Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịgbaghara Mmehie Tupu Jizọs Ejiri Ndụ Ya Chụọ Àjà

Ịgbaghara Mmehie Tupu Jizọs Ejiri Ndụ Ya Chụọ Àjà

Ọ bụ naanị àjà mgbapụta ahụ Jizọs ji ọbara ya chụọ ga-eme ka a gbaghara anyị mmehie anyị. (Efe. 1:7) Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Chineke mere ihe a iji gosi na ya bụ onye ezi omume n’ihi na ntachi obi ya mere ka ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga,” ya bụ, tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà. (Rom 3:25) Olee otú Jehova si nwee ike ime ya ma ka bụrụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi?

N’anya Jehova, ozugbo o kpebiri na a ga-enwe “nwa” ga-azọpụta ụmụ mmadụ nwere okwukwe na ya, ọ dị nnọọ ka à ga-asị na a kwụọla ihe mgbapụta ahụ. (Jen. 3:15; 22:18) Obi siri Chineke ezigbo ike na mgbe oge ya ruru, Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ga-ekweta iji ndụ ya chụọ àjà. (Gal. 4:4; Hib. 10:7-10) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, Jehova nyere ya ikike ịgbaghara mmehie tupu ya ejiri ndụ ya chụọ àjà. Ihe mere Jizọs ji nwee ike ịgbaghara ndị nwere okwukwe mmehie ha bụ na ọ ma na àjà ahụ ọ ga-achụ ga-ekpuchi mmehie ha.​—Mat. 9:2-6.