Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

“Lee Anyị! Ziga Anyị”

“Lee Anyị! Ziga Anyị”

Ị̀ NA-ECHE gbasara ịkwaga ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, dị ka ná mba ọzọ? Ọ bụrụ otú ahụ, akụkọ Nwanna Bergame na nwunye ya ga-enyere gị aka.

Nwanna Bergame na nwunye ya Marie-Line nọ n’ozi oge niile kemgbe afọ 1988. A ma ha ama ka ndị ebe ọ bụla ha gara na-amara ahụ́ ngwa ngwa. Ha kwetara ije ozi na Gụadilop na French Gịyana. Ọ bụzi alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans na-elekọta ọrụ a na-arụ n’obodo abụọ ahụ. Ka anyị jụọ Jack na Marie-Line nwunye ya ajụjụ ole na ole.

Gịnị mere unu ji banye n’ozi oge niile?

Marie-Line: Mgbe m na-eto eto na Gụadilop, mụ na mama m na-esokarị kwusagide ozi ọma chi ejie. Mgbe ọ dị ndụ, ọ bụ Onyeàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi. M hụrụ ndị mmadụ n’anya. N’ihi ya, ozugbo m gụchara akwụkwọ n’afọ 1985, m malitere ịsụ ụzọ.

Jack: Mgbe m ka na-eto eto, mụ na ndị ozi oge niile na-ejighị ikwusa ozi ọma egwu egwu na-anọkarị. M na-asụkarịkwa ụzọ inyeaka n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ anyị. Ná ngwụcha izu ọ bụla, anyị na-agba bọs gaa soro ndị ọsụ ụzọ nọ ebe ọzọ kwusaa ozi ọma. Anyị na-ekwusagide ozi ọma chi ejie. E mechaa, anyị agaa kporie ndụ n’akụkụ osimiri. Anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ.

Obere oge mụ na Marie-Line lụchara n’afọ 1988, mụ asị onwe m: ‘Gịnị mere anyị agaghị ejekwuru Jehova ozi, ebe ọ bụ na e nweghị ihe na-egbochi anyị?’ M sooro Marie-Line sụwa ụzọ oge niile. Mgbe otu afọ gachara, a họpụtara anyị ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mgbe anyị gachara ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ. Anyị jere ozi tọrọ anyị ụtọ n’ebe dị iche iche na Gụadilop tupu a gwa anyị gafee French Gịyana.

E zigala unu ọtụtụ ebe ịga jee ozi kemgbe ọtụtụ afọ. Olee ihe nyeere unu aka inwe ike ije ozi n’ebe ndị ahụ?

Marie-Line: Ụmụnna nọ na Betel dị na French Gịyana maara na amaokwu Baịbụl na-atọgbu anyị atọgbu bụ Aịzaya 6:8. N’ihi ya, ihe ha na-ebukarị ụzọ agwa anyị ma ha kpọọ anyị bụ: “Ùnu chetara amaokwu Baịbụl ahụ na-atọ unu ụtọ?” Anyị na-amata na ihe ọ pụtara bụ na a na-aga iziga anyị ebe ọzọ. N’ihi ya, anyị na-asị: “Lee anyị! Ziga anyị.”

Anyị anaghị eji ebe e zigara anyị atụnyere ebe anyị jeburu ozi, n’ihi na anyị mee otú ahụ, ebe anyị na-eje ozi agaghị na-atọ anyị ụtọ. Anyị na-agba mbọ meta ụmụnna anyị enyi.

Jack: N’oge gara aga, ụfọdụ ndị enyi anyị ji obi ọcha ha gwa anyị ka anyị ghara ịpụ, n’ihi na ha chọrọ ka anyị na ha nọrọ. Ma, mgbe anyị si Gụadilop pụọ, otu nwanna chetaara anyị okwu Jizọs kwuru na Matiu 13:​38, bụ́: “Ubi ahụ bụ ụwa.” N’ihi ya, mgbe ọ bụla e zigara anyị ebe ọzọ, anyị na-echetara onwe anyị na ọ ka bụkwa n’otu ubi ahụ ka anyị nọ n’agbanyeghị ebe anyị gara. A sị ka e kwuwe, ihe kacha mkpa bụ ndị mmadụ na ebe anyị na-ekwusa ozi ọma.

Mgbe ọ bụla anyị gafere ebe ọhụrụ, anyị na-ahụ na ndị ọzọ bi ebe ahụ na-enwekwa obi ụtọ. N’ihi ya, anyị na-agbalị ibi ndụ ka ha. N’agbanyeghị na nri ha nwere ike ịdị iche, anyị na-eri ihe ha na-eri, na-aṅụkwa mmiri ha. Ma, anyị na-akpachapụkwa anya ka anyị ghara ibute ọrịa. Anyị na-agbalị ikwu ihe dị mma gbasara ebe ọ bụla e zigara anyị.

Marie-Line: Anyị na-amụtakwa ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna ndị nọ ebe ahụ. Echetara m mgbe mbụ anyị gara French Gịyana. Ezigbo mmiri nọ na-ezo. N’ihi ya, anyị chere na anyị ga-echere ka mmiri kwụsị tupu anyị agawa ozi ọma. Ma, otu nwanna nwaanyị sịrị m: “Ka anyị gawanụ.” O juru m anya, mụ asị ya: “Olee otú anyị si aga?” Ya asị m, “Were nche anwụ gị. Anyị ga-agbara ígwè anyị gawa.” Esi m otú ahụ mụta otú e si eji nche anwụ n’otu aka na-agba ígwè. A sị na mụ amụtaghị ya, agaraghị m na-aga ozi ọma n’oge udu mmiri.

Unu akwafeela ebe ọzọ ihe dị ka ugboro iri na ise. È nwere aro unu ga-atụrụ ndị ọzọ gbasara ịkwaga ebe ọzọ?

Marie-Line: Ịkwaga ebe ọzọ adịghị mfe. Ma, ọ dị mkpa ka mmadụ nweta ebe o nwere ike ịnọ ahụ́ eruo ya ala ma ọ lọta ozi ọma.

Jack: Anyị kwafee ebe ọzọ, m na-etegharịkarị ime ụlọ anyị ágbá. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị na-amata na o nwere ike ịbụ na anyị agaghị anọte aka n’ebe anyị na-aga, ha asị m, “Jack, enyela onwe gị nsogbu ite ebe unu bi ugbu a ágbá.”

Marie-Line ma otú e si ahazi ngwongwo. Ọ na-etinye ihe dị iche iche n’igbe nke ya, dee ya aha, dị ka “ụlọ ịsa ahụ́,” “ụlọ ihi ụra,” “usekwu,” na ihe ndị yiri ya. N’ihi ya, ozugbo anyị kwabara n’ụlọ ọhụrụ, ọ na-adịrị anyị mfe ibusa igbe nke ọ bụla n’ọnụ ụlọ nke ya. Ọ na-edekwa ihe ndị dị n’igbe nke ọ bụla ka ọ dịrị anyị mfe iwere ihe anyị na-achọ.

Marie-Line: Ebe anyị mụtara otú e si ahazi ihe nke ọma, ọ na-adịrị anyị mfe ịmalite ikwusa ozi ọma ozugbo anyị rutere.

Olee otú unu si ahazi oge unu ka unu nwee ike ‘ijezu ozi unu’?​—2 Tim. 4:5.

Marie-Line: Ụbọchị Mọnde ka anyị na-ezu ike, kwadebekwa maka ọmụmụ ihe. Malite na Tuzdee gawa, anyị na-aga ozi ọma.

Jack: Ọ bụ eziokwu na e nwere awa ole a chọrọ ka anyị rụzuo n’ọnwa ọ bụla, ma ọ bụghị ya bụ mkpa anyị. Ọ bụ ozi ọma bụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị. Malite mgbe anyị si n’ụlọ pụọ, ruo mgbe anyị lọtara, anyị na-agbalị izi onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma.

Marie-Line: Anyị gawagodị ilegharị anya, m na-eji traktị aga. Ụfọdụ ndị na-abịakwute anyị, sị anyị nye ha akwụkwọ, n’agbanyeghị na anyị agwabeghị ha na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ya mere anyị ji akpachara anya n’ụdị ejiji anyị na-eji na n’ụdị àgwà anyị na-akpa. Ụdị ihe ndị ahụ ka ndị mmadụ na-ele.

Jack: Otú ọzọ anyị na-esi ezi ndị agbata obi anyị ozi ọma bụ imere ha ihe ọma. M na-enyere ha aka tụtụọ ahịhịa, kpofuo ihe, zachaakwa gburugburu ebe anyị bi. Ndị agbata obi anyị na-ahụ ihe ndị ahụ. Ha na-ajụ m mgbe ụfọdụ, sị: “Ì nwere Baịbụl ị ga-enye m?”

Ọtụtụ ebe unu gara kwusaa ozi ọma bụ n’ime ime obodo. Ò nwere ihe mere n’otu n’ime ebe ndị ahụ unu na-agaghị echefu echefu?

Jack: Na Gịyana, e nwere ụfọdụ ebe siri ezigbo ike ọgịga. Anyị na-agakarị narị kilomita isii n’izu n’ụzọ ndị jọgburu onwe ha. Anyị agaghị echefu mgbe anyị gara Sent Eli, dị n’oké ọhịa Amazọn. Ịgaru ebe ahụ were anyị ihe dị ka awa atọ. Anyị gbara ụgbọala nwere ike ịgba n’ebe ụzọ na-adịghị, gbaakwa ụgbọ mmiri nwere njin. Ọtụtụ ndị bi ebe ahụ bụ ndị na-egwu ọlaedo. Ụfọdụ n’ime ha na-enye anyị irighiri ọlaedo iji gosi na obi dị ha ụtọ maka akwụkwọ ndị anyị nyere ha. N’anyasị, anyị na-egosi ha otu n’ime vidio nzukọ Jehova wepụtara. Ọtụtụ ndị ebe ahụ na-abịakwa ele ya.

Marie-Line: Afọ ole na ole gara aga, a gwara Jack ka o kwuo okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs na Kamopi. Iji ruo ebe ahụ, ụgbọ mmiri nwere njin bu anyị gbaa awa anọ n’Osimiri Oyapọk. Ọ tọrọ anyị ezigbo ụtọ.

Jack: Ebe mmiri ahụ na-emighị emi ma na-asọsi ike nwere ike ịta isi mmadụ. Ọ na-atọ ụtọ ma e ruwe ebe ahụ mmiri na-asọsi ike. Ọ bụ onye na-akwọ ụgbọ mmiri aka siri ike ga-agafeli ebe ahụ. Ije ahụ tọgburu anyị atọgbu. N’agbanyeghị na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova isii bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ahụ, ihe dị ka mmadụ iri ise bịara ya, ma ụfọdụ ndị nwe ala Amerịka.

Marie-Line: Ndị na-eto eto ga-enwe ụdị obi ụtọ a ma ọ bụrụ na ha ewepụta onwe ha jekwuoro Jehova ozi. I kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi ma ị nọrọ n’ụdị ọnọdụ a. Ọ ga-emekwa ka okwukwe gị sikwuo ike. Anyị na-ahụkarị otú Jehova si enyere anyị aka.

Unu amụtala asụsụ ụfọdụ. Ọ̀ na-adịrị unu mfe ịmụta asụsụ?

Jack: Mbanụ. Amụtara m asụsụ ndị a ka m nwee ike iji ha na-ezi ozi ọma ma na-enye aka n’ọgbakọ. M bu ụzọ duzie Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche n’asụsụ Sranantongo * tupudị mụ emee ihe omume ọgụgụ Baịbụl. M jụrụ otu nwanna ma hà ghọtara ihe m kwuru. Ya asị m, “E nwere ihe ụfọdụ i kwuru anyị na-aghọtaghị. Ma ihe omume gị magburu onwe ya.” Ụmụaka nyeere m ezigbo aka. Ha na-agwa m ma e nwee ihe m na-ekwuteghị. Ma ndị toro eto anaghị agwa m. M mụtara ọtụtụ ihe n’aka ụmụaka.

Marie-Line: N’otu ebe anyị kwusara ozi ọma, e nwere ndị m na-amụrụ Baịbụl n’asụsụ French, Pọtugiiz, na Sranantongo. Otu nwanna nwaanyị tụụrụ m aro ka m na-ebu ụzọ amụrụ ndị na-asụ asụsụ na-akacha esiri m ike ihe, jirizie ndị na-asụ asụsụ m kacha mara mechie. Emechara m ghọta uru aro ahụ bara.

Otu ụbọchị, m bu ụzọ mụọrọ mmadụ ihe n’asụsụ Sranantongo, mechaa mụọrọ onye ọzọ n’asụsụ Pọtugiiz. Mgbe m malitere ịmụrụ onye nke abụọ ihe, nwanna nwaanyị mụ na ya so sịrị m, “Nwanna Nwaanyị Marie-Line, ọ naghị aghọta ihe ị na-ekwu.” Mgbe ahụ ka m chọpụtara na m ji asụsụ Sranantongo na-amụrụ nwaanyị onye Brazil ihe kama iji asụsụ Pọtugiiz.

Ụmụnna nọ n’ebe niile unu jere ozi hụrụ unu n’anya nke ukwuu. Olee otú unu si mee ka unu na ha dịrị ná mma otú a?

Jack: Ilu 11:25 sịrị: “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba.” Anyị na-ewepụta onwe anyị inyere ndị ọzọ aka. A bịa n’iso rụọ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụfọdụ na-asị m: “Hapụrụ ya ndị nkwusa.” Ma, m na-asị ha: “Mụnwa bụkwa onye nkwusa. E nwee ọrụ a ga-arụ, achọrọ m iso rụọ ya.” Ọ bụ eziokwu na anyị niile nwere mgbe anyị na-achọ ime ihe ndị dịịrị anyị, anyị na-echetara onwe anyị na anyị ekwesịghị ikwe ka o mee ka anyị ghara inyere ndị ọzọ aka.

Marie-Line: Anyị na-agbalịsi ike igosi ụmụnna anyị na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi. Anyị na-esi otú ahụ mata mgbe ha chọrọ onye ga-elekọtara ha ụmụaka ma ọ bụ onye ga-aga kpọlata ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ. Anyị na-ahazigharị ihe anyị chọrọ ime ka anyị nwee ike inyere ha aka. Ọ bụ otú anyị si ewepụta onwe anyị inyere ha aka mere ka anyị na ha dịrị n’ezigbo mma.

Olee uru ndị unu ritere n’ije ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa?

Jack: Ije ozi oge niile emeela ka anyị na-enwekwu obi ụtọ. O meela ka anyị na-enwekwu ohere ile ihe dị iche iche Jehova kere. N’agbanyeghị na e nweela ihe ụfọdụ siiri anyị ike, obi ruru anyị ala n’ihi na anyị ma na ndị Chineke ga na-akwado anyị n’ebe ọ bụla anyị nọ.

Mgbe m bụ nwa okorobịa, a tụrụ m mkpọrọ na French Gịyana maka na ekweghị m aga agha. O nwetụdịghị mgbe m chere na e nwere mgbe m ga-abịa ebe a bụrụ onye ozi ala ọzọ, e nyekwa m ikike ịga na-ezi ndị mkpọrọ ozi ọma. N’eziokwu, ngọzi Jehova ezuola m ahụ́.

Marie-Line: Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ inyere ndị ọzọ aka. Obi dị anyị ụtọ ịna-ejere Jehova ozi. O meekwala ka mụ na di m bụrụ nnu na mmanụ. Mgbe ụfọdụ, di m na-asị m ka anyị kpọọ di na nwunye dara mbà n’obi ka ha bịa rie nri n’ụlọ anyị. M na-asịkarị ya, “Ọ bụkwa ihe mụnwa na-eche.” Ụdị ihe a na-emekarị.

Jack: N’oge na-adịbeghị anya, a chọpụtara na m nwere ọrịa kansa n’ihe m ji bụrụ nwoke. E nwere ihe m na-agwa nwunye m ọ na-anaghị achọ iji ntị anụ. M na-asị ya: “Nke m, m nwụgodị echi, a gaghị asị na m ‘nwụrụ n’ezigbo agadi.’ Ma obi ga-adị m ụtọ n’ihi na m ma na m ji ndụ m niile jeere Chineke ozi, bụ́kwanụ ihe bara ezigbo uru.”​—Jen. 25:8.

Marie-Line: Jehova enyela anyị ọtụtụ ọrụ anyị na-atụghị anya ha, meekwa ka anyị nwee ike ime ihe ndị anyị chere na anyị agaghị emeli. O jirila ọtụtụ ihe ọma gọzie anyị. Anyị tụkwasịrị Jehova obi. N’ihi ya, ebe ọ bụla nzukọ ya chọrọ ka anyị gaa, ọ bụ ebe ahụ ka anyị ga-aga.

^ par. 32 E si n’asụsụ Bekee, Dọch, Pọtugiiz, na asụsụ ụfọdụ n’Afrịka nweta asụsụ Sranantongo. Ọ bụ ndị ohu malitere ịsụ ya.