Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13

Olee Otú Jehova Si Echebe Gị?

Olee Otú Jehova Si Echebe Gị?

“Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emekwa ka unu guzosie ike, na-echekwa unu nche n’ihi ajọ onye ahụ.”—2 TESA. 3:3.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị mere Jizọs ji rịọ Jehova ka o chebe ndị na-eso ụzọ ya?

N’ABALỊ bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ nọ na-eche banyere ụdị nsogbu ga-abịara ndị na-eso ụzọ ya. Ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ mere ka ọ rịọ nna ya ka o “chee ha nche n’ihi ajọ onye ahụ.” (Jọn 17:14, 15) Jizọs ma na ọ bụrụ na ya alaghachi n’eluigwe, Setan agaghị akwụsị ibuso onye ọ bụla chọrọ ife Jehova agha. N’ihi ya, o doro anya na ọ ga-adị mkpa ka Jehova chebe ndị ya.

2. Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga na-aza anyị ekpere anyị?

2 Jehova zara Jizọs ekpere ya n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị agbalịa ike anyị na-eme ihe dị Jehova mma, ọ ga na-aza anyị ekpere anyị, na-echebekwa anyị. Ebe Jehova bụ Onyeisi ezinụlọ na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma, ọ ga-anọgide na-elekọta anyị dị ka ụmụ ọ hụrụ n’anya. Ma ó meghị otú ahụ, o nwere ike ime ka a kọchaa aha ya.

3. Gịnị mere nchebe Jehova ji dị anyị mkpa taa?

3 Nchebe Jehova dị anyị mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ekwensu “na-ewe oké iwe” n’ihi na a chụpụla ya n’eluigwe. (Mkpu. 12:12) Ekwensu emeela ka ụfọdụ ndị na-akpagbu anyị chee na ha na-ejere “Chineke ozi dị nsọ.” (Jọn 16:2) Ndị nke na-ekwetaghị na Chineke dị na-akpagbu anyị n’ihi na anyị dị iche n’ụwa. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị a niile, obi siri anyị ike. N’ihi gịnị? N’ihi na Okwu Chineke sịrị: “Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emekwa ka unu guzosie ike, na-echekwa unu nche n’ihi ajọ onye ahụ.” (2 Tesa. 3:3) Olee otú Jehova si echebe anyị? Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ.

JEHOVA NYERE ANYỊ EKIKE AGHA

4. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 6:13-17, gịnị ka Jehova nyere anyị iji chebe anyị?

4 Jehova emeela ka anyị nwee ekike agha zuru ezu ga-echebe anyị n’ọgụ Ekwensu na-alụso anyị. (Gụọ Ndị Efesọs 6:13-17.) Ekike agha a Chineke nyere anyị siri ezigbo ike. Ọ na-arụkwa ọrụ nke ọma. Ma, naanị ihe ga-eme ka o chebe anyị bụ ma ọ bụrụ na anyị eyiri nke ọ bụla n’ime ha, gharakwa iyipụ ya. Gịnị ka nke ọ bụla n’ime ekike agha ndị ahụ nọchiri anya ya? Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ha.

5. Gịnị bụ eziokwu ahụ a na-eke n’úkwù? Gịnị mere anyị ji kwesị ike ya?

5 Eziokwu ahụ a na-eke n’úkwù nọchiri anya eziokwu dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kee ya n’úkwù? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu bụ “nna ụgha.” (Jọn 8:44) Ekwensu na-agha ụgha kemgbe ọtụtụ puku afọ. O duhiekwala “elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Ma, eziokwu ndị dị na Baịbụl na-eme ka a ghara iduhie anyị. Olee otú anyị si eke eziokwu a n’úkwù? Otú anyị si eme ya bụ ịmụ eziokwu gbasara Jehova, ife ya “n’ime mmụọ na n’eziokwu,” nakwa ịna-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.—Jọn 4:24; Efe. 4:25; Hib. 13:18.

Ihe a na-eke n’úkwù: Eziokwu dị na Baịbụl

6. Gịnị bụ ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji na-eyi ya?

6 Ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume nọchiri anya iwu ezi omume Jehova. Gịnị mere anyị kwesịrị iji yiri ihe mgbochi obi ahụ bụ́ ezi omume? Otú ahụ ihe mgbochi obi si echebe obi onye agha ka mgbọ ghara ịtụ ya, ka ihe mgbochi obi ahụ bụ́ ezi omume si echebe obi anyị ka ihe ọjọọ juru n’ụwa a ghara imebi ya. (Ilu 4:23) Jehova chọrọ ka anyị hụ ya n’anya ma jiri obi anyị niile na-efe ya. (Mat. 22:36, 37) N’ihi ya, Ekwensu na-achọ ka anyị hụwa ihe ndị dị n’ụwa n’anya si otú ahụ kwụsị iji obi anyị niile na-efe Jehova. (Jems 4:4; 1 Jọn 2:15, 16) Ọ bụrụ na nke ahụ enweghị isi, ọ na-eyi anyị egwu ka anyị mebie iwu Jehova.

Ihe mgbochi obi: Iwu ezi omume Jehova

7. Olee otú anyị si eyiri ihe mgbochi obi ahụ bụ́ ezi omume?

7 Otú anyị si eyiri ihe mgbochi obi a bụ́ ezi omume bụ ịkpọ ihe ndị Jehova kpọrọ asị asị na ịhụ ihe ọ hụrụ n’anya n’anya. (Ọma 97:10) Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na iwu Jehova na-ekegide anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị akwụsị ịna-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-adị ka onye agha yipụrụ ihe mgbochi obi ya n’ọgbọ agha n’ihi na ọ na-anyị ya arọ. Ihe ahụ bụ omume iberiibe. Ndị hụrụ Jehova n’anya na-ele iwu ya anya ka ihe na-azọ ndụ, ọ bụghị ihe dị “arọ.”—1 Jọn 5:3.

8. Gịnị ka iyiri akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo pụtara?

8 Pọl gwakwara anyị ka anyị yiri akpụkpọ ụkwụ bụ́ ngwá ọrụ nke ozi ọma nke udo. Ihe ọ pụtara bụ na anyị kwesịrị ịdị njikere mgbe niile ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Anyị jiri Baịbụl na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, okwukwe anyị na-esikwu ike. Obi na-adị anyị ụtọ ịhụ otú ndị Jehova n’ụwa niile si achọ ụzọ dị iche iche ha nwere ike isi kwusaa ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ha na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọrụ ha ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe a na-ere ahịa, mgbe ha gara ịzụrụ ihe, mgbe ha gara ileta ndị ikwu ha na-abụghị Ndịàmà Jehova, na mgbe ha na ndị enyi ha na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na ụjọ emee ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma, anyị ga-adị ka onye agha yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya n’ọgbọ agha. Ihe ga-emerụ ya ahụ́ ngwa ngwa. Ọ ga-eme ka o siere ya ike ichebe onwe ya, meekwa ka o siere ya ike ime ihe onyeisi agha ha gwara ya mee.

Akpụkpọ ụkwụ: Njikere anyị dị mgbe niile ikwusa ozi ọma

9. Gịnị mere anyị kwesịrị iji buru ọta ukwu bụ́ okwukwe?

9 Ọta ukwu bụ́ okwukwe nọchiri anya okwukwe anyị nwere na Jehova. Obi siri anyị ike na ọ ga-emezu nkwa niile o kwere anyị. Okwukwe ahụ ga-enyere anyị aka “imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” Olee ihe mere anyị kwesịrị iji buru ọta ukwu ahụ. Ọ ga-enyere anyị aka mee ka ozizi ndị si n’ezi ofufe dapụ ghara iduhie anyị, meekwa ka anyị ghara ịda mbà n’ihi emo ndị mmadụ na-akwa anyị. Ọ bụrụ na anyị enweghị okwukwe, anyị agaghị enwe ike irubere Jehova isi mgbe ndị ọzọ na-agbalị ime ka anyị nupụrụ ya isi. Ma, mgbe ọ bụla anyị jụrụ inupụrụ Jehova isi, ma n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma n’ụlọ akwụkwọ, ọ bụ okwukwe anyị na-echebe anyị. (1 Pita 3:15) Mgbe ọ bụla anyị jụrụ ịrụ ọrụ a ga na-akwụ anyị ego buru ibu, nke ga-eme ka anyị ghara ime ike anyị niile n’ofufe Jehova, ọ bụ okwukwe anyị na-echebe anyị. (Hib. 13:5, 6) Mgbe ọ bụla anyị tachiri obi na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu, ọ bụ okwukwe anyị na-echebe anyị.—1 Tesa. 2:2.

Ọta: Okwukwe anyị nwere na Jehova nakwa ná nkwa ya

10. Gịnị bụ okpu agha bụ́ nzọpụta, gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji kpuru ya?

10 Okpu agha bụ́ nzọpụta bụ olileanya anyị nwere na Jehova ga-echebe anyị. Ọ bụkwa olileanya anyị nwere na Jehova ga-enye ndị niile na-efe ya ụgwọ ọrụ ha, nakwa na ọ bụrụgodị na ha anwụọ, ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (1 Tesa. 5:8; 1 Tim. 4:10; Taị. 1:1, 2) Otú ahụ okpu agha si echebe isi onye agha ka olileanya anyị nwere maka nzọpụta si echebe anyị ka anyị ghara ịna-eche echiche ọjọọ. Olee otú o si eme ya? Olileanya anyị nwere na-eme ka anyị lekwasị anya ná nkwa ndị Jehova kwere, na-emekwa ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ndị na-abịara anyị mee ka ike gwụ anyị. Olee otú anyị si eyiri okpu agha ahụ? Otú anyị si eme ya bụ ịna-eche echiche otú Chineke si eche. Dị ka ihe atụ, anyị na-eme ka olileanya anyị dịrị n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị n’akụnụba a na-ejighị n’aka.—Ọma 26:2; 104:34; 1 Tim. 6:17.

Okpu agha: Olileanya anyị nwere maka ndụ ebighị ebi

11. Gịnị bụ mma agha nke mmụọ nsọ? Gịnịkwa mere anyị kwesịrị iji na-eji ya?

11 Mma agha nke mmụọ nsọ bụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Mma agha ahụ nwere ikike ime ka ndị mmadụ mata ụgha dị iche iche a na-akụzi, mee ka ha nwere onwe ha na ya, nyekwara ha aka ịkwụsị àgwà ọjọọ. (2 Kọr. 10:4, 5; 2 Tim. 3:16, 17; Hib. 4:12) Ịmụ Baịbụl na ọzụzụ ndị anyị na-enweta ná nzukọ Jehova na-enyere anyị aka ịma otú e si eji mma agha ahụ nke ọma. (2 Tim. 2:15) E wezụga ekike agha a, e nwekwara ihe ọzọ siri ezigbo ike Jehova ji echebe anyị. Gịnị ka ọ bụ?

Mma agha: Okwu Chineke bụ́ Baịbụl

ANYỊ AGAGHỊ ALỤ ỌGỤ AHỤ NAANỊ ANYỊ

12. Olee ihe ọzọ dị anyị mkpa, n’ihi gịnịkwa?

12 Onye agha ma otú e si alụ agha nke ọma ma na naanị ya agaghị emerili ìgwè ndị agha. Enyemaka ndị agha ibe ya dị ya mkpa. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa, anyị agaghị emerili Ekwensu na ndị òtù ya naanị anyị. Enyemaka ụmụnna anyị dị anyị mkpa. Jehova mere ka anyị nwee “òtù ụmụnna” zuru ụwa ọnụ na-enyere anyị aka.—1 Pita 2:17.

13. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 10:24, 25, olee uru ịga ọmụmụ ihe na-abara anyị?

13 Otu ụzọ anyị si enweta enyemaka bụ ịga ọmụmụ ihe anyị. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) E nwee ihe mere ka anyị daa mbà, dị ka ọ na-adị anyị niile mgbe ụfọdụ, ọmụmụ ihe anyị na-enyere anyị aka inweta onwe anyị. Ajụjụ ndị ụmụnna anyị na-esi n’ala ala obi ha aza na-agba anyị ume. Okwu ndị a na-esi na Baịbụl ekwu na ihe ngosi ndị ha na-eme na-enye aka mee ka anyị kpebisikwuo ike ịna-efe Jehova. Ụka anyị na ụmụnna anyị na-akparịta tupu ọmụmụ ihe ebido nakwa mgbe ọmụmụ ihe gbasara na-agbakwa anyị ume. (1 Tesa. 5:14) Ihe ọzọ bụkwa na ọmụmụ ihe anyị na-eme ka anyị nyere ụmụnna anyị aka, na-emekwa ka ha na-enwe ọṅụ. (Ọrụ 20:35; Rom 1:11, 12) O nwekwara ụzọ ndị ọzọ ọmụmụ ihe anyị si enyere anyị aka. Ọ na-enyere anyị aka ịmụta otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma. Dị ka ihe atụ, n’ọmụmụ ihe, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eji ihe ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe akụzi ihe nke ọma. N’ihi ya, na-akwadebe ọmụmụ ihe nke ọma. Na-ege ntị nke ọma n’ọmụmụ ihe. Egbula oge ime ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-abụ “ezi onye agha nke Kraịst Jizọs.”—2 Tim. 2:3.

14. Olee ndị ọzọ na-enyere anyị aka?

14 Ndị ọzọ na-enyere anyị aka bụ ìgwè ndị mmụọ ozi dị ike. Chegodị ihe otu mmụọ ozi nwere ike ime. (Aịza. 37:36) Chezie ihe ìgwè ndị mmụọ ozi ga-emeli. O nweghị mmadụ ma ọ bụ mmụọ ọjọọ dị ike ka ndị agha Jehova. Onye Jehova nọnyeere ka ndị iro ya ike n’agbanyeghị ole ha dị. (Ikpe 6:16) Ihe a bụ eziokwu. Na-echeta ihe ndị a mgbe ọ bụla onye ọrụ ibe gị, nwa akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ onye ikwu gị na-abụghị Onyeàmà Jehova na-eyi gị egwu. Cheta na ọ bụghị naanị gị na-alụ ọgụ a. Ebe ọ bụ ihe Jehova kwuru ka ị na-eme, ọ ga-anọnyere gị.

JEHOVA GA-ANỌGIDE NA-ECHEBE ANYỊ

15. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 54:15, 17, gịnị mere na o nweghị ihe nwere ike ime ka ndị Chineke kwụsị ikwusa ozi ọma?

15 E nwere ọtụtụ ihe mere ụwa a Ekwensu na-achị ji kpọ anyị asị. Anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ na-alụ agha. Anyị na-eme ka a mata aha Chineke, na-ekwukwa na ọ bụ naanị Alaeze ya ga-eme ka e nwee udo. Anyị na-edebekwa iwu ya. Anyị na-emekwa ka ndị mmadụ mata na onye na-achị ụwa a bụ ezigbo onye ụgha na ogbu mmadụ. (Jọn 8:44) Anyị na-agwakwa ndị mmadụ na a ga-ala ụwa ọjọọ Ekwensu a n’iyi n’oge na-adịghị anya. Ma, Ekwensu na ndị òtù ya agaghị emeli ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma. Kama nke ahụ, anyị ga-anọgide na-esi n’ụzọ ọ bụla anyị nwere ike na-eto Jehova. N’agbanyeghị na Ekwensu dị ezigbo ike, o nwebeghị ike ịkwụsị ozi ọma a anyị na-ekwusa. Naanị ihe mere na ọ kwụsịbeghị ya bụ na Jehova na-echebe anyị.—Gụọ Aịzaya 54:15, 17.

16. Olee otú Jehova ga-esi echebe ndị ya n’oké mkpagbu?

16 Gịnị ga-eme n’ọdịnihu? N’oge oké mkpagbu ahụ, Jehova ga-esi n’ụzọ abụọ dị ịtụnanya chebe anyị. Nke mbụ, ọ ga-echebe ndị niile na-efe ya n’oge ọ ga-eme ka ndị eze nke ụwa bibie Babịlọn Ukwu ahụ, bụ́ okpukpe ụgha niile. (Mkpughe 17:16-18; 18:2, 4) Nke abụọ, ọ ga-echebe ndị ya mgbe ọ ga-ebibi ụwa ọjọọ Ekwensu a n’Amagedọn.—Mkpughe 7:9, 10; 16:14, 16.

17. Olee otú anyị na Jehova ịdị ná mma ga-esi baara anyị uru?

17 Ọ bụrụ na anyị na Jehova adịrị ná mma, o nweghị ihe Ekwensu ga-eme anyị ga-adịru ebighị ebi. Kama, ọ bụ yanwa bụ onye a ga-ebibi kpamkpam. (Rom 16:20) N’ihi ya, yiri ekike agha zuru ezu. Eyipụkwala ya. Echekwala na ị ga-alụsoli Setan na ụwa ya ọgụ naanị gị. Na-akwado ụmụnna gị, na-emekwa ihe Jehova kwuru. Ị na-eme otú ahụ, obi ga-esi gị ike na Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n’anya ga-enye gị ike, chebekwa gị.—Aịza. 41:10.

ABỤ NKE 149 Abụ Mmeri

^ par. 5 Baịbụl kwere nkwa na Jehova ga-enye anyị ike, chebekwa anyị. N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị mere o ji dị mkpa ka Jehova chebe anyị? Olee otú Jehova si echebe anyị? Oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ka Jehova nwee ike ichebe anyị?