Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12

Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ikwu Okwu?

Olee Mgbe Anyị Kwesịrị Ikwu Okwu?

“E nwere . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.”​—EKLI. 3:​1, 7.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Ekliziastis 3:​1, 7 na-akụziri anyị?

ỤFỌDỤ n’ime anyị bụ ndị okwu. E nwekwara ndị ọ na-amasị ịgbachi nkịtị. Amaokwu e si nweta isiokwu a gosiri na e nwere oge ikwu okwu na oge ịgbachi nkịtị. (Gụọ Ekliziastis 3:​1, 7.) Ma, anyị nwere ike ịchọ ka ụfọdụ ụmụnna anyị na-ekwu okwu karịa otú ha na-ekwu ma ọ bụ belata otú ha si ekwu okwu.

2. Ònye kwesịrị ịgwa anyị mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na otú anyị kwesịrị isi ekwu ya?

2 Ikwu okwu bụ onyinye Jehova nyere anyị. (Ọpụ. 4:​10, 11; Mkpu. 4:11) Na Baịbụl, o nyeere anyị aka ịghọta otú anyị kwesịrị isi na-ekwu okwu. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị a kọrọ na Baịbụl ga-enyere anyị aka ịmata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na mgbe anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị. Anyị ga-ahụkwa otú ihe anyị na-agwa ndị ọzọ si eme ka obi dị Jehova. Ka anyị burugodị ụzọ mata mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu.

OLEE MGBE ANYỊ KWESỊRỊ IKWU OKWU?

3. N’ihi ihe e kwuru ná Ndị Rom 10:​14, olee mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu?

3 Anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe ọ bụla ikwu gbasara Jehova na Alaeze ya. (Mat. 24:14; gụọ Ndị Rom 10:14.) Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị na-eme ka Jizọs. Otu n’ime ihe kacha mkpa mere Jizọs ji bịa n’ụwa bụ ịgwa ndị ọzọ eziokwu gbasara Nna ya. (Jọn 18:37) Ma, anyị kwesịrị icheta na otú anyị si ekwu okwu dịkwa mkpa. N’ihi ya, anyị gwawa ndị ọzọ gbasara Jehova, anyị kwesịrị iji “obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu” na-agwa ha ya. Anyị kwesịkwara ikwu ya otú gosiri na anyị na-eche gbasara otú obi dị ndị ọzọ na ihe ha kweere. (1 Pita 3:15) Anyị mee otú ahụ, ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgwa mmadụ okwu, kama anyị ga-akụziri ya ihe nwere ike iru ya n’obi.

4. Dị ka e kwuru n’Ilu 9:​9, olee otú okwu anyị nwere ike isi nyere ndị ọzọ aka?

Ndị okenye ekwesịghị ịgbachi nkịtị ma ha hụ nwanna e kwesịrị inye ndụmọdụ. Ma, ha ga-ahọrọ oge ha kwesịrị iji gwa onye ahụ okwu ka ha ghara imenye ya ihere. Ọ ga-adị mma ka ha chere ruo mgbe naanị ha na onye ahụ nọ. Ndị okenye na-agbalị mgbe niile ikwu okwu otú ga-egosi na ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ma, ha anaghị ahapụ igosi ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere ha aka ime ihe dị mma. (Gụọ Ilu 9:9.) Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị kata obi kwuo okwu mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu? Ka anyị leba anya n’ihe atụ abụọ dị iche. Otu bụ ebe otu nwoke kwesịrị ịgbazi ụmụ ya, nke ọzọ abụrụ ebe otu nwaanyị kwesịrị ịga gwa onye ga-abụ eze okwu.

5. Olee mgbe Ilaị bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà kwesịrị ikwu okwu, mana o kwughị?

5 Ilaị bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà nwere ụmụ nwoke abụọ ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. Ma, ụmụ ya ndị ahụ anaghị akwanyere Jehova ùgwù. Ha bụ ndị nchụàjà n’ụlọikwuu Jehova, nke bụ́ ọrụ dị ezigbo mkpa. Ma, ha ji ikike ha na-eme ihe ha na-ekwesịghị ime. Ha na-eme ihe gosiri na o nweghị ihe ha ji àjà a na-achụrụ Jehova kpọrọ. Ha na-emekwa omume rụrụ arụ n’asọghị anya. (1 Sam. 2:​12-17, 22) Ihe Iwu Mozis kwuru gosiri na ụmụ Ilaị kwesịrị ịnwụ. Ma naanị ihe Ilaị mere bụ iji nwayọọ baara ha mba ma hapụ ha ka ha ka bụrụkwa ndị nchụàjà n’ụlọikwuu Jehova. (Diut. 21:​18-21) Olee otú Jehova si lee ihe ahụ Ilaị mere anya? Ọ sịrị Ilaị: “Gịnị mere . . . [i ji] na-asọpụrụ ụmụ gị karịa mụ onwe m?” Jehova kpebiziri igbu mmadụ abụọ ahụ.​—1 Sam. 2:​29, 34.

6. Olee ihe anyị mụtara n’akụkọ Ilaị?

6 Anyị na-amụta ihe dị mkpa n’akụkọ Ilaị. Anyị chọpụta na enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị mebiri iwu Chineke, anyị kwesịrị ikwu okwu, gwa ya ihe iwu Chineke kwuru. Anyị kwesịkwara ịgbalị hụ na ọ gakwuuru ndị Jehova họpụtara ka ha nyere ya aka. (Jems 5:14) Anyị ekwesịghị ịna-akwanyere enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị ùgwù karịa Jehova otú ahụ Ilaị mere. Anyị ga-akata obi ma ọ bụrụ na anyị ga-agwa mmadụ na ihe o mere adịghị mma. Ma, ime otú ahụ na-aba ezigbo uru. Ka anyị hụ ihe dị iche n’ihe Ilaị mere na ihe otu nwaanyị Izrel aha ya bụ Abigel mere.

Abigel họọrọ oge ka mma ikwu okwu. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 na nke 8) *

7. Gịnị mere Abigel ji gwa Devid okwu?

7 Abigel bụ nwunye Nebal, bụ́ nwoke bara ọgaranya, nweekwa ala. Mgbe Devid na ndị ikom ya nọ na-agba ọsọ n’ihi Eze Sọl, ha na ndị ọzụzụ atụrụ Nebal nọrọ, ha ana-echebekwa ìgwè atụrụ Nebal ka ndị ohi ghara izuru ha. Nebal ò gosiri na obi dị ya ụtọ maka ihe a ha meere ya? Mba. Mgbe Devid gwara Nebal ka o nye ya na ndị ikom ya obere nri na mmiri, iwe bịara ya, ya akparịwa ha. (1 Sam. 25:​5-8, 10-12, 14) N’ihi ya, Devid kpebiri igbukpọ ụmụ nwoke niile nọ n’ezinụlọ Nebal. (1 Sam. 25:​13, 22) Olee otú a ga-esi gbochie nsogbu ahụ? Abigel chọpụtara na ihe a bụ oge o kwesịrị ikwu okwu. N’ihi ya, ọ katara obi gaa zute narị ụmụ nwoke anọ agụụ ji, ji ngwá ọgụ, obi na-afụkwa ka ose, ma gwa Devid okwu.

8. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe Abigel mere?

8 Mgbe Abigel zutere Devid, otú o si gwa ya okwu gosiri na ọ katara obi ma na-akwanyere ya ùgwù. O mere ka Devid kweta ihe o kwuru. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị Abigel kpatara nsogbu ahụ, ọ rịọrọ Devid mgbaghara. O kwuru na Devid bụ ezigbo mmadụ nakwa na ọ ga-eme ihe dị mma. Abigel tụkwasịkwara Jehova obi na ọ ga-enyere ya aka. (1 Sam. 25:​24, 26, 28, 33, 34) Anyị hụ na mmadụ na-eme ihe ga-eme ka o mee ihe jọgburu onwe ya, anyị kwesịrị ịkata obi kwuo okwu otú ahụ Abigel mere. (Ọma 141:5) Anyị kwesịrị ịkwanyere onye ahụ ùgwù. Ma, anyị kwesịkwara ịkata obi. Anyị wetuo obi nye mmadụ ndụmọdụ e kwesịrị inye ya, anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo enyi.​—Ilu 27:17.

9-10. Olee ihe ndị okenye kwesịrị icheta ma ha nyewe ndị ọzọ ndụmọdụ?

9 Ọ dị ezigbo mkpa ka ndị okenye kata obi gwa ndị zọhiere ụkwụ n’ọgbakọ okwu. (Gal. 6:1) Ndị okenye ma na hanwa ezughịkwa okè, na e nwekwara mgbe e kwesịrị inye ha ndụmọdụ. Ma, ọ naghị eme ka ha ghara ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị mgbe ọ dị mkpa. (2 Tim. 4:2; Taị. 1:9) Ha nyewe mmadụ ndụmọdụ, ha na-agbalị iji okwu ha na-akụzi ihe nke ọma ma na-enwere onye ahụ ndidi. Ha hụrụ nwanna ha n’anya. Ọ bụ ya mere ha ji enyere ya aka. (Ilu 13:24) Ma, ihe na-akacha ha mkpa bụ ịkwanyere Jehova ùgwù. Otú ha si eme ya bụ irubere iwu ya isi na ichebe ọgbakọ.​—Ọrụ 20:28.

10 Anyị ekwuola gbasara mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu. Ma, e nwere mgbe ọ ga-akacha mma ka anyị gbachi nkịtị. Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ime otú ahụ?

OLEE MGBE ANYỊ KWESỊRỊ ỊGBACHI NKỊTỊ?

11. Olee ihe atụ Jems ji kọwaa ikwu okwu? Gịnị mere o ji daba adaba?

11 O nwere ike isiri anyị ike ijide ọnụ anyị aka. Jems bụ́ onye so dee Baịbụl ji ihe atụ dabara adaba kọwaa ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:​2, 3) “Ịchịkwa” e kwuru n’amaokwu a na-ekwu gbasara eriri e ji eduzi ịnyịnya, nke a na-eke ịnyịnya ma n’ọnụ ma n’isi. Onye na-agba ịnyịnya ahụ dọọ eriri ahụ aka, ọ ga-eji ya na-eduzi ịnyịnya ahụ ma ọ bụ mee ka ọ kwụsị. Ọ bụrụ na onye ahụ ejidesighị eriri ahụ ike, ịnyịnya ahụ nwere ike itinye isi n’ebe masịrị ya, kpatara ya na onye na-agba ya nsogbu. Otú ahụ ka okwu anyị dị. Ọ bụrụ na anyị ejideghị ọnụ anyị aka, o nwere ike ịkpatara anyị ọtụtụ nsogbu. Ka anyị leba anya n’oge ụfọdụ anyị kwesịrị ijide ọnụ anyị aka ma ghara ikwu okwu.

12. Olee mgbe anyị kwesịrị ijide ọnụ anyị ma ghara ikwu okwu?

12 Gịnị ka ị na-eme ma ị chọpụta na nwanna ma ihe a na-ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ? Dị ka ihe atụ, ị hụ nwanna bi n’obodo a machiri ọrụ anyị, ọ̀ na-adị gị ka ị jụta ya ihe niile gbasara otú ọrụ anyị si na-aga n’obodo ahụ? O doro anya na ihe mere i ji ajụ abụghị na e nwere ihe ọjọọ ị chọrọ ime ha. Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya, chọọkwa ịma otú ihe si dịrị ha. Anyị chọkwara ịma ihe anyị ga-ekpe n’ekpere gbasara ha. Ma, oge a bụ oge anyị kwesịrị ijide ọnụ anyị ma gbachi nkịtị. Ọ bụrụ na anyị enyewe mmadụ nsogbu ka ọ gwa anyị ihe a na-ekwesịghị ịgwa ndị ọzọ, anyị na-egosi na anyị ahụghị ya n’anya, na-egosikwa na anyị ahụghị ụmụnna ndị tụkwasịrị ya obi na ọ gaghị ekwu gbasara ha n’anya. O doro anya na e nweghị onye n’ime anyị ga-achọ ime ka nsogbu ụmụnna anyị nọ na ya ná mba ndị ahụ a machiri ọrụ anyị kakwuo njọ. O nweghịkwa nwanna bi ná mba ndị ahụ ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ otú ụmụnna anyị ndị nọ ebe ahụ si aga ozi ọma ma ọ bụ na-eme ihe ndị ọzọ gbasara ofufe Chineke.

13. Dị ka e kwuru n’Ilu 11:​13, olee ihe ndị okenye kwesịrị ime? N’ihi gịnịkwa?

13 Ndị okenye karịchaa kwesịrị ime ihe Baịbụl kwuru n’Ilu 11:13. (Gụọ ya.) Otú ha ga-esi eme ya bụ ịghara ịgwa ndị ọzọ ihe ha na-ekwesịghị ịma. O nwere ike isi ike mgbe ụfọdụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na okenye ahụ alụọla nwaanyị. Di na nwunye ga-adị n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na ha ana-akọrọ ibe ha ihe nzuzo ha, otú obi dị ha, nakwa ihe na-echegbu ha. Ma okenye ma na ya ekwesịghị ịgwa nwunye ya ihe nzuzo gbasara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. O mee otú ahụ, ha agaghịzi atụkwasị ya obi ma ọ bụkwanụ na-akwanyere ya ùgwù. Ndị nwere ọrụ ha na-arụ n’ọgbakọ ekwesịghị ịbụ “ndị ire abụọ” ma ọ bụ ndị aghụghọ. (1 Tim. 3:8) Ihe ọ pụtara bụ na ha ekwesịghị ịghọgbu ndị ọzọ ma ọ bụ na-agba asịrị. Okenye hụrụ nwunye ya n’anya agaghị na-agwa ya ihe ndị ọ na-ekwesịghị ịma.

14. Olee otú nwunye okenye ga-esi nyere di ya aka ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù?

14 Nwanna nwaanyị nwere ike inyere di ya aka ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù ma ọ bụrụ na ọ naghị enye ya nsogbu ka ọ gwa ya ihe ọ na-ekwesịghị ịma. Ọ bụrụ na nwaanyị ana-eme otú ahụ, ọ na-akwado di ya, na-akwanyekwara ndị gwara ya ihe nzuzo ahụ ùgwù. Nke ka nke bụ na ọ na-eme Jehova obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, udo adịrịkwa na ya.​—Rom 14:19.

OLEE OTÚ OBI NA-ADỊ JEHOVA GBASARA IHE ANYỊ NA-EKWU?

15. Olee otú obi dị Jehova maka ihe ndị enyi Job atọ ahụ mere? N’ihi gịnịkwa?

15 Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’akwụkwọ Job gbasara otú anyị ga-esi na-ekwu okwu na mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu. Mgbe nsogbu na-agbawa obi zochaara Job ka mmiri, ụmụ nwoke anọ bịara ịkasi ya obi na inye ya ndụmọdụ. Ha gbachiri nkịtị ogologo oge. Ma ihe atọ n’ime ha, ya bụ, Elifaz, Bildad, na Zofa mechara kwuo mere ka o doo anya na ihe mere ha ji gbachi nkịtị ogologo oge abụghị na ha na-eche otú ha ga-esi nyere Job aka. Kama, ha nọ na-eche otú ha ga-esi egosi na Job mere ihe ọjọọ. E nwere ihe ụfọdụ ha kwuru bụ eziokwu, ma ọtụtụ n’ime ihe ndị ha kwuru gbasara Job na Jehova bụ okwu ọjọọ ma ọ bụ ụgha. Ha boro Job ebubo na ọ bụghị ezigbo mmadụ. (Job 32:​1-3) Olee ihe Jehova mere gbasara ya? O wesoro mmadụ atọ ahụ ezigbo iwe. Ọ kpọrọ ha ndị nzuzu ma gwa ha ka ha gaa rịọ Job ka o kpee ekpere maka ha.​—Job 42:​7-9.

16. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe na-adịghị mma Elifaz, Bildad, na Zofa mere?

16 E nwere ihe ndị anyị ga-amụta n’ihe na-adịghị mma Elifaz, Bildad, na Zofa mere. Nke mbụ, anyị ekwesịghị ikpe ụmụnna anyị ikpe. (Mat. 7:​1-5) Kama, anyị kwesịrị ige ha ntị nke ọma tupu anyị ekwuo okwu. Ọ bụ naanị ihe ga-eme ka anyị ghọta otú ihe si dịrị ha. (1 Pita 3:8) Nke abụọ, anyị kwuwe okwu, anyị kwesịrị ịgbalị hụ na anyị ji obiọma kwuo ya, nakwa na ihe anyị ga-ekwu bụ eziokwu. (Efe. 4:25) Nke atọ, Jehova anaghị eji ihe anyị na-agwa ibe anyị egwu egwu.

17. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe Elaịhu mere?

17 Onye nke anọ bịara ileta Job bụ Elaịhu, bụ́ onye ikwu Ebreham. O gere ntị mgbe Job na ụmụ nwoke atọ ndị nke ọzọ nọ na-ekwu okwu. O doro anya na o gere ntị nke ọma n’ihe ha kwuru n’ihi na o ji olu ọma gwa Job ihe ndị nyeere ya aka ịgbanwe echiche ya. (Job 33:​1, 6, 17) Ihe kacha Elaịhu mkpa bụ ime ka e too Jehova, ọ bụghị yanwa ma ọ bụkwanụ mmadụ ọzọ. (Job 32:​21, 22; 37:​23, 24) Ihe Elaịhu mere na-akụziri anyị na e nwere oge ịgbachi nkịtị ma gee ntị. (Jems 1:19) Anyị mụtakwara na anyị nyewe mmadụ ndụmọdụ, ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ ka e too Jehova, ọ bụghị anyịnwa.

18. Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị?

18 Otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye ikwu okwu Chineke nyere anyị bụ ime ihe Baịbụl kwuru gbasara ịma mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na otú anyị ga-esi ekwu ya. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” (Ilu 25:11) Anyị gee ntị nke ọma n’ihe ndị ọzọ na-ekwu ma chee echiche tupu anyị ekwuo okwu, okwu anyị ga-adị ka apụl ọlaedo ndị ahụ. Ọ ga-aba uru, maakwa mma. Ma ànyị kwuru nnukwu okwu ma ọ bụ obere okwu, ọ ga-agba ndị ọzọ ume, meekwa ka obi dị Jehova mma. (Ilu 23:15; Efe. 4:29) O nweghị ụzọ ka mma anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka onyinye a Chineke nyere anyị.

ABỤ NKE 82 “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

^ par. 5 Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịma mgbe anyị kwesịrị ikwu okwu na mgbe anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị. Anyị mata ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya, anyị ga na-ekwu ihe ndị ga-eme Jehova obi ụtọ.

^ par. 62 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-enye nwanna nwaanyị nke ọzọ ndụmọdụ.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-atụrụ nwanna ọzọ aro gbasara ịdị ọcha.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: N’oge dabara adaba, Abigel rịọrọ Devid ka o mee ihe dị mma. Devid mekwara ya.

^ par. 68 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na nwunye ya na-ekweghị agwa ndị ọzọ gbasara otú ọrụ anyị si aga n’ebe a machiri ọrụ anyị.

^ par. 70 NKỌWA FOTO: Ebe otu okenye na-agbalị ka a ghara ịnụ ihe ndị ọzọ na-ekwesịghị ịnụ gbasara ọgbakọ.