ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9
Ụmụ Okorobịa, Olee Otú Unu Ga-esi Mee Ka Ndị Ọzọ Tụkwasị Unu Obi?
“I nwere ìgwè ụmụ okorobịa . . . dị nnọọ ka igirigi.” —ỌMA 110:3.
ABỤ NKE 39 Meere Onwe Gị Ezi Aha n’Ebe Chineke Nọ
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee ihe e nwere ike ikwu gbasara ụmụnna nwoke na-eto eto?
ỤMỤNNA nwoke na-eto eto, e nwere ọtụtụ ihe unu nwere ike ime n’ọgbakọ. Ahụ́ gbasiri ọtụtụ n’ime unu ike. (Ilu 20:29) E nwere ọtụtụ uru ị ga-abara ọgbakọ unu. O nwekwara ike ịbụ na ị na-atụsi anya ike mgbe a ga-ahọpụta gị ka ị bụrụ ohu na-eje ozi. Ma, i nwere ike ịna-eche na ndị ọzọ na-ele gị anya na i torubeghị ma ọ bụkwanụ na i rughị eru ka e nye gị ọrụ dị mkpa. Ọ bụrụgodị na ị ka na-eto eto, e nwere ihe ndị i nwere ike ime ugbu a ka ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu nwee ike ịtụkwasị gị obi, na-akwanyekwara gị ùgwù.
2. Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?
2 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị mere ná ndụ Eze Devid. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ụfọdụ mere ná ndụ ndị eze Juda abụọ bụ́ Esa na Jehọshafat. Anyị ga-atụle ụfọdụ nsogbu bịaara ụmụ nwoke atọ ndị a, ihe ha mere, nakwa ihe ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka ha.
MỤTA IHE N’AKA EZE DEVID
3. Olee otu ụzọ ndị na-eto eto nwere ike isi nyere ndị agadi nọ n’ọgbakọ ha aka?
3 Mgbe Devid ka na-eto eto, ọ mụtara nkà ndị ọzọ weere ka ihe dị mkpa. O doro anya na ya na Chineke dị ná mma. Ọ mụrụ otú e si akụ egwú, jirikwa ya nyere Sọl bụ́ eze Chineke họpụtara aka. (1 Sam. 16:16, 23) Ụmụnna nwoke na-eto eto, ùnu nwere nkà ga-abara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ unu uru? Ọtụtụ n’ime unu nwere. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na obi na-atọ ndị agadi nọ n’ọgbakọ unu ụtọ ma a kụziere ha otú e si eji ekwentị amụ ihe n’onwe ha nakwa n’ọmụmụ ihe. I nwere ike inyere ha aka n’ihi na ị ma anya kọmputa na ekwentị.
4. Dị ka Devid, olee àgwà ndị ụmụnna nwoke na-eto eto kwesịrị inwe? (Kọwaa ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
4 Devid mere ihe ndị gosiri na a ga-atụkwasịli ya obi ná ndụ ya niile. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ ka na-eto eto, ọ gbara mbọ na-elekọta atụrụ nna ya. Ọrụ ahụ nwere ike ịta isi mmadụ. Devid mechara gwa Eze Sọl, sị: “Ohu gị ghọrọ onye na-azụ ìgwè atụrụ nna ya, otu ọdụm wee bịa, otu anụ ọhịa bea bịakwara, nke ọ bụla buuru otu atụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ. M wee chụwa ya kụgbuo ya ma napụta ya n’ọnụ ya.” (1 Sam. 17:34, 35) Devid ma na ilekọta ụmụ atụrụ ahụ bụ ọrụ ya. Ọ bụ ya mere o ji kata obi lụso anụ ọhịa ndị ahụ ọgụ. Ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ime ka Devid. Otú ha ga-esi eme ya bụ iwepụta obi ha na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ha.
5. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 25:14, olee ihe kacha mkpa ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ime?
5 Devid mere ka ya na Jehova dịrị n’ezigbo mma mgbe ọ ka na-eto eto. Adịm ná mma Devid na Jehova dị mkpa karịa obi ike Devid ma ọ bụ ụbọ ọ ma akpọ. Ọ bụghị naanị na Jehova bụ Chineke Devid, ọ bụkwa ezigbo enyi ya. (Gụọ Abụ Ọma 25:14.) Ụmụnna nwoke na-eto eto, ihe kacha mkpa unu ga-eme bụ ime ka unu na Nna unu nke eluigwe dị n’ezigbo mma. Ime otú ahụ nwere ike ime ka e nyekwuo unu ọrụ n’ọgbakọ.
6. Olee ihe na-adịghị mma ụfọdụ ndị chere gbasara Devid?
6 Otu nsogbu Devid nwere bụ na ụfọdụ ndị chere na o torubeghị ime ihe ụfọdụ ma ọ bụ na ọ naghị eji ihe akpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid wepụtara onwe ya ịlụso Golayat ọgụ, Eze Sọl gbalịrị ime ka ọ ghara ịga. Ọ gwara ya, sị: “Ị ka bụ nwata.” (1 Sam. 17:31-33) Tupu mgbe ahụ, ụmụnne Devid kwukwara na ọ naghị eji ihe akpọrọ ihe. (1 Sam. 17:26-30) Ma, Jehova eleghị Devid anya ka nwata ma ọ bụ onye na-anaghị eji ihe akpọrọ ihe. Ọ ma Devid nke ọma. Devid gburu Golayat n’ihi na ọ tụkwasịrị enyi ya bụ́ Jehova obi na ọ ga-enye ya ike.—1 Sam. 17:45, 48-51.
7. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’otu akụkọ a kọrọ gbasara Devid?
7 Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’aka Devid? Anyị mụtara na anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi. O nwere ike iwe oge tupu ndị ma gị mgbe ị bụ nwata achọpụta na i toola. Ka obi sie gị ike na ihe Jehova na-ele abụghị naanị otú ị dị. Ọ ma gị nke ọma, marakwa ihe ị ga-emeli. (1 Sam. 16:7) Mee ka gị na Chineke dịrịkwuo ná mma. Otú Devid si mee ka ya na Chineke dịrị ná mma bụ ịna-eleru ihe ndị o kere anya. Devid chebaara ihe ha na-akụziri ya gbasara Onye kere ha echiche. (Ọma 8:3, 4; 139:14; Rom 1:20) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịrịọ Jehova ka o nye gị ike. Dị ka ihe atụ, ụmụ klas unu hà na-akwa gị emo n’ihi na ị bụ Onyeàmà Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Na-emekwa ihe ị mụtara na Baịbụl, n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, nakwa na vidio ndị anyị nwere. Mgbe ọ bụla ị hụrụ na Jehova nyeere gị aka imeri nsogbu i nwere, obi ga-esi gị ike na ọ ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị ọzọ. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na ndị ọzọ ana-ahụ na ị na-atụkwasị Jehova obi, ha ga-atụkwasịkwa gị obi.
8-9. Gịnị nyeere Devid aka iji ndidi chere ruo mgbe ọ ghọrọ eze? Oleekwa ihe ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka ya?
8 Ka anyị kwuo gbasara nsogbu ọzọ bịaara Devid. Mgbe e techara ya mmanụ ịbụ eze, o cheere ruo ọtụtụ afọ tupu ya amalite ịchị na Juda. (1 Sam. 16:13; 2 Sam. 2:3, 4) Gịnị nyeere ya aka inwe ndidi n’oge ndị ahụ? Kama ịda mbà n’obi, o lekwasịrị anya n’ihe o nwere ike imeli n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gbagara ọsọ ndụ na Filistia, o ji oge ahụ na-alụso ndị iro ndị Izrel ọgụ. O si otú ahụ chebe ókèala Juda.—1 Sam. 27:1-12.
9 Gịnị ka ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ịmụta n’aka Devid? Jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ nyere ụmụnna gị aka. Chegodị gbasara ihe mere otu nwanna aha ya bụ Ricardo. * Mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na atọ, ọ chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ma, ndị okenye gwara ya ka o cheretụkwuo. Kama Ricardo iwewe iwe maka ya ma ọ bụ daa mbà n’obi, o wepụtakwuru oge na-aga ozi ọma. Ọ sịrị: “M na-echeta ihe mere n’oge ahụ, m ma na e nwere ebe ndị m kwesịrị ịna-emekwu nke ọma. M gbalịrị hụ na m gaghachiri na nke onye ọ bụla gosiri mmasị. M na-akwadokwa akwado tupu mụ agaa. Ọ bụ nke ahụ bụ nke mbụ m mụụrụ mmadụ ihe. Ka m na-ekwusakwu ozi ọma, ka m na-akwụsị ịtụ ụjọ.” Ugbu a, Ricardo bụzi ọsụ ụzọ oge niile na-eme nke ọma, bụrụkwa ohu na-eje ozi.
10. Gịnị ka Devid mere n’otu oge tupu ya emee mkpebi dị ezigbo mkpa?
10 Cheekwa gbasara ihe ọzọ mere ná ndụ Devid. Mgbe Devid na ụmụ nwoke ndị ya na ha so nọ n’ebe ha gbagara ọsọ ndụ, ha hapụrụ ndị ezinụlọ ha gaa agha. Mgbe ha pụrụ, ndị iro bịara bukọrọ ihe niile ha nwere n’ụlọ, kpọrọkwa ndị ezinụlọ ha. Devid nwere ike iche na otú a ọ bụ dike n’agha, ọ ga-ama ihe ọ ga-eme iji napụta ndị ezinụlọ ha a kpọọrọ. Kama ime otú ahụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme. O si n’aka 1 Sam. 30:7-10) Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’akụkọ a?
Abayata bụ́ onye nchụàjà jụọ Jehova, sị: “Ọ̀ bụ m chụwa ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga nke a?” Jehova gwara Devid ka ọ chụwa ha, meekwa ka obi sie ya ike na ọ ga-emeri ha. (11. Gịnị ka i nwere ike ime tupu gị emee mkpebi?
11 Gakwuru ndị ọzọ ka ha nye gị ndụmọdụ tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme. Gị na nne na nna gị kwurịta ya. I nwekwara ike ịgakwuru ndị okenye maara nke a na-akọ ka ha nye gị ndụmọdụ. Jehova tụkwasịrị ndị okenye ndị a obi. Gịnwa nwekwara ike ịtụkwasị ha obi. Jehova na-ele ha anya ka “onyinye” n’ọgbakọ. (Efe. 4:8) Ị ga na-eme mkpebi ndị dị mma ma ọ bụrụ na ị na-eṅomi okwukwe ha, na-egekwa ntị n’aro ndị ha na-atụrụ gị. Ka anyị leba anya n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Eze Esa.
MỤTA IHE N’AKA EZE ESA
12. Olee àgwà ndị Eze Esa nwere mgbe ọ malitere ịchị?
12 Mgbe Eze Esa ka na-eto eto, ọ dị umeala n’obi, nweekwa obi ike. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nọchiri nna ya, bụ́ Eze Abaịja, ọ malitere iwepụsị arụsị ndị dị n’obodo ha. “Ọ gwakwara Juda ka ha chọọ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha nakwa ka ha debe iwu ya na ntụziaka ya.” (2 Ihe 14:1-7) Mgbe Zira, bụ́ onye Itiopia, chị ndị agha ya dị otu nde wakpoo Juda, Esa gakwuuru Jehova ka o nyere ya aka. Ọ sịrị: “Jehova, a bịa n’inye aka, ma ndị mmadụ hà dị ọtụtụ ma ọ bụ na ha adịghị ike, o nweghị ihe o mere n’ebe ị nọ. Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, nyere anyị aka n’ihi na anyị dabeere n’ebe ị nọ.” Ihe ndị a magburu onwe ya Esa kwuru gosiri na obi sịrị ya ike na Jehova ga-anapụta ya na ndị ya. Esa tụkwasịrị Nna ya nke eluigwe obi. ‘Jehova merikwara ndị Itiopia.’—2 Ihe 14:8-12.
13. Gịnị mere Esa, n’ihi gịnịkwa?
13 Ị manụ na ịlụso ndị agha dị otu nde ọgụ abụghị obere ihe. Ma, Esa meriri ha n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ma, ọ dị mwute na mgbe nsogbu ọzọ na-erughị nke mbụ bịaara ya, ọ tụkwasịghị Jehova obi. Mgbe eze ọjọọ na-achị Izrel aha ya bụ Beasha yiri ya egwu, ọ gbakwuuru eze Siria ka o nyere ya aka. Ihe ahụ 2 Ihe 16:7, 9; 1 Eze 15:32) Gịnị ka akụkọ a na-akụziri anyị?
o mere kpataara ya ezigbo nsogbu. Jehova si n’ọnụ onye amụma aha ya bụ Hanenaị gwa ya, sị: “Ebe ọ bụ na ị dabeere n’ebe eze Siria nọ, ị dabereghị n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ, n’ihi ya, ndị agha eze Siria agbapụwo n’aka gị.” Malite mgbe ahụ gawa, Esa nọ n’agha. (14. Olee otú i nwere ike isi na-atụkwasị Jehova obi, gịnịkwa ka 1 Timoti 4:12 kwuru na ị ga-abụ ma i mee otú ahụ?
14 Dịrị umeala n’obi, nọgidekwa na-atụkwasị Jehova obi. Mgbe i mere baptizim, i gosiri na i nwere ezigbo okwukwe, tụkwasịkwa Jehova obi. Obi dịkwa Jehova ezigbo ụtọ ịnabata gị n’ezinụlọ ya. Ihe i kwesịrị ime ugbu a bụ ịnọgide na-atụkwasị Jehova obi. O nwere ike ịdịrị gị mfe ịtụkwasị Jehova obi ma ị na-eme mkpebi ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ gị. Ma, ọ bụrụkwanụ na i mewe mkpebi ndị ọzọ? Ọ dịkwa ezigbo mkpa ka ị tụkwasị Jehova obi ma ị na-ekpebi ihe ị ga-eme gbasara ụdị ihe ị ga-eji atụrụ ndụ, ụdị ọrụ ị ga-arụ, nakwa ụdị ihe ị ga-eme ná ndụ gị. Atụkwasịla onwe gị obi. Kama ime otú ahụ, chọta amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ikpebi ihe ị ga-eme. Meekwa ihe ebe ahụ kwuru. (Ilu 3:5, 6) I mee otú ahụ, ị ga-eme Jehova obi ụtọ, ndị nọ n’ọgbakọ unu ana-akwanyekwara gị ùgwù.—Gụọ 1 Timoti 4:12.
MỤTA IHE N’AKA EZE JEHỌSHAFAT
15. Dị ka e kwuru ná 2 Ihe E Mere 18:1-3; 19:2, olee ihe ndị na-adịghị mma Eze Jehọshafat mere?
15 Nke bụ́ eziokwu bụ na gịnwa ezughị okè otú ahụ anyị niile na-ezughị. Mgbe ụfọdụ, i nwekwara ike imehie ihe. Ma, nke ahụ ekwesịghị igbochi gị ime ike gị niile n’ozi Jehova. Ka anyị leba anya n’akụkọ Jehọshafat. O nwere ọtụtụ àgwà ọma. Baịbụl kwuru na n’oge ọ bụ okorobịa ‘ọ chọrọ Chineke nke nna ya, ọ bụkwa n’iwu ya ka o jere ije.’ Ihe ọzọ bụ na o zigara ndị isi ka ha gaa n’obodo niile dị na Juda kụziere ndị mmadụ gbasara Jehova. (2 Ihe 17:4, 7) N’agbanyeghị ihe ọma ndị a niile Jehọshafat mere, o nwekwara mgbe ụfọdụ o mere mkpebi ndị na-adịghị mma. Otu n’ime mkpebi ndị na-adịghị mma o mere mere ka Jehova ziga mmadụ ka ọ gaa gbazie ya. (Gụọ 2 Ihe E Mere 18:1-3; 19:2.) Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’akụkọ a?
16. Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’akụkọ Rajeev?
16 E nye gị ndụmọdụ, nabata ya. O nwere ike ịbụ na ọ na-esiri gị ike ime ofufe Jehova ihe kacha mkpa ná ndụ gị otú ahụ ọ na-esiri ọtụtụ ụmụ okorobịa. Adala mbà n’obi. Chee gbasara otu nwanna na-eto eto aha ya bụ Rajeev. O kwuru ihe mere mgbe ọ na-erubeghị afọ iri abụọ. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, anaghị m ama ihe m ga-eji ndụ m eme. M na-enwekarị mmasị n’egwuregwu nakwa n’ikpori ndụ karịa ịga ọmụmụ ihe na ịga ozi ọma. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ọtụtụ ndị na-eto eto.” Gịnị nyeere Rajeev aka? Otu okenye dị obiọma gbaziri ya. Rajeev kwuru, sị: “O nyeere m aka ichebara ihe e dere na 1 Timoti 4:8 echiche.” Rajeev ji obi umeala nabata ihe ahụ ọ gwara ya ma chebara ihe ndị o weere ka ihe ndị kacha mkpa ná ndụ ya echiche. Ọ sịrị: “M kpebiziri ime ihe ndị gbasara ofufe Jehova ihe kacha mkpa ná ndụ m.” Gịnịzi si n’ihe a o kpebiri ime pụta? Ọ sịrị: “Ka afọ ole na ole gachara, a họpụtara m ka m bụrụ ohu na-eje ozi.”
MEE KA NNA GỊ NKE ELUIGWE JIRI GỊ NA-EME ỌNỤ
17. Olee otú obi dị ụmụnna gbasara ụmụ okorobịa ndị na-efe Jehova?
17 Ụmụnna nọ n’ọgbakọ ji unu bụ́ ụmụ okorobịa unu na ha ji “otu obi na-efe” Jehova kpọrọ ihe. (Zef. 3:9) Obi dị ha ụtọ otú unu si jiri ịnụ ọkụ n’obi na ike unu niile na-eme ihe ọ bụla a sịrị unu mee n’ozi Jehova. Ihe unu na-amasị ha.—1 Jọn 2:14.
18. Dị ka e kwuru n’Ilu 27:11, olee otú obi na-adị Jehova n’ebe ụmụ okorobịa na-efe ya nọ?
18 Ụmụnna nwoke na-eto eto, unu echefula na Jehova hụrụ unu n’anya, tụkwasịkwa unu obi. O kwuru na n’oge ikpeazụ, a ga-enwe ọtụtụ ndị na-eto eto ga-eji obi ha niile wepụta onwe ha. (Ọma 110:1-3) Ọ ma na ị hụrụ ya n’anya, chọọkwa iji ike gị niile na-efe ya. N’ihi ya, nweere ndị ọzọ ndidi, nweekwara onwe gị ndidi. Mgbe ọ bụla i mehiere ihe, nabata ọzụzụ na mgbazi a ga-enye gị. Lee ya anya ka ihe si n’aka Jehova. (Hib. 12:6) Jiri obi gị niile rụọ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Ma, ihe kacha mkpa bụ ime Nna gị nke eluigwe obi ụtọ n’ihe ọ bụla ị na-eme.—Gụọ Ilu 27:11.
ABỤ NKE 135 Jehova Ji Obiọma Na-arịọ: “Mara Ihe, Nwa M”
^ par. 5 Ka nwanna nwoke na-eto eto na Jehova na-adịkwu ná mma, ọ na-achọ ijekwuru ya ozi. Ọ bụrụ na nwanna nwoke achọọ iru eru ịbụ ohu na-eje ozi, o kwesịrị ime ihe ndị ga-eme ka ndị ọgbakọ ha na-akwanyere ya ùgwù. Gịnị ka ụmụnna nwoke na-eto eto nwere ike ime ka ndị ọzọ na-akwanyere ha ùgwù?
^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.