ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12
Ịhụnanya Na-enyere Anyị Aka Mgbe A Kpọrọ Anyị Asị
“Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya. Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị.”—JỌN 15:17, 18.
ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Dị ka e kwuru na Matiu 24:9, gịnị mere na o kwesịghị iju anyị anya ma ụwa kpọọ anyị asị?
JEHOVA kere anyị ka anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya nakwa ka ndị ọzọ na-ahụ anyị n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ akpọ anyị asị, ọ na-ewute anyị. O nwekwara ike ime ka ụjọ tụwa anyị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị bi na Yurop aha ya bụ Georgina sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na anọ, mama m kpọrọ m asị n’ihi na m na-efe Jehova. Ọ dị m ka à jụrụ m ajụ, mụ amalitekwa iche ma m̀ bụkwa ezigbo mmadụ.” * Otu nwanna aha ya bụ Danylo sịrị: “Mgbe ndị amị kụrụ m ihe, kparịa m ma yie m egwu n’ihi na m bụ Onyeàmà Jehova, ụjọ tụrụ m, ihere onwe m emeekwa m.” Ụdị ịkpọasị a na-ewute anyị. Ma, ọ naghị eju anyị anya. Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-akpọ anyị asị.—Gụọ Matiu 24:9.
2-3. Gịnị mere e ji kpọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị?
2 Ụwa kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị. N’ihi gịnị? N’ihi na dị ka Jizọs kwuru, anyị “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:17-19) N’ihi ya, n’agbanyeghị na anyị na-erubere ndị ọchịchị isi, anyị anaghị efe ha ma ọ bụ ihe ndị na-anọchi anya ha. Ọ bụ naanị Jehova ka anyị na-efe. Anyị kwetara na ọ bụ Chineke ka o ruuru ịchị ụmụ mmadụ. Ma, Setan na “mkpụrụ ya” ekwetaghị ihe a. (Jen. 3:1-5, 15) Anyị na-agwa ndị mmadụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke bụ olileanya ụmụ mmadụ nwere, nakwa na Alaeze ahụ ga-ebibi ndị niile na-emegide ya n’oge na-adịghị anya. (Dan. 2:44; Mkpu. 19:19-21) Ozi a na-amasị ndị dị umeala n’obi. Ma, ọ bụụrụ ndị ajọ omume ozi ọjọọ.—Ọma 37:10, 11.
Jud 7) Ndị mmadụ na-akwa anyị emo, na-akpọkwa anyị ndị oké ezi omume n’ihi na anyị na-edebe iwu Chineke nyere gbasara omume ndị ahụ.—1 Pita 4:3, 4.
3 Ndị mmadụ kpọkwara anyị asị n’ihi na anyị na-edebe iwu Chineke. Ihe Chineke na-ewere ka ihe ọma na ihe ọjọọ dị nnọọ iche n’ihe ndị ụwa na-ewere ka ihe ọma na ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị taa na-anabata omume rụrụ arụ yiri ndị ahụ mere Chineke ji bibie obodo Sọdọm na Gọmọra. (4. Olee àgwà ndị ga-enyere anyị aka ma a kpọọ anyị asị?
4 Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi ma ndị mmadụ kpọọ anyị asị, na-akparịkwa anyị? Anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Dị ka ọta, okwukwe anyị nwere ike “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Efe. 6:16) Ma, ọ bụghị naanị okwukwe dị anyị mkpa. Anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya. N’ihi gịnị? N’ihi na ịhụnanya adịghị “abụ nke a kpasuru iwe.” Ọ na-edi ma na-atachi obi mgbe a na-eme ya ihe ọjọọ. (1 Kọr. 13:4-7, 13) Ka anyị lee otú ịhụ Jehova n’anya, ịhụ ụmụnna anyị n’anya, na ịhụ ndị iro anyị n’anya ga-esi enyere anyị aka ma a kpọọ anyị asị.
ỊHỤ JEHOVA N’ANYA NA-ENYERE ANYỊ AKA MA A KPỌỌ ANYỊ ASỊ
5. Olee otú ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe Nna ya nọ si mee ka ọ dị ike?
5 N’abalị bọtara ụbọchị ndị iro Jizọs gburu ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘M hụrụ Nna m n’anya, n’ihi ya, dị ka Nna m nyere m iwu ka m mee, otú ahụ ka m na-eme.’ (Jọn 14:31) Otú Jizọs si hụ Jehova n’anya mere ka obi sie ya ike maka ọnwụnwa ndị ga-abịara ya. Otú anyị si hụ Jehova n’anya ga-emekwa ka anyị nwee ike idi ọnwụnwa ndị ga-abịara anyị.
6. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 5:3-5, olee otú ọ na-adị ndị Jehova ma ụwa kpọọ ha asị?
6 Ịhụ Chineke n’anya na-enyere ndị na-efe Chineke aka mgbe niile idi mkpagbu. Dị ka ihe atụ, mgbe ụlọikpe kacha elu ndị Juu nyere ndịozi iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ịhụ Chineke n’anya mere ka ha “rubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29; 1 Jọn 5:3) Otú ụmụnna anyị si jiri obi ha niile hụ Chineke n’anya taa na-emekwa ka ha dị ike n’agbanyeghị na ndị ọchịchị aka ike na-emegide ọtụtụ n’ime ha. Kama ịda mbà, obi na-adị anyị ụtọ n’agbanyeghị asị ụwa kpọrọ anyị.—Ọrụ 5:41; Gụọ Ndị Rom 5:3-5.
7. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ndị ezinụlọ anyị megidewe anyị?
7 Ndị ezinụlọ anyị imegide anyị nwere ike ịbụ otu n’ime ihe ndị kacha sie ike odidi. Ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị chọpụta na anyị chọrọ ịmụ banyere Jehova, ha nwere ike ịna-eche na e megharịala anyị anya. Ndị ọzọ nwekwara ike ịna-eche na isi emebiela anyị. (Tụlee Mak 3:21.) Ha nwedịrị ike imesiwe anyị ike. Ụdị ihe a ekwesịghị iju anyị anya. Jizọs kwuru, sị: “Ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:36) N’eziokwu, n’agbanyeghị otú ndị ikwu anyị si ele anyị anya, anyị anaghị ewere ha ka ndị iro anyị. Kama, ka anyị na-ahụkwu Jehova n’anya, anyị na-ahụkwu ndị mmadụ n’anya. (Mat. 22:37-39) Ma, anyị agaghị anwa anwa hapụ ime ihe Baịbụl kwuru naanị iji mee ka obi dị ndị mmadụ mma.
8-9. Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị aka idi mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ a kpagburu ya?
8 Georgina anyị kwuru gbasara ya ná mmalite nọgidere na-efe Jehova n’agbanyeghị na nne ya na-emegide ya. Ọ sịrị:
“Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ mụ na mama m Baịbụl. Ma mgbe m mụrụ ihe ọnwa isii chọọ ibido gawa ọmụmụ ihe, mama m malitere imegide m. M chọpụtara na ọ na-agụ ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ dere. Ọ na-agwakwa m ihe ndị ha na-ekwu gbasara Ndịàmà Jehova ma mụ na ya kwuwe okwu. Ọ na-akparị m, na-adọ m ná ntutu, na-atọgide m n’akpịrị, na-etufusịkwa akwụkwọ m. Mgbe m gbara afọ iri na ise, m mere baptizim. Mama m gbalịrị ka ọ kwụsị m ife Jehova. Ọ kpọgara m ebe a na-akpọga ụmụ agbọghọ na-eme isi ike. Ụfọdụ n’ime ndị nọ ebe ahụ na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-emekwa omume ọjọọ ndị ọzọ. Ọ na-esiri mmadụ ezigbo ike idi mkpagbu, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye na-akpagbu ya bụ onye kwesịrị ịhụ ya n’anya ma na-elekọta ya.”9 Gịnị nyeere Georgina aka idi mkpagbu ahụ? Ọ sịrị: “Ọ dịghị anya m gụchara Baịbụl niile mgbe mama m malitere imegide m. Obi sikwara m ezigbo ike na mụ amatala eziokwu, mụ na Jehova dịkwa n’ezigbo mma. M na-ekpe ekpere mgbe niile, ọ na-azakwa m ekpere. Mgbe m bi n’ebe ahụ mama m kpọgara m, otu nwanna nwaanyị gwara m bịa n’ụlọ ya. M gara mụ na ya amụọ Baịbụl. N’oge ahụ niile, ụmụnna na-agba m ume. Ha weere m ka onye ezinụlọ ha. Eji m anya m hụ na Jehova dị ike karịa ndị na-akpagbu anyị n’agbanyeghị ndị ha bụ.”
10. Olee ihe obi nwere ike isi anyị ike na Jehova Chineke anyị ga-emere anyị?
10 Pọl onyeozi kwuru na e nweghị ihe nwere ike “ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Rom 8:38, 39) Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịta ahụhụ ruo oge ụfọdụ, Jehova ga-anọnyere anyị mgbe niile, na-akasi anyị obi, na-emekwa ka anyị dị ike. Dịkwa ka anyị hụrụ n’akụkọ Georgina, Jehova na-ejikwa ụmụnna anyị enyere anyị aka.
ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA NA-ENYERE ANYỊ AKA MA A KPỌỌ ANYỊ ASỊ
11. Olee otú ịhụnanya Jizọs kwuru okwu ya na Jọn 15:12, 13 ga-esi nyere ndị na-eso ụzọ ya aka? Nye ihe atụ.
11 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ahụ ibe ha n’anya. (Gụọ Jọn 15:12, 13.) Ọ ma na ịhụ ụmụnna ha n’anya ga-enyere ha aka ịnọgide na-adị n’otu n’agbanyeghị asị ụwa kpọrọ ha. Ka anyị legodị ihe mere n’ọgbakọ dị na Tesalonaịka. Malite n’oge e hiwere ya, a kpagburu ụmụnna nọ na ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụnna ndị ahụ bụ ndị e ji ama atụ n’ikwesị ntụkwasị obi na n’ịhụnanya. (1 Tesa. 1:3, 6, 7) Pọl gbara ha ume ka ha nọgide na-ahụ ibe ha n’anya “n’ụzọ zuru ezu karị.” (1 Tesa. 4:9, 10) Otú ha si hụ ibe ha n’anya ga-eme ka ha na-akasi ndị dara mbà obi ma na-akwado ndị na-adịghị ike. (1 Tesa. 5:14) Ha mere ihe a Pọl gwara ha. Ọ bụ ya mere na n’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara ha mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, ọ gwara ha, sị: “Ịhụnanya unu niile nwere n’otu n’otu na-amụbakwa n’ebe ibe unu nọ.” (2 Tesa. 1:3-5) Otú ha si hụ ibe ha n’anya nyeere ha aka idi ihe isi ike na mkpagbu.
12. N’otu oge a na-alụ agha, olee otú ụmụnna nọ n’otu obodo si gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya?
12 Legodị ihe mere Danylo anyị kwuru okwu ya ná mmalite na nwunye ya. Mgbe agha dara n’obodo ha, ha ka na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusakwa ozi ọma otú ha nwere ike. Ha na ụmụnna ha na-esokwa eri nri ndị ha nwere. Otu ụbọchị, ndị amị bu égbè bịakwutere Danylo. Danylo sịrị: “Ha gwara m ka m kwuo na mụ abụghịzi Onyeàmà Jehova. Mgbe m jụrụ, ha kụrụ m ihe, meekwa ka hà chọrọ ịgbagbu m. Ha gbara égbè, ya esi n’elu isi m gafere. Tupu ha apụwa, ha kwuru na ha ga-alọghachi bịa dịnaa nwunye m n’ike. Mana, ụmụnna tinyere anyị n’ụgbọ okporo ígwè na-aga obodo ọzọ ozugbo. Agaghị m echefu otú ụmụnna ndị ahụ si hụ anyị n’anya. Mgbe anyị ruru obodo ahụ, ụmụnna nọ n’ebe ahụ nyere anyị nri, nyekwara m aka ịchọta ọrụ na ụlọ. Ihe ahụ mere ka anyị nwee ike ịnabata ụmụnna ndị ọzọ si ebe ahụ a na-alụ agha gbaa ọsọ ndụ.” Ụdị akụkọ a na-egosi na ịhụnanya anyị hụrụ ibe anyị nwere ike inyere anyị aka ma a kpọọ anyị asị.
ỊHỤ NDỊ IRO ANYỊ N’ANYA NA-ENYERE ANYỊ AKA MA A KPỌỌ ANYỊ ASỊ
13. Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova ma mgbe ndị mmadụ kpọrọ anyị asị?
13 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụ ndị iro ha n’anya. (Mat. 5:44, 45) Ihe a ọ̀ dị mfe omume? Mbanụ. Ma, mmụọ nsọ Chineke ga-enyere anyị aka ime ya. Ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ bụ ịhụnanya, ndidi, obiọma, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye. (Gal. 5:22, 23) Àgwà ndị a na-enyere anyị aka ma a kpọọ anyị asị. Ọtụtụ ndị na-emegidebu anyị agbanweela n’ihi na di ha, nwunye ha, nwa ha, ma ọ bụ onye agbata obi ha na-akpa àgwà ọma ndị a. Ọtụtụ ndị na-emegidebu anyị aghọọla ụmụnna anyị. N’ihi ya, ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịhụ ndị kpọrọ gị asị n’ihi na ị bụ Onyeàmà Jehova n’anya, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ka obi siekwa gị ike na ime ihe Jehova gwara anyị mee bụ ihe kacha mma ime mgbe niile.—Ilu 3:5-7.
14-15. Olee otú ihe e kwuru ná Ndị Rom 12:17-21 si nyere Yasmeen aka ịhụ di ya n’anya n’agbanyeghị na ọ na-emegide ya?
14 Legodị ihe mere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Yasmeen. Mgbe ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova, di ya chere na a ghọgbuola ya. N’ihi ya, ọ chọrọ ịkwụsị ya ife Chineke. Ọ kparịrị ya, meekwa ka ndị ikwu ha, otu ụkọchukwu, na otu dibịa afa yie ya egwu ma bo ya ebubo na ọ na-achọ itisa ezinụlọ ha. N’otu oge ụmụnna nọ n’ọmụmụ ihe, di ya gara ebe ahụ kparịa ha. Yasmeen na-ebekarị ákwá n’ihi otú a na-adịghị mma e si na-emeso ya.
15 Yasmeen gaa ọmụmụ ihe, ụmụnna na-akasi ya obi, na-emekwa ka ọ dị ike. Ndị okenye gwara ya ka o mee ihe e dere ná Ndị Rom 12:17-21. (Gụọ ya.) Yasmeen sịrị: “Ọ dịrịghị m mfe. Ma m rịọrọ Jehova ka o nyere m aka. M gbalịrị ike m niile iji mee ihe a Baịbụl kwuru. N’ihi ya, di m kpachara anya wụsasịa unyi n’usekwu anyị, m na-azachasị ya kpofuo. Ọ gwa m okwu ọjọọ, m na-emeda obi zaghachi ya. Ọ daakwa ọrịa, m na-elekọta ya.”
16-17. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ Yasmeen?
16 Otú a Yasmeen si hụ di ya n’anya baara ya ezigbo uru. Ọ sịrị: “Di m malitere ịtụkwasịkwu m obi n’ihi na ọ ma na m na-agwa ya eziokwu mgbe niile. Ọ malitere iji nwayọọ na-ege m ntị ma anyị kwuwe gbasara okpukpe. O kwere ka anyị mee udo n’ezinụlọ anyị. Ugbu a, ọ na-agwadị m ka m gaa ọmụmụ ihe. Mụ na ya adịkwuola ná mma ugbu a, anyị na-ebikwa n’udo. Ekpere m bụ ka ọ nabata eziokwu ma soro m fewe Jehova.”
17 Akụkọ Yasmeen gosiri na ịhụnanya “na-edi ihe niile, . . . na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” (1 Kọr. 13:4, 7) Ịkpọasị nwere ike isi ike, na-agbawakwa obi. Ma, ịhụnanya na-akpa ike karịa ya. Ịhụnanya na-eme ka mmadụ gbanwee ndụ ya. Ọ na-emekwa ka Jehova ṅụrịa. Ma, ọ bụrụ na ndị na-emegide anyị anọgide na-akpọ anyị asị, anyị ka nwere ike inwe obi ụtọ. Olee otú ọ ga-esi kwe omume?
INWE OBI ỤTỌ MGBE A KPỌRỌ ANYỊ ASỊ
18. Gịnị nwere ike ime ka anyị na-enwe obi ụtọ ma a kpọọ anyị asị?
18 Jizọs sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị.” (Luk 6:22) Ọ bụghị anyị họọrọ ka ndị mmadụ kpọọ anyị asị. Mkpagbu a na-akpagbu anyị n’ihi okwukwe anyị anaghị atọ anyị ụtọ. N’ihi ya, olee ihe nwere ike ime ka obi na-atọ anyị ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị? E nwere ihe atọ na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ mgbe a na-akpagbu anyị. Nke mbụ, ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi, ihe anyị na-amasị Jehova. (1 Pita 4:13, 14) Nke abụọ, mkpagbu na-anụcha okwukwe anyị, ya esikwuo ike. (1 Pita 1:7) Nke atọ, Jehova ga-eji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ.—Rom 2:6, 7.
19. Gịnị mere ndịozi Jizọs ji ṅụrịa ọṅụ mgbe a pịachara ha ihe?
19 Obere oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ndịozi ya nwere ụdị obi ụtọ ahụ o kwuru banyere ya. Mgbe a pịachara ha ihe ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha ṅụrịrị ọṅụ. N’ihi gịnị? “N’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha [Jizọs].” (Ọrụ 5:40-42) Ịhụnanya ha nwere n’ebe Nna ha ukwu nọ karịrị egwu ha na-atụ asị ndị iro ha kpọrọ ha. Ha nọgidekwara na-ekwusa ozi ọma “n’akwụsịghị akwụsị” iji gosi na ha hụrụ Jizọs n’anya. Ọtụtụ ụmụnna anyị taa ka na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu. Ha ma na Jehova agaghị echefu ọrụ ha na ịhụnanya ha gosiri maka aha ya.—Hib. 6:10.
20. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
20 Ebe anyị ka bi n’ụwa ochie a, ụwa ga na-akpọ anyị asị. (Jọn 15:19) Ma, ụjọ ekwesịghị ịtụ anyị. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, Jehova ‘ga-eme ka ndị na-erubere ya isi guzosie ike, na-echekwa ha nche.’ (2 Tesa. 3:3) N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ahụ Jehova, ụmụnna anyị, nakwa ndị iro anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, anyị ga-adị n’otu, okwukwe anyị esiekwa ike. Anyị ga-emekwa ka e too Jehova. Anyị ga-egosikwa na ịhụnanya na-akpa ezigbo ike karịa ịkpọasị.
ABỤ NKE 106 Ka Anyị Mụta Ịhụnanya
^ par. 5 N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú ịhụ Jehova n’anya, ịhụ ụmụnna anyị n’anya, nakwa ịhụ ndị iro anyị n’anya ga-esi enyere anyị aka ịnọgide na-efe Jehova n’agbanyeghị asị ụwa kpọrọ anyị. Anyị ga-ahụkwa ihe mere Jizọs ji kwuo na anyị nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ma a kpọ anyị asị.
^ par. 1 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 58 NKỌWA FOTO: Mgbe ndị amị yichara Nwanna Danylo egwu, ụmụnna nyeere ya na nwunye ya aka ịkwapụ. Ụmụnna nọ n’ebe ha kwagara nabatakwara ha nke ọma.
^ par. 60 NKỌWA FOTO: Di Nwanna Nwaanyị Yasmeen megidere ya, ma ndị okenye nyere ya ezigbo ndụmọdụ. Ọ kpara àgwà ka ezigbo nwaanyị ma lekọta di ya mgbe ọ dara ọrịa.