Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

Otú Ịgụ Baịbụl Si Enyere Anyị Aka Idi Nsogbu

Otú Ịgụ Baịbụl Si Enyere Anyị Aka Idi Nsogbu

“Chineke . . . na-enye ntachi obi.ROM 15:5.

ABỤ NKE 94 Anyị Na-ekele Chineke Maka Okwu Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ụdị nsogbu nwere ike ịbịara ndị na-efe Jehova?

È NWERE nsogbu tara akpụ gị na ya na-alụ? O nwere ike ịbụ na o nwere onye nọ n’ọgbakọ kpasuru gị iwe. (Jems 3:2) Ma ọ bụ na ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị na-akwa gị emo n’ihi na ị na-efe Jehova. (1 Pita 4:3, 4) Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ndị ezinụlọ unu chọrọ ịkwụsị gị ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ịgwa ndị ọzọ gbasara ihe i kweere. (Mat. 10:35, 36) Ọ bụrụ na nsogbu bịaara gị tara ezigbo akpụ, ị nwere ike ịna-eche na ọ ka mma ka ị kwụsị ife Jehova. Ma, ka obi sie gị ike na n’agbanyeghị ụdị nsogbu ọ bụla bịaara gị, Jehova ga-enye gị amamihe na ike ị ga-eji edi ya.

2. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 15:4, olee otú ịgụ Baịbụl ga-esi baara anyị uru?

2 Na Baịbụl, Jehova mere ka e dee ihe ndị gosiri otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè si tachie obi ná nsogbu ndị bịaara ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka anyị nwee ike ịmụta ihe na ha. Ihe a dabara n’ihe Pọl onyeozi dere ná Ndị Rom 15:4. (Gụọ ya.) Ịgụ akụkọ ndị a nwere ike ịkasi anyị obi ma mee ka anyị nwee olileanya. Ma, ihe anyị ga-eme ka akụkọ ndị ahụ baara anyị uru abụghị naanị ịgụ ha na Baịbụl. Anyị kwesịrị ikwe ka ihe ndị anyị gụtara na ha gbanwee otú anyị si eche echiche, gbanweekwa obi anyị. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na o nwere otu nsogbu anyị chọrọ ịma ihe anyị ga-eme gbasara ya? Anyị nwere ike ime ihe anọ ndị a: (1Kpee ekpere, (2Were ya na ị na-ahụ ka ihe ahụ na-eme, (3Chebara ya echiche, (4Meekwa ihe ị mụtara na ya. Ka anyị kwuo gbasara otú anyị ga-esi na-eme nke ọ bụla n’ime ihe anọ ndị a. * Anyị ga-ejizi ihe anọ ndị a leba anya n’ihe ụfọdụ mere ná ndụ Eze Devid na Pọl onyeozi.

1. KPEE EKPERE

Tupu gị amalite ịgụ Baịbụl, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhụ ihe ndị ga-abara gị uru na ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Tupu gị amalite ịgụ Baịbụl, gịnị ka i kwesịrị ime, n’ihi gịnịkwa?

3 (1Kpee ekpere. Tupu gị amalite ịgụ Baịbụl, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhụ ihe ndị ga-abara gị uru n’ihe ahụ ị na-agụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-achọ otú ị ga-esi die otu nsogbu i nwere, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọta amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme.—Fil. 4:6, 7; Jems 1:5.

2. WERE YA NA Ị NA-AHỤ KA IHE Ị NA-AGỤ NA-EME

Were ya na ọ bụ gịnwa ka ihe ahụ ị na-agụ gbasara ya na Baịbụl na-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4))

4. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl nke ọma?

4 (2Were ya na ị na-ahụ ka ihe ị na-agụ na-eme. Jehova kere anyị otú anyị nwere ike iji uche anyị na-ahụ ihe anyị na-eche n’echiche. Iji nwee ike ịghọta ihe ị na-agụ na Baịbụl nke ọma, gbalịa were ya na ị na-ahụ ka ihe a kọrọ na Baịbụl na-eme, werekwa ya na ọ bụ gịnwa ka ihe ahụ na-eme. Gbalịa na-ahụ ihe onye ahụ hụrụ. Meekwa ka obi dị gị otú ọ dị onye ahụ.

3. CHEBARA YA ECHICHE

Chebara ihe ị gụrụ echiche, cheekwa otú ọ ga-esi baara gị uru (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5))

5. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche nke ọma? Oleekwanụ otú anyị ga-esi mee ya?

5 (3Chebara ya echiche. Anyị gụwa Baịbụl, anyị kwesịrị iche gbasara otú ihe anyị na-agụ si gbasa anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọta isiokwu ahụ nke ọma. Ịgụ Baịbụl n’echebaraghị ya echiche dị ka ebe mmadụ nwere ihe ndị e ji esi nri ma na-ele ha naanị n’anya n’anya. Ọ bụrụ na o jighị ihe ndị ahụ sie nri, ọ gaghị eri nri dị ụtọ. Ma, ichebara ihe anyị gụrụ na Baịbụl echiche dị ka ebe onye ahụ ji ihe ndị ahụ sie nri dị ụtọ. Ịjụ onwe gị ajụjụ ndị a na ịza ha ga-enyere gị aka ichebara ihe ị gụrụ echiche: ‘Gịnị ka onye a kọrọ akụkọ ya n’ebe a mere iji nyere onwe ya aka? Olee otú Jehova si nyere ya aka? Olee otú ihe m mụtara n’akụkọ a ga-esi nyere m aka ma ọnwụnwa bịara m?’

4. NA-EME IHE Ị MỤTARA

Na-eme ihe ị mụtara ka o nyere gị aka ịna-eme mkpebi ndị dị mma, ịna-eme ka obi ruo gị ala, nakwa ịna-eme ka okwukwe gị sie ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6))

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe anyị mụtara?

6 (4Na-eme ihe ị mụtara. Jizọs kwuru na ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe anyị mụtara, anyị dị ka nwoke na-arụ ụlọ n’elu ájá. Ọ na-arụsi ọrụ ike, ma mbọ ya niile ga-akụ afọ n’ala. N’ihi gịnị? N’ihi na oké ifufe na idei mmiri bịa, ụlọ ahụ ga-ada. (Mat. 7:24-27) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị ana-ekpe ekpere, na-ewere ya na anyị na-ahụ ebe ihe anyị na-agụ gbasara ya na-eme, na-echebakwara ha echiche, ma anyị anaghị eme ha, mbọ anyị niile ga-akụ afọ n’ala. Ọ ga-emekwa ka o siere anyị ike idi ọnwụnwa ma ọ bụ mkpagbu. Ma, ọ bụrụ na anyị na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ndị anyị mụtara, anyị ga na-eme mkpebi ndị dị mma, obi ana-eru anyị ala, okwukwe anyị ana-esikwa ike. (Aịza. 48:17, 18) Ka anyị jiri ihe anọ ndị a anyị kwuru gbasara ha ugbu a lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere ná ndụ Eze Devid.

GỊNỊ KA I NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA EZE DEVID?

7. Olee akụkọ Baịbụl anyị ga-eleba anya na ya ugbu a?

7 Enyi gị ma ọ bụ onye ezinụlọ gị ọ̀ gbatụla gị mgba okpuru? Ọ bụrụ otú ahụ, akụkọ Absalọm nwa Eze Devid ga-abara gị ezigbo uru. Absalọm gbara papa ya mgba okpuru, chọọkwa ịnaghara ya eze ya.—2 Sam. 15:5-14, 31; 18:6-14.

8. Gịnị ka i nwere ike ime ka Jehova nyere gị aka?

8 (1Kpee ekpere. Tupu gị agụọ akụkọ Baịbụl ahụ, gwa Jehova otú obi dị gị gbasara ihe ọjọọ e mere gị. (Ọma 6:6-9) Gwa Jehova otú ọ dị gị n’obi. Rịọ ya ka o nyere gị aka ịhụ amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere gị aka idi nsogbu ahụ siri ike bịaara gị.

9. Olee ihe mere n’etiti Devid na Absalọm?

9 (2Were ya na ị na-ahụ ka ihe ị na-agụ na-eme. Chee gbasara ihe mere n’akụkọ a. Werekwa ya na ọ bụ gị ka ihe ahụ mere Devid mere. Nwa ya nwoke bụ́ Absalọm gbara mbọ ruo ọtụtụ afọ ka ndị mmadụ nwee ike ịhụ ya n’anya. (2 Sam. 15:7) Mgbe Absalọm chere na oge eruola ka ọ bụrụ eze, o zigara ndị nledo ka ha gaa n’Izrel niile mee ka ndị mmadụ nabata ya ka ọ bụrụ eze ha. O medịrị ka otu n’ime ndị ezigbo enyi Devid na ndị ndụmọdụ ya aha ya bụ Ahitofel soro ya na-agba nna ya mgba okpuru. Absalọm mere onwe ya eze, gbalịakwa ịga jide Devid ma gbuo ya. O nwere ike ịbụ na ezigbo ọrịa na-arịa Devid n’oge ahụ. (Ọma 41:1-9) Devid matara gbasara nkata a ha na-akpara ya ma si na Jeruselem gbapụ. Ndị agha Absalọm na ndị agha Devid mechara lụọ agha, ndị nke Devid emerie, gbuokwa Absalọm.

10. Gịnị ka Eze Devid gaara eme?

10 Ihe ọzọ ị ga-eme bụ iche otú obi dị Devid mgbe ihe a niile na-eme. Ọ hụrụ Absalọm n’anya, tụkwasịkwa Ahitofel obi. Ma, ha abụọ gharịpụrụ ya. Ha mere Devid ezigbo ihe ọjọọ, chọọdị igbu ya. Ihe a gaara eme ka Devid gharazie ịna-atụkwasị ndị enyi ya ndị ọzọ obi, na-eche na ha niile esowela Absalọm. O nwedịrị ike ịmalite chewe naanị gbasara onwe ya ma chọwa ịgbapụ n’obodo ahụ naanị ya ma ọ bụkwanụ ike ụwa agwụ ya. Ma, e nweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a Devid mere. Kama, o meriri ọnwụnwa ahụ siri ezigbo ike bịaara ya. Gịnị nyeere ya aka imeri ọnwụnwa ahụ?

11. Olee ihe Devid mere mgbe nsogbu bịaara ya?

11 (3Chebara ya echiche. Olee ihe i nwere ike ịmụta n’akụkọ ahụ? Zaa ajụjụ a, “Olee ihe Devid mere iji nyere onwe ya aka?” Devid ekweghị ka ụjọ mee ka o mee mkpebi na-adịghị mma ngwa ngwa ma ọ bụkwanụ kwe ka ụjọ mee ka ọ ghara ịma ihe ọ ga-eme eme. Kama nke ahụ, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka. Ọ gwakwara ndị enyi ya ka ha nyere ya aka. O mekwara ihe o kpebiri ime ngwa ngwa. N’agbanyeghị na ihe ahụ gbawara ya obi, o meghị ka ọ kwụsị ịtụkwasị ndị ọzọ obi ma ọ bụkwanụ kpọọ ha asị. Ọ nọgidere na-atụkwasị Jehova na ndị enyi ya obi.

12. Olee ihe Jehova mere iji nyere Devid aka?

12 Olee otú Jehova si nyere Devid aka? I mee nchọnchọ, ị ga-ahụ na Jehova nyere Devid ike o ji die nsogbu ahụ. (Ọma 3:1-8; okwu mmeghe) Jehova gọziri mkpebi Devid mere. Ọ kwadokwara ndị enyi Devid mgbe ha na-alụ ọgụ iji chebe Devid.

13. Olee otú ị ga-esi eme ka Devid ma ọ bụrụ na mmadụ akpasuo gị ezigbo iwe? (Matiu 18:15-17)

13 (4Na-eme ihe ị mụtara. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi na-eme ka Devid?’ I kwesịrị ime ihe ngwa ngwa gbasara nsogbu ahụ. I nwere ike ime ihe Jizọs kwuru na Matiu isi iri na asatọ. (Gụọ Matiu 18:15-17.) Ejila iwe kpebie ihe ị ga-eme ngwa ngwa. I kwesịrị ịrịọ Jehova ka o mee ka obi jụrụ gị, rịọkwa ya ka o nye gị amamihe ị ga-eji kpebie ihe ị ga-eme. Akwụsịla ịtụkwasị ndị enyi gị obi. Kama, nabata enyemaka ọ bụla ha chọrọ inye gị. (Ilu 17:17) Ihe kacha mkpa bụ ka i mee ihe Jehova na-agwa gị n’Okwu ya bụ́ Baịbụl.—Ilu 3:5, 6.

GỊNỊ KA I NWERE IKE ỊMỤTA N’AKA PỌL?

14. Olee mgbe ihe e kwuru na 2 Tim. 1:12-16; 4:6-11, 17-22 nwere ike ịgba gị ume?

14 Ndị ezinụlọ unu hà na-akpagbu gị? Ì bi n’obodo ebe a machiri Ndịàmà Jehova ime ihe ụfọdụ ma ọ bụ machie ha iwu kpamkpam? Ọ bụrụ otú ahụ, ịgụ ihe e dere na 2 Tim. 1:12-16; 4:6-11, 17-22 * nwere ike ịgba gị ume. Pọl dere amaokwu Baịbụl ndị a mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ.

15. Gịnị ka i nwere ike ịrịọ Jehova ka o meere gị?

15 (1Kpee ekpere. Tupu gị agụọ amaokwu Baịbụl ndị ahụ, gwa Jehova nsogbu i nwere na otú obi dị gị maka ya. Ezorola ya ọnụ. Rịọzie ya ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe ndị mere ná ndụ Pọl ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme maka nsogbu ahụ.

16. Gịnị mere Pọl?

16 (2Were ya na ị na-ahụ ka ihe ị na-agụ na-eme. Were ya na ọ bụ gị bụ Pọl. A tụrụ ya mkpọrọ na Rom. Ọ gaala mkpọrọ n’oge mbụ. Ma na nke ugbu a, o doro ya anya na a ga-egbu ya. Ụfọdụ ndị enyi ya agbahapụla ya, ezigbo ike gwụkwara ya.—2 Tim. 1:15.

17. Gịnị ka Pọl gaara eme?

17 Ọ bụrụ na Pọl chọrọ, ọ gaara na-eche gbasara ihe ndị gara aga, na-eche na a garaghị atụ ya mkpọrọ ma a sị na ọ bụghị Onye Kraịst na-anụ ọkụ n’obi. Ọ gaara ewewere ụmụ nwoke ndị bi n’ógbè Eshia iwe na ha gbahapụrụ ya. O nwekwara ike ime ka ọ kwụsị ịtụkwasị ndị enyi ya ndị ọzọ obi. Mana, Pọl emeghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. Gịnị mere obi ji sie ya ike na ndị enyi ya agaghị ahapụ ya nakwa na Jehova ga-akwụ ya ụgwọ maka ihe o mere?

18. Gịnị ka Pọl mere gbasara nsogbu a siri ike bịaara ya?

18 (3Chebara ya echiche. Zaa ajụjụ a, “Olee otú Pọl si nyere onwe ya aka?” N’agbanyeghị na Pọl ma na a ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya, o chefughị na o kwesịrị ịna-eme ihe ga-eme ka e too Jehova. Ọ nọgidekwara na-eche otú o nwere ike isi na-agba ndị ọzọ ume. Ọ na-ekpe ekpere mgbe niile iji gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. (2 Tim. 1:3) Kama ịnọ na-eche mgbe niile gbasara ndị gbahapụrụ ya, o gosiri na obi dị ya ezigbo ụtọ gbasara ndị enyi ya ndị na-enyere ya aka ma na-akwado ya. Ihe ọzọ bụ na Pọl nọgidere na-amụ Okwu Chineke. (2 Tim. 3:16, 17; 4:13) Ihe kacha mkpa bụ na obi siri ya ike na Jehova na Jizọs Kraịst hụrụ ya n’anya. Ha agbahapụghị ya. Ha ga-akwụghachikwa ya ụgwọ maka ozi o ji obi ya niile jee.

19. Olee otú Jehova si nyere Pọl aka?

19 Jehova gwara Pọl na a ga-akpagbu ya n’ihi na ọ bụ Onye Kraịst. (Ọrụ 21:11-13) Olee otú Jehova si nyere Pọl aka? Ọ zara ya ekpere ya, mechaakwa nye ya ike. (2 Tim. 4:17) E mekwara ka obi sie Pọl ike na ọ ga-enweta ụgwọ ọrụ ahụ ọ gbasiri mbọ ike inweta. Jehova mekwara ka ndị enyi Pọl nyere ya aka.

20. Dị ka e kwuru ná Ndị Rom 8:38, 39, olee otú anyị nwere ike isi na-enwe okwukwe ka Pọl?

20 (4Na-eme ihe ị mụtara. Jụọ onwe gị sị, ‘Olee otú m nwere ike isi na-eme ka Pọl?’ Anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga-akpagbu anyị otú ahụ a kpagburu Pọl n’ihi na anyị na-efe Jehova. (Mak 10:29, 30) Iji nwee ike ịna-erubere Jehova isi n’oge nsogbu, anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere, na-amụchikwa Baịbụl anya. Anyị kwesịkwara icheta na ihe kacha mkpa bụ ịna-eme ka e too Jehova. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agaghị agbahapụ anyị. O nweghịkwanụ ihe onye ọ bụla nwere ike ime iji mee ka ọ kwụsị ịhụ anyị n’anya.—Gụọ Ndị Rom 8:38, 39; Hib. 13:5, 6.

MỤTA IHE N’AKA NDỊ ỌZỌ A KỌRỌ AKỤKỌ HA NA BAỊBỤL

21. Gịnị nyeere Aya na Hector aka imeri nsogbu ha?

21 Ịmụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nwere ike ime ka anyị nwee ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Dị ka ihe atụ, otu ọsụ ụzọ bi na Japan aha ya bụ Aya kwuru na akụkọ Jona nyeere ya aka ịkwụsị ịtụ ụjọ ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. E nwekwara nwanna ọzọ na-eto eto bi n’Indoneshia aha ya bụ Hector. Nne na nna ya abụghị Ndịàmà Jehova. Akụkọ Rut nyeere ya aka ịmụta gbasara Jehova ma na-efe ya.

22. Gịnị ka ị ga-eme ka akụkọ Baịbụl ndị ị na-ele na vidio na ihe ndị ị na-agụ n’isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” baara gị uru?

22 Olee ebe i nwere ike ịhụ akụkọ Baịbụl ndị ga-enyere gị aka imeri nsogbu gị? Vidio anyị, ihe nkiri ndị a na-egere egere, nakwa isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” ga-enyere anyị aka ịghọta akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl. * Tupu gị elee vidio ndị ahụ, ma ọ bụ gee akụkọ Baịbụl ndị ahụ, ma ọ bụkwanụ gụọ isiokwu ndị ahụ e mere ezigbo nchọnchọ wepụta, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịchọpụta ihe ndị i nwere ike ime. Were ya na ọ bụ gị bụ onye ihe ahụ na-eme. Chee gbasara ihe ndị a niile ji obi ha fee Jehova mere nakwa otú Jehova si nyere ha aka imeri nsogbu ndị ha nwere. Mee ihe ndị ị mụtara na ha. Kelee Jehova maka otú o si nyere gị aka. Gosikwa na obi dị gị ụtọ n’ụzọ ndị a Jehova si nyere gị aka. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịchọ otú ị ga-esi na-agba ndị ọzọ ume ma na-akwado ha.

23. Dị ka e kwuru n’Aịzaya 41:10, 13, gịnị ka Jehova kwere nkwa imere anyị?

23 Ndụ nwere ike isi ezigbo ike n’ụwa a Ekwensu na-achị. Mgbe ụfọdụ, anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme eme. (2 Tim. 3:1) Ma, anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị ma ọ bụ tụwa ụjọ. Jehova ma ihe anyị na-agabiga. Ọ bụrụ na anyị adaa, o kwere nkwa na ya ga-eji aka nri ya dị ike jidesie anyị ike. (Gụọ Aịzaya 41:10, 13.) Obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Ihe anyị na-agụta na Baịbụl ga-enyekwara anyị aka idi nsogbu ọ bụla ga-abịara anyị.

ABU NKE 96 Okwu Chineke Bụ Akụ̀

^ par. 5 Ọtụtụ akụkọ ndị dị na Baịbụl na-egosi na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya, na-enyekwara ha aka idi nsogbu ndị na-abịara ha. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú ị ga-esi amụta ihe n’akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl ma ị na-amụ Baịbụl.

^ par. 2 Ihe e kwuru ebe a bụ otu n’ime ụzọ ndị e si amụ Baịbụl. I nwere ike ịhụ ụzọ ndị ọzọ n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Baịbụl,” n’isiokwu nta bụ́ “Ịgụ na Ịghọta Baịbụl nke Ọma.”

^ par. 14 Agụla amaokwu ndị a ma a na-amụ Ụlọ Nche a n’ọmụmụ ihe.

^ par. 22 Gụọ isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha—Ụmụ Nwoke na Ụmụ Nwaanyị Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl.” (Gaa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa INWE OKWUKWE NA CHINEKE.)