Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 11

ABỤ NKE 129 Anyị Ga Na-atachi Obi

Ị Ga-anọsili Ike n’Ofufe Jehova n’Agbanyeghị Ihe Ndị Wutere Gị

Ị Ga-anọsili Ike n’Ofufe Jehova n’Agbanyeghị Ihe Ndị Wutere Gị

“Unu na-atachi obi . . . n’ihi aha m.”​—MKPU. 2:3.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-anọsili ike n’ozi Jehova n’agbanyeghị ihe ndị wutere anyị.

1. Olee ngọzi ụfọdụ anyị na-enweta n’ihi na anyị nọ n’ọgbakọ Jehova?

 Ọ BỤ ezigbo ihe ọma meere anyị na anyị nọ n’ọgbakọ Jehova n’oge ikpeazụ a dị oké egwu. Ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa a, Jehova nyere anyị ụmụnna anyị ka ha na-enyere anyị aka. (Ọma 133:1) Ọ na-enyere anyị aka ka anyị na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ anyị. (Efe. 5:33–6:1) Ọ na-enyekwa anyị amamihe na nghọta ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị, meekwa ka obi na-eru anyị ala.

2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime, maka gịnị?

2 Ma, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ịnọsi ike na-efe Jehova. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na mgbe ụfọdụ, ihe ndị ọzọ mejọrọ nwere ike iwe anyị iwe. Anyị nwekwara ike ịda mbà maka ihe ndị anyị mejọrọ, karịchaa, ma ọ bụrụ na anyị emejọọ otu ihe ahụ ugboro ugboro. Anyị kwesịrị ịnọsi ike n’ozi Jehova (1) mgbe nwanna anyị mejọrọ anyị, (2) mgbe di anyị ma ọ bụ nwunye anyị mere ihe wutere anyị, na (3) mgbe obi dara anyị mbà maka ihe anyị mejọrọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya na nke ọ bụla n’ime nsogbu ndị a. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị ga-amụta n’aka otu onye ji obi ya fee Jehova a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl.

NỌSIE IKE N’OFUFE JEHOVA MGBE NWANNA GỊ MEJỌRỌ GỊ

3. Olee nsogbu ụfọdụ na-abịara ndị Jehova?

3 Ihe mere o ji esi ike. Ụfọdụ ụmụnna anyị nwere àgwà ndị na-ewe anyị iwe. Ndị ọzọ nwekwara ike mee ihe wutere anyị ma ọ bụkwanụ ghara iji obiọma meso anyị ihe. Ndị na-eduzi anyị n’ọgbakọ nwere ike imejọ ihe. Ihe ndị a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ma ihe a ọ̀ ka bụkwa ọgbakọ Jehova. Kama isoro ụmụnna ha “jiri otu obi” na-efe Chineke, ha nwere ike ịkwụsị ha na ụmụnna ndị ahụ imekọ ihe ma ọ bụdị kwụsị ịga ọmụmụ ihe. (Zef. 3:9) Ime otú ahụ ọ̀ dị mma? Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl ụdị ihe ahụ mere.

4. Olee nsogbu ndị bịaara Pọl onyeozi?

4 Onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Pọl onyeozi ma na ụmụnna ya ezughị okè. Dị ka ihe atụ, obere oge ọ ghọchara Onye Kraịst, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem ekwetaghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe ha hụrụ ya. (Ọrụ 9:26) Mgbe e mechara, ụfọdụ ndị kwuru okwu ọjọọ gbasara ya ka ndị ọzọ ghara ịtụkwasị ya obi. (2 Kọr. 10:10) Pọl hụkwara ka otu nwanna a na-akwanyere ùgwù mere mkpebi na-adịghị mma nke nwere ike ime ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ. (Gal. 2:11, 12) Otu n’ime ndị ha na Pọl rụkọrọ ọrụ, bụ́ Mak, mere ihe gbawara ya obi. (Ọrụ 15:37, 38) Ọ bụrụ na Pọl chọrọ, ọ gaara ekwe ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mee ka ọ na-agbara ndị ahụ mejọrọ ya ọsọ. Ma, o meghị otú ahụ. O ji ụmụnna ya kpọrọ ihe, nọsiekwa ike n’ofufe Jehova. Gịnị nyeere Pọl aka?

5. Gịnị nyeere Pọl aka ka ike ụmụnna ya ghara ịgwụ ya? (Ndị Kọlọsi 3:13, 14) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

5 Pọl hụrụ ụmụnna ya n’anya. Otú o si hụ ụmụnna ya n’anya mere ka o lekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere, ọ bụghị n’ihe ndị ha na-anaghị emeta. Ịhụnanya nyekwaara Pọl aka ime ihe yanwa dere ná Ndị Kọlọsi 3:13, 14. (Gụọ ya.) Ka anyị lee otú Pọl si gbaghara Mak. Ọ bụ eziokwu na Mak hapụrụ Pọl mgbe ọ na-eje ozi ala ọzọ ya nke mbụ, ma Pọl eburughị ya iwe n’obi. Mgbe e mechara, o degaara ụmụnna nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi, too Mak na ọ bụ onye ya na ya na-arụkọ ọrụ o ji kpọrọ ihe nakwa na ọ ‘na-akasi ya nnọọ obi.’ (Kọl. 4:10, 11) Mgbe Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ na Rom, o ziri ozi ka Mak bịa nyere ya aka. (2 Tim. 4:11) O doro anya na Pọl na-agbaghara ụmụnna ya, ya na ha ana-emekọkwa ihe. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl?

Pọl, Banabas, na Mak nwere nghọtahie. Ma, Pọl mechara chefuo ihe merenụ, ya na Mak ejiri obi ụtọ na-arụkọ ọrụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6-7. Olee otú anyị ga-esi ghara ịkwụsị igosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya n’agbanyeghị ihe ndị ha na-emejọ? (1 Jọn 4:7)

6 Ihe anyị na-amụta. Jehova chọrọ ka anyị ghara ịkwụsị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 4:7.) Ọ bụrụ na nwanna akpaghị àgwà ka Onye Kraịst, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ kpachaghị anya chọọ ime ihe ga-ewute anyị nakwa na ọ na-agba mbọ ime ihe Jehova kwuru. (Ilu 12:18) Chineke hụrụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya n’agbanyeghị na ha na-emejọ ihe. Ọ naghị ajụ anyị ma anyị mejọọ ihe. Ọ naghịkwanụ eburu anyị iwe n’obi. (Ọma 103:9) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ka Nna anyị nke na-agbaghara ndị ọzọ.​—Efe. 4:32–5:1.

7 Chetakwa na ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịna-adịkwu ná mma. Anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga na-akpagbukwu anyị. E nwedịrị ike ịtụ anyị mkpọrọ maka na anyị na-efe Chineke. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, enyemaka ụmụnna anyị ga-adịkwu anyị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (Ilu 17:17) Ka anyị lee ihe mere otu okenye na Spen aha ya bụ Josep. a A tụrụ ya na ụmụnna ndị ọzọ mkpọrọ maka na ha ekweghị aga agha. Ọ sịrị: “Mgbe anyị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ dị mfe ime ihe ga-ewe ụmụnna anyị iwe n’ihi na anyị niile bikọtara ọnụ. Anyị gbalịsiri ike na-ediri ụmụnna anyị ihe ma na-agbaghara ha kpamkpam. Ihe a chebere anyị, nyekwara anyị aka ịdị n’otu. Ndị anyị na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ bụ ndị na-anaghị efe Jehova. E nwere otu oge m gbajiri aka, e kee m ya bandeeji, ya emee ka m ghara ịna-emeli ihe ọ bụla. Ma, otu nwanna na-asara m uwe m ma na-enyere m aka n’ihe ndị ọzọ. Nwanna a gosiri m ezigbo ịhụnanya mgbe ọ kacha dịrị m mkpa.” Ihe ndị a bụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị ịgba mbọ ka anyị na ụmụnna anyị dozie nsogbu ọ bụla anyị nwere ugbu a.

NỌSIE IKE N’OFUFE JEHOVA MA DI GỊ MA Ọ BỤ NWUNYE GỊ MEE IHE GBAWARA GỊ OBI

8. Olee nsogbu ndị di na nwunye na-enwe?

8 Ihe mere o ji esi ike. Di na nwunye ọ bụla na-enwe nsogbu. Baịbụl kwukwara hoo haa na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe “ọtụtụ nsogbu.” (1 Kọr. 7:28) Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na di na nwunye ezughị okè. Àgwà ha, ihe ndị na-amasị ha, na ihe ndị na-anaghị amasị ha abụghị otu. Obodo ha na omenala ha nwekwara ike ịdị iche iche. Ka oge na-aga, ha nwere ike kpaa àgwà ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-amabughị na ha nwere tupu ha alụọ. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nwere ike ịkpata nsogbu. Ha nwere ike ịtawa ibe ha ụta kama ịghọta na onye nke ọ bụla so kpata nsogbu ahụ, nakwa na ha kwesịrị ịgba mbọ dozie ya. Ha nwedịrị ike iche na onye ọ bụla ịga nọọrọ onwe ya ma ọ bụkwanụ ịgba alụkwaghịm bụ ihe ga-edozi nsogbu ha. Ma, ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ onye ọ bụla ịnọrọ onwe ya ọ̀ ga-edozili nsogbu? b Ka anyị lee ihe anyị ga-amụta n’aka otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, onye na-ahapụghị di ya n’agbanyeghị na o siiri ya ike.

9. Olee nsogbu Abigel nwere?

9 Onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Aha di Abigel bụ Nebal. Baịbụl kwuru na Nebal dị aka ike, na-akpakwa àgwà ọjọọ. (1 Sam. 25:3) O doro anya na o siiri Abigel ike ya na ụdị nwoke ahụ ibi. Abigel ò nwere ohere ịhapụ di ya? Ee. E nwere mgbe Devid, onye ga-abụ eze Izrel n’ọdịnihu, bịara ka o gbuo di ya n’ihi na ọ kparịrị ya na ndị so ya. (1 Sam. 25:9-13) Ọ bụrụ na Abigel chọrọ, ọ gaara agba ọsọ, hapụ Devid ka o gbuo di ya. Ma, o meghị otú ahụ. Kama, ọ rịọrọ Devid ka ọ hapụ igbu di ya. (1 Sam. 25:23-27) Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

10. Gịnị ka o nwere ike ịbụ ya nyeere Abigel aka ka ọ ghara ịhapụ di ya na-akpa àgwà ọjọọ?

10 Abigel hụrụ Jehova n’anya, jirikwa iwu Jehova nyere maka alụmdi na nwunye kpọrọ ihe. Ọ ga-abụ na ọ ma ihe Jehova gwara Adam na Iv mgbe o jikọtara ha abụọ. (Jen. 2:24) Abigel ma na Jehova na-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe dị nsọ. Ọ chọrọ ime Jehova obi ụtọ. Ọ ga-abụ ya mere o ji mee ihe niile o nwere ike ime iji chebe ndị niile bi n’ụlọ ha, ma di ya. O mere ihe ozugbo ka o gbochie Devid igbu Nebal. Ọ dịkwa njikere ịrịọ mgbaghara maka ihe ọjọọ ọ na-emeghị. Ọ bụ nwaanyị nwere obi ike, onye na-anaghịkwa achọ ihe ga-abara naanị ya uru. O doro anya na Jehova hụrụ ya n’anya. Olee ihe ndị nwunye nakwa ndị di ga-amụta n’aka Abigel?

11. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ ka di na nwunye na-eme? (Ndị Efesọs 5:33) (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Carmen mere ka ya na di ya ghara itisa? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Ihe anyị na-amụta. Jehova chọrọ ka di na nwunye jiri alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na otu n’ime ha na-akpa àgwà ọjọọ. Obi ga-atọgbu Jehova atọgbu ma ọ hụ ka di na nwunye na-agbasi mbọ ike idozi nsogbu ha, na-egosi ibe ha ịhụnanya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. (Gụọ Ndị Efesọs 5:33.) Ka anyị leba anya n’akụkọ Nwanna Nwaanyị Carmen. Ihe dị ka afọ isii ọ lụchara di, Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya Baịbụl, ya emechaakwa mee baptizim. Ọ sịrị: “Ihe a adịghị di m mma. Ọ dị ya ka Jehova ọ̀ na-anara ya nwunye ya. Ọ na-akparị m ma na-agwa m na ọ ga-ahapụ m.” N’agbanyeghị ya, Nwanna Nwaanyị Carmen ahapụghị di ya. Ruokwa afọ iri ise, ọ gbasiri mbọ ike ịna-ahụ di ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù. Ọ sịrị: “Ka afọ na-agafe, m mụtara ịna-aghọtakwu otú obi dị di m, jirikwa akọ na-agwa ya okwu. Ebe m ma na alụmdi na nwunye dị nsọ n’anya Jehova, m mere ihe niile m nwere ike ime ka mụ na di m ghara itisa. E nweghị mgbe m hapụrụ di m n’ihi na m hụrụ Jehova n’anya.” c Gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị nwee nsogbu, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-akwado gị, nyekwara gị aka ịnọsi ike na-efe ya.

Gịnị ka i nwere ike ịmụta n’otú Abigel si dị njikere ime ihe ọ bụla o nwere ike ime ka ya na di ya ghara itisa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


NỌSIE IKE N’OZI JEHOVA MGBE OBI DARA GỊ MBÀ MAKA IHE I MEJỌRỌ

12. Olee ihe nwere ike ịbụ nsogbu anyị ma anyị mee mmehie dị oké njọ?

12 Ihe mere o ji esi ike. Ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ, anyị nwere ike ịda mbà. Baịbụl kwukwara na mmehie nwere ike ime ka ‘obi gbawaa anyị, ihe anyị mere ana-ewutekwa anyị.’ (Ọma 51:17) Otu nwanna aha ya bụ Robert gbasiri mbọ ike ruo ọtụtụ afọ bụrụ ohu na-eje ozi. Ma, o mere mmehie dị oké njọ nke mere ka ọ chọpụta na ya emechuola Jehova ihu. Ọ sịrị: “Mgbe m matara ihe m mere, akọnuche m nyere m ezigbo nsogbu. Obi mechara jọwa m ezigbo njọ. M bere ákwá, kpeekwa ekpere. M chetara na m nọ na-eche na Jehova agaghị achọ ige m ntị ọzọ. Oleekwanụ ihe mere ọ ga-eji chọọ ige m ntị? Emechuola m ya ihu.” Ọ bụrụ na anyị emee mmehie, ike ụwa nwere ike ịgwụ anyị, anyị echewe na Jehova ahapụla anyị, n’ihi ya, na ọ baghị uru ka anyị gbaa mbọ ifewe ya. (Ọma 38:4) Ọ bụrụ na ọ dịtụla gị otú ahụ, chee banyere otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, onye nọsiri ike na-efe Jehova n’agbanyeghị na o mere ihe dị oké njọ.

13. Olee mmehie dị ezigbo njọ Pita mere, oleekwa ihe kpatara ya?

13 Onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, Pita onyeozi mejọrọ ọtụtụ ihe nke mere ka o mee ihe ọjọọ kachanụ o metụrụla. Nke mbụ, onwe Pita buru ya isi, ya etuo ọnụ na ya agaghị ahapụ Jizọs ọ bụrụgodị na ndịozi ndị ọzọ ahapụ ya. (Mak 14:27-29) Nke ọzọ, mgbe ha nọ n’ogige Getsemeni, Pita anọghị na nche ugboro ugboro. (Mak 14:32, 37-41) Mgbe ìgwè mmadụ, ndị ji mma agha na okpiri, bịara ka ha kpụrụ Jizọs, Pita riri mbọmbọ. (Mak 14:50) N’ikpeazụ, Pita gọnahụrụ Jizọs ugboro atọ, ṅụọdị iyi n’ụgha a ọ ghara. (Mak 14:66-71) Gịnị ka Pita mere mgbe ọ chọpụtara na ihe a o mere jọgburu onwe ya? Obi gbawara ya, ya ebee ezigbo ákwá. Ọ ga-abụkwa na akọnuche ya nọ na-enye ya ezigbo nsogbu. (Mak 14:72) Chegodị otú obi si jọọ Pita ezigbo njọ mgbe e mechara gbuo enyi ya bụ́ Jizọs. Ọ ga-abụrịrị na ihe a mere ka Pita chee na ya abaghịzi uru.

14. Gịnị nyeere Pita aka ịnọsi ike n’ozi Jehova? (Kọwaa foto .)

14 E nwere ihe ụfọdụ mere Pita ji nọsie ike n’ofufe Jehova. Ọ kpapụghị onwe ya iche. Ọ gakwuuru ụmụnna ya. O dokwara anya na ha kasiri ya obi. (Luk 24:33) Ihe ọzọ bụ na Jizọs pụtara n’ihu Pita mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ ga-abụ na ọ bịara ka ọ gbaa Pita ume. (Luk 24:34; 1 Kọr. 15:5) Mgbe e mechara, kama ịbara enyi ya Pita mba maka ihe ndị o mejọrọ, Jizọs gwara ya na ọ ga-enyekwu ya ọrụ. (Jọn 21:15-17) Pita ma na ihe o mere dị ezigbo njọ, ma ọ nọkwa na-agbalị ime ihe dị mma. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi siri ya ike na Nna ya ukwu bụ́ Jizọs ahapụbeghị ya. Ụmụnna Pita kwadokwara ya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pita?

Jọn 21:15-⁠17 gosiri na Jizọs ahapụghị Pita. Ihe a gbara Pita ume ịnọsi ike n’ofufe Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)


15. Gịnị ka Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ya? (Abụ Ọma 86:5; Ndị Rom 8:38, 39) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

15 Ihe anyị na-amụta. Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ọ hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ dị njikere ịgbaghara anyị. (Gụọ Abụ Ọma 86:5; Ndị Rom 8:38, 39.) Anyị mee mmehie, obi anyị na-ama anyị ikpe. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị. Ma, anyị ekwesịghị iche na Jehova agaghị ahụli anyị n’anya ma ọ bụkwanụ na ọ gaghị agbaghara anyị. Kama, anyị kwesịrị ịga ka e nyere anyị aka ozugbo. Nwanna Robert anyị kwuburu okwu ya sịrị: “Ihe mere m ji mee mmehie bụ na m chere na m ga-emerili ọnwụnwa n’ike m.” Ọ chọpụtara na o kwesịrị ịga kọọrọ ndị okenye ihe o mere. Ọ sịrị: “Ozugbo m gara kọọrọ ya ndị okenye, m chọpụtara na Jehova ji ha na-enyere m aka, hụkwa na Jehova hụrụ m n’anya. M chọpụtakwara na ndị okenye hụrụ m n’anya. Ha nyeere m aka ịmata na Jehova ahapụbeghị m.” Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nakwa na ọ ga-agbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa, gaa ka e nyere anyị aka, gbasiekwa mbọ ike ịghara ime ihe ahụ ọzọ. (1 Jọn 1:8, 9) Ọ bụrụ na obi esie anyị ike otú ahụ, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịkwụsị ife Jehova ma ọ bụrụ na anyị emejọọ ihe.

Olee otú obi na-adị gị ma ọ bụ otú obi ga-adị gị ma ndị okenye nyere gị aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Gịnị mere i ji kpebisie ike ịnọsi ike na-efe Jehova?

16 Jehova ji mbọ anyị na-agba ife ya n’oge ikpeazụ a tara akpụ kpọrọ ezigbo ihe. N’enyemaka Jehova, anyị ga-anọsili ike n’ofufe ya n’agbanyeghị ihe ndị wutere anyị. Anyị nwere ike ịhụkwu ụmụnna anyị n’anya ma na-agbaghara ha ma ha mejọọ anyị. Anyị nwere ike igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu ma na-akwanyere ndokwa alụmdi na nwunye o mere ùgwù ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile idozi nsogbu ọ bụla anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwere. Ọ bụrụkwa na anyị emee mmehie, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka, nabata ịhụnanya ya na mgbaghara ya, nọsiekwa ike n’ofufe ya. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji ma ọ bụrụ na “ike ime ihe dị mma . . . agwụghị anyị.”​—Gal. 6:9.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI ANỌSI IKE N’OZI JEHOVA MGBE . . .

  • nwanna mejọrọ anyị?

  • di anyị ma ọ bụ nwunye anyị mere ihe wutere anyị?

  • obi dara anyị mbà maka ihe anyị mejọrọ?

ABỤ NKE 139 Hụ Onwe Gị n’Ụwa Ọhụrụ

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Okwu Chineke na-akụziri anyị na ọ dịghị mma ka di na nwunye hapụ ibe ha. O mekwara ka o doo anya na ọ bụrụ na ha ahapụ ibe ha, ha ekwesịghị ịga lụọ onye ọzọ. Ma, e nwere ihe ụfọdụ siri ike merela ka ụfọdụ Ndị Kraịst kpebie ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha gaa nọrọ nke ha. Gụọ ihe nke 4 e dere ná ngwụcha akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi isiokwu ya bụ “Mmadụ Ịhapụ Di Ya ma Ọ Bụ Nwunye Ya.”

c Ị chọọ ịhụ akụkọ ọzọ, gaa na jw.org lee vidio isiokwu ya bụ Ekwela Ka Udo Na-abụghị nke Ezigbo Ya Duhie Gị​—Darrel na Deborah Freisinger.