ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 12
ABỤ NKE 77 Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị
Zere Ọchịchịrị, Nọrọ n’Ìhè
“Unu nọbu n’ọchịchịrị, ma unu nọzi n’ìhè.”—EFE. 5:8.
IHE A GA-AMỤ
Ihe anyị ga-amụta n’ọchịchịrị na ìhè Pọl kwuru okwu ha ná Ndị Efesọs isi 5.
1-2. (a) Olee mgbe Pọl degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ ozi? Gịnị mekwara o ji dee ya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?
MGBE a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom, ọ gụrụ ya agụụ ịgba ụmụnna ya ume. Ma, o nweghị ike ịga leta ha. N’ihi ya, o degaara ha akwụkwọ ozi. O degaara ụmụnna nọ n’Efesọs otu n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ n’ihe dị ka n’afọ 60 ma ọ bụ 61 Oge Ndị Kraịst.—Efe. 1:1; 4:1.
2 Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri tupu mgbe ahụ, Pọl nọrọ ogologo oge n’Efesọs na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha ihe. (Ọrụ 19:1, 8-10; 20:20, 21) Ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya nke ukwuu, chọọkwa inyere ha aka ka ha ghara ịkwụsị ife Jehova. Ma, gịnị mere o ji degara Ndị Kraịst e tere mmanụ akwụkwọ ozi gbasara ọchịchịrị na ìhè? Olee ihe Ndị Kraịst niile nwere ike ịmụta na ndụmọdụ a? Ka anyị tụlee azịza ajụjụ ndị a.
ISI N’ỌCHỊCHỊRỊ BANYE N’ÌHÈ
3. Olee ihe ndị Pọl ji mee ihe atụ n’akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Efesọs?
3 Pọl degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs akwụkwọ ozi, sị: “Unu nọbu n’ọchịchịrị, ma unu nọzi n’ìhè.” (Efe. 5:8) N’ebe a, Pọl ji ọchịchịrị na ìhè mee ihe atụ iji kọwaa ụdị mgbanwe ndị Efesọs mere. Ka anyị tụlee ihe mere Pọl ji kwuo na ndị Efesọs “nọbu n’ọchịchịrị.”
4. Olee otú o si bụrụ na ndị Efesọs nọ n’ọchịchịrị n’ihe gbasara okpukpe?
4 Okpukpe ụgha. Tupu ndị Efesọs Pọl degaara akwụkwọ ozi amụta eziokwu ma ghọọ Ndị Kraịst, ha nọbu na-ekpe okpukpe ụgha ma kwerekwa n’omenala ndị gbasara mgbaasị. Ọ bụ n’Efesọs ka a rụrụ ụlọ chi nwaanyị a ma ama aha ya bụ Atemis, nke ndị oge ahụ weere ka otu n’ime ihe asaa dị ịtụnanya e nwere n’ụwa. Ọ bụ arụsị ka ndị mmadụ na-efe n’ụlọ ahụ. Ịkpụ chi nwaanyị ahụ na ụlọ arụsị ya na ire ha na-enye ezigbo ego n’oge ahụ. (Ọrụ 19:23-27) Ihe ọzọ e ji mara obodo a bụ ime anwansi.—Ọrụ 19:19.
5. Olee otú o si bụrụ na ndị Efesọs nọ n’ọchịchịrị n’ihe gbasara omume rụrụ arụ?
5 Omume rụrụ arụ. E ji ịkwa iko ndị jọgburu onwe ha na ime ihe ọjọọ n’asọghị anya mara ndị bi n’Efesọs oge ochie. Ihe ha na-eme ma n’ebe a na-eme ihe nkiri ma n’ememme okpukpe ha na-abụkarị gbasara omume rụrụ arụ. (Efe. 5:3) Mmehie ọtụtụ n’ime ndị bi ebe ahụ “anaghịzi ewute” ha. (Efe. 4:17-19) Tupu ndị Efesọs amata ihe Jehova kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ, akọnuche ha anaghị ama ha ikpe ma ha mee ihe na-adịghị mma. Ha anaghịkwanụ achọ ịma otú Jehova si ewere ihe ha na-eme. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo na “uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị.”
6. Gịnị mere Pọl ji gwa ndị Efesọs na ha “nọzi n’ìhè”?
6 Ma, ụfọdụ ndị Efesọs ahụ mechara pụta n’ọchịchịrị. Pọl kwuru na ha ‘nọzi n’ìhè maka na ha na Onyenwe anyị dị n’otu.’ (Efe. 5:8) Ha amalitela ibi ndụ otú dabara n’ihe Okwu Chineke kwuru, nke dị ka ìhè nke na-eduzi ha. (Ọma 119:105) Ndị Efesọs ndị a akwụsịla ikpe okpukpe ụgha na ime omume rụrụ arụ. Ha ‘emewela ka Chineke.’ Ha na-emekwa ike ha niile ife Jehova na ime ihe ọ chọrọ.—Efe. 5:1.
7. Olee otú anyị na ọtụtụ Ndị Kraịst nọ n’Efesọs si yie?
7 Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Tupu anyị amụta eziokwu, anyị nọbu n’ọchịchịrị. Ụfọdụ n’ime anyị mere ememme okpukpe ụgha, e nweekwa ndị nke mere omume rụrụ arụ. Ma, ozugbo anyị matara ihe Jehova chọrọ, anyị gbanwere, biwe ndụ dabara n’ihe ọ chọrọ. Ime otú ahụ abaarala anyị nnukwu uru. (Aịza. 48:17) Ma, ọ naghị adịrị anyị mfe mgbe niile ịhapụcha ọchịchịrị ahụ ma ‘na-akpa àgwà ka ụmụ nke ìhè.’ Gịnị ga-enyere anyị aka?
ZERE ỌCHỊCHỊRỊ
8. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 5:3-5, olee ihe ndị Efesọs kwesịrị izere?
8 Gụọ Ndị Efesọs 5:3-5. Ka Ndị Kraịst nọ n’Efesọs nwee ike izere omume rụrụ arụ, ha kwesịrị ịgbasi mbọ ike na-ajụ omume ndị na-anaghị amasị Jehova. Ọ bụghị naanị izere omume rụrụ arụ, ha kwesịkwara ịna-ezere okwu ndị rụrụ arụ. Pọl chetaara ndị Efesọs na ha kwesịrị izere ụdị ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ‘iketa Alaeze Kraịst na nke Chineke.’
9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee omume rụrụ arụ?
9 Anyịnwa kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ime “ihe ndị na-enweghị isi . . . , nke e ji mara ndị nọ n’ọchịchịrị.” (Efe. 5:11) Ihe ndị mere eme egosila ọtụtụ ugboro na ọ bụrụ na mmadụ ana-ele, na-ege, ma ọ bụ na-ekwu ihe ndị rụrụ arụ, ọ ga-eme ka ọ dịrị onye ahụ mfe ime omume rụrụ arụ. (Jen. 3:6; Jems 1:14, 15) N’otu obodo, ọtụtụ ụmụnna malitere ịna-akparịta ụka n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet. Ná mmalite, ọtụtụ n’ime ha nọ na-ekwu gbasara Jehova na eziokwu ndị a na-akụziri anyị. Ma, ka oge na-aga, ha kwuweziri ihe ndị na-adịghị Jehova mma. Ha bidoro ịna-ekwu gbasara mmekọahụ. Ọtụtụ n’ime ha mechara kwuo na okwu ndị a rụrụ arụ ha na-ekwu mere ka ha kwaa iko.
10. Olee otú Setan si agbalị iduhie anyị? (Ndị Efesọs 5:6)
10 Ụwa Setan na-agbalị iduhie anyị. Ọ na-achọ ime ka anyị kweta na o nweghị ihe dị njọ n’ihe Jehova sịrị na ọ rụrụ arụ ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha. (2 Pita 2:19) Ihe a anaghị eju anyị anya. Ihe Setan na-eme kemgbe ụwa bụ imegharị ndị mmadụ anya ka ha ghara ịma ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. (Aịza. 5:20; 2 Kọr. 4:4) Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ fim, ihe omume tiivi, nakwa Ịntanet na-akwado ihe ndị Jehova kwuru na ha adịghị mma. Setan na-agbalị ịghọgbu anyị ka anyị chewe na ihe ndị Jehova sịrị na ha rụrụ arụ dị mma, na ha nwere ike ime anyị obi ụtọ, nakwa na o nweghị ihe ha ga-eme anyị.—Gụọ Ndị Efesọs 5:6.
11. Olee otú akụkọ Nwanna Nwaanyị Angela si egosi na anyị kwesịrị ime ihe e dere ná Ndị Efesọs 5:7? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
11 Setan chọrọ ka anyị na ndị ga-eme ka o siere anyị ike idebe iwu Jehova na-akpa. Ọ bụ ya mere Pọl ji gwa ndị Efesọs, sị: “Ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ unu na ha,” ya bụ, ndị na-eme ihe dị njọ n’anya Chineke. (Efe. 5:7) Anyị kwesịrị icheta na ndị anyị na ha na-akpa abụghị naanị ndị anyị na ha na-anọ ihu na ihu. Ndị anyị na ha na-ekwurịta okwu n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet sokwa na ha. Ụdị ihe ahụ adịghị n’oge ndị Efesọs oge ochie. E nwere otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Angela a bi n’Eshia. Ọ chọpụtara na ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet nwere ike itinye mmadụ ná nsogbu. Ọ sịrị: “O ji nwayọọ nwayọọ gbanwee otú m si eche echiche. O nwere mgbe o ruru, e nweghịzi ihe m ji imeta ndị na-anaghị erubere Jehova isi enyi kpọrọ. M mechakwara chewe na o nweghị ihe o mere ma m na-eme ihe Jehova kpọrọ asị.” Obi dị anyị ụtọ na ndị okenye nyeere Nwanna Nwaanyị Angela aka ịgbanwe. Ọ sịrị: “Ihe m lekwasịrị anya ugbu a bụ Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme, ọ bụghị ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet.”
12. Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe ndị Jehova kwuru na ha dị mma ma zere ihe ndị ọ kpọrọ asị?
12 Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike zere ihe ndị ụwa na-eche, nke bụ́ na o nweghị ihe omume rụrụ arụ mere. Anyị ma na ọ dị njọ. (Efe. 4:19, 20) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-akpachara anya ka mụ na ndị ọrụ ibe m, ụmụ akwụkwọ ibe m, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-anaghị erubere iwu Jehova isi ghara ịna-akpa? M̀ na-akata obi na-eme ihe Jehova chọrọ ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị na-akatọ m maka ya?’ Dị ka e kwuru na 2 Timoti 2:20-22, o nwekwara ike ịdị mkpa ka anyị kpachara anya mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị na ha ga na-akpachi anya n’ọgbakọ. Anyị kwesịrị iburu n’uche na ọ bụghị ha niile ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova.
“NA-AKPANỤ ÀGWÀ KA ỤMỤ NKE ÌHÈ”
13. Gịnị ka ‘ịna-akpa àgwà ka ụmụ nke ìhè’ pụtara? (Ndị Efesọs 5:7-9)
13 Pọl gbara Ndị Kraịst bi n’Efesọs ume ka ha na-ajụ ọchịchịrị nakwa ka ha ‘na-akpa àgwà ka ụmụ nke ìhè.’ (Gụọ Ndị Efesọs 5:7-9.) Gịnị ka ọ pụtara? Ọ pụtara ịna-akpa àgwà ka ezigbo Ndị Kraịst mgbe niile. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agụchi Baịbụl anya nakwa ịna-eji akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl na-amụ ya. Jizọs bụ “ìhè nke ụwa.” Ọ dịkwa ezigbo mkpa ka anyị chebara ihe ndị o mere na ihe ndị ọ kụziri echiche.—Jọn 8:12; Ilu 6:23.
14. Olee otú mmụọ nsọ nwere ike isi nyere anyị aka?
14 Ọ dịkwa mkpa ka mmụọ nsọ Chineke nyere anyị aka ka anyị nwee ike ịna-akpa àgwà ka “ụmụ nke ìhè.” Maka gịnị? Ọ bụ maka na ịdị ọcha n’ụwa a rụrụ arụ adịghị mfe. (1 Tesa. 4:3-5, 7, 8) Mmụọ nsọ nwere ike inyere anyị aka ịghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa na-anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ya. Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ‘ịna-eme ezi omume, na-akpakwa àgwà dị mma.’—Efe. 5:9.
15. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi enweta mmụọ nsọ? (Ndị Efesọs 5:19, 20)
15 Otu ụzọ anyị ga-esi enweta mmụọ nsọ bụ ikpe ekpere maka ya. Jizọs kwuru na Jehova ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ha na-arịọ ya.’ (Luk 11:13) Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị ana-eto Jehova n’ọmụmụ ihe, anyị na-enwetakwa mmụọ nsọ. (Gụọ Ndị Efesọs 5:19, 20.) Ike mmụọ nsọ Chineke ga-akpa ná ndụ anyị ga-enyere anyị aka ịna-ebi ndụ otú na-amasị Chineke.
16. Gịnị ga-enyere anyị aka ime ezigbo mkpebi? (Ndị Efesọs 5:10, 17)
16 E nwee ihe ndị dị mkpa anyị ga-ekpebi, anyị kwesịrị ịchọpụta “ihe Jehova chọrọ” ma mee ya. (Gụọ Ndị Efesọs 5:10, 17.) Anyị chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe anyị chọrọ ime, ọ pụtara na anyị na-agbalị ịmata ihe bụ́ echiche Jehova gbasara ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka anyị mee ezigbo mkpebi.
17. Olee otú anyị nwere ike isi jiri oge anyị na-eme ihe ndị kacha mkpa? (Ndị Efesọs 5:15, 16) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)
17 Pọl dụkwara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ọdụ ka ha na-eji oge ha eme ihe ndị kacha mkpa. (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Setan bụ “ajọ onye ahụ,” bụrụkwa onye iro anyị. Ọ chọrọ ka anyị jiri oge anyị na-achụ ihe nke ụwa nke ga-eme ka anyị ghara inwe ohere ijere Jehova ozi. (1 Jọn 5:19) Ọ ga-adịrị Onye Kraịst mfe iwere ịchụ akụnụba, ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ime ka ihe dị mkpa karịa ofufe Jehova. O mee otú ahụ, ọ pụtara na ọ na-eche echiche ka ndị ụwa. N’eziokwu, ihe ndị ahụ adịghị njọ. Ma, ha ekwesịghị ịbụ ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-akpa àgwà “ka ụmụ nke ìhè,” anyị kwesịrị ‘ịna-eji oge anyị eme ihe kacha mkpa,’ ya bụ, ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’eziokwu.
18. Olee ihe ndị Nwanna Donald mere ka o nwee ike iji oge ya na-eme ihe ndị kacha mkpa?
18 Chọpụta ohere ndị i nwere ike iji jekwuoro Jehova ozi. Ọ bụ ihe Nwanna Donald bi na Saụt Afrịka mere. Ọ sịrị: “M lebara anya n’otú ihe si dịrị m ma rịọ Jehova ka o nyere m aka ịna-emekwu nke ọma n’ozi ọma. M kpere ekpere ka m nweta ọrụ ga-enyekwu m ohere ịna-ekwusa ozi ọma. Jehova nyeere m aka mụ achọta ụdị ọrụ ahụ. Mụ na nwunye m malitere ozi oge niile.”
19. Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-akpa àgwà ka ụmụ nke ìhè’?
19 Ọ ga-abụrịrị na akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs nyeere ha aka ịna-akpa àgwà ka Ndị Kraịst. Ndụmọdụ ahụ si n’ike mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka taa. Dị ka anyị kwuburu, o nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị na-ahọrọ ihe ndị anyị ga-eji eme onwe anyị obi ụtọ na ndị anyị na ha ga na-akpa. O nwekwara ike ime ka anyị na-amụ Baịbụl mgbe niile ka ìhè nke eziokwu na-eduzi anyị n’ihe niile anyị na-eme. O kwukwara na mmụọ nsọ Chineke dị mkpa n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-akpa àgwà ndị dị mma. Ime ihe Pọl kwuru ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ndị dị mma, ya bụ, ihe ndị dabara n’otú Jehova si eche echiche. Anyị mee ihe ndị a, anyị ga-ezere ọchịchịrị nke ụwa a ma nọsie ike n’ìhè.
GỊNỊ KA Ị GA-AZA?
-
Gịnị ka “ọchịchịrị” na “ìhè” e kwuru okwu ha ná Ndị Efesọs 5:8 pụtara?
-
Olee otú anyị nwere ike isi zere “ọchịchịrị”?
-
Olee otú anyị ga-esi ‘na-akpa àgwà ka ụmụ nke ìhè’?
ABỤ NKE 95 Ìhè Na-enwusikwu Ike
a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
b NKỌWA FOTO: Foto dị ebe a bụ akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs.