ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10
Otú Ọgbakọ Ga-esi Enyere Ndị A Na-amụrụ Baịbụl Aka Iru Eru Ime Baptizim
“Akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu . . . na-eme ka ahụ́ na-eto eto.”—EFE. 4:16.
ABỤ NKE 85 Na-anabatanụ Ibe Unu
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1-2. Olee ndị nwere ike inyere onye a na-amụrụ Baịbụl aka iru eru ime baptizim?
OTU nwanna nwaanyị bi na Fiji aha ya bụ Amy sịrị: “Ihe m na-amụta na Baịbụl a na-amụrụ m masịrị m. Ama m na ọ bụ eziokwu. Ma mgbe m gbanwere ndụ m ma ruo eru ime baptizim bụ mgbe mụ na ụmụnna bidoro mekọwa ihe.” Ihe a mere Amy na-akụziri anyị otu eziokwu dị mkpa. O yiri ka onye a na-amụrụ ihe ọ̀ ga-aka eme nke ọma ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enyere ya aka.
2 Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike inyere ndị ọhụrụ aka ịbata n’ọgbakọ. (Efe. 4:16) Otu ọsụ ụzọ bi na Vanuwatu aha ya bụ Leilani sịrị: “A na-ekwukarị na ọ bụghị otu onye na-azụ nwa. M chekwa na ihe a bụ eziokwu ma a bịa n’ime ndị na-eso ụzọ. Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-enye aka mee ka mmadụ bata n’ọgbakọ.” Nne na nna, ndị ikwu, ndị enyi, na ndị nkụzi na-enye aka azụ nwatakịrị ka ọ bụrụ dimkpa. Otú ha si eme ya bụ ịgba ya ume na ịkụziri ya ihe ndị dị ezigbo mkpa. Otú ahụkwa ka ndị nkwusa nwere ike ịna-enye onye a na-amụrụ ihe ndụmọdụ, na-agba ya ume, na-akpakwa àgwà ndị ha chọrọ ka ọ mụta. Ha ga-esi otú a nyere ya aka iru eru ime baptizim.—Ilu 15:22.
3. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Ana, Dorin, na Leilani kwuru?
3 Gịnị mere onye na-amụrụ mmadụ Baịbụl kwesịrị iji na-enwe obi ụtọ ma ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-enyere onye ọ na-amụrụ ihe aka? Otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ oge niile bi na Mọldova aha ya bụ Ana sịrị: “O siri ezigbo ike otu onye ime ihe niile ga-enyere onye a na-amụrụ ihe aka ime nke ọma ma ruo eru ime baptizim.” Nwanna nwaanyị ọzọ aha ya bụ Dorin bụ́kwa ọsụ ụzọ pụrụ iche n’obodo ahụ sịrị: “Ọtụtụ mgbe, Jọn 13:35.
ndị nkwusa ndị ọzọ na-ekwu ihe na-emetụ onye m na-amụrụ ihe n’obi, ihe ndị m na-echetụbedịghị n’echiche.” Leilani kwukwara ihe ọzọ. Ọ sịrị: “Otú e si gosi onye a na-amụrụ ihe na a hụrụ ya n’anya nwere ike ime ka ọ mata na Ndịàmà Jehova bụ ndị Chineke.”—4. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
4 Ma, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Olee otú mụnwa nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka ebe ọ bụkwanụ na ọ bụghị mụnwa na-amụrụ ya ihe?’ Ka anyị lee ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na nwanna agwa anyị ka anyị soro ya gaa mụọrọ mmadụ ihe nakwa ihe anyị ga-eme ma onye a na-amụrụ ihe malite ịbịa ọmụmụ ihe. Anyị ga-ahụkwa otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị a na-amụrụ ihe aka iru eru ime baptizim.
I SORO GAA ỊMỤRỤ MMADỤ IHE
5. Olee ihe bụ ọrụ gị ma i soro gaa ịmụrụ mmadụ ihe?
5 Ọ bụ ọrụ onye na-amụrụ mmadụ ihe inyere onye a na-amụrụ ihe aka ịghọta Okwu Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ akpọọ gị ka i soro ya gaa ịmụrụ mmadụ ihe, ihe ị gara ime bụ inyere ya aka. (Ekli. 4:9, 10) Olee ihe i nwere ike ime iji nye aka mgbe a na-amụrụ onye ahụ ihe?
6. A kpọọ gị ka i soro gaa ịmụrụ mmadụ ihe, olee otú ị ga-esi eme ihe e kwuru n’Ilu 20:18?
6 Kwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịgwa nwanna ahụ ka ọ kọtụrụ gị ihe ụfọdụ banyere onye ahụ ọ na-amụrụ ihe. (Gụọ Ilu 20:18.) I nwere ike ịjụ ya, sị: “Olee ihe ụfọdụ ị ma gbasara onye ahụ ị na-amụrụ ihe? Olee isiokwu gị na ya ga-amụ? Olee ihe ị chọrọ ka ọ mụta n’ọmụmụ ihe ahụ? Ò nwere ihe m kwesịrị ime ma ọ bụ kwuo ma ọ bụ ihe m na-ekwesịghị ime ma ọ bụ kwuo n’ọmụmụ ihe ahụ? Olee otú m ga-esi gbaa ya ume ka ọ na-eme nke ọma?” O doro anya na ọ gaghị agwa gị ihe onye ahụ na-achọghị ka ndị ọzọ mara gbasara onwe ya. Ma ihe ọ ga-agwa gị ga-enye aka. Otu onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Joy na ụmụnna na-ekwurịta gbasara ihe ndị a ma ọ kpọrọ ha gawa ịmụrụ mmadụ ihe. Ọ sịrị: “Ụdị mkparịta ụka a na-eme ka ndị mụ na ha so nwee mmasị n’ebe onye m na-amụrụ ihe nọ, na-emekwa ka ha mara ihe ha ga-ekwu ga-enyere ya aka ma a mụwara ya ihe.”
7. Gịnị mere i kwesịrị iji kwadebe akwadebe ma ọ bụrụ na ị ga-eso gaa ịmụrụ mmadụ ihe?
7 Nwanna kpọọ gị ka i soro ya gaa mụọrọ mmadụ ihe, ọ ga-adị ezigbo mma ma ị kwadebe ihe a ga-amụ. (Ezra 7:10) Nwanna Dorin anyị kwuru okwu ya ná mmalite sịrị: “Obi na-adị m ụtọ ma onye mụ na ya so gaa ịmụrụ mmadụ ihe kwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. Ọ ga-eme ka o nwee ike ikwu ihe ndị ga-aba ezigbo uru n’ọmụmụ ihe ahụ.” Ihe ọzọ bụ na onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịchọpụta na unu abụọ kwadoro nke ọma. Ọ ga-emekwa ka ọ na-akwadebe nke ya. Ọ bụrụgodị na i nweghị ike ịkwadebe ihe niile a ga-amụ nke ọma, i nwere ike iwepụta obere oge ghọta isi ihe dị n’ọmụmụ ihe ahụ.
8. I soro nwanna gaa ịmụrụ mmadụ Baịbụl, gịnị ga-enyere gị aka ịmara ihe ị ga-ekpe n’ekpere?
8 Ekpere dị ezigbo mkpa n’ọmụmụ Baịbụl. N’ihi ya, chebara ihe ị ga-ekpe n’ekpere echiche ma a gwa gị kpee ekpere. Ọ ga-eme ka ị mara ihe ị ga-ekwu n’ekpere ahụ. (Ọma 141:2) Otu nwanna nwaanyị bi na Japan aha ya bụ Hanae ka na-echeta ekpere otu nwanna nwaanyị so onye na-amụrụ ya Baịbụl bịa ịmụrụ ya ihe kpere. Hanae sịrị: “M chọpụtara na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. M chọkwara ịdị ka ya. Obi tọgbukwara m atọgbu mgbe ọ kpọrọ aha m n’ekpere ahụ.”
9. Gịnị ka i nwere ike ime iji nyere onye kpọ gị gaa ịmụrụ mmadụ ihe aka?
9 Na-enyere nwanna ahụ aka n’ọmụmụ ihe ahụ. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ pụrụ iche bi na Naịjirịa aha ya bụ Omamuyovbi sịrị: “Onye so gaa ịmụrụ mmadụ ihe ga na-ege ntị nke ọma ma ọ bụrụ na ọ chọrọ inye aka. Ọ ga na-ekwu okwu ndị ga-aba uru. Ma, ọ gaghị na-ekwu oké okwu. Ọ ma na ọ bụ nwanna ahụ kpọ ya kwesịrị ịna-akụziri onye ahụ ihe.” Olee otú ị ga-esi ama mgbe ị ga-ekwu okwu nakwa otú ị ga-esi ekwu ya ma a mụwara mmadụ ihe? (Ilu 25:11) Na-ege ntị nke ọma mgbe nwanna ahụ na onye ọ na-amụrụ ihe na-ekwu okwu. (Gụọ Jems 1:19.) Ọ bụ ya ga-eme ka ị dịrị njikere inye aka n’oge kwesịrị ekwesị. Ma, i kwesịrị iche echiche tupu gị ekwuo okwu. Dị ka ihe atụ, i kwesịghị ikwu oké okwu ma ọ bụ napụ nwanna na-akụziri ya ihe okwu n’ọnụ mgbe ọ na-akọwara ya ihe ma ọ bụkwanụ kwuwe ihe ọzọ dị iche. Ma, i nwere ike ikwu obere okwu, jirikwa ihe atụ ma ọ bụ ajụjụ mee ka ihe a na-akụzi doo anya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị gị ka e nweghị ezigbo ihe i nwere ike ikwu. Ma, ọ bụrụ na ị jaa onye ahụ a na-amụrụ ihe mma ma gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi, ọ ga-enyere ya aka ime nke ọma.
10. Olee otú ịkọrọ onye a na-amụrụ ihe gbasara onwe gị nwere ike isi nyere ya aka?
10 Kọọrọ ya gbasara onwe gị. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, i nwere ike ịkọtụrụ onye ahụ a na-amụrụ ihe otú i si mụta eziokwu, otú i si merie otu nsogbu, ma ọ bụkwanụ otú Jehova si nyere gị aka ná ndụ gị. (Ọma 78:4, 7) Ihe a nwere ike ịbụ ihe dị ya mkpa ịnụ n’oge ahụ. O nwere ike ime ka okwukwe ya sie ike ma ọ bụkwanụ gbaa ya ume ịnọgide na-eme nke ọma ka o nwee ike iru eru ime baptizim. O nwekwara ike ime ka ọ mata otú ọ ga-esi emeri nsogbu ya na ya na-alụ. (1 Pita 5:9) E nwere otu nwanna aha ya bụ Gabriel. O bi na Brazil, na-asụkwa ụzọ. O kwuru ihe nyeere ya aka n’oge a na-amụrụ ya ihe. Ọ sịrị: “Mgbe ụmụnna kọọrọ m gbasara onwe ha, m mụtara na Jehova na-ahụ nsogbu niile anyị na ha na-alụ. Ọ bụrụkwa na hanwa nwere ike imeri nsogbu ha, m ga-emerilikwa ndị nke m.”
MGBE ONYE A NA-AMỤRỤ IHE BỊAWARA ỌMỤMỤ IHE
11-12. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nabata onye a na-amụrụ Baịbụl bịara ọmụmụ ihe anyị nke ọma?
11 Ka onye a na-amụrụ Baịbụl nwee ike iru eru ime baptizim, o kwesịrị ịna-agachi ọmụmụ ihe anya ma na-amụta ihe na ya. (Hib. 10:24, 25) Ọ na-abụkarị onye na-amụrụ mmadụ ihe na-agwa ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe nke mbụ ya. Ọ bịa, anyị niile nwere ike ịgba ya ume ka ọ nọgide na-abịa ọmụmụ ihe. Olee otú anyị nwere ike isi mee ya?
12 Nabata ya nke ọma. (Rom 15:7) Ọ bụrụ na e mee ka ahụ́ ruo onye a na-amụrụ ihe ala mgbe ọ bịara ọmụmụ ihe, o nwere ike ime ka ọ nọgide na-abịa ọmụmụ ihe. Anyị kwesịrị ikele ya nke ọma, meekwa ka ọ mata ndị ọzọ. Ma anyị ekwesịghị imefe ya ókè. Gakwuru ya ka gị na ya kparịta n’ihi na o nwere ike ịbụ na onye na-amụrụ ya ihe abịarutebeghị ma ọ bụkwanụ na e nwere ọrụ ndị ọzọ o ji n’aka n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Na-ege ntị nke ọma n’ihe ndị ọ na-ekwu, meekwa ka ọ mara na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. Olee otú ime ihe ndị a nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka? E nwere otu nwanna mere baptizim afọ ole na ole gara aga. Aha ya bụ Dmitrii. Ugbu a ọ bụzi ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. O chetara ihe mere n’ọmụmụ ihe mbụ ọ gara. Ọ sịrị: “Otu nwanna hụrụ ka m nọ n’èzí ka onye ụjọ ji, ya akpọbata m n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọtụtụ ndị bịara kelee m. Ihe a juru m anya. Ọ tọgburu m atọgbu nke na ọ dịzi m ka ụbọchị niile ọ̀ ga-abụzi ọmụmụ ihe. E nwetụbeghị ebe ọzọ m hụrụ ụdị ihe a.”
13. Olee otú àgwà ọma gị nwere ike isi nyere onye a na-amụrụ ihe aka?
13 Na-eme ihe ị chọrọ ka ha mụta. Otú i si akpa àgwà nwere ike ime ka onye a na-amụrụ ihe kwetasie ike na ya achọtala eziokwu. (Mat. 5:16) Otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ na Mọldova aha ya bụ Vitalii sịrị: “Mgbe m hụrụ otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ si ebi ndụ, otú ha si eche echiche, nakwa otú ha si akpa àgwà, o mere ka obi sie m ike na ọ bụ Ndịàmà Jehova na-efe Chineke n’eziokwu.”
14. Olee otú ihe ị na-eme nwere ike isi nyere mmadụ aka ịna-eme nke ọma?
14 Ka onye a na-amụrụ ihe nwee ike iru eru ime baptizim, o kwesịrị ime ihe ọ na-amụta. Ime ihe a anaghị adị mfe mgbe niile. Ma, ọ bụrụ na ọ hụ uru ime ihe Baịbụl kwuru na-abara gị, o nwere ike ime ka ọ chọọ ịna-eme ka gị. (1 Kọr. 11:1) Chegodị gbasara Hanae anyị kwuburu gbasara ya. Ọ sịrị: “Ụmụnna ndị ahụ na-eme ihe m na-amụ banyere ya. M si n’aka ha mụta otú m nwere ike isi na-agba ndị ọzọ ume, na-agbaghara ha, na-ahụkwa ha n’anya. Ha na-ekwukarị okwu ọma banyere ndị ọzọ. M chọkwara ịna-eme ka ha.”
15. Olee otú Ilu 27:17 si enyere anyị aka ịmata ihe mere anyị kwesịrị iji meta onye a na-amụrụ Baịbụl na-abịa ọmụmụ ihe enyi?
15 Meta ya enyi. Ka onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl na-abịa ọmụmụ ihe, nọgide na-egosi ya na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. (Fil. 2:4) I nwere ike gbalịa ka ị matakwuo ya nke ọma. I nwere ike ịja ya mma maka mgbanwe ndị o mere ma jụọ ya otú ọmụmụ ihe ya si aga, otú ndị ezinụlọ ya mere, nakwa otú ọrụ ya si aga. Ma, ajụkwala ya ajụjụ ga-emenye ya ihere. Ụdị mkparịta ụka a nwere ike ime ka gị na ya bụrụ enyi. Gị na ya bụrụ enyi, ị ga-enyere ya aka ka o ruo eru ime baptizim. (Gụọ Ilu 27:17.) Hanae bụzi ọsụ ụzọ oge niile ugbu a. O chetara ihe mere n’ọmụmụ ihe mbụ ọ gara. Ọ sịrị: “Ka m na-emetakwu ndị enyi n’ọgbakọ ka ịga ọmụmụ ihe na-agụkwu m agụụ. M na-agadị ya ma mgbe ike gwụrụ m. Mụ na ndị enyi ọhụrụ m ịnọ na-atọ m ezigbo ụtọ. O nyeere m aka ịhapụ ndị enyi m mụ na ha na-ekweghị n’otu ihe. M chọrọ ka mụ na Jehova na ụmụnna m dịrịkwuo ná mma. N’ihi ya, m kpebiri ime baptizim.”
16. Olee ihe ọzọ i nwere ike ime ka obi ruo onye a na-amụrụ ihe ala n’ọgbakọ?
16 Ka onye a na-amụrụ ihe na-emekwu nke ọma ma na-eme mgbanwe ná ndụ ya, nyere ya aka ka ọ ghọta na e ji ya kpọrọ ihe n’ọgbakọ. Otú i nwere ike isi eme ya bụ ịna-ele ya ọbịa. (Hib. 13:2) Otu nwanna na-eje ozi na Mọldova aha ya bụ Denis chetara ihe mere n’oge a ka na-amụrụ ya ihe. Ọ sịrị: “E nwere oge ndị a kpọrọ mụ na nwunye m ka anyị na ụmụnna nọrịa. Ha kọọrọ anyị otú Jehova si nyere ha aka. Ọ gbara anyị ume. Oge ndị ahụ mere ka obi sie anyị ike na anyị chọrọ ife Jehova nakwa na ndụ anyị ga-amagbu onwe ya ma anyị bịa fewe ya.” Onye a na-amụrụ ihe ghọọ onye nkwusa, i nwere ike ịgwa ya ka o soro gị gaa ozi ọma. Otu onye nkwusa bi na Brazil aha ya bụ Diego sịrị: “Ọtụtụ ụmụnna kpọrọ m ka m soro ha gaa ozi ọma. Ihe a bụ ụzọ kacha mma m na-esi amata ha nke ọma. Ka m na-amatakwu ha, ka m na-amụtakwu ihe. O mere ka m nọrọkwuo Jehova na Jizọs nso.”
OLEE OTÚ NDỊ OKENYE NWERE IKE ISI NYE AKA?
17. Olee otú ndị okenye nwere ike isi nyere ndị a na-amụrụ ihe aka?
17 Na-ewepụtara ndị a na-amụrụ ihe oge. Ndị okenye, ọ bụrụ na unu enwee mmasị n’ebe ndị a na-amụrụ ihe nọ, o nwere ike inyere ha aka iru eru ime baptizim. Ì nwere
ike iwepụta oge ka gị na ndị a na-amụrụ ihe na-ekwurịta okwu n’ọmụmụ ihe? Ọ bụrụ na ị na-akpọ ha aha ha, karịchaa, ma ị kpọwa ha ka ha zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe, ọ ga-eme ka ha mata na i ji ha kpọrọ ihe. Ì nwere ike ịhazi oge gị ka i soro ndị nkwusa na-amụrụ mmadụ ihe? I nwere ike inyere onye a na-amụrụ ihe aka karịa otú i chere. Otu nwanna nwaanyị na-asụ ụzọ aha ya bụ Jackie bi na Naịjirịa sịrị: “Ọ na-atụ ọtụtụ n’ime ndị m na-amụrụ ihe n’anya ma ha mata na nwanna mụ na ya so bịa ịmụrụ ha ihe bụ okenye. Otu n’ime ha sịrị: ‘Pastọ anyị agadịghị anwa anwa eme ụdị ihe a. Ndị ọ na-aga na nke ha bụ naanị ndị bara ọgaranya. Ọ bụkwa naanị ma ha kwụọ ya ụgwọ.’” Onye ahụ a na-amụrụ ihe na-abịazi ọmụmụ ihe.18. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ihe e dere n’Ọrụ Ndịozi 20:28?
18 Na-azụ ndị na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, na-agbakwa ha ume. Ndị okenye, unu nwere nnukwu ọrụ inyere ndị nkwusa aka ka ha bụrụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma na ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:28.) Ọ bụrụ na ihere na-eme mmadụ iduzi ọmụmụ Baịbụl n’ihu gị, gwa ya ka i duzie ya. Jackie anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ndị okenye na-ajụkarị m gbasara ndị m na-amụrụ ihe. Ọ bụrụ na e nwere ihe na-esiri m ike n’ihe m na-akụziri ha, ha na-agwa m ihe na-abara m uru.” E nwere ọtụtụ ihe ndị okenye nwere ike ime iji gbaa ndị na-amụrụ mmadụ ihe ume. (1 Tesa. 5:11) Jackie kwukwara, sị: “Obi na-atọ m ụtọ ma ndị okenye na-agba m ume ma gwa m na ha ji ọrụ m na-arụ kpọrọ ihe. Ụdị okwu a na-eme ka ahụ́ ruo m ala otú ahụ mmiri jụrụ oyi si eme ka ahụ́ jụọ mmadụ oyi mgbe anwụ na-acha. Otú ha si aja m mma na-eme ka obi na-esikwu m ike, na-emekwa ka m na-enwekwu ọṅụ n’ịkụziri ndị mmadụ ihe.”—Ilu 25:25.
19. Olee ihe nwere ike ime anyị niile obi ụtọ?
19 Ọ bụrụgodị na e nweghị onye anyị na-amụrụ Baịbụl ugbu a, anyị ka nwere ike inyere mmadụ aka iru eru ime baptizim. Anyị nwere ike ịkwadebe ihe dị nkenke anyị ga-ekwu nke ọma iji nyere onye na-amụrụ mmadụ ihe aka ma ọ mụwara mmadụ ihe. Anyị nwere ike imeta onye a na-amụrụ ihe enyi ma ọ bịa ọmụmụ ihe. Anyị nwekwara ike ịna-akpa àgwà ọma ndị ha ga-amụta. Ndị okenye nwere ike ịna-agba ndị a na-amụrụ ihe ume ma ha na-ewepụtara ha oge, na-agbakwa ndị na-amụrụ ha ihe ume ma ha na-azụ ha ma na-aja ha mma. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe, ọ bụrụgodị obere ihe, iji nyere mmadụ aka ịhụ Jehova n’anya ma na-efe ya.
ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike
^ par. 5 Ọ bụghị anyị niile nwere onye anyị na-amụrụ Baịbụl ugbu a. Ma, anyị niile nwere ike inyere mmadụ aka ka o ruo eru ime baptizim. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú onye ọ bụla n’ime anyị ga-esi enyere onye a na-amụrụ ihe aka ka o ruo eru ime baptizim.