Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji esekarị Pọl onyeozi n’akwụkwọ ha ka onye isi nkwọcha?

Taa, e nweghị onye nwere ike ikwu kpọmkwem otú Pọl dị. Ihe ndị anyị na-ese n’akwụkwọ anyị gbasara otú Pọl dị bụ ihe osise nkịtị, ha abụghị foto ndị e si n’ihe ndị mgbe ochie nweta.

Ma, e nwere ihe ụfọdụ gosiri otú Pọl dị. Dị ka ihe atụ, Ụlọ Nche March 1, 1902, kwuru otu n’ime ha. O kwuru, sị: “A bịa n’otú Pọl dị: . . . akwụkwọ aha ya bụ ‘Acts of Paul and Thecla,’ . . . nke e dere n’ihe dị ka afọ 150, kwuru otú Pọl dị nke nwere ike ịbụ ya kacha daba adaba, nke bụ́ ihe ọtụtụ ndị kweere kemgbe ụwa. Akwụkwọ ahụ kwuru na ‘ọ dị mkpụmkpụ, nwee isi nkwọcha, nwee ụkwụ ọbọgwụ, gbaa dimkpa, nwee ezigbo iku anya; na imi ogologo.’”

Otu akwụkwọ aha ya bụ The Oxford Dictionary of the Christian Church (nke e biri n’afọ 1997) kwuru gbasara akwụkwọ Acts of Paul and Thecla, sị: “Ihe ahụ akwụkwọ a kwuru banyere otú Pọl dị nwere ike ịbụ eziokwu.” Ndị dịrị ndụ mgbe narị afọ ole na ole gachara e dere akwụkwọ Acts of Paul and Thecla ejighị ya egwu egwu. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na taa, e nwere akwụkwọ a iri asatọ e dere n’asụsụ Grik, nweekwa ndị e dere n’asụsụ ndị ọzọ. N’ihi ya, ihe ndị anyị sere n’akwụkwọ anyị gbasara otú Pọl onyeozi dị dabara n’ihe ụfọdụ akwụkwọ ndị oge ochie kwuru gbasara otú ọ dị.

Chetakwa na e nwere ihe ndị dị mkpa karịa otú Pọl dị. Mgbe Pọl na-eje ozi ya, ụfọdụ ndị na-akatọ ya kwuru na “ọnụnọ ya onwe ya adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe efu.” (2 Kọr. 10:10) Ma, anyị kwesịrị icheta na ọ ghọrọ Onye Kraịst mgbe Jizọs si n’eluigwe gwa ya okwu n’okporo ụzọ. Anyị nwekwara ike iche gbasara ihe ndị Pọl rụrụ, ebe ọ bụ “arịa [Kraịst] họọrọ ka o buru aha [Jizọs] gakwuru ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 9:3-5, 15; 22:6-8) Anyị kwesịkwara iche gbasara ọtụtụ uru ndị anyị na-erite n’akwụkwọ ndị Jehova ji mmụọ nsọ ya mee ka o dee na Baịbụl.

Pọl ejighị ihe ndị o mere tupu ya abụrụ Onye Kraịst tuo ọnụ, o kwukwanụghị banyere otú yanwa dị. (Ọrụ 26:4, 5; Fil. 3:4-6) O kwuru, sị: “Abụ m onye kasị nta n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi.” (1 Kọr. 15:9) O mechakwara kwuo, sị: “Ọ bụ m, bụ́ onye dị ala karịa onye kasị nta n’ime ndị nsọ niile, ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ, ka m wee zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere akụ̀ Kraịst nke a na-apụghị ịghọta aghọta.” (Efe. 3:8) Ihe a o kwuru bara uru karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike iche gbasara otú ọ dị.