Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Nne na Nna, Ùnu Na-enyere Nwa Unu Aka Ka O Ruo Ime Baptizim?

Ndị Nne na Nna, Ùnu Na-enyere Nwa Unu Aka Ka O Ruo Ime Baptizim?

“Gịnị mere i ji egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim.”—ỌRỤ NDỊOZI 22:16.

ABỤ: 51, 135

1. Olee ihe ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-achọ ịma tupu e mee ụmụ ha baptizim?

OTU nwata nwaanyị aha ya bụ Blossom Brandt kwuru ihe ndị mere mgbe o kpebiri ime baptizim. O kwuru, sị: “M nọ na-agwa Papa m na Mama m ruo ọtụtụ ọnwa na m chọrọ ime baptizim, mụ na ha na-ekwurịtakwa ya mgbe niile. Ha chọrọ ịma ma m̀ makwa ihe mkpebi a m chọrọ ime pụtara. Abalị iri atọ na otu n’ọnwa Disemba afọ 1934 bụ ụbọchị pụrụ iche ná ndụ m.” Taa, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-achọ inyere ụmụ ha aka ka ha mee mkpebi ndị dị mma. Iyigharị ma ọ bụ igbu oge a ga-eji eme ụmụ ha baptizim n’ihi ihe na-enweghị isi, nwere ike ịkpa adịm ná mma ụmụ ha na Chineke aka ọjọọ. (Jems 4:17) Tupu e mee ụmụ ha baptizim, ha na-achọ ijide n’aka na ụmụ ha ejikerela ime ihe ndị e ji ama onye na-eso ụzọ Kraịst.

2. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị nlekọta sekit chọpụtarala? (b) Olee ihe ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Ụfọdụ ndị nlekọta sekit achọpụtala na e nwere ndị na-eto eto dị n’agbata afọ iri na asatọ na afọ iri abụọ na atọ na-emebeghị baptizim, n’agbanyeghị na nne na nna ha bụ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ n’ime ha na-aga ozi ọma na ọmụmụ ihe. Ha na-ewere onwe ha ka Ndịàmà Jehova. Ma, n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ha enyefebeghị Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Olee ihe nwere ike ịkpata ihe a? Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na nne na nna ha gwara ha ka ha chetụgodị. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe anọ na-echegbu ndị nne na nna nke na-egbochi ha inyere ụmụ ha aka iru eru ime baptizim.

NWA M Ò TORUOLA?

3. Olee ihe na-echegbu nne na nna Blossom?

3 Ndị mụrụ Blossom anyị kwuru banyere ha na paragraf nke mbụ na-echegbu onwe ha ma ọ̀ makwa ihe ime baptizim pụtara. Olee otú ndị nne na nna ga-esi amata ma nwa ha ò toruola inyefe Jehova onwe ya?

4. Olee otú ihe Jizọs kwuru na Matiu 28:19, 20 ga-esi enyere ndị nne na nna aka ịkụziri ụmụ ha ihe?

4 Gụọ Matiu 28:19, 20. Dị ka anyị kwurula n’isiokwu bu nke a ụzọ, Baịbụl ekwughị afọ ole mmadụ ga-eru tupu e mee ya baptizim. Ma ọ dị mma ka ndị nne na nna chee gbasara ihe inyere mmadụ aka ka ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs pụtara. Okwu Grik e si sụgharịa “ime ndị na-eso ụzọ,” nke dị na Matiu 28:19, pụtara ịkụziri mmadụ ihe, buru n’obi na onye ahụ ga-aghọ nwa akwụkwọ ma ọ bụ onye na-eso ụzọ. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ onye na-amụ ma na-aghọta ihe Jizọs na-akụzi, kpebisiekwa ike ịna-eme ihe ndị ahụ. N’ihi ya, mkpa ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ inyere ụmụ ha aka malite mgbe ha ka dị obere ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịghị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Ma, Baịbụl kwuru na ụmụaka nwediri ike ịghọta eziokwu Baịbụl, jirikwa ya kpọrọ ihe.

5, 6. (a) Gịnị ka ihe Baịbụl kwuru banyere Timoti na-eme ka anyị kwuo banyere baptizim ya? (b) Olee otú ndị nne na nna ma ihe ga-esi enyere ụmụ ha aka?

5 Timoti bụ onye na-eso ụzọ Jizọs ji ofufe Chineke kpọrọ ihe malite mgbe ọ na-eto eto. Pọl onyeozi kwuru na Timoti mụtara eziokwu Baịbụl ‘malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ.’ Nna Timoti abụghị Onye Kraịst, ma nne ya na nne nne ya nyeere ya aka iji Okwu Chineke kpọrọ ihe. Nke a mere ka okwukwe ya sie ezigbo ike. (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) Mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na otu, e nyere ya ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ.—Ọrụ 16:1-3.

6 Nke bụ eziokwu bụ na nwatakịrị nke ọ bụla dị iche n’ibe ya. Ụfọdụ na-aghọta eziokwu, na-eme ezigbo mkpebi, ma chọọ ka e mee ha baptizim mgbe ahụ ha ka na-eto eto. Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị adị njikere ime baptizim ruo mgbe ha tolitere. Ndị nne na nna ma ihe anaghị amanye ụmụ ha ka ha mee baptizim. Kama, ha na-enyere nwa ha nke ọ bụla aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ otú ike kwere ya. Obi ga-atọ ndị nne na nna ụtọ ma nwa ha kpaa àgwà ka onye ma ihe. (Gụọ Ilu 27: 11.) Ma, ha ekwesịghị ichefu na ihe bụ mkpa ha bụ ime ka ụmụ ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ha kwesịrị ịjụ onwe ha ajụjụ a, ‘Nwa m ọ̀ mụtala ọtụtụ ihe na Baịbụl nke ga-eme ka o nyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim?’

NWA M Ọ̀ MA NKE A NA-AKỌ GBASARA CHINEKE?

7. Ọ̀ bụ eziokwu na onye chọrọ ime baptizim ga-amata ihe niile Baịbụl na-akụzi tupu e mee ya baptizim? Kọwaa.

7 Ndị nne na nna kwesịrị ịgba mbọ ka ụmụ ha mụta eziokwu nke ọma. Ọ ga-enyere ụmụ ha aka ka ha nyefee Chineke onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ma nke a apụtaghị na nwatakịrị ga-ama ihe niile Baịbụl na-akụzi tupu ya enyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim. Onye na-eso ụzọ Jizọs ọ bụla ga na-amụ ihe ma mgbe o mechara baptizim. (Gụọ Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ma, olee ihe mmadụ kwesịrị ibu ụzọ mata tupu e mee ya baptizim?

8, 9. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Pọl na onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ?

8 Ihe mere n’otu ezinụlọ n’oge ndịozi ga-enyere ndị nne na nna aka. (Ọrụ 16:25-33) N’ihe dị ka afọ 50, mgbe Pọl na-aga ozi ọma n’obodo dị iche iche na nke ugboro abụọ ya, ọ gara Filipaị. Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, e jidere ya na Saịlas n’ihi ebubo ụgha e boro ha ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. N’abalị ya, ala ọma jijiji mere, ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ niile emeghee. Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ tụrụ ụjọ ma chọọ igbu onwe ya n’ihi na o chere na ndị mkpọrọ ahụ niile agbaala ọsọ. Ma Pọl gwara ya ka ọ ghara igbu onwe ya. Pọl na Saịlas ziri ya na ndị ezinụlọ ya ozi ọma banyere Jizọs. Gịnị ka ha mere mgbe ha mụtachara eziokwu banyere Jizọs? E mere ha baptizim n’egbughị oge. Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị?

9 O nwere ike ịbụ na onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ bụ onye agha Rom lara ezumike nká. Ọ maghị nke a na-akọ n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi ya, o kwesịrị ịmụta ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, ghọtakwa ihe mmadụ ịbụ onye na-efe Chineke pụtara, ma kpebisie ike ịna-erube isi n’ihe Jizọs na-akụzi. Ihe ndị ọ mụtara n’obere oge ahụ a kụziiri ya ihe, nakwa otú obi si na-atọ ya ụtọ mere ka o mee baptizim. O doro anya na ọ nọgidere na-amụ Okwu Chineke mgbe o mechara baptizim. Gịnị ka ihe a merenụ ga-eme ka i mee ma nwa gị gwa gị na ya chọrọ ime baptizim n’ihi na ọ mụtala ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, dị ka ihe mmadụ inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim pụtara? I nwere ike ịgwa ya ka ọ gaa kọọrọ ndị okenye ka ha mara ma ò ruru eru ime baptizim. * Mgbe o mechara baptizim, ọ ga na-amụ banyere Jehova n’oge niile ọ dị ndụ, ruodị mgbe ebighị ebi, otú ahụ ndị ọzọ e mere baptizim na-eme.—Rom 11:33, 34.

OLEE AGỤMAKWỤKWỌ GA-AKACHA ABARA NWA M URU?

10, 11. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị nne na nna kwurula? (b) Olee ihe kwesịrị ịka ndị nne na nna mkpa?

10 Ụfọdụ ndị nne na nna kwuru na ọ kacha mma ka nwa ha buru ụzọ gụọ ezigbo akwụkwọ, nweta ezigbo ọrụ tupu e mee ya baptizim. Ha nwere ike buru ezi ihe n’obi na-eche ụdị ihe a, ma, ihe ndị a hà ga-eme ka ihe gaziere nwa ha n’eziokwu? Ihe a ha na-eche, ọ̀ dabara n’ihe Baịbụl kwuru? Olee ihe Jehova chọrọ ka anyị jiri ndụ anyị na-eme?—Gụọ Ekliziastis 12:1.

11 Anyị kwesịrị icheta na ụwa a na ihe ndị dị n’ime ya na-emegide ihe Jehova chọrọ na otú o si eche echiche. (Jems 4:7, 8; 1 Jọn 2:15-17; 5:19) Adịm ná mma nwatakịrị na Jehova bụ ihe ga-akacha eme ka ọ gbaara Setan, ụwa ya na echiche ọjọọ ya ọsọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ewere agụmakwụkwọ na ịrụ ezigbo ọrụ ka ha kacha ha mkpa ná ndụ, ụmụ ha nwere ike na-eche na ihe nke ụwa ka adịm ná mma ha na Jehova mkpa. Ebe ọ bụ na unu hụrụ nwa unu n’anya, ùnu ga-achọ ka ndị ụwa kụziere ya ihe ha chere nwere ike ime ya obi ụtọ? Nke bụ eziokwu bụ na ihe ga-eme ka ihe gaziere anyị, anyị enweekwa ezigbo obi ụtọ ná ndụ bụ ibute Jehova ụzọ ná ndụ anyị.—Gụọ Abụ Ọma 1:2, 3.

Ọ BỤRỤKWANỤ NA NWA M EMEE MMEHIE?

12. Gịnị mere ụfọdụ ndị nne na nna ji achọ ka ụmụ ha cheretụ tupu e mee ha baptizim?

12 Otu nne kwuru ihe mere o ji na-egbochi nwa ya ime baptizim. O kwuru, sị: “Ihere na-eme m ikwu na ihe kacha mee ka m na-egbochi nwa m ime baptizim bụ na e nwere ike ịchụ ya n’ọgbakọ.” O nwekwara ụfọdụ ndị nne na nna ọ dị otú ahụ. Ha na-eche na ọ ga-akacha mma ka nwa ha ghara ime baptizim ruo mgbe o tofere àgwà ụmụaka. (Jenesis 8:21; Ilu 22:15) Ha nwere ike ịna-eche sị, ‘Ebe ọ bụ na nwa m emebeghị baptizim, e nweghị ike ịchụ ya n’ọgbakọ. Gịnị mere na ọ dịghị mma iche ụdị echiche a?—Jems 1:22.

13. Ọ bụrụ na mmadụ emebeghị baptizim, ọ̀ ga-eme ka ọ ghara ịza Jehova ajụjụ? Kọwaa.

13 O doro anya na ndị nne na nna achọghị ka e mee nwa ha baptizim tupu ya ekpebie inyefe Jehova onwe ya. Ma, ọ dịghị mma iche na ọ bụrụ na nwatakịrị emebeghị baptizim, ọ gaghị aza Chineke ajụjụ. N’ihi Gịnị? Ọ bụghị naanị ndị mere baptizim ga-aza Jehova ajụjụ. Kama, nwatakịrị ga-aza Jehova ajụjụ n’ihi na ọ marala ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Gụọ Jems 4:17) Kama igbochi nwatakịrị ime baptizim, ndị nne na nna maara ihe kwesịrị ịgbalị na-akpa àgwà ọma ụmụ ha ga-eṅomi. Ha kwesịrị ịmalite mgbe nwa ha dị obere na-akụziri ya ka ọ hụ ihe Jehova sị ka anyị na-eme n’anya ma kpọ ihe ndị ọ sịrị anyị emela asị. (Luk 6:40) Ịhụnanya nwatakịrị nwere n’ebe Jehova nọ ga-eme ka ọ ghara ime mmehie dị oké njọ, n’ihi na ọ ga-achọ ime ihe Jehova kwuru na ha dị mma.—Aịza. 35:8.

NDỊ ỌZỌ NWERE IKE INYE AKA

14. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị nne na nna aka ná mbọ ha na-agba ka ụmụ ha ruo ime baptizim?

14 Ndị okenye nwere ike inyere ndị nne na nna aka ná mbọ ha na-agba inyere ụmụ ha aka. Otú ha nwere ike isi eme ya bụ ikwu okwu ọma banyere ihe mmadụ kpebiri ime n’ofufe Chineke. Otu nwanna nwaanyị sụrụla ụzọ ihe karịrị iri afọ asaa chetara otú okwu ya na Nwanna Charles T. Russell kwurịtara si nyere ya aka. Nwanna nwaanyị a dị afọ isii mgbe ahụ. O kwuru, sị: “Anyị ji nkeji iri na ise kwurịta ihe ndị m kpebiri ime n’ofufe Chineke.” N’eziokwu, okwu ọma na agbamume nwere ike inyere mmadụ aka ná ndụ ya. (Ilu 25:11) Ndị okenye nwekwara ike ịkpọ ndị nne na nna na ụmụ ha ka ha bịa rụọ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha ga-enye ụmụaka ahụ ọrụ ndị ha ga-arụli.

15. Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ike isi na-agba ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ ume?

15 Olee otú ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ nwere ike isi enye aka? Ọ bụ inwe mmasị n’ebe ndị na-eto eto nọ. Ha nwere ike ileru anya ka ha mara mgbe nwatakịrị malitere ime nke ọma n’ọgbakọ. Nwatakịrị ọ̀ na-esi n’ala ala obi ya aza ajụjụ ma ọ bụ na-eme ihe omume n’ọmụmụ ihe? Ọ̀ na-ezi ụmụ akwụkwọ ibe ya ozi ọma ma ọ bụ na-akpa àgwà dị mma mgbe a gwara ya ka o mee ihe na-adịghị mma? Ọ bụrụ otú ahụ, jaa ya mma ozugbo. Anyị nwere ike ịgba mbọ ka anyị na ụmụaka na-ekwurịta okwu tupu a malite ọmụmụ ihe nakwa mgbe ọmụmụ ihe gbasara, si otú ahụ gosi na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ime ihe ndị a na ihe ndị ọzọ ga-eme ka ha ghọta na ha so ‘n’ọgbakọ buru ibu.’—Ọma 35:18.

NYERE NWA GỊ AKA KA O MEE BAPTIZIM

16, 17. (a) Olee ihe jikọrọ baptizim na ndụ mmadụ ga-adị n’ọdịnihu? (b) Olee ụdị ọṅụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-achọ ka ha nweta? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

16 Ịzụlite nwatakịrị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova” bụ otu n’ime ọrụ kachanụ Chineke nyere nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst. (Efe. 6:4; Ọma 127:3) N’Izrel oge ochie, ụmụaka na-aghọ ndị e nyefere Jehova malite mgbe a mụrụ ha. Ma, ụmụ anyị adịghị ka ụmụ ndị Izrel. Ihe ọzọ bụ na, ọ bụrụ na nne na nna hụrụ Chineke n’anya ma jiri eziokwu kpọrọ ihe, ọ pụtaghị na ụmụ ha ga-eme otú ahụ. Mkpa ndị nne na nna malite n’ụbọchị ahụ ha mụrụ nwa, kwesịrị ịbụ ka ha nyere ya aka ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs, nyefee Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim. Olee ihe kacha mkpa? A sị ka ekwuwe, ihe ga-eme ka a zọpụta mmadụ n’oké mkpagbu na-abịa bụ onye ahụ inyefe Chineke onwe ya, e mee ya baptizim, ya anọgidekwa na-efe Chineke.—Mat. 24:13.

Mkpa ndị nne na nna kwesịrị ịbụ ka ha nyere ụmụ ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16, na nke 17)

17 Mgbe Blossom Brandt chọrọ ime baptizim, ndị mụrụ ya chọrọ ịma ma ọ̀ dịla njikere ime ihe a kacha mkpa ná ndụ ya. Ozugbo ha chọpụtara na ọ dịla njikere, ha kwadoro ya. E nwere ihe magburu onwe ya papa ya mere n’abalị bọtara ụbọchị e mere ya baptizim. Blossom kwuru, sị: “Ọ gwara anyị niile ka anyị gbunye ikpere n’ala, ya ekpee ekpere. Ọ gwara Jehova na obi bụ ya sọ aṅụrị na obere nwa ya nwaanyị ekpebiela inyefe ya onwe ya.” Mgbe ihe karịrị afọ iri isii gachara, Blossom kwuru, sị: “Agaghị m echefu abalị ahụ echefu ná ndụ m niile.” Ndị nne na nna, ka Jehova mee ka unu nweta ọṅụ ndị nne na nna na-enwe mgbe unu na-ahụ ka ụmụ unu nyefere Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim, ha abụrụ ndị ohu Jehova.

^ para. 9 Ndi nne na nna na nwa ha nwere ike ịtụle ihe ndị nwere ike inyere ha aka n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, peeji nke 304-310. Ha nwekwara ike ịgụ “Igbe Ajụjụ” dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Eprel 2011, peeji nke 2.