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” Ọ bụrụ na anyị achọpụta ụzọ ụmụnna anyị si ka anyị mma, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ha n’anya, meekwa ka anyị jiri obi anyị lee ha ezigbo ọbịa. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’okwukwe ha, ndidi ha, otú ha si akata obi, ma ọ bụkwanụ n’àgwà ha ndị ọzọ e ji mara Ndị Kraịst.

BỤRỤ EZIGBO ONYE ỌBỊA

Ndị kpọrọ oriri na-akwadokarị nke ọma maka ndị ha kpọrọ oriri (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. Gịnị mere anyị ji kwesị ịga na nke onye chọrọ ile anyị ọbịa? Olee otú anyị kwesịrị isi eme ya?

20 Ọbụ abụ bụ́ Devid jụrụ, sị: “Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?” (Ọma 15:1) Mgbe o kwuchara ihe a, o kwuziri gbasara àgwà Chineke chọrọ ka ndị ga-abụ ndị ọbịa ya na-akpa. Otu bụ ịna-eme ihe anyị kwuru. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.” (Ọma 15:4) Ọ bụrụ na anyị ekweta ịga na nke onye kpọrọ anyị ka anyị bịa na nke ya, anyị ekwesịghị ịkagbu ya n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ. O nwere ike ịbụ na onye kpọrọ anyị akwadebechaala ihe ọ chọrọ iji ele anyị ọbịa, mbọ niile ọ gbara nwere ike ifu ọhịa ma anyị sị na anyị agaghị abịazi. (Mat. 5:37) Ụfọdụ akagbuola òkù a kpọrọ ha n’ihi na ha chọrọ ịga nke ha chere ka ya mma. I mee otú ahụ, ò gosiri na ị hụrụ onye ahụ n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù? Kama, anyị kwesịrị ịga ma gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọ bụla ọ ga-enye anyị. (Luk 10:7) E nwee ihe ga-eme ka anyị ghara ịga, anyị kwesịrị ịgwa onye ahụ ozugbo iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya ma na-eche banyere ya.

21. Olee otú ịkwanyere omenala obodo anyị bi na ya ùgwù ga-esi enyere anyị aka ịbụ ezigbo ndị ọbịa?

21 Anyị kwesịkwara ịkwanyere omenala obodo anyị bi na ya ùgwù. N’obodo ụfọdụ, e nwee oriri, a na-anabata ndị a na-akpọghị akpọ. N’ebe ọzọ, ha na-achọ ka a kpọọ mmadụ akpọọ tupu ya abịa. Ná mba ụfọdụ, onye kpọrọ oriri na-enye ndị ọbịa ya ihe kacha mma o nwere, ma nye ndị ezinụlọ ya nke fọrọ afọ. N’ebe ụfọdụ, ihe mmadụ nyere ndị ọbịa ya ka ọ na-enye ndị ezinụlọ ya. E nwere ebe ọ na-abụ ndị ọbịa bịawa, ha eweta ihe, ma n’ebe ndị ọzọ, onye kpọrọ oriri anaghị achọ ka ndị ọbịa weta ihe. E nwere ebe a na-achọ ka ndị mmadụ meda obi gwa ndị kpọrọ ha na ha agaghị abịa na nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ a kpọrọ ha, ma nwee ebe a na-ewere ya ka mkparị ma onye ahụ jụ ịbịa na nke mbụ a kpọrọ ya. Ka anyị gbalịa hụ na obi tọrọ onye kpọrọ anyị bịa na nke ya ụtọ.

22. Olee ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị ‘na-ele ibe anyị ọbịa’?

22 Pita kwuru, sị: “Ma ọgwụgwụ ihe niile adịwo nso.” (1 Pita 4:7) Taa, ọ dịla nso karịa mgbe ọ bụla ọzọ. A ga-enwe oké mkpagbu a na-enwetụbeghị kemgbe. Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa a, anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya. Ihe a Pita gwara Ndị Kraịst bara uru ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ sịrị: “Na-elenụ ibe unu ọbịa.” (1 Pita 4:9) N’eziokwu, ile ọbịa na-eme anyị obi ụtọ, bụrụkwa ihe anyị kwesịrị ịna-eme ma ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi.