Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 10

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

“Na-eso” Jizọs ma I Mechaa Baptizim

“Na-eso” Jizọs ma I Mechaa Baptizim

“Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị na-eso m.”​—LUK 9:23.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịhụ otú nnyefe anyị nyefere Jehova onwe anyị si agbasa otú anyị si ebi ndụ. Ma ọ ga-akacha enyere ndị mere baptizim ọhụrụ aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova.

1-2. Olee ngọzi mmadụ na-enweta ma o mechaa baptizim?

 OBI na-atọ anyị ụtọ ma anyị mee baptizim ma ghọọ ndị ezinụlọ Jehova. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere ndị ha na Jehova dị ná mma. Anyị kwetakwara ihe ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru. Ọ sịrị: “Onye ị họọrọ ma kpọta nso ka o biri n’ogige ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.”​—Ọma 65:4.

2 Ọ bụghị onye ọ bụla Jehova hụrụ ka ọ na-akpọbata n’ezinụlọ ya. Dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ, ndị ọ na-abịaru nso bụ ndị gosiri na ha chọrọ ka ha na ya dịrị n’ezigbo mma. (Jems 4:8) I nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, ị na-abịarukwu ya nso n’ụzọ pụrụ iche. Obi kwesịrị isi gị ike na i mechaa baptizim, Jehova ‘ga-awụsa gị ngọzi ruo mgbe ihe ọ bụla na-agaghị akọ gị.’​—Mal. 3:10; Jere. 17:7, 8.

3. Olee ihe dị ezigbo mkpa Ndị Kraịst nyefere Jehova onwe ha ma mee baptizim kwesịrị ime? (Ekliziastis 5:4, 5)

3 Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ime baptizim bụ otú i si amalite iji ndụ gị ejere Jehova ozi. I mechaa baptizim, ị ga-achọ ime ike gị niile imezu nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ọ bụrụgodị na ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu abịara gị. (Gụọ Ekliziastis 5:4, 5.) Ebe ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ị ga na-esosi Jizọs ike ma na-agbasi mbọ ike idebe iwu ya. (Mat. 28:19, 20; 1 Pita 2:21) Isiokwu a ga-enyere gị aka ime otú ahụ.

“NA-ESO” JIZỌS N’AGBANYEGHỊ ỌNWỤNWA NA NSOGBU

4. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si eburu “osisi ịta ahụhụ”? (Luk 9:23)

4 Echekwala na i mechaa baptizim na ị gaghị enwe nsogbu ọ bụla. N’eziokwu, Jizọs mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-eburu “osisi ịta ahụhụ.” Ha ga na-eme otú ahụ “kwa ụbọchị.” (Gụọ Luk 9:23.) Ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na ndị na-eso ụzọ ya ga na-ata ahụhụ mgbe niile? Ọ bụghị ya. Ihe ọ na-ekwu bụ na, e wepụ ngọzi ndị anyị ga-enweta, anyị ga-enwe nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha nwedịrị ike isi ezigbo ike.​—2 Tim. 3:12.

5. Olee nkwa Jizọs kwere ndị hapụrụ ihe ụfọdụ iji soro ya?

5 O nwere ike ịbụ na ndị ezinụlọ gị ebidola megidewe gị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị hapụla ịchụ akụnụba ka i nwee ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. (Mat. 6:33) Ọ bụrụ otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova na-ahụ ihe niile ị na-emere ya. (Hib. 6:10) O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “E nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma, nke na-agaghị enweta okpukpu otu narị (100) ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwaanyị, nne, ụmụ, ubi, nakwa mkpagbu n’oge a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.” (Mak 10:29, 30) Ngọzi ndị i nwetarala karịrị ihe ndị ị hapụrụ.​—Ọma 37:4.

6. Gịnị mere i ji kwesị ịna-agbasi mbọ ike ka ị ghara ime “ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ” ma i mechaa baptizim?

6 Ị ka kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka ị ghara ime “ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ” ma i mechaa baptizim. (1 Jọn 2:16) A sị ka e kwuwe, ị ka bụkwa nwa Adam na-ezughị okè. O nwere ike ịdị gị mgbe ụfọdụ otú ọ dị Pọl onyeozi. O dere, sị: “N’ime obi m, iwu Chineke na-amasị m. Ma ana m ahụ na e nwere iwu ọzọ na-akpa ike n’ahụ́ m. Iwu a na-alụso iwu na-achị obi m agha. Ọ na-adọrọkwa m n’agha, mee ka m gbawara iwu mmehie nke dị n’ahụ́ m ohu.” (Rom 7:22, 23) Ihe ọjọọ na-agụ gị agụụ nwere ike ime ka obi daa gị mbà. Ma, icheta nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ga-eme ka i kpebisie ike imeri ọnwụnwa. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnwụnwa bịara gị, nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ga-enyere gị aka. Olee otú ọ bụ?

7. Olee otú inyefe Jehova onwe gị ga-esi enyere gị aka ịna-erubere ya isi?

7 Mgbe i nyefere Jehova onwe gị, ị jụrụ onwe gị. Ọ pụtara na ị jụrụ ọchịchọ ndị na-adịghị mma nakwa ihe ndị ọzọ ị chọrọ ime na-agaghị amasị Jehova. (Mat. 16:24) N’ihi ya, ọnwụnwa bịara gị, ị gaghị echewe ihe ị ga-eme. I bula ụzọ kpebie ihe ị ga-eme, ya bụ, irubere Jehova isi. Ị ga-ekpebisi ike ime ihe na-amasị Jehova. I mee otú ahụ, ị na-eme ka Job. N’agbanyeghị na ọtụtụ ọnwụnwa ndị siri ezigbo ike bịaara ya, o ji obi ya niile sị: “M ga-ejisi Chineke aka ike.”​—Job 27:5.

8. Olee otú ichebara ekpere i kpere mgbe i nyefere Jehova onwe gị echiche ga-esi enyere gị aka imeri ọnwụnwa?

8 I chee gbasara nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị, ọ ga-enyere gị aka ịjụ ọnwụnwa ọ bụla bịaara gị. Dị ka ihe atụ, ị̀ ga-aga chụwa di ma ọ bụ nwunye mmadụ? Mbanụ. I bula ụzọ kpebie na ị gaghị eme ya. Ime otú a ga-enyere gị aka ka ị ghara ichewe ihe na-adịghị mma nke ga-eme ka ị chọwazie otú ị ga-esi ewepụ ya n’obi gị mgbe e mechara. Ị ga-ezere “ụzọ ndị ajọ omume.”​—Ilu 4:14, 15.

9. Olee otú ichebara ekpere i kpere mgbe i nyefere Jehova onwe gị echiche ga-esi enyere gị aka iwere ihe gbasara ofufe ya ka ihe kacha mkpa?

9 Ọ bụrụkwanụ na e nye gị ọrụ ga-eme ka ị ghara ịna-agachi ọmụmụ ihe anya? Ị makwa ihe i kwesịrị ime. Tupu e nyedị gị ọrụ ahụ, i burula ụzọ kpebie na ị gaghị anara ụdị ọrụ ahụ. Ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịnara ọrụ ga-eme ka o siere gị ike ịgachi ọmụmụ ihe anya, mechazie chọwa otú ị ga-esi were ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa. Ichebara ihe Jizọs mere echiche ga-enyere anyị aka. O kpebisiri ike ime Nna ya obi ụtọ. N’ihi ya, dị ka Jizọs, kpebisie ike na e nwee ihe ọ bụla na-agaghị amasị Jehova, onye i nyefere onwe gị, na ị ga-ajụ ya ozugbo.​—Mat. 4:10; Jọn 8:29.

10. Olee otú Jehova ga-esi enyere gị aka ‘ịna-eso’ Jizọs?

10 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnwụnwa na nsogbu ndị na-abịara gị bụ ohere ị ga-eji gosi na i kpebisiri ike ‘ịna-eso’ Jizọs. I mee otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka. Baịbụl sịrị: “Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ gaghịkwa ekwe ka ọnwụnwa unu na-agaghị edili bịara unu. N’ihi ya, ọnwụnwa bịara unu, ọ ga-enyere unu aka idi ya.”​—1 Kọr. 10:13.

OTÚ Ị GA-ESI NA-ESO JIZỌS

11. Olee otu n’ime ụzọ ndị kacha mma anyị ga-esi na-eso Jizọs? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

11 Jizọs ji obi ya niile fee Jehova. O kpekwara ekpere ka o nwee ike ịbịaru Jehova nso. (Luk 6:12) N’eziokwu, otu n’ime ụzọ ndị kacha mma ị ga-esi na-eso Jizọs ma i mechaa baptizim bụ ịna-eme ihe ndị ga-eme ka ị bịarukwuo Jehova nso. Baịbụl sịrị: “Otú ọ bụla anyị merurula nke ọma, ka anyị si otú ahụ mere nke ọma na-aga.” (Fil. 3:16) Mgbe ụfọdụ, ị ga na-anụ akụkọ ụmụnna ndị wepụtakwuru oge ha ijekwuru Jehova ozi. O nwere ike ịbụ ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze ma ọ bụkwanụ kwaga n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na ị ga-emeli ya, gbaa mbọ ka i mee ya. Ọ na-agụ ndị Jehova agụụ ijekwuru ya ozi. (Ọrụ 16:9) Ma, ọ bụrụkwanụ na ị gaghị emeli ya ugbu a? Echekwala na ị baghị uru ma e jiri gị tụnyere ndị nwere ike ime ya. Ihe dị mkpa bụ ka ị na-atachi obi. (Mat. 10:22) Echefukwala na ị na-eme Jehova obi ụtọ ma i mee ihe niile i nwere ike ime n’ozi ya. Ọ bụ otu ụzọ dị mkpa i nwere ike isi na-eso Jizọs ma i mechaa baptizim.​—Ọma 26:1.

I mechaa baptizim, kpebie ime ihe ndị ga-eme ka ị bịarukwuo Jehova nso (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)


12-13. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ofufe Jehova anaghị anụchazi gị ọkụ n’obi? (1 Ndị Kọrịnt 9:16, 17) (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Akwụsịla Ịgba Ọsọ Ndụ.”)

12 Ọ bụrụkwanụ na e nwee mgbe i bidoro chewe na ị naghị esi n’obi gị ekpe ekpere ma ọ bụkwanụ na ozi ọma anaghị atọ gị ụtọ otú o sibu atọ gị? Ọ bụrụkwanụ na ịgụ Baịbụl anaghị atọ gị ụtọ otú o sibu atọ gị? Ihe ndị a mee gị mgbe i mechara baptizim, echekwala na Jehova anapụla gị mmụọ ya. Ị bụ mmadụ na-ezughị okè, otú obi dị gị nwekwara ike ịgbanwe. Ọ bụrụ na ị naghịzi anụ ọkụ n’obi, chee gbasara Pọl onyeozi. Ọ bụ eziokwu na ọ gbalịrị ime ka Jizọs, ọ ma na mgbe ụfọdụ, o nwere ike ọ gaghị anụ ya ọkụ n’obi otú o si anụ ya n’oge ndị ọzọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:16, 17.) Pọl sịrị: “Ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe m chọrọ ime, m ga-emerịrị ya n’ihi na ọ bụ ọrụ Chineke họpụtara m ka m na-arụ.” Ihe Pọl na-ekwu bụ na ya kpebisiri ike ijezu ozi ya n’agbanyeghị otú ọ bụla obi dị ya.

13 Dịkwa ka Pọl, emekwala mkpebi naanị n’ihi otú obi dị gị. Kpebisie ike na ị ga na-eme ihe dị mma n’agbanyeghị otú ọ bụla obi dị gị. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe dị mma mgbe niile, otú obi dị gị nwere ike ịgbanwe. Ọ bụrụgodị na ọ gbanweghị, gbalịa na-emechi ihe ndị gbasara ofufe Jehova anya. Ọ ga-enyere gị aka ịna-eso Jizọs ma i mechaa baptizim. Ọ bụrụ na ị na-emechi ihe ndị ahụ anya, ọ ga na-agbakwa ụmụnna gị ume.​—1 Tesa. 5:11.

“NA-ENYOCHANỤ ONWE UNU . . . NA-EGOSINỤ ỤDỊ MMADỤ UNU BỤ”

14. Gịnị ka i kwesịrị ịna-enyocha mgbe niile? Maka gịnị? (2 Ndị Kọrịnt 13:5)

14 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka ma i mechaa baptizim bụ ịna-enyocha onwe gị mgbe niile. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 13:5.) Ị gụrụ gụrụ, i kwesịrị ịna-achọpụta ma ị̀ na-ekpe ekpere kwa ụbọchị, na-agụ Okwu Chineke ma na-amụ ya, na-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Gbalịa ka ị chọpụta ihe ndị ga-enyere gị aka ka ime ihe ndị a ị na-eme n’ofufe Jehova na-atọkwu gị ụtọ ma na-abakwuru gị uru. Dị ka ihe atụ, jụọ onwe gị ajụjụ ndị dị ka: ‘M̀ nwere ike ịkọwara mmadụ eziokwu ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi? È nwere ụzọ ndị m nwere ike isi mee ka ozi m na-atọkwu m ụtọ? M̀ na-akpọ okwu aha n’ekpere m, na-egosikwa na m tụkwasịrị Jehova obi m niile? M̀ na-agachi ọmụmụ ihe anya? Olee otú m ga-esi na-etinyekwu uche m n’ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe ma na-azakwu ajụjụ na ya?’

15-16. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ otu nwanna kọrọ gbasara imeri ọnwụnwa?

15 Ọ dịkwa mkpa ka ị chọpụta ihe ndị ị na-anaghị emeta. Ihe otu nwanna aha ya bụ Robert kwuru mere ka ihe a doo anya. Ọ sịrị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri abụọ, e nwere ọrụ m na-arụ n’ụbọchị ụfọdụ n’izu. Otu ụbọchị a gbasara ọrụ, otu nwa agbọghọ mụ na ya na-arụkọ ọrụ kpọrọ m ka m bịa n’ụlọ ya. Ọ gwara m na ọ bụ naanị mụ na ya ga-anọ nakwa na anyị ga-ekpori ndụ. Ná mmalite, m gwara ya ihe ụfọdụ na-erijughị afọ mere na agaghị m abịa. Mana, m mechara sị ya na mụ agaghị abịa, kọwaakwara ya ihe mere na mụ agaghị abịa.” Nwanna Robert meriri ọnwụnwa ahụ. Ọ dịkwa mma na o mere otú ahụ. Ma, mgbe o mechara cheta ihe ahụ merenụ, ọ chọpụtara na e nwere ụzọ ka mma ọ gaara esi emeri ọnwụnwa ahụ. Ọ sịrị: “Ọnụ akaghị m ịjụ ọnwụnwa ahụ ozugbo otú ahụ Josef mere mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya. (Jen. 39:7-9) N’eziokwu, ọ na-eju m anya icheta na o siiri m ike ịgbara ọnwụnwa ahụ ọsọ. Ihe ahụ nyeere m aka ịghọta na m kwesịrị ime ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.”

16 Ọ ga-abara gị uru ma i nyochaa onwe gị otú ahụ Nwanna Robert mere. Ọ bụrụgodị na i meriri ọnwụnwa, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee oge o were m ịjụ ọnwụnwa ahụ?’ Ọ bụrụ na ị chọpụta na i kwesịrị imekwu nke ọma, adala mbà. Obi kwesịrị ịdị gị ụtọ na ị ma ebe ndị ị na-anaghị emeta. Kpee ekpere maka ya, meekwa ihe ndị i kwesịrị ime ka i kpebisikwuo ike ịna-edebe iwu Jehova.​—Ọma 139:23, 24.

17. Olee otú ihe Nwanna Robert mere si gbasa aha Jehova?

17 E nwere ihe ọzọ anyị na-amụta n’ihe Nwanna Robert kọrọ. Ọ sịrị: “Mgbe m gwachara nwa agbọghọ ahụ na mụ agaghị abịa, ọ sịrị m, ‘I meriela ọnwụnwa m nwara gị.’ M jụrụ ya ihe mere o ji kwuo ya, ya agwa m na otu nwoke ya na ya dị ná mma, bụ́bu Onyeàmà Jehova, gwara ya na Ndịàmà Jehova niile na-eto eto na-eme ihe ọjọọ na nzuzo ma ọ bụrụ na ha enweta ohere ya. N’ihi ya, ọ gwara enyi ya ahụ na ya ga-eji m chọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe m matara na ihe m mere mere ka e too aha Jehova.”

18. Gịnị ka i kpebisiri ike ime ma i mechaa baptizim? (Kwuokwa ihe e dere n’igbe isiokwu ya bụ “ Isiokwu Abụọ Ga-atọ Gị Ụtọ.”)

18 I nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, ị na-egosi na ị chọrọ ido aha ya nsọ n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Obi kwesịkwara isi gị ike na Jehova ma ọnwụnwa na nsogbu ọ bụla i meriri. Ọ ga-agọzi gị maka irubere ya isi. Obi siekwa gị ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nye gị ike ị ga-eji emeri ọnwụnwa. (Luk 11:11-13) N’enyemaka Jehova, ị ga-enwe ike ịna-eso Jizọs ma i mechaa baptizim.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee otú Ndị Kraịst si eburu ‘osisi ịta ahụhụ ha kwa ụbọchị’?

  • Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ‘ịna-eso’ Jizọs ma i mechaa baptizim?

  • Olee otú ichebara ekpere i kpere mgbe i nyefere Jehova onwe gị echiche ga-esi enyere gị aka ịna-erubere Jehova isi?

ABỤ NKE 89 Gee Ntị, Rube Isi, Ka A Gọzie Gị