Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10

Ịhụ Jehova n’Anya Ga-eme Ka I Mee Baptizim

Ịhụ Jehova n’Anya Ga-eme Ka I Mee Baptizim

“Gịnị na-egbochi ime m baptizim?”​—ỌRỤ 8:36.

ABỤ NKE 37 M Ji Obi M Niile Na-efe Jehova

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Dị ka e kwuru n’Ọrụ Ndịozi 8:​27-31, 35-38, gịnị mere ọnaozi Itiopia ji mee baptizim?

Ị̀ CHỌRỌ ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst e mere baptizim? Ọtụtụ ndị ekpebiela ime baptizim n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya, chọọkwa ikele ya maka ihe ndị ọ na-emere ha. Ka anyị leba anya n’akụkọ otu onye na-ejere eze nwaanyị Itiopia ozi.

2 Ọnaozi Itiopia ahụ mere baptizim ozugbo ọ mụtara n’Akwụkwọ Nsọ na ọ bụ ihe o kwesịrị ime. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:​27-31, 35-38.) Gịnị mere o ji mee ya? O ji Okwu Chineke kpọrọ ihe n’ihi na ọ nọ na-agụ amaokwu ụfọdụ n’akwụkwọ Aịzaya mgbe ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya. Mgbe Filip gwachara ya okwu, obi dị ya ụtọ maka ihe Jizọs meere ya. Ma, gịnị mere nwoke ahụ ji gaa Jeruselem? Ọ bụ n’ihi na ọ malitela ịhụ Jehova n’anya. Olee otú anyị si mara? Ọ gara Jeruselem ife Jehova. Ọ ga-abụ na ọ hapụrụ okpukpe ọ na-ekpe kemgbe a mụrụ ya ma soro naanị otu mba nyefere ezi Chineke onwe ha. Ọ bụ otú a o si hụ Jehova n’anya mere ka o kpebie ime ihe ọzọ dị mkpa, ya bụ, ime baptizim ma bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst.​—Mat. 28:19.

3. Olee ihe nwere ike igbochi mmadụ ime baptizim? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Olee Ụdị Ala Obi Gị Yiri?

3 Ịhụ Jehova n’anya nwere ike ime ka i mee baptizim. Ma, e nwere ịhụnanya nwere ike igbochi gị ime baptizim. Olee ịhụnanya ọ bụ? Ka anyị leba anya n’ihe atụ ụfọdụ. O nwere ike ịbụ na ị hụrụ ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị na-abụghị Ndịàmà Jehova n’anya nke ukwuu. I nwekwara ike ịna-eche na ha ga-akpọ gị asị ma i mee baptizim. (Mat. 10:37) O nwekwara ike ịbụ na e nwere àgwà ndị na-atọgbu gị atọgbu ị ma na ha adịghị Chineke mma, ma ha esiere gị ike nkwụsị. (Ọma 97:10) O nwere ike ịbụ na ị na-eme ememme ndị okpukpe ụgha kemgbe ị dị obere, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na obi na-atọgbu gị atọgbu ma i cheta ememme ahụ niile i mere n’oge gara aga. N’ihi ya, o nwere ike isiri gị ike ịkwụsị ime ememme ndị na-adịghị Jehova mma. (1 Kọr. 10:​20, 21) Ọ bụ ya mere i ji kwesị ịjụ onwe gị, sị: “Olee onye m kacha hụ n’anya?” ma ọ bụ, “Olee ihe kacha atọ m ụtọ?”

ONYE ANYỊ KWESỊRỊ ỊHỤ N’ANYA KARỊCHAA

4. Olee ihe kacha mkpa mere ị ga-eji mee baptizim?

4 E nwere ọtụtụ ihe dị mma i kwesịrị iji kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, tupu gị na Ndịàmà Jehova amalitedị ịmụ Baịbụl, o nwere ike ịbụ na i jighị Baịbụl egwu egwu, nakwa na ị hụrụ Jizọs n’anya. Ugbu a ị matara Ndịàmà Jehova, o nwere ike ịna-amasị gị ka gị na ha na-anọrị. Ma, otú ihe ọma ndị a si atọ gị ụtọ abụghị naanị ihe ga-eme ka ị chọọ inyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim. Ihe kacha mkpa mere ị ga-eji mee baptizim bụ na ị hụrụ Jehova n’anya. Ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya karịa ihe ọ bụla, ị gaghị ekwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla gbochie gị ife ya. Ịhụ Jehova n’anya ga-eme ka i kpebie ime baptizim, nyekwara gị aka iji obi gị niile na-efe ya ma i mechaa baptizim.

5. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

5 Jizọs kwuru na anyị ga-eji obi anyị niile, mkpụrụ obi anyị niile, uche anyị niile, na ike anyị niile hụ Jehova n’anya. (Mak 12:30) Olee otú i nwere ike isi mụta ịhụ Jehova n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù otú ahụ? Iche gbasara otú Jehova si hụ anyị n’anya ga-enyere anyị aka ịhụkwa yanwa n’anya. (1 Jọn 4:19) Olee ihe ndị ọzọ ị ga-eme ozugbo i bidoro ịhụ Jehova n’anya otú ahụ? Oleekwa otú ọ ga-eme ka obi dị gị? *

6. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 1:​20, olee otu n’ime ụzọ ndị i nwere ike isi mụtakwuo gbasara Jehova?

6 Si n’ihe ndị Jehova kere mụta gbasara ya. (Gụọ Ndị Rom 1:20; Mkpu. 4:11) Chee gbasara osisi na ụmụ anụmanụ Chineke kere na otú ha si egosi na ọ ma ihe. Mụtatụ gbasara otú dị egwu Chineke si kee ahụ́ gị. (Ọma 139:14) Cheekwa gbasara ike dị egwu Jehova mere ka anyanwụ nwee. E wezụga anyanwụ, e nwekwara ọtụtụ ijeri kpakpando ndị nwere ike dị egwu. * (Aịza. 40:26) Iche gbasara ihe ndị Jehova kere ga-eme ka ị na-akwanyekwuru ya ùgwù. Ma, ihe ga-eme ka gị na Jehova dịrị n’ezigbo mma abụghị naanị ịmata na ọ ma ihe, dịrịkwa ike. Ị chọọ ịhụkwu ya n’anya, i kwesịrị ịmatakwu ya.

7. Olee ihe obi kwesịrị isi gị ike na ya ka i nwee ike ịhụkwu Jehova n’anya?

7 Obi kwesịrị isi gị ike na Jehova hụrụ gịnwa n’anya. Ọ̀ na-esiri gị ike ikweta na Onye kere eluigwe na ụwa ma gị, nakwa na ihe gbasara gị na-emetụ ya n’obi? Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Jehova ‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’ (Ọrụ 17:​26-28) Ọ “na-enyocha obi niile.” Ọ gwara gị ihe ahụ Devid gwara Sọlọmọn, na “ọ bụrụ na ị chọọ ya, ọ ga-ekwe ka ị chọta ya.” (1 Ihe 28:9) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere i ji amụ Baịbụl ugbu a bụ na Jehova ‘dọtara gị.’ (Jere. 31:3) Ka ị na-amakwu ihe niile Jehova meere gị, ị ga na-ahụkwu ya n’anya.

8. Olee otú ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka na Jehova hụrụ gị n’anya?

8 Otu n’ime ụzọ ndị ị ga-esi gosi na obi dị gị ụtọ maka na Jehova hụrụ gị n’anya bụ ịna-ekpe ekpere. Ị ga na-ahụkwu Jehova n’anya ma ọ bụrụ na ị na-agwa ya ihe niile na-echegbu gị ma na-ekele ya maka ihe niile ọ na-emere gị. Gị na ya ga-adịkwu ná mma ma ị na-ahụ otú o si aza ekpere gị. (Ọma 116:1) Obi ga-esi gị ike na ọ na-aghọta gị. Ma, ị chọọ ka gị na Jehova dị ná mma, i kwesịrị ịghọta otú o si eche echiche. I kwesịkwara ịmata ihe ọ chọrọ ka ị na-eme. Naanị otú ị ga-esi amata ya bụ ịmụ Okwu ya bụ́ Baịbụl.

Otú kacha mma anyị na Jehova ga-esi dịrị ná mma, anyị amatakwa ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme bụ ịna-amụ Baịbụl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9) *

9. Olee otú i nwere ike isi gosi na i ji Baịbụl kpọrọ ihe?

9 Mụta iji Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kpọrọ ihe. Ọ bụ naanị Baịbụl na-ekwu nke bụ́ eziokwu gbasara Jehova na ihe o bu n’obi imere gị. Otú ị ga-esi gosi na i ji Baịbụl kpọrọ ihe bụ ịna-agụ ya kwa ụbọchị, ịna-akwado akwado tupu onye na-amụrụ gị ihe abịa, na ịna-eme ihe ndị ị na-amụta. (Ọma 119:​97, 99; Jọn 17:17) Ì nwere ebe e depụtara otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl? Ị̀ na-eso ya, ka i nwee ike ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị?

10. Olee otu n’ime ihe ndị mere Baịbụl ji pụọ iche?

10 Otu n’ime ihe ndị mere Baịbụl ji pụọ iche bụ na ọ bụ ndị ji anya ha hụ Jizọs kọrọ ihe e dere gbasara Jizọs. Ọ bụ naanị ya bụ akwụkwọ kọwara ihe bụ́ eziokwu gbasara ihe Jizọs meere gị. Ka ị na-amụ gbasara ihe Jizọs kwuru na ihe o mere, o nwere ike ime ka ị chọọ ka gị na ya bụrụ enyi.

11. Olee otú i nwere ike isi mụta ịhụ Jehova n’anya?

11 Mụta ịhụ Jizọs n’anya, ị ga-ahụkwu Jehova n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi na Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. (Jọn 14:9) Ọ bụ ya mere ịmụtakwu gbasara Jizọs ga-eji mee ka ị matakwuo Jehova ma hụkwuo ya n’anya. Chegodị gbasara otú Jizọs si meere ndị a na-eleda anya ebere, ma ndị ogbenye ma ndị ọrịa ma ndị na-adịghị ike. Cheekwa gbasara ndụmọdụ bara uru ọ na-enye gị nakwa otú ige ya ntị si eme ka ndụ gị ka mma.​—Mat. 5:​1-11; 7:​24-27.

12. Gịnị ka ịmụtakwu gbasara Jizọs nwere ike ime ka i mee?

12 I nwere ike ịhụkwu Jizọs n’anya ma ọ bụrụ na i chee echiche nke ọma gbasara àjà ọ chụrụ ka Chineke nwee ike ịgbaghara anyị mmehie. (Mat. 20:28) Ọ bụrụ na ị ghọta na Jizọs wepụtara onwe ya nwụọ maka gị, o nwere ike ime ka i chegharịa ma rịọ Jehova mgbaghara. (Ọrụ 3:​19, 20; 1 Jọn 1:9) Ka ị na-ahụkwu Jehova na Jizọs n’anya, ị ga-achọkwu ka gị na ndị hụrụ ha n’anya na-akpakọrịta.

13. Olee ihe Jehova mere ka i nwee?

13 Mụta ịhụ ezinụlọ Jehova n’anya. E nwere ike ndị ezinụlọ unu na-abụghị Ndịàmà Jehova na ndị bụ́bu ndị enyi gị agaghị aghọta ihe mere i ji chọọ inyefe Jehova onwe gị. Ha nwedịrị ike ịna-akpagbu gị. Jehova ga-enyere gị aka, mee ka ndị nọ n’ọgbakọ ghọọrọ gị ezinụlọ. Ọ bụrụ na gị na ha ana-akpakọrịta, ha ga-ahụ gị n’anya ma nyere gị aka. (Mak 10:​29, 30; Hib. 10:​24, 25) Ka oge na-aga, ndị ezinụlọ unu nwere ike isoro gị fewe Jehova ma na-erubere ya isi.​—1 Pita 2:12.

14. Dị ka e kwuru na 1 Jọn 5:​3, gịnị ka ị chọpụtarala gbasara iwu Jehova?

14 Mụta iji iwu Jehova kpọrọ ihe ma na-erubere ya isi. Tupu gị amata Jehova, o nwere ike ịbụ na ị na-eji aka gị ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, ị hụla ugbu a na iwu Jehova ka mma. (Ọma 1:​1-3; gụọ 1 Jọn 5:3.) Chee gbasara ndụmọdụ Baịbụl nyere ndị di, ndị nwunye, ndị nne na nna, na ụmụaka. (Efe. 5:22–6:4) Ka ị na-eme ihe ahụ Baịbụl kwuru, ị̀ chọpụtala na o meela ka ezinụlọ unu na-enwe obi ụtọ? Ị̀ hụla ihe gosiri na àgwà gị akala mma n’ihi na ị na-emeta ndị ezigbo mmadụ enyi otú ahụ Baịbụl kwuru? Ị̀ na-enwekwu obi ụtọ? (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33) O nwere ike ịbụ na ihe ị ga-aza n’ajụjụ ndi a niile bụ ee.

15. Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịmata otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru?

15 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri gị ike ịma otú ị ga-esi eme ihe ndị ị na-amụta na Baịbụl. Ọ bụ ihe mere Jehova ji jiri nzukọ ya na-ewepụta ihe ndị e ji amụ Baịbụl nwere ike inyere gị aka ịmata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ. (Hib. 5:​13, 14) Ị gụọ ha ma mụọ ha, ị ga-ahụ na ihe ndị dị na ha na-aba uru, hụkwa otú gịnwa ga-esi mee ha emee. O nwekwara ike ime ka ị chọọ ịbata n’ọgbakọ Jehova.

16. Olee otú Jehova si hazie ndị ya?

16 Mụta iji ọgbakọ Jehova kpọrọ ihe ma na-akwado ya. Jehova haziri ndị ya n’ọgbakọ n’ọgbakọ. Jizọs bụkwa onyeisi ọgbakọ ndị ahụ niile. (Efe. 1:22; 5:23) Ọ họpụtala ụmụ nwoke ole na ole e tere mmanụ ka ha na-eduzi ọrụ ọ chọrọ ka a rụọ n’oge anyị a. Jizọs kpọrọ ha “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” Ọrụ ha bụ iji Okwu Chineke na-azụ gị na inyere gị aka ka gị na Jehova na-adị ná mma. Ha anaghịkwa eji ọrụ ahụ egwu egwu. (Mat. 24:​45-47) Otu n’ime ụzọ ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si enyere gị aka bụ ịhọpụta ụmụ nwoke ruru eru ka ha bụrụ ndị okenye ga na-azụ gị dị ka atụrụ. (Aịza. 32:​1, 2; Hib. 13:17; 1 Pita 5:​2, 3) Ndị okenye ndị ahụ dị njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji kasie gị obi ma mee ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma. Ma, otu n’ime ihe ndị kacha mkpa ha na-eme bụ inyere gị aka ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova.​—Efe. 4:​11-13.

17. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 10:​10, 13, 14, gịnị mere anyị ji agwa ndị ọzọ gbasara Jehova?

17 Na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta ịhụ Jehova n’anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kụziere ndị ọzọ gbasara Jehova. (Mat. 28:​19, 20) Anyị nwere ike ịna-eme ihe ahụ Jizọs kwuru iji mezuo iwu. Ma, ka anyị na-ahụkwu Jehova n’anya, ọ ga-adị anyị otú ahụ ọ dị Pita onyeozi na Jọn onyeozi. Ha sịrị: “Anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.” (Ọrụ 4:20) O nweghị ihe na-eme obi ụtọ ka inyere mmadụ aka ịhụ Jehova n’anya. Chegodị otú ọ dị Filip onye na-ezisa ozi ọma mgbe o nyeere onye Itiopia ahụ aka ịmụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ ma mee baptizim. Ọ bụrụ na i mee ka Filip ma na-ekwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs gwara anyị, ị na-egosi na ị chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova. (Gụọ Ndị Rom 10:​10, 13, 14.) I nweziri ike ịjụ ihe ahụ onye Itiopia ahụ jụrụ. Ọ jụrụ, sị: “Gịnị na-egbochi ime m baptizim?”​—Ọrụ 8:36.

18. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu na-esonụ?

18 Ihe kacha mkpa ị ga-ekpebi ná ndụ gị bụ ikpebi ime baptizim. Ebe ọ bụ ihe dị ezigbo mkpa, i kwesịrị ichebara ihe ọ pụtara echiche nke ọma. Gịnị ka i kwesịrị ịmata gbasara baptizim? Gịnị ka i kwesịrị ime tupu gị emee baptizim na mgbe i mechara baptizim? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

ABỤ NKE 2 Jehova Bụ Aha Gị

^ par. 5 Ụfọdụ ndị hụrụ Jehova n’anya amaghị ma hà adịla njikere ime baptizim iji ghọọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, isiokwu a ga-enyere gị aka iche gbasara ihe ụfọdụ i nwere ike ime ga-enyere gị aka ime baptizim.

^ par. 5 Ndị mmadụ dị iche iche. N’ihi ya, otú ụfọdụ ndị nwere ike isi mee ihe ndị e kwuru n’isiokwu a nwere ike ịdị iche n’usoro e ji dee ha ebe a.

^ par. 6 Ị chọọ ịhụ ihe atụ ndị ọzọ, gụọ broshọ bụ́ Was Life Created? na The Origin of Life​—Five Questions Worth Asking.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nwaanyị na-enye nwa agbọghọbịa ọ hụrụ n’ebe ọ gara ịzụ ihe traktị.