Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

Eyipụla “Àgwà Ọhụrụ” Mgbe I Mechara Baptizim

Eyipụla “Àgwà Ọhụrụ” Mgbe I Mechara Baptizim

“Yirinụ àgwà ọhụrụ.”​—KỌL. 3:10.

ABỤ NKE 49 Ka Anyị Na-eme Ka Obi Jehova Ṅụrịa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe kacha eme ka anyị na-akpa àgwà otú anyị si akpa?

 MA ÀNYỊ ka mere baptizim ụbọchị ole na ole gara aga ma ọ bụkwanụ kemgbe ọtụtụ afọ, anyị niile chọrọ ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ. Iji mee ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe ndị anyị na-eche n’echiche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe kacha eme ka anyị na-akpa àgwà otú anyị si akpa àgwà bụ ihe anyị na-eche n’echiche. Ọ bụrụ na ihe anyị na-echekarị bụ ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ, anyị ga na-ekwu ma na-eme ihe ndị na-adịghị mma. (Efe. 4:​17-19) Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe dị mma mgbe niile, ihe anyị ga na-ekwu na ihe anyị ga na-eme ga-abụ ihe dị Nna anyị nke eluigwe bụ́ Jehova mma.​—Gal. 5:16.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Dị ka e kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị agaghị egbochili ihe ọjọọ ịbata anyị n’obi chaa chaa. Ma, anyị nwere ike ikpebi na anyị agaghị eme ihe ọjọọ ahụ na-abata anyị n’obi. Tupu anyị emee baptizim, ọ dị mkpa ka anyị kwụsị ịna-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe ndị na-adịghị Jehova mma. Ihe a bụ ihe mbụ na ihe kacha mkpa anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iyipụ àgwà ochie. Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova ezigbo mma, anyị kwesịkwara ime ihe ọ gwara anyị. Ọ sịrị: “Yirinụ àgwà ọhụrụ.” (Kọl. 3:10) N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ndị a: Gịnị bụ “àgwà ọhụrụ”? Olee otú anyị ga-esi yiri àgwà ọhụrụ ma ghara iyipụ ya?

GỊNỊ BỤ “ÀGWÀ ỌHỤRỤ”?

3. Gịnị ka ọ pụtara ma a sị na mmadụ yi “àgwà ọhụrụ”? Oleekwa otú mmadụ si eyiri ya? (Ndị Galeshia 5:​22, 23)

3 A sị na mmadụ yi “àgwà ọhụrụ,” ọ pụtara na onye ahụ na-eme ka Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ yi àgwà ọhụrụ, ọ ga na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ọ ga-ekwe ka mmụọ nsọ na-eme ka ihe ọ na-eche na ihe ọ na-eme bụrụ ihe ndị dị mma. (Gụọ Ndị Galeshia 5:​22, 23.) Dị ka ihe atụ, onye ahụ ga-ahụ Jehova na ndị ya n’anya. (Mat. 22:​36-39) Onye ahụ na-enwekwa ọṅụ ọ bụrụgodị na ọnwụnwa abịara ya. (Jems 1:​2-4) Ọ na-eme udo. (Mat. 5:9) Ọ na-enwe ndidi, na-emekwara ndị ọzọ obiọma. (Kọl. 3:13) Ihe dị mma na-amasị ya, ọ na-emekwa ya. (Luk 6:35) Otú o si akpa àgwà na-egosi na o nwere okwukwe siri ike n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. (Jems 2:18) Ọ na-adị nwayọọ ma a kpasuo ya iwe, na-ejidekwa onwe ya ma ọnwụnwa bịara ya.​—1 Kọr. 9:​25, 27; Taị. 3:2.

4. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iyiri àgwà ọhụrụ, gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akpa àgwà ọma niile e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 5:​22, 23 nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl?

4 Ọ bụrụ na anyị chọrọ iyiri àgwà ọhụrụ, anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma niile e kwuru okwu ha ná Ndị Galeshia 5:​22, 23 nakwa n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. * Àgwà ndị a adịghị ka uwe ndị anyị nwere ike iyi naanị otu otu mgbe. Anyị kwesịrị ịna-akpa àgwà ndị a niile. N’eziokwu, ọtụtụ àgwà ndị a na ibe ha yiri. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị hụrụ onye agbata obi gị n’anya n’eziokwu, ị ga na-enwere ya ndidi ma na-emere ya obiọma. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịna-eme ihe dị mma, ị ga na-adị nwayọọ ma na-ejide onwe gị.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI YIRI ÀGWÀ ỌHỤRỤ?

Ka anyị na-amụtakwu banyere otú Jizọs si eche echiche, ka ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịna-eme ka ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5, nke 8, nke 10, nke 12, na nke 14)

5. Gịnị ka ‘ịma uche Kraịst’ pụtara? Oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara ndụ Jizọs? (1 Ndị Kọrịnt 2:16)

5 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:16. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iyiri àgwà ọhụrụ, anyị kwesịrị ‘ịma uche Kraịst.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-amụta otú Jizọs si eche echiche ma na-eche echiche otú ahụ. Jizọs kpara àgwà niile so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. O mere nnọọ ka Jehova. (Hib. 1:3) Ọ bụrụ na anyị ana-eche echiche ka Jizọs, ọ ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ka ya, meekwa ka ọ dịrị anyị mfe iyiri àgwà ọhụrụ.​—Fil. 2:5.

6. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-agba mbọ iyiri àgwà ọhụrụ?

6 Ọ̀ ga-ekwe anyị omume ime ka Jizọs? Anyị nwere ike iche, sị: ‘Jizọs zuru okè. Agaghị m emetacha ihe niile ka ya.’ Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, chebara ihe ndị a echiche. Nke mbụ, Jehova kere gị ka i nwee ike ime ka ya na Jizọs. N’ihi ya, i nwere ike ikpebi na ị ga na-eme ka ha. Ị ga-emelikwa ya, ọ bụ eziokwu na ị gaghị emetacha ihe niile ka ha. (Jen. 1:26) Nke abụọ, mmụọ nsọ Chineke bụ ike kacha ike nille n’eluigwe na n’ụwa. Ọ ga-enyere gị aka ime ihe ndị ị na-agaghị emeli n’onwe gị. Nke atọ, Jehova anaghị atụ anya na anyị ga-akpatacha àgwà niile so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ ugbu a. Nna anyị hụrụ anyị n’anya kwudịrị na ọ ga-eji otu puku afọ nyere ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa aka izu okè. (Mkpu. 20:​1-3) Ihe Jehova chọrọ n’aka anyị ugbu a bụ ka anyị mee ike anyị niile ịna-akpa àgwà ndị ahụ ma tụkwasị ya obi ka o nyere anyị aka.

7. Olee ihe ndị anyị ga-eleba anya na ha ugbu a?

7 Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs? Anyị ga-eleba anya n’àgwà anọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Ka anyị na-eleba anya na nke ọ bụla n’ime ha, anyị ga-ahụ ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si kpaa àgwà ahụ. Anyị ga-elebakwa anya n’ajụjụ ndị ga-enyere anyị aka ịma ebe ndị anyị ga-emekwu nke ọma n’iyiri àgwà ọhụrụ.

8. Olee otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ Jehova na ndị mmadụ n’anya?

8 Jizọs hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji mee ihe dị Nna ya mma, meekwa ihe ga-abara anyịnwa uru. (Jọn 14:31; 15:13) Otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa gosiri na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. N’ụbọchị niile ọ dịrị ndụ n’ụwa, o gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma na-enwere ha ọmịiko, ma mgbe ụfọdụ na-emegide ya. Otu ụzọ dị mkpa o si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya bụ ịkụziri ha banyere Alaeze Chineke. (Luk 4:​43, 44) Jizọs gosikwara na ọ hụrụ Chineke na ndị mmadụ n’anya mgbe o ji obi ya niile kweta ka ndị mmehie taa ya ahụhụ ma gbuo ya. O si otú a mee ka anyị niile nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.

9. Olee otú anyị ga-esi na-ahụ ndị mmadụ n’anya ka Jizọs?

9 Anyị nyefere Jehova onwe anyị ma mee baptizim n’ihi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya. N’ihi ya, dịkwa ka Jizọs, otú anyị si emeso ndị mmadụ kwesịrị igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, agaghị ahụli Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-anaghị ahụ anya.” (1 Jọn 4:20) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ mụtala isi n’ala ala obi m na-ahụ ndị mmadụ n’anya? M̀ na-enwere ndị mmadụ ọmịiko ọ bụrụgodị na ha na-eme m ihe ọjọọ? Otú m si hụ ndị mmadụ n’anya ọ̀ na-eme ka m na-eji oge m na ihe ndị m nwere na-enyere ha aka ịmụta gbasara Jehova? M̀ na-adị njikere ime ihe a ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị enweghị ihe ha ji ihe m na-eme kpọrọ ma ọ bụkwanụ na-emegide m? M̀ nwere ike iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma?’​—Efe. 5:​15, 16.

10. Olee otú Jizọs si bụrụ onye na-eme udo?

10 Jizọs na-eme udo. Mgbe ndị mmadụ mere ya ihe ọjọọ, o megwaraghị ha. Ma, ọ bụghị naanị ihe o mere. Ọ gbara mbọ mee ka ya na ndị mmadụ dịrị n’udo, gbaakwa ndị mmadụ ume ka ha na ndị ha na ha na-ese okwu kpezie. Dị ka ihe atụ, ọ kụziiri ha na ọ bụrụ na ha chọrọ ka Jehova nabata ofufe ha, na ha ga-eme ka ha na ụmụnna ha dịrị n’udo. (Mat. 5:​9, 23, 24) O nyekwaara ndịozi ya aka ọtụtụ ugboro idozi okwu ha na-ese gbasara onye kacha ukwuu n’ime ha.​—Luk 9:​46-48; 22:​24-27.

11. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme udo?

11 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eme udo, ihe anyị ga-eme abụghị naanị izere ịkpata nsogbu. Anyị kwesịrị ịgba mbọ buru ụzọ mee ihe ga-eme ka anyị na ndị mmadụ mee udo, na-agbakwa ụmụnna anyị ume ka ha dozie esemokwu ha nwere. (Fil. 4:​2, 3; Jems 3:​17, 18) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Olee ihe ndị m dị njikere ịhapụ iji mee ka mụ na ndị ọzọ dịrị n’udo? Ọ bụrụ na nwanna emejọọ m, m̀ na-eburu ya iwe n’obi? M̀ na-eche ka ọ bịa ka mụ na ya kpezie, ka ọ̀ bụ m na-ebu ụzọ aga ka mụ na ya mee udo ọ bụrụgodị na m chere na ọ bụ ya mejọrọ m? Mgbe ọ dabara adaba, m̀ na-agba ndị ọzọ ume ka ha dozie esemokwu ha na ibe ha nwere?’

12. Olee otú Jizọs si gosi na ọ dị obiọma?

12 Jizọs dị obiọma. (Mat. 11:​28-30) Otú o si gosi na ọ dị obiọma bụ na ọ na-adị nwayọọ ma na-echebara ndị ọzọ echiche, ma mgbe ihe siiri ya ike. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwaanyị onye Finishia bịara rịọ ya ka ọ gwọọ nwa ya, o kweghị agwọ nwa ya na mbụ. Ma mgbe nwaanyị ahụ gosiri na o nwere ezigbo okwukwe, o meere ya obiọma ma gwọọ nwa ya. (Mat. 15:​22-28) Ọ bụ eziokwu na Jizọs dị obiọma, ma ọ naghị eme ka ọ ghara inye mmadụ ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Mgbe ụfọdụ, otú o si gosi na ọ dị obiọma bụ ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya ebe ndị ha na-anaghị emeta. Dị ka ihe atụ, Mgbe Pita gbalịrị ịgwa Jizọs ka ọ ghara ime uche Jehova, ọ gbaziri ya n’ihu ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ. (Mak 8:​32, 33) O meghị ihe a iji menye Pita ihere. Kama, o mere ya iji kụziere Pita na ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ na ha kwesịrị ịna-akwado ya ka ọ na-eme uche Chineke kama ịgba ya ume ka ọ ghara ime ya. O doro anya na ihe a menyetụrụ Pita ihere, ma ndụmọdụ ahụ o nyere ya baara ya uru.

13. Olee otú anyị ga-esi na-emere ndị mmadụ obiọma?

13 Mgbe ụfọdụ, otú anyị ga-esi egosi na anyị na-emere ndị anyị hụrụ n’anya obiọma bụ inye ha ndụmọdụ. Ọ bụrụ na anyị ana-enye ha ndụmọdụ, anyị kwesịrị ime ka Jizọs, mee ka ndụmọdụ anyị si na Baịbụl. Dịrị nwayọọ. Obi sie gị ike na ha chọrọ ime ihe dị mma, nakwa na ndị hụrụ ma Jehova ma gịnwa n’anya ga-anabata ndụmọdụ i nyere ha. Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘M̀ na-akata obi agwa onye m hụrụ n’anya ihe ọ na-emetaghị? Ọ bụrụ na m chọrọ inye ndụmọdụ, m̀ na-emeda obi nye mmadụ ndụmọdụ, ka m̀ na-aba mba? Olee ihe m na-ebu n’obi enye ndụmọdụ? M̀ na-enye mmadụ ndụmọdụ n’ihi na ihe o mere kpasuru m iwe ka ọ̀ bụ maka na m bu ọdịmma ya n’obi?’

14. Olee otú Jizọs si meere ndị mmadụ ihe ọma?

14 Ọ bụghị naanị na Jizọs ma ihe dị mma ọ ga-eme, ọ na-emekwa ya. Ọ na-eme ihe dị mma mgbe niile, na-ebukwa ezi ihe n’obi eme ya n’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya. Ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi nyere ndị ọzọ aka ma meere ha ihe ọma. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ya. Ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịmara ihe dị mma anyị kwesịrị ime, anyị kwesịkwara ịna-eme ya, burukwa ezi ihe n’obi na-eme ya. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Mmadụ ọ̀ ga-ebuli ihe ọjọọ n’obi na-eme ihe ọma?’ Eenụ. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru gbasara ndị na-enyere ndị ogbenye aka ka ndị ọzọ hụ ha ma towe ha. Ọ bụ eziokwu na aka ha nyeere ndị mmadụ adịghị njọ, mana ọ masịghị Jehova n’ihi na ha ebughị ihe ọma n’obi na-eme ya.​—Mat. 6:​1-4.

15. Gịnị ga-eme ka ihe ọma anyị na-emere ndị mmadụ bụrụ nke ezigbo ya?

15 Naanị ihe ga-eme ka ihe ọma anyị na-eme bụrụ nke ezigbo ya bụ ma ọ bụrụ na anyị bu ezi ihe n’obi na-eme ya. N’ihi ya, i nwere ike ijụ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ama ihe dị mma m kwesịrị ime ma na-eme ya? Gịnị mere m na-eji emere ndị mmadụ ihe ọma?’

GỊNỊ KA ANYỊ GA-EME KA IHE Ọ BỤLA GHARA IMEBI ÀGWÀ ỌHỤRỤ ANYỊ?

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme kwa ụbọchị, n’ihi gịnịkwa?

16 Ka anyị ghara iche na anyị ga-akwụsị ịgba mbọ iyiri àgwà ọhụrụ ma anyị mechaa baptizim. Àgwà ọhụrụ a dị ka ákwà ọhụrụ anyị na-ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla mebie. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịgba mbọ na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke kwa ụbọchị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova bụ Chineke na-eme ihe dị mma, ọ bụkwa mmụọ nsọ ya ka ọ na-eji eme ya. (Jen. 1:2) N’ihi ya, àgwà ọ bụla so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ anyị kpara ga-enyere anyị aka ime ihe dị mma. Dị ka ihe atụ, Jems bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs dere, sị: ‘Okwukwe anyị abaghị uru ma ọ bụrụ na anyị anaghị eme ihe dị mma.’ (Jems 2:26) E nwekwara ike ikwu ihe ahụ gbasara àgwà ndị ọzọ niile so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Mgbe ọ bụla anyị kpara àgwà ndị a, ọ na-egosi na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ahụ́ anyị.

17. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma o siere anyị ike ịkpa àgwà ụfọdụ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ?

17 Ndị Kraịst merela baptizim kemgbe ọtụtụ afọ nwedịrị ike ha agaghị akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ mgbe ụfọdụ. Ma ihe ka mkpa bụ ka anyị ghara ịda mbà. Legodị ihe atụ a: Ọ bụrụ na ị maghị ama dọkaa uwe gị mara ezigbo mma, ị̀ ga-atụfu ya ozugbo? Mba. O yiri ka ị̀ ga-achọ ụzọ dụchie ya ma ọ bụrụ na o kwere omume. Ọ ga-emezi ka ị kpacharakwuo anya mgbe ọzọ. Ọ bụrụkwanụ na mgbe ụfọdụ, i meereghị mmadụ obiọma ma ọ bụ i nweghị ndidi ma ọ bụkwanụ gosi mmadụ na ị hụrụ ya n’anya? Adala mbà. Isi n’ala ala obi gị rịọ onye ahụ mgbaghara nwere ike idozi nsogbu ahụ, meekwa ka gị na ya dịghachi ná mma. Kpebisiekwa ike ịkpa àgwà ka mma mgbe ọzọ.

18. Olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

18 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jizọs mere ihe ndị anyị nwere ike ịmụta ihe na ha. Ọ bụrụ na anyị na-eche echiche ka Jizọs ma na-akpa àgwà ka ya, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịna-eme ka ya. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme ka Jizọs, ọ ga-adịkwuru anyị mfe iyiri àgwà ọhụrụ. N’isiokwu a, anyị atụleela àgwà anọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ọ ga-adị mma ma i wepụta oge mụọ àgwà ndị ọzọ so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke ma gbalịa chọpụta ma ị̀ na-akpa àgwà ndị ahụ nke ọma. Ị ga-ahụ ebe ndị a kọwara àgwà ndị a n’Akwụkwọ Ndịàmà Jehova Ji Eme Nchọnchọ, n’isiokwu bụ́ “Otú Ndị Kraịst Si Ebi Ndụ,” n’ebe e dere “Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ.” Ka obi sie gị ike na ọ bụrụ na ị gbaa mbọ ka ị mụta otú e si akpa àgwà ndị a, Jehova ga-enyere gị aka iyiri àgwà ọhụrụ ma ghara iyipụ ya.

ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

^ par. 5 N’agbanyeghị ụdị onye anyị bụ, anyị nwere ike iyiri “àgwà ọhụrụ.” Iji mee ya, anyị kwesịrị ịna-agbanwe otú anyị si eche echiche ma gbalịa ịna-eme ka Jizọs. N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú Jizọs si eche echiche nakwa ihe ndị o mere. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi na-eme ka ya ma anyị mechaa baptizim.

^ par. 4 E deghị àgwà ọma niile mmụọ nsọ Chineke ga-enyere anyị aka ịkpa ná Ndị Galeshia 5:​22, 23. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ya, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche Jun 2020.