Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 9

ABỤ NKE 75 “Lee M, Ziga M”

Ị̀ Dịla Njikere Inyefe Jehova Onwe Gị?

Ị̀ Dịla Njikere Inyefe Jehova Onwe Gị?

“Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ maka ihe ọma niile o meere m?”​—ỌMA 116:12.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-enyere gị aka ka gị na Jehova dịrịkwuo ná mma ka ị chọọ inyefe ya onwe gị ma mee baptizim.

1-2. Gịnị ka mmadụ ga-emerịrị tupu ya emee baptizim?

 N’IME afọ ise gara aga, ihe karịrị otu nde mmadụ emeela baptizim, ghọọkwa Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a malitere ịkụziri eziokwu Baịbụl ‘n’oge ha bụ nwata,’ dị ka e meere Timoti n’oge ndịozi. (2 Tim. 3:14, 15) E nwekwara ndị mụtara gbasara Jehova mgbe ha torola, ụfọdụ abụrụ mgbe ha merela agadi. Otu nwaanyị ya na Ndịàmà Jehova mụrụ Baịbụl mere baptizim mgbe ọ dị afọ iri itoolu na asaa.

2 Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma ọ bụ na ndị mụrụ gị bụ Ndịàmà Jehova, ị̀ na-eche echiche ime baptizim? Ọ dị mma ma ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ. Ma, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị tupu i mee baptizim. Isiokwu a ga-akọwa ihe mmadụ inyefe Jehova onwe ya pụtara. Ọ ga-enyekwara gị aka ịhụ ihe mere na i kwesịghị ịtụ ụjọ inyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim ma i jikere ime ya.

GỊNỊ KA MMADỤ INYEFE JEHOVA ONWE YA PỤTARA?

3. Kwuo ụfọdụ ndị Baịbụl gwara anyị na e nyefere Jehova.

3 Na Baịbụl, onye e nyefere Jehova bụ onye a họpụtara maka ọrụ dị nsọ. Izrel bụ mba e nyefere Jehova. Ma, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị e nyefere Jehova n’ụzọ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, Erọn na-eyi “ihe àmà dị nsọ,” ya bụ, ihe dị mbadamba na-egbuke egbuke e ji ọlaedo mee e tinyere n’ihu ákwà isi ya. Ihe ahụ e ji ọlaedo mee na-egosi na a họpụtara ya ịrụ ọrụ pụrụ iche, ya bụ, ịbụ nnukwu onye nchụàjà n’Izrel. (Lev. 8:9) Ndị Naziraịt bụkwa ndị e nyefere Jehova n’ụzọ pụrụ iche. Okwu Hibru bụ́ nazirʹ a sụgharịrị “Naziraịt” pụtara “Onye E Wepụtara Iche” ma ọ bụ “Onye E Nyefere Chineke.” N’Iwu Mosis, e nwere ihe ndị e nyere ndị Naziraịt iwu ka ha zere.​—Ọnụ Ọgụ. 6:2-8.

4. (a) Olee otú o si bụrụ na ndị e nyefere Jehova bụ ndị e wepụtara iche maka ọrụ dị nsọ? (b) Gịnị ka mmadụ ‘ịjụ onwe ya’ pụtara? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

4 I nyefee Jehova onwe gị, ị họrọla ịghọ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, meekwa ka ime uche Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Gịnị ka i kwesịrị ime ka ị bụrụ Onye Kraịst nyefere Jehova onwe ya? Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya.” (Mat. 16:24) Okwu Grik a sụgharịrị ‘mmadụ ịjụ onwe ya’ nwekwara ike ịpụta ‘mmadụ ịghara ịna-eme ihe masịrị ya.’ Ebe i nyefere Jehova onwe gị, i kwesịrị ịjụ ihe ọ bụla na-anaghị amasị Jehova. (2 Kọr. 5:14, 15) Ọ pụtakwara mmadụ ịjụ “ọrụ ndị e ji mara anụ ahụ́,” dị ka ịkwa iko. (Gal. 5:19-21; 1 Kọr. 6:18) Ịjụ ihe ndị a ọ̀ ga-eme ka ihe siere gị ike ná ndụ? Mba. Ọ gaghị esiri gị ike ma ọ bụrụ na ị hụrụ Jehova n’anya, ya edookwa gị anya na iwu ya ga-abara gị uru. (Ọma 119:97; Aịza. 48:17, 18) Otu nwanna aha ya bụ Nicholas kwuru, sị, “I nwere ike ịna-ele iwu Jehova anya ka ígwè e ji gbachie ụlọ mkpọrọ nke na-agaghị ekwe gị mee ihe ị chọrọ ime ma ọ bụ ka ígwè e ji gbachie ebe ọdụm nọ nke na-echebe gị ka ọdụm ghara imerụ gị ahụ́.”

Ị̀ na-ele iwu Jehova anya ka ígwè e ji gbachie ụlọ mkpọrọ nke na-agaghị ekwe gị mee ihe ị chọrọ ime, ka ọ̀ bụ ka ígwè e ji gbachie ebe ọdụm nọ nke na-echebe gị ka ọdụm ghara imerụ gị ahụ́? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)


5. (a) Olee otú ị ga-esi nyefee Jehova onwe gị? (b) Gịnị dị iche ná mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 Olee otú ị ga-esi nyefee Jehova onwe gị? Ị ga-ekpe ekpere, kwe Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ị ga-efe, nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. N’eziokwu, ị na-ekwe Jehova nkwa na ị gaghị akwụsị iji “obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile na ike gị niile” na-ahụ ya n’anya. (Mak 12:30) Ị ga-enyefe Jehova onwe gị mgbe naanị gị na ya nọ. Ma, ime baptizim bụ ihe ị ga-eme n’ihu ọha. Ọ ga-egosi ndị mmadụ na i nyefeela Jehova onwe gị. Nnyefe i nyefere Jehova onwe gị bụ nkwa dị nsọ i kwere ya. Ọ chọkwara ka i mezuo nkwa ahụ otú ahụ ị chọrọ imezu ya.​—Ekli. 5:4, 5.

Inyefe Jehova onwe gị bụ ikpe ekpere mgbe naanị gị nọ, kwe Jehova nkwa na ị ga na-efe naanị ya nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


GỊNỊ MERE Ị GA-EJI NYEFEE JEHOVA ONWE GỊ?

6. Gịnị na-eme ka mmadụ chọọ inyefe Jehova onwe ya?

6 Isi ihe mere ị ga-eji nyefee Jehova onwe gị bụ na ị hụrụ ya n’anya. Ihe mere i ji hụ ya n’anya abụghị naanị na ị chọrọ ịhụ ya n’anya, kama ọ bụ n’ihi na ‘ị matala uche Chineke nke ọma,’ matakwa nzube ya. (Kọl. 1:9) Ịmụ Baịbụl emeela ka o doo gị anya (1) na Jehova bụ onye dị adị, (2) na Baịbụl bụ Okwu ya si n’ike mmụọ nsọ, nakwa (3) na ọ na-eji nzukọ ya emezu nzube ya.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme tupu anyị enyefee Jehova onwe anyị?

7 Ndị na-enyefe Jehova onwe ha kwesịrị ịma ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi, na-erubekwa isi n’iwu Chineke. Ha na-agbalịsi ike ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị ha na-amụta. (Mat. 28:19, 20) Ha na-ahụkwu Jehova n’anya. Ọ na-agụsikwa ha agụụ ike ife naanị Jehova. Ọ́ bụghị otú ọ dị gị? Ụdị ịhụnanya a ga-eme ka ị ghara iwere inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim ka ihe ị ga-eme iji mee onye na-amụrụ gị ihe ma ọ bụ ndị mụrụ gị ma ọ bụkwanụ ndị enyi gị obi ụtọ.

8. Olee otú inwe obi ụtọ maka ihe ọma ndị Jehova na-emere gị ga-esi enyere gị aka inyefe Jehova onwe gị? (Abụ Ọma 116:12-14)

8 Ị gaghịzi egbu oge inyefe Jehova onwe gị ma ọ bụrụ na ị na-eche banyere ihe ọma niile o meere gị. (Gụọ Abụ Ọma 116:12-14.) Ọ dabara adaba na Baịbụl kpọrọ Jehova onye na-enye anyị “onyinye ọ bụla dị mma, nke zukwara okè.” (Jems 1:17) Nke kacha n’ime onyinye ndị ahụ bụ Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst nwụrụ n’ihi anyị. Chegodị echiche. Ihe mgbapụta ahụ emeela ka gị na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova emeekwala ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (1 Jọn 4:9, 10, 19) Inyefe Jehova onwe gị so n’ụzọ ị ga-esi gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ịhụnanya kachanụ o gosiri anyị nakwa maka ihe ndị ọzọ o ji gọzie gị. (Diut. 16:17; 2 Kọr. 5:15) E kwuru banyere ụdị obi ụtọ a n’isi nke 46, nọmba nke 4, n’akwụkwọ bụ́ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. O nwekwara vidio ga-ewe nkeji atọ aha ya bụ Inye Chineke Onyinye.

Ì JIKERELA INYEFE JEHOVA ONWE GỊ NA IME BAPTIZIM?

9. Gịnị mere na e kwesịghị inyewe mmadụ nsogbu ka o nyefee Jehova onwe ya?

9 I nwere ike ịna-eche na ị dịbeghị njikere inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim. O nwere ike ịbụ na ị ka kwesịrị ịgbanwe ihe ụfọdụ ná ndụ gị ka ọ daba n’ihe Jehova chọrọ, ma ọ bụkwanụ na ị ka kwesịrị ime ka okwukwe gị sikwuo ike. (Kọl. 2:6, 7) Otú onye nke ọ bụla a na-amụrụ Baịbụl si eme nke ọma n’ịhụ Jehova n’anya na-adị iche, ọ bụghịkwa ndị niile na-eto eto bụ́ ọgbọ na-adị njikere ime baptizim n’otu oge. Gbalịa chọpụta ebe ndị ị ga-emekwu nke ọma, gị emee ihe ndị i nwere ike ime, ọ bụghị iji onwe gị na-atụnyere ndị ọzọ.​—Gal. 6:4, 5.

10. Gịnị ka i nwere ike ime ma i chee na ị dịbeghị njikere ime baptizim ugbu a? (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “ Maka Ndị Nne na Nna Ha Bụ Ndịàmà Jehova.”)

10 Ọ bụrụgodị na ị chọpụta na ị dịbeghị njikere inyefe Jehova onwe gị, kpebie ime ya. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịgbanwe ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị. (Fil. 2:13; 3:16) Ka obi siekwa gị ike na ọ ga-anụ ekpere gị ma meere gị ihe ị rịọrọ ya.​—1 Jọn 5:14.

IHE MERE ỤFỌDỤ NDỊ ACHỌGHỊ IME BAPTIZIM

11. Olee otú Jehova ga-esi nyere anyị aka ịna-erubere ya isi?

11 Ụfọdụ ndị rurula inyefe Jehova onwe ha ma mee baptizim achọghị ime ya. Ha nwere ike ịna-eche, sị ‘Ọ bụrụkwanụ na mụ emee mmehie dị oké njọ, a chụọ m n’ọgbakọ?’ Ọ bụrụ na ụdị ụjọ a na-atụ gị, ka obi sie gị ike na Jehova ga-enye gị ihe niile dị gị mkpa iji “na-eme ihe otú ndị na-efe [ya] kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ.” (Kọl. 1:10) Ọ ga-enyekwa gị ike ime ihe ziri ezi. O meerela ya ọtụtụ ndị ọzọ. (1 Kọr. 10:13) O so n’ihe mere na ndị a na-achụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst ebughị ibu. Jehova na-enyere ndị ya aka ịna-erubere ya isi.

12. Olee otú anyị nwere ike isi zere ime mmehie dị oké njọ?

12 Ọnwụnwa na-abịara mmadụ niile na-ezughị okè ka ha mee ihe na-adịghị mma. (Jems 1:14) Ma, ọ bụ gị ga-ekpebi ma ị̀ ga-eme ihe ọjọọ ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ gị ka ọ dịịrị ikpebi otú ị ga-esi ebi ndụ gị. Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụghị mmadụ ga-ekpebi otú obi na-adị ya na ihe ndị ọ na-eme. Ma, ọ bụghị eziokwu. Mmadụ ga-ejideli onwe ya ma agụụ ime ihe ọjọọ gụwa ya. Ọ bụrụgodị na a nwaa gị ọnwụnwa ime ihe ọjọọ, ị ka nwere ike ịjụ ime ya. Ihe ndị nwere ike inyere gị aka ime ya bụ ịna-ekpe ekpere kwa ụbọchị, ịna-amụchi Okwu Chineke anya, ịna-aga ọmụmụ ihe niile, na ịna-agwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ime ihe ndị a mgbe niile ga-enyere gị aka imezu nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị. Echefukwala na Jehova ga-enyere gị aka ime ya.​—Gal. 5:16.

13. Gịnị ka Josef mere anyị ga-amụta ihe na ya?

13 Ọ ga-aka adịrị gị mfe ịna-erubere Jehova isi ma i buru ụzọ kpebie ihe ị ga-eme ma ọnwụnwa bịara gị. Baịbụl kwuru gbasara ọtụtụ ndị mere otú ahụ n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Dị ka ihe atụ, nwunye Pọtịfa gbalịrị ọtụtụ ugboro ime ka ya na Josef kwaa iko. Ma, Josef eburula ụzọ kpebie ihe ọ ga-eme. Baịbụl gwara anyị na ‘ọ jụrụ,’ ma sị: “Gịnịzi mere m ga-eji eme ihe a jọgburu onwe ya ma mehie Chineke?” (Jen. 39:8-10) O doro anya na Josef eburula ụzọ kpebie ihe ọ ga-eme tupu nwunye Pọtịfa anwaa ya ọnwụnwa ahụ. O mere ka ọ dịrị ya mfe ime ihe ziri ezi mgbe a nwara ya.

14. Olee otú anyị ga-esi mụta ịjụ ime omume ọjọọ?

14 Olee otú ị ga-esi eme ka Josef ma mee ihe ziri ezi ma ọnwụnwa bịara gị? I nwere ike iji ugbu a kpebie ihe ị ga-eme tupu ọnwụnwa abịara gị. Mụta otú ị ga-esi ajụ ihe ndị Jehova kpọrọ asị ozugbo, gharakwa ịna-eche gbasara ha. (Ọma 97:10; 119:165) Ime otú a ga-eme ka ị ghara imehie ma ọnwụnwa bịara gị ebe ọ bụ na ị marala ihe ị ga-eme.

15. Olee otú mmadụ ga-esi gosi na ya ‘na-achọsi Jehova ike’? (Ndị Hibru 11:6)

15 O nwere ike ịbụ na o doola gị anya na ihe ị na-amụta bụ eziokwu nakwa na ị chọrọ iji obi gị niile fee Jehova, ma a ka nwere ihe na-egbochi gị inyefe Jehova onwe gị ma mee baptizim. Cheta ihe Eze Devid mere. I nwere ike ịrịọ Jehova, sị: “Chineke, biko, nyochaa m, ka ị mara ihe dị m n’obi. Nyochaa m, ka ị mara ihe na-echegbu m. Lee ma è nwere ihe dị njọ dị m n’obi, ka i wee na-edu m n’ụzọ ndụ ebighị ebi.” (Ọma 139:23, 24) Jehova na-agọzi ndị niile “na-achọsi ya ike.” Mbọ ị na-agba inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim na-egosi ya na ọ bụ ihe ị na-eme.​—Gụọ Ndị Hibru 11:6.

NA-ABỊARUKWU JEHOVA NSO

16-17. Olee otú Jehova si adọta ndị nne na nna ha bụ Ndịàmà Jehova? (Jọn 6:44)

16 Jizọs kwuru na ọ bụ Jehova na-adọta ndị na-eso ụzọ ya. (Gụọ Jọn 6:44.) Chee ihe ọma pụrụ iche ọ bụ nakwa otú o si gbasa gị. Jehova hụrụ ihe dị mma n’ebe onye ọ bụla ọ dọtaara onwe ya nọ. Ọ na-ewere onye ahụ ka ‘onye pụrụ iche.’ (Diut. 7:6) Ọ bụkwa otú ahụ ka o si ele gị anya.

17 Ma, o nwere ike ịbụ na ị bụ onye na-eto eto ndị mụrụ ya bụ Ndịàmà Jehova. O nwere ike ịdị gị ka ihe mere i ji efe Jehova bụ naanị maka na ndị mụrụ gị na-efe ya, ọ bụghị na Jehova dọtara gị. Ma, Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8; 1 Ihe 28:9) Ọ bụrụ na gịnwa eburu ụzọ bịaruo Jehova nsọ, yanwa ga-abịarukwa gị nso. Jehova anaghị ewere gị ka naanị onye so ná ndị ya. Ọ bụ ya na-adọta onye nke ọ bụla, ma onye nne na nna ya bụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na onye dị otú ahụ eburu ụzọ bịaruo Jehova nso, Jehova na-abịaru ya nso dị ka e kwuru na Jems 4:8.​—I nwere ike ịtụle 2 Ndị Tesalonaịka 2:13.

18. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-eso nke a? (Abụ Ọma 40:8)

18 I nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, ị na-eme ka Jizọs. O ji obi ya niile nyefee Jehova onwe ya ime ihe ọ bụla Jehova sị ya mee. (Gụọ Abụ Ọma 40:8; Hib. 10:7) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’ihe ga-enyere gị aka ịnọsi ike na-efe Jehova ma i mechaa baptizim.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị ka ịbụ onye e nyefere Jehova pụtara?

  • Olee otú obi ịdị gị ụtọ maka ihe ndị Jehova meere gị ga-esi enyere gị aka inyefe Jehova onwe gị?

  • Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ime mmehie dị oké njọ?

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike