Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nụrụnụ Ịdọ Aka Ná Ntị Wee Mara Ihe”

“Nụrụnụ Ịdọ Aka Ná Ntị Wee Mara Ihe”

“Ụmụ m, . . . nụrụnụ ịdọ aka ná ntị wee mara ihe.”—ILU 8:32, 33.

ABỤ: 56, 89

1. Olee otú anyị si enweta amamihe? Oleekwa uru ọ na-abara anyị?

AMAMIHE si n’aka Jehova. Ọ na-eji obi ya niile enye anyị ya. Jems 1:5 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha.” Otu ụzọ anyị si enweta amamihe n’aka Chineke bụ ịnabata aka ná ntị ọ na-adọ anyị. Amamihe ahụ ga-eme ka anyị ghara ịkpa àgwà ọjọọ, meekwa ka anyị na Jehova na-adị ná mma. (Ilu 2:10-12) Nke a ga-eme ka anyị ‘nọrọ n’ịhụnanya Chineke nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.’—Jud 21.

2. Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ maka aka ná ntị Chineke na-adọ anyị?

2 Ma ezughị okè anyị, otú e si zụlite anyị, nakwa ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka o siere anyị ike ịnabata aka ná ntị a na-adọ anyị, ma ọ bụ mee ka anyị lee ya anya ka ihe ziri ezi. Anyị chọpụta na aka ná ntị a dọrọ anyị baara anyị uru, obi na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-egosikwa na Chineke hụrụ anyị n’anya. Ilu 3:11, 12 kwuru, sị: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị Jehova, . . . n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba.” Ka anyị ghara ichefu na Jehova chọrọ ka ihe dịrị anyị ná mma. (Gụọ Ndị Hibru 12:5-11.) N’ihi na Chineke ma anyị nke ọma, otú o si adọ anyị aka ná ntị na-adaba adaba mgbe niile, bụrụkwa ihe anyị chọrọ. Ka anyị tụlee ụzọ anọ e nwere ike isi dọọ anyị aka ná ntị: (1) mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka, (2) aka ná ntị ndị nne na nna na-adọ ụmụ ha, (3) ịdọ aka ná ntị n’ọgbakọ, na (4) ihe dị njọ karịa mwute anyị nwere ike inwe ma a dọọ anyị aka ná ntị.

ỊRỤ AHỤ́ ANYỊ ỤKA NA-EGOSI NA ANYỊ NWERE AMAMIHE

3. Olee otú nwata ga-esi mụta ịna-ejide onwe ya? Kọwaa.

3 Mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka nwekwara ike ịpụta mmadụ ijide onwe ya ka o nwee ike imekwu nke ọma n’àgwà ya, nakwa n’otú o si eche echiche. Anyị ebughị àgwà a pụta ụwa. Anyị ga-amụ ya amụ. Dị ka ihe atụ: Mgbe nwata na-amụ otú e si agba ígwè, nne ya ma ọ bụ nna ya na-ejidere ya ígwè ahụ aka ka ọ ghara ịda. Ma, nwa ahụ mụtawa ịgba ígwè, ihe nne ya ma ọ bụ nna ya na-eme bụ, o jidetụ ya, ya ahapụtụkwa ya. Ọ mụtachaa ịgba ígwè, nne ya ma ọ bụ nna ya agaghị na-ejideziri ya ígwè ahụ aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị nne na nna. Ọ bụrụ na ha ejiri ndidi na-azụ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova,” ha na-enyere ụmụ ha aka ịna-ejide onwe ha na inwe amamihe.—Efe. 6:4.

4, 5. (a) Gịnị mere njide onwe onye ji bụrụ otu n’ime ihe dị mkpa n’iyiri “mmadụ ọhụrụ”? (b) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịda mbà ọ bụrụgodị na anyị ‘adaa ugboro asaa’?

4 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị matara Jehova mgbe ha torola eto. E nwekwara ike ikwu na ndị malitere ife Jehova ọhụrụ dị ka ụmụaka. Ọ bụ eziokwu na ha nwere ike ịna-ejidetụ onwe ha, ma ha abụbeghị Ndị Kraịst tozuru okè. Ma, ha malite “iyiri mmadụ ọhụrụ” ma na-agbalị ịdị ka Kraịst, ha na-eji nwayọọ nwayọọ na-etozu okè. (Efe. 4:23, 24) Mmadụ ijide onwe ya so n’ihe dị mkpa na-eme ka onye ahụ tozuo okè. Nke a na-enyere anyị aka ‘ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.’—Taịtọs 2:12.

5 Anyị niile bụ ndị mmehie. (Ekli. 7:20) Ma, ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe, ọ pụtaghị na anyị anaghị ejide onwe anyị ma otu ma otu. Ilu 24:16 kwuru, sị: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha; ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ.” Gịnị ga-enyere ya aka ibili ọzọ? Ọ bụghị n’ike aka ya, kama ọ bụ mmụọ Chineke. (Gụọ Ndị Filipaị 4:13.) Otu n’ime àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ njide onwe onye. Ya na mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka yikwara.

6. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịna-amụ Okwu Chineke nke ọma? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ihe ndị ọzọ nwere ike inyere anyị aka ịna-ejide onwe anyị bụ iji obi anyị niile na-ekpe ekpere, ịmụ Baịbụl na ichebara ihe ndị anyị na-agụ echiche. Ọ bụrụkwanụ na ọ na-esiri gị ike ịmụ Baịbụl? Ikekwe, ị naghị ele onwe gị anya ka onye na-amụsi Baịbụl ike. Ma, buru n’obi na Jehova ga-enyere gị aka ma i kwe. Ọ ga-enyere gị aka ka Okwu ya ‘na-agụ gị agụụ.’ (1 Pita 2:2) Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ka ịna-ewepụta oge na-amụ Baịbụl. Gbalịa ka ị na-eme ihe ị na-ekpe n’ekpere. I nwere ike iji obere oge na-amụ ihe ná mmalite. Ka oge na-aga, ọ ga na-adịkwuru gị mfe ịna-amụ ihe, ya ana-atọkwa gị ụtọ. Oge ndị ahụ i ji na-echebara ihe ndị ị gụrụ banyere Jehova echiche, ga na-atọ gị ụtọ.—1 Tim. 4:15.

7. Olee otú ịrụ ahụ́ anyị ụka nwere ike isi nyere anyị aka ime ihe ndị anyị kpebiri ime n’ozi Jehova?

7 Ịrụ ahụ́ anyị ụka ga-enyere anyị aka ime ihe ndị anyị kpebiri ime n’ozi Jehova. Dị ka ihe atụ, otu nna chọpụtara na ya anaghịzi anụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova. N’ihi ya, o kpebiri ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ọ gụkwara isiokwu ndị kwuru gbasara ịsụ ụzọ na magazin anyị. Ihe ndị a na ikpe ekpere mere ka ya na Jehova dịrị ná mma. Ọ sụkwara ụzọ nwa oge mgbe o nwere ike. Olee ihe mechara mee? N’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya, obi ya niile dịgidere n’ịsụ ụsọ, ya emechaakwa bụrụ ọsụ ụzọ oge niile.

ỊZỤ ỤMỤ OTÚ JEHOVA CHỌRỌ

Mgbe a mụrụ ụmụaka, ha amaghị aka nri na aka ekpe. E kwesịrị ịzụ ha azụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8-10. Olee ihe nwere ike inyere ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst aka ịzụ ụmụ ha ka ha na-efe Jehova? Nye ihe atụ.

8 Jehova nyere ndị nne na nna ọrụ magburu onwe ya ha ga-arụ. Ọ gwara ha ka ha na-azụ ụmụ ha “na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Ọrụ a abụghị obere ọrụ, karịchaa, n’ụwa nke oge a. (2 Tim. 3:1-5) Mgbe a mụrụ ụmụaka, ha amaghị aka nri na aka ekpe. Ha nwere akọnuche, ma e kwesịrị ịzụ ya azụ. (Rom 2:14, 15) Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na okwu Grik e si sụgharịa “ịdọ aka ná ntị” nwere ike ịpụta “ịzụ nwatakịrị ka o too.”

9 Ọ bụrụ na nne na nna azụọ ụmụ ha n’ihi na ha hụrụ ha n’anya, obi ga na-eru ụmụ ha ala. Ha na-amụta na ọ bụghị ihe niile ka a ga-ekwe ha mee, nakwa na mkpebi ọ bụla ha mere nwere ike ịbara ha uru ma ọ bụ ghọ ha ahịa. Ọ bụ ya mere ndị nne na nna ji kwesị ịtụkwasị Jehova obi ka o nye ha amamihe ya. Cheta na otú e si azụ ụmụ n’otu obodo dị iche n’otú e si azụ ha n’obodo ọzọ. Otú e si zụọ ụmụ n’otu ọgbọ na-adị iche n’otú e si azụ ha n’ọgbọ ọzọ. Ọ bụrụ na ndị nne na nna egee Chineke ntị, ha ekwesịghị ịna-ajụ onwe ha mgbe niile banyere otú ha ga-esi na-azụ ụmụ ha, ha agaghịkwa atụkwasị obi n’amamihe nke ha.

10 Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Noa. Mgbe Jehova gwara ya wuo ụgbọ, ọ dabereghị n’amamihe nke ya. O wutụbeghị ụgbọ mbụ. N’ihi ya, ọ tụkwasịrị Jehova obi ma mee “nnọọ otú ahụ,” ya bụ, o mere ihe Jehova gwara ya. (Jen. 6:22) Olee uru ọ baara ya? A zọpụtara ya na ezinụlọ ya. Noa bụkwa ezigbo nna. Maka gịnị? Maka na ọ tụkwasịrị Chineke obi ka o nye ya amamihe. Noa zụrụ ụmụ ya nke ọma, kpaakwa àgwà otú ha ga-eṅomi ya, ọ bụ eziokwu na ọ dịrịghị ya mfe n’oge ahụ ihe ọjọọ juru ebe niile tupu Iju Mmiri ahụ.—Jen. 6:5.

11. Gịnị mere ndị nne na nna kwesịrị iji gbasie mbọ ike ka ha na-azụ ụmụ ha?

11 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị ga-esi mee “nnọọ otú ahụ” n’anya Chineke? Na-ege Jehova ntị. Kwe ka o jiri Okwu ya na ihe ndị anyị na-amụta ná nzukọ ya kụziere gị otú i ga-esi na-azụ ụmụ gị. Ka oge na-aga, ụmụ gị nwere ike ikele gị maka ya. Otu nwanna kwuru, sị: “Obi na-atọgbu m atọgbu maka otú nne na nna m si zụọ m. Ha gbalịrị ime ka ihe ha kụziiri m ruo m n’obi. Ọ bụ ha nyeere m aka ime ka mụ na Jehova dịrị ná mma.” Ma, n’agbanyeghị mbọ niile ndị nne na nna na-agba, ụfọdụ ụmụaka na-ahapụ Jehova. Ma, ndị nne na nna, bụ́ ndị gbara ezigbo mbọ mee ka eziokwu ruo n’obi ụmụ ha, na-enwe akọnuche dị ọcha. Ha na-enwekwa olileanya na otu ụbọchị, nwa ha hapụrụ Jehova nwere ike ịlọghachikwute ya.

12, 13. (a) Olee otú ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst ga-esi egosi na ha na-erubere Chineke isi ma a chụọ nwa ha n’ọgbakọ? (b) Olee otú ihe otu di na nwunye mere si baara ezinụlọ ha uru?

12 Otu n’ime ihe ndị kacha eme ka o siere ụfọdụ ndị nne na nna ike irubere Jehova isi bụ mgbe a chụrụ nwa ha n’ọgbakọ. Tụlee ihe otu nne mere mgbe a chụrụ nwa ya nwaanyị n’ọgbakọ, ya ahapụ ụlọ. O kwuru, sị: “M chọrọ ihe ndị m ga-akụdo aka n’akwụkwọ anyị ka mụ na nwa m nwaanyị na nwa ya nwaanyị na-anọrị.” O kwukwara, sị: “Ma di m nyeere m aka mee ka m ghọta na ihe banyere nwa anyị dịzi Jehova n’aka, nakwa na anyị kwesịrị irubere Jehova isi.”

13 Mgbe afọ ole na ole gachara, a nabatara nwa ha nwaanyị n’ọgbakọ. Nne ya kwuru, sị: “Ugbu a, ọ na-akpọ m ma na-ezitere m ozi n’ekwentị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ụbọchị niile. Ọ na-asọpụrụ anyị nke ukwuu n’ihi na ọ ma na anyị rubeere Chineke isi. Anyị na ya na-emekọrịta ihe nke ọma.” Ọ bụrụ na a chụrụ nwa gị n’ọgbakọ, ị̀ ‘ga-ejiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, ma ghara ịdabere ná nghọta gị’? (Ilu 3:5, 6) Cheta na aka ná ntị Jehova na-adọ anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu, gosikwa na o nwere amamihe na-enweghị atụ. Chetakwa na o nyere Ọkpara ya maka anyị niile, ma nwa gị. Chineke achọghị ka e bibie onye ọ bụla. (Gụọ 2 Pita 3:9) N’ihi ya, ndị nne na nna, ka obi sie unu ike na aka ná ntị Jehova na-adọ anyị, nakwa otú o si na-eduzi anyị na-abara anyị uru, ma mgbe irubere ya isi na-esiri unu ike. Nabatanụ aka ná ntị Chineke na-adọ anyị, unu agbakwala ya ụkwụ.

ỊDỌ AKA NÁ NTỊ N’ỌGBAKỌ

14. Olee otú anyị na-esi erite uru n’ihe Jehova si n’aka “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi” na-akụziri anyị?

14 Jehova kwere nkwa na ya ga na-elekọta, na-echebe ma na-akụziri ọgbakọ Ndị Kraịst ihe. E nwere ọtụtụ ụzọ o si na-eme ya. Dị ka ihe atụ, o mere Ọkpara ya onyeisi nke ọgbakọ, ọkpara ya ahọpụtakwanụ “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi” ka ọ na-akụziri ọgbakọ Okwu Chineke n’oge ya. (Luk 12:42) Ihe ndị ha na-akụziri anyị ma ọ bụ aka ná ntị ha na-adọ anyị na-abara anyị ezigbo uru. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ugboro ole ka okwu e kwuru ná nzukọ anyị ma ọ bụ isiokwu gbara n’otu n’ime magazin anyị merela ka m gbanwee otú m si eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà?’ Ọ bụrụ na i meela otú ahụ, ka obi na-atọ gị ụtọ. Ị na-ekwe ka Jehova na-akpụzi gị ma ọ bụ na-adọ gị aka ná ntị ka ị baara onwe gị uru.—Ilu 2:1-5.

15, 16. (a) Olee otú anyị ga-esi erite uru n’ọrụ ndị okenye na-arụ n’ọgbakọ? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ọrụ ndị okenye na-atọkwu ha ụtọ?

15 Kraịst nyekwara ọgbakọ “onyinye n’ụdị mmadụ,” ya bụ, ndị okenye na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke. (Efe. 4:8, 11-13) Olee otú anyị ga-esi rite uru n’ọrụ ndị okenye na-arụ? Otu ụzọ bụ iṅomi okwukwe na àgwà ọma ha. Ụzọ ọzọ bụ ige ntị na ndụmọdụ ha si n’Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị. (Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17) Cheta na ndị okenye hụrụ anyị n’anya ma na-achọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha achọpụta na anyị anaghịzi abịachi ọmụmụ ihe anya, ma ọ bụkwanụ na ịnụ ọkụ n’obi anyị ajụwala oyi, ha ga-eme ihe ozugbo ka ha nyere anyị aka. Ha ga-ege anyị ntị ma gbalịa gbaa anyị ezigbo ume. Ha ga-ejikwa Akwụkwọ Nsọ nye anyị ndụmọdụ. Ị̀ na-ele aka a ha na-enyere anyị anya ka ihe na-egosi na Jehova hụrụ gị n’anya?

16 Cheta na o nwere ike ọ gaghị adịchara ndị okenye mfe ịbịakwute anyị nye anyị ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, olee otú i chere obi dị Netan onye amụma mgbe ọ chọrọ ịgwa Eze Devid okwu, mgbe Devid mere mmehie dị oké njọ ma gbalịa izo ya? (2 Sam. 12:1-14) Pọl onye ozi mekwara ihe Netan onye amụma mere. Ọ katara obi gbazie Pita, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs, mgbe Pita melaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu ihe karịa ndị mba ọzọ. (Gal. 2:11-14) Ma, olee ihe i nwere ike ime ka ihe dịrị ndị okenye nọ n’ọgbakọ unu mfe? Ọ bụ ịdị umeala n’obi, ịna-ekele ha maka ihe ha na-eme, nakwa ime ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịgwa gị okwu. Were aka ha na-enyere gị ka ihe na-egosi na Chineke hụrụ gị n’anya. Nke a ga-abara gị uru, meekwa ka ha jirikwuo obi ụtọ na-arụ ọrụ ha.

17. Olee otú ndị okenye si nyere otu nwanna nwaanyị aka?

17 O siiri otu nwanna nwaanyị ike ịhụ Jehova n’anya n’ihi ihe ndị mere ya n’oge gara aga. O kwuru, sị: “Mgbe ihe ndị mere m n’oge gara aga nakwa ihe ndị ọzọ mere ka m daa mbà, m gakwuuru ndị okenye. Ha abaraghị m mba ma ọ bụ katọọ m, kama, ha gbara m ume ma mee ka okwukwe m sie ike. Mgbe ọ bụla a gbasara ọmụmụ ihe, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu onye n’ime ha na-abịa ajụ m otú m mere, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe ha ji n’aka. N’ihi ihe ndị mere m n’oge gara aga, o siiri m ezigbo ike ikweta na Jehova ga-ahụli m n’anya. Ma, Jehova ejirila ọgbakọ na ndị okenye gosi m ọtụtụ ugboro na ọ hụrụ m n’anya. M na-agwa ya na agaghị m ahapụ ya.”

GỊNỊ DỊ NJỌ KARỊA MWUTE ANYỊ NWERE IKE INWE MA A DỌỌ ANYỊ AKA NÁ NTỊ

18, 19. Gịnị dị njọ karịa mwute anyị nwere ike inwe ma a dọọ anyị aka ná ntị? Nye ihe atụ.

18 Ọ bụ eziokwu na o nwere ike iwute anyị ma a dọọ anyị aka ná ntị, ma e nwere ihe nwere ike iwute anyị karịa ya. Ọ bụ nsogbu ịjụ ịnabata aka ná ntị a dọrọ anyị nwere ike ịkpatara anyị. (Hib. 12:11) Ka anyị tụlee gbasara mmadụ abụọ, ya bụ, Ken na Eze Zedekaya. Mgbe Ken kpọrọ nwanne ya Ebel asị ma chọọ igbu ya, Chineke baara ya mba, sị: “Gịnị mere i ji na-ewe iwe dị ọkụ, gịnịkwa mere ihu gị ji gbarụọ? Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ezi ihe, lee, mmehie makpu n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa gị ka ọ na-achọsi ike inweta; ma gị onwe gị, ị̀ ga-emeri ya?” (Jen. 4:6, 7) Ma, Ken egeghị Chineke ntị. O gburu nwanne ya ma taa ezigbo ahụhụ ná ndụ ya niile. (Jen. 4:11, 12) A sị na Ken gere Jehova ntị mgbe ahụ Jehova baara ya mba, ọ garaghị aba ná nsogbu ọ bara.

19 Zedekaya bụ eze ọjọọ na-anaghị akata obi. Ọ chịrị n’oge ihe tara ezigbo akpụ na Jeruselem. Jeremaya onye amụma dọrọ ya aka ná ntị ọtụtụ ugboro ka ọ hapụ ihe ọjọọ ọ na-eme, ma o geghị ya ntị. Nke a mere ka ọ hụsie anya. (Jere. 52:8-11) Jehova achọghị ka anyị hụsie anya ka Ken na Zedekaya.—Gụọ Aịzaya 48:17, 18.

20. Gịnị ga-eme ndị nabatara aka ná ntị Chineke na-adọ anyị nakwa ndị jụrụ ịnabata ya?

20 N’ụwa a, a na-eji ịdọ aka ná ntị na mmadụ ịrụ ahụ́ ya ụka eme ihe ọchị. Ma, n’oge na-adịghị anya, onye ọ bụla jụrụ ịnabata aka ná ntị Chineke na-adọ anyị ga-ahụsi anya. (Ilu 1:24-31) N’ihi ya, ka anyị ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị ma mara ihe.’ Ilu 4:13 kwuru, sị: “Jisie ịdọ aka ná ntị ike; ahapụla ya. Chekwaa ya, n’ihi na ọ bụ ya bụ ndụ gị.”