Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 13

ABỤ NKE 127 Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

Otú Obi Ga-esi Sie Gị Ike na Ihe Gị Masịrị Jehova

Otú Obi Ga-esi Sie Gị Ike na Ihe Gị Masịrị Jehova

“Ihe gị masịrị m.”​—LUK 3:22.

IHE A GA-AMỤ

Anyị ga-amụ otú obi ga-esi esi anyị ike na ihe anyị masịrị Jehova.

1. Gịnị nwere ike ịna-eme ụfọdụ ndị ji obi ha niile na-efe Jehova obi abụọ?

 OBI na-esi anyị ike ma anyị mata na Jehova hụrụ ndị ya n’anya. Baịbụl sịrị: “Jehova hụrụ ndị ya n’anya.” (Ọma 149:4) Ma, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịda mbà, ha ana-eche, sị, ‘Ihe mụnwa ọ̀ masịrị Jehova?’ Ọtụtụ ndị fere Jehova n’oge ochie chere ụdị ihe ahụ mgbe ụfọdụ.​—1 Sam. 1:6-10; Job 29:2, 4; Ọma 51:11.

2. Olee ndị ihe ha masịrị Jehova?

2 Baịbụl mere ka o doo anya na ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-amasịli Jehova. Olee otú ọ bụ? Anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jizọs Kraịst ma mee baptizim. (Jọn 3:16) Anyị na-esi otú ahụ egosi ndị mmadụ na anyị echegharịala ná mmehie anyị ma kwe Chineke nkwa ime uche ya. (Ọrụ 2:38; 3:19) Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị mee ihe ndị a ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ bụrụhaala na anyị ana-eme ike anyị niile imezu nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị, ihe anyị na-adị Jehova mma, ọ na-ewerekwa anyị ka ezigbo ndị enyi ya.​—Ọma 25:14.

3. Olee ajụjụ atọ anyị ga-aza?

3 Ma, gịnị mere ụfọdụ ndị nwere ike iji na-eche mgbe ụfọdụ na ihe ha amasịghị Jehova? Olee otú Jehova si egosi na ihe anyị masịrị ya? Oleekwa otú obi ga-esi esikwu Onye Kraịst ike na ihe ya masịrị Jehova?

IHE MERE ỤFỌDỤ NDỊ NWERE IKE IJI NA-ECHE NA IHE HA AMASỊGHỊ JEHOVA

4-5. Ọ bụrụgodị na anyị echee na anyị abaghị uru, olee ihe obi kwesịrị isi anyị ike na ya?

4 Kemgbe anyị dị obere, e nweela oge ọtụtụ n’ime anyị chere na anyị abaghị uru. (Ọma 88:15) Otu nwanna aha ya bụ Adrián sịrị: “M na-eche mgbe niile na mụ abaghị uru. M na-echeta ekpere m na-ekpe mgbe m bụ nwata. M na-arịọ Jehova ka o mee ka ndị ezinụlọ anyị banye na Paradaịs, ọ bụ eziokwu na obi m gwara m na mụnwa erughị eru ịbanye na ya.” E nwere otu nwanna aha ya bụ Tony. Nne na nna ya abụghị Ndị Kraịst. Ọ sịrị: “E nweghị mgbe ndị mụrụ m gwara m na ha hụrụ m n’anya ma ọ bụ na ha ji m eme ọnụ. Ihe a mere ka m na-eche na e nweghị ihe m ga-eme meta ha.”

5 Ọ bụrụ na e nwere mgbe ụfọdụ anyị na-eche na anyị abaghị uru, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ Jehova n’onwe ya dọtara anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ọ hụrụ àgwà ọma anyị nwere, nke o nwere ike ịbụ na anyị anaghị ahụ. Ọ makwa obi anyị. (1 Sam. 16:7; 2 Ihe 6:30) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ya obi mgbe ọ sịrị na anyị bara ezigbo uru n’anya ya.​—1 Jọn 3:19, 20.

6. Olee otú mmehie ndị Pọl onyeozi mere n’oge gara aga dị ya?

6 Tupu anyị amụta eziokwu, ụfọdụ n’ime anyị mere ihe ndị nwere ike ime ka akọnuche anyị na-ama anyị ikpe ruo ugbu a. (1 Pita 4:3) E nwedịrị Ndị Kraịst ji obi ha niile na-efe Jehova na-agbasi mbọ ike ka ha ghara ime ihe na-adịghị mma. Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na Jehova agaghị agbagharali gị? Ọ bụrụ otú ahụ, icheta na e nweela ndị ji obi ha niile fee Jehova chere otú ahụ ga-akasi gị obi. Dị ka ihe atụ, obi anaghị adị Pọl onyeozi mma ma o cheta ihe ndị ọ na-anaghị emeta. (Rom 7:24) Ma, n’eziokwu, Pọl echegharịala ná mmehie ya ma mee baptizim. N’agbanyeghị ya, ọ kpọrọ onwe ya onye “kacha nta” n’ime ndịozi nakwa ‘onye kacha bụrụ onye mmehie.’​—1 Kọr. 15:9; 1 Tim. 1:15.

7. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche gbasara mmehie anyị mere n’oge gara aga?

7 Nna anyị nke eluigwe kwere nkwa ịgbaghara anyị ma ọ bụrụ na anyị echegharịa. (Ọma 86:5) N’ihi ya, ọ bụrụ na mmehie anyị mere wutere anyị n’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova agbagharala anyị otú ahụ o kwuru.​—Kọl. 2:13.

8-9. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-eche na anyị agaghị emeli ihe dị Jehova mma?

8 Anyị niile chọrọ ime ike anyị niile n’ofufe Jehova. Ma, ụfọdụ ndị chere na ihe ọ sọkwara ha mee, ihe ha agaghị amasịli Jehova. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Amanda sịrị: “M chere na ime ike m niile n’ozi Jehova pụtara ịna-emekwu ihe n’ozi ya mgbe niile. Ọtụtụ mgbe, m na-atụ anya ka m mee ihe m na-agaghị emeli. Ọ bụrụ na mụ emelighị ya, m na-eche na otú ahụ obi na-adịghị m mma na mụ emelighị ya ka obi na-adịghịkwa Jehova mma.”

9 Olee otú anyị ga-esi kwụsị iche na anyị agaghị emeli ihe ga-amasị Jehova? Cheta na Jehova na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ naghị achọ ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. Obi na-adị ya ụtọ maka ihe anyị meere ya, ọ bụrụhaala na ọ bụ ihe kacha mma anyị nwere ike ime. Chetakwa akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl banyere ndị ji obi ha niile fee Jehova. Chegodị gbasara Pọl. Ọ rụsiri ọrụ ike n’ozi Chineke ruo ọtụtụ afọ. Ọ gara ọtụtụ puku kilomita, hiwekwa ọtụtụ ọgbakọ. Ma, mgbe ihe gbanwere ná ndụ ya nke mere ka ọ ghara ịna-ekwusa ozi ọma otú ọ na-emebu, ihe ya ọ̀ kwụsịrị ịmasị Jehova? Mba. Ọ kwụsịghị ime ihe ọ ga-emeli. Jehova gọzikwara ya. (Ọrụ 28:30, 31) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ihe anyị ga-emeli n’ozi Jehova nwere ike ịgbanwe. Ma, ihe kacha mkpa bụ ihe mere anyị ji eme ya. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ụzọ Jehova si egosi na ihe anyị masịrị ya.

OLEE OTÚ JEHOVA SI EGOSI NA IHE ANYỊ MASỊRỊ YA?

10. Olee otú anyị nwere ike isi nụ ka Jehova na-agwa anyị na ihe anyị masịrị ya? (Jọn 16:27)

10 Okwu ya bụ́ Baịbụl. Ọ na-amasị Jehova ịgwa ndị ọ hụrụ n’anya na ihe ha masịrị ya. Baịbụl kwuru ugboro abụọ ọ gwara Jizọs na ọ bụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị ya. (Mat. 3:17; 17:5) Ị̀ ga-achọ ka Jehova gwa gị na ihe gị masịrị ya? Jehova anaghị esi n’eluigwe agwa anyị okwu. Ma, ọ na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl agwa anyị okwu. Ọ bụrụ na anyị agụọ okwu Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, ọ ga-adị ka ànyị na-anụ ka Jehova na-agwa anyị okwu ndị ahụ. (Gụọ Jọn 16:27.) Jizọs mere nnọọ ka Nna ya. N’ihi ya, anyị gụọ otú Jizọs si gwa ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ezughị okè na ihe ha masịrị ya, anyị ga-ewere ya na ọ bụ anyị ka Jehova na-agwa okwu ndị ahụ.​—Jọn 15:9, 15.

Jehova na-esi n’ọtụtụ ụzọ egosi anyị na ihe anyị masịrị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)


11. Ọ bụrụ na anyị atawa ahụhụ, gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na ihe anyị adịghịzi Jehova mma? (Jems 1:12)

11 Ihe ndị ọ na-eme. Jehova chọsiri ike inyere anyị aka, dị ka igboro anyị mkpa anyị. Mgbe ụfọdụ, Jehova nwere ike ikwe ka ihe siere anyị ike otú ahụ o kwere ka ihe siere Job ike. (Job 1:8-11) Anyị tawa ahụhụ, ọ pụtaghị na ihe anyị amasịghịzi Jehova. Kama, ọ bụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya nakwa na anyị tụkwasịrị ya obi. (Gụọ Jems 1:12.) Anyị tawa ahụhụ, anyị ga-ahụ otú Jehova si hụ anyị n’anya nakwa otú o si enyere anyị aka idi ya.

12. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’akụkọ Nwanna Dmitrii?

12 Legodị ihe mere otu nwanna bi n’Eshia aha ya bụ Dmitrii. E nwere mgbe ọ na-enweghịzi ọrụ. O nweghịkwa ike ịchọta ọrụ ọzọ ruo ọtụtụ ọnwa. N’ihi ya, o kpebiri iwepụtakwu oge na-ekwusa ozi ọma, si otú ahụ gosi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ma ọtụtụ ọnwa gafere, o nwetabeghịkwa ọrụ. Ọ rịawakwara ọrịa nke na ọ naghịzi apụta èzí. Ọ malitere iche ma ya bụkwa ezigbo di na ezigbo nna, na-echekwa ma ihe ya ọ̀ ka dịkwa Jehova mma. Mana, otu mgbede, nwa ya nwaanyị dere ihe e kwuru n’Aịzaya 30:15 n’akwụkwọ. Ebe ahụ sịrị: “Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.” O wetaara papa ya akwụkwọ ahụ ebe o dina, sị ya, “Papa, obi jọwa gị njọ, cheta ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl a.” Nwanna Dmitrii chọpụtara na ọ bụ Jehova na-eme ka ndị ezinụlọ ya nwee nri ha na-eri, uwe ha na-eyi, nakwa ebe ha bi. Ọ sịrị: “Ihe m kwesịrị ime bụ ịnọrọ jii ma tụkwasị Chineke m obi.” Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa a abịara gị, ka obi sie gị ike na ihe gbasara gị na-emetụ Jehova n’obi nakwa na ọ ga-enyere gị aka idi ya.

Jehova na-esi n’ọtụtụ ụzọ egosi anyị na ihe anyị masịrị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12) a


13. Ole ndị ka Jehova nwere ike iji agwa anyị na ihe anyị masịrị ya? Oleekwa otú o nwere ike isi eme ya?

13 Ụmụnna anyị. Jehova na-eji ụmụnna anyị egosi anyị na ihe anyị masịrị ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka ụmụnna anyị gbaa anyị ume n’oge ọ dị anyị mkpa. Ihe a mere otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia n’oge ihe siiri ya ike. O nweghịzi ọrụ, ya adaakwa ọrịa. Di ya mekwara mmehie dị oké njọ, a kwụsị ya ịbụ okenye. Ọ sịrị: “Amaghị m ihe mere ihe ndị a ji na-eme m. M chere na ọ ga-abụ na mụ emeela ihe ọjọọ, nakwa na ihe m adịghịzi Jehova mma.” Nwanna nwaanyị a rịọrọ Jehova ka o mee ka obi sie ya ike na ihe ya masịrị ya. Olee otú Jehova si mee ya? Ọ sịrị: “Ndị okenye gwara m okwu ma mee ka obi sie m ike na Jehova hụrụ m n’anya.” Ọ gwakwara Jehova ọzọ ka o nyere ya aka. Ọ sịrị: “N’otu ụbọchị ahụ, enwetara m otu akwụkwọ ozi ụmụnna nọ n’ọgbakọ anyị detaara m. Ka m na-agụ okwu ndị na-agba ume ha dere, m bịara ghọta na Jehova azala ekpere m.” N’eziokwu, Jehova na-esikarị n’okwu ọma ndị ọzọ na-agwa anyị egosi anyị na ihe anyị masịrị ya.​—Ọma 10:17.

Jehova na-esi n’ọtụtụ ụzọ egosi anyị na ihe anyị masịrị ya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) b


14. Olee ụzọ ọzọ Jehova nwere ike isi agwa anyị na ihe anyị masịrị ya?

14 Jehova na-ejikwa ụmụnna anyị enye anyị ndụmọdụ mgbe ọ dị anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, n’oge ndịozi, Jehova ji Pọl onyeozi degara ụmụnna ya akwụkwọ ozi iri na anọ. N’akwụkwọ ozi ndị ahụ, Pọl nyere ụmụnna ya ndụmọdụ gosiri na ọ hụrụ ha n’anya, mana, o zoghị ọnụ. Gịnị mere Jehova ji mee ka Pọl dee ụdị ndụmọdụ ahụ n’akwụkwọ ozi ndị ahụ? Jehova bụ ezigbo Nna. Ọ na-adọkwa ụmụ ya “ọ hụrụ n’anya” aka ná ntị. (Ilu 3:11, 12) N’ihi ya, ọ bụrụ na e si na Baịbụl nye anyị ndụmọdụ, anyị kwesịrị iwere ya ka ihe na-egosi na ihe anyị masịrị Jehova, ọ bụghị ihe na-egosi na ihe anyị adịghịzi ya mma. (Hib. 12:6) Olee ihe ndị ọzọ na-egosi na ihe anyị masịrị Jehova?

IHE NDỊ ỌZỌ NA-EGOSI NA IHE ANYỊ MASỊRỊ JEHOVA

15. Olee ndị Jehova na-enye mmụọ nsọ ya? Gịnịkwa mere ihe a ji eme ka obi sie anyị ike?

15 Ndị Jehova na-enye mmụọ nsọ ya bụ ndị ihe ha masịrị ya. (Mat. 12:18) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘È nweela àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ m na-akpa ná ndụ m?’ Ị̀ chọpụtala na ị na-enwere ndị ọzọ ndidi karịa ka ị na-enwe tupu gị amata Jehova? N’eziokwu, ọ bụrụ na ị na-amụtakwu àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọ ga-edokwu gị anya na ihe gị masịrị Jehova.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ Bụ . . .

Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta na ihe anyị masịrị Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)


16. Olee ndị Jehova nyere ọrụ ikwusa ozi ọma? Oleekwa otú o mere ka obi dị gị? (1 Ndị Tesalonaịka 2:4)

16 Obi na-adị Jehova mma inye ndị ihe ha masịrị ya ọrụ ikwusa ozi ọma. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:4.) Ka anyị chọpụta otú izi ndị mmadụ ozi ọma si baara otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jocelyn uru. Otu ụbọchị, o tetara ụra, ezigbo ike agwụ ya. Ọ sịrị: “Ike adịghị m. M chekwara na o nweghị ihe m ga-emeli. Ma, abụ m ọsụ ụzọ. Ụbọchị ahụ bụkwa ụbọchị m ji aga ozi ọma. N’ihi ya, m kpere ekpere ma gawa ozi ọma.” N’ụtụtụ ahụ, ọ hụrụ otu nwaanyị nwere obiọma aha ya bụ Mary. O kwetakwara ka a mụwara ya Baịbụl. Mgbe ụfọdụ ọnwa gafere, Mary kwuru na ya nọ na-ekpe ekpere ka Jehova nyere ya aka mgbe Nwanna Nwaanyị Jocelyn kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ya. Mgbe Nwanna Nwaanyị Jocelyn chetara ihe merenụ, ọ sịrị: “O yiri ka Jehova ọ̀ na-asị m, ‘Ihe gị masịrị m.’” Ọ bụghị mmadụ niile ga-ege anyị ntị n’ozi ọma. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na obi na-adị Jehova ụtọ ma anyị mee ike anyị niile izi ndị mmadụ ozi ọma.

Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta na ihe anyị masịrị Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16) c


17. Gịnị ka ị mụtara n’ihe Nwanna Nwaanyị Vicky kwuru gbasara ihe mgbapụta ahụ? (Abụ Ọma 5:12)

17 Jehova na-eme ka ihe mgbapụta ahụ baara ndị ihe ha masịrị ya uru. (1 Tim. 2:5, 6) Ma, ọ bụrụkwanụ na obi anyị ana-agwa anyị na ihe anyị amasịghị Jehova, n’agbanyeghị na anyị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ, meekwa baptizim? Cheta na anyị ekwesịghị ịna-ekwere ihe niile obi anyị na-agwa anyị. Mana, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Ọ na-ewere ndị nwere okwukwe n’ihe mgbapụta ahụ ka ndị ezi omume, kwekwa nkwa ịgọzi ha. (Gụọ Abụ Ọma 5:12; Rom 3:26) Ịtụgharị uche n’ihe mgbapụta ahụ nyeere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Vicky aka. Otu ụbọchị, mgbe o chebachaara ihe mgbapụta ahụ echiche, ọ sịrị: “Jehova na-enwere m ndidi kemgbe. . . . Ma, o yiri ka m̀ na-asị ya: ‘Ịhụnanya gị agaghị eruteli m. Àjà Ọkpara gị chụrụ ezughị ezu ikpuchi mmehie m.’” Mgbe nwanna nwaanyị a chebaara ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị echiche, ọ malitere ịchọpụta na Jehova hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụkwa na anyịnwa echebara ihe mgbapụta ahụ echiche, anyị ga-achọpụta na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ihe anyị masịrị ya.

Olee otú anyị nwere ike isi chọpụta na ihe anyị masịrị Jehova? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)


18. Gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ịhụ Nna anyị nke eluigwe n’anya?

18 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịgbalịsi ike ime ihe ndị e kwuru n’isiokwu a, obi nwere ike ịda anyị mbà mgbe ụfọdụ, anyị ana-echekwa ma ihe anyị ọ̀ ka masịrị Jehova. Ụdị ihe a mee anyị, ka anyị cheta na ndị ihe ha masịrị Jehova bụ “ndị hụrụ ya n’anya.” (Jems 1:12) N’ihi ya, na-abịarukwu Jehova nso ma na-achọpụta otú o si egosi na ihe gị masịrị ya. Na-echeta mgbe niile na Jehova “nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.”​—Ọrụ 17:27.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Gịnị mere ụfọdụ ndị nwere ike iji na-eche na ihe ha amasịghị Jehova?

  • Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si egosi na ihe anyị masịrị ya?

  • Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe anyị masịrị Jehova?

ABỤ NKE 88 Mee Ka M Mara Ụzọ Gị

a NKỌWA FOTO: Otú ihe a kọrọ akụkọ ya si mee

b NKỌWA FOTO: Otú ihe a kọrọ akụkọ ya si mee

c NKỌWA FOTO: Otú ihe a kọrọ akụkọ ya si mee