Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Gịnị mere 2 Samuel 21:7-9 ji kwuo na Devid ‘meteere Mefiboshet ebere,’ mechaakwa kwuo na ọ kpọnyere Mefiboshet ndị Gibiọn ka ha gbuo ya?
Ụfọdụ ndị gụrụ akụkọ a ọkụ ọkụ ajụọla ajụjụ a. Ma e nwere mmadụ abụọ aha ha bụ Mefiboshet a kpọrọ aha n’akụkọ a. E nwere ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a ma ọ bụrụ na anyị elebakwuoro ya anya.
Sọl bụ́ eze Izrel mụrụ ụmụ nwoke asaa na ụmụ nwaanyị abụọ. Aha ọkpara Sọl bụ Jonatan. E mechara mụọrọ Eze Sọl nwa nwoke aha ya bụ Mefiboshet. Ọ bụ iko ya nwaanyị aha ya bụ Rizpa mụụrụ ya nwa ahụ. Jonatan nwekwara nwa nwoke aha ya bụ Mefiboshet. N’ihi ya, ihe ọ pụtara bụ na Eze Sọl nwere nwa aha ya bụ Mefiboshet, nweekwa nwa nwa aha ya bụ Mefiboshet.
E nwere oge Sọl lụsawara ndị Gibiọn bi n’Izrel agha, chọọkwa igbuchapụ ha niile. Ọ ga-abụkwa na o gburu ụfọdụ n’ime ha. Ihe a o mere jọrọ ezigbo njọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’oge Joshụa, ndị Gibiọn na ndị isi Izrel gbara ndụ, meekwa udo.—Josh. 9:3-27.
Ọgbụgba ndụ ahụ ka dịkwa n’oge Eze Sọl. Ma, Sọl enweghị ihe o ji ọgbụgba ndụ ahụ kpọrọ. Ọ gbara mbọ ikpochapụ ndị Gibiọn niile. Ihe ahụ o mere mere ka ‘ikpe ọbara ma Sọl na ezinụlọ ya.’ (2 Sam. 21:1) Mgbe Devid mechara bụrụ eze, ndị Gibiọn fọrọ ndụ gwara ya gbasara ihe ọjọọ ahụ Sọl mere ha. Devid jụrụ ha ihe ọ ga-emere ha ka obi ha jụrụ maka ihe ọjọọ ahụ Sọl mere ha nakwa ka Jehova gọzie ala Izrel. Ndị Gibiọn agwaghị ya ka o weta ego. Kama, ha gwara ya ka ọ kpọnye ha mmadụ asaa n’ime ụmụ nwoke Sọl mụrụ bụ́ onye chọrọ “igbuchapụ” ha ka ha gbuo. (Ọnụ Ọgụ. 35:30, 31) Devid mere ihe a ha kwuru.—2 Sam. 21:2-6.
Sọl na Jonatan anwụọla n’agha n’oge ahụ. Ma Mefiboshet nwa Jonatan ka dị ndụ. Ihe mberede o nwere mgbe ọ dị obere mere ka ọ daa ngwọrọ. O soghịkwa nna nna ya bụ́ Sọl chọọ igbuchapụ ndị Gibiọn. Devid na Jonatan gbakwara ndụ na ha ga-anọgide na-ahụ ibe ha n’anya. Ọgbụgba ndụ ahụ ga-abakwara ụmụ ha uru. Mefiboshet nwa Jonatan sokwa ná ndị ọgbụgba ndụ ahụ ga-abara uru. (1 Sam. 18:1; 20:42) Baịbụl kwuru, sị: “Eze Devid meteere Mefiboshet nwa Jonatan nwa Sọl ebere, n’ihi iyi ya na Jonatan nwa Sọl ji aha Jehova ṅụọrọ ibe ha.”—2 Sam. 21:7.
Ma, Devid mekwara ihe ndị Gibiọn rịọrọ. Ọ kpọnyere ha ụmụ Sọl ndị nwoke abụọ. Aha otu n’ime ha bụ Mefiboshet, kpọnyekwa ha ụmụ ụmụ Sọl ise. (2 Sam. 21:8, 9) Ihe a Devid mere mere ka ikpe ọbara gharazie ịma ala ahụ.
E nwere ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a. Ihe iwu Chineke kwuru doro anya. Iwu ya kwuru, sị: “A gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi ihe nna ha mere.” (Diut. 24:16) Jehova agaraghị akwado ihe a e mere ụmụ Sọl ndị nwoke abụọ na ụmụ ụmụ ya ndị nwoke ise ma ọ bụrụ na aka ha dị ọcha. Iwu ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ naanị mmehie mmadụ mere ga-eme ka e gbuo ya.” Ọ ga-abụ na ụmụ Sọl asaa ahụ so ya kpaa nkata igbuchapụ ndị Gibiọn. Ihe ọ kpataziri bụ na ha ji ndụ ha kwụọ ụgwọ ya.
Akụkọ a na-akụziri anyị na mmadụ agaghị asị na aka ya adịghị n’ihe ọjọọ o mere n’ihi na ọ bụ onye ọzọ gwara ya mee ya. Otu ilu Baịbụl kwuru, sị: “Mee ka ụzọ ị na-aga dị larịị, ụkwụ ga-esikwa gị ike n’ala. Abanyela n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. Wepụ ụkwụ gị n’ihe ọjọọ.”—Ilu 4:24-27; Efe. 5:15.