Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Ịda Ogbi Emeghị Ka M Ghara Ịkụziri Ndị Ọzọ Ihe

Ịda Ogbi Emeghị Ka M Ghara Ịkụziri Ndị Ọzọ Ihe

E mere m baptizim n’afọ 1941 mgbe m dị afọ iri na abụọ. Ma ọ bụ n’afọ 1946 ka m ghọtara eziokwu Baịbụl nke ọma. Olee otú o si mee? Ka m kọọrọ gị otú mụ na ije si gaa.

N’IHE dị ka n’afọ 1910, papa m na mama m si Tibilisi dị na Jọjia kwaga Kanada. Ha bi n’obere ụlọ dị n’ugbo, n’ebe dị nso n’obodo Peli dị na Saskachewan, n’ebe ọdịda anyanwụ Kanada. A mụrụ m n’afọ 1928. M bụ nwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ isii papa m na mama m mụrụ. Papa m nwụrụ ọnwa isii tupu a mụọ m, mama m anwụọ mgbe m ka dị ezigbo obere. Ọ dịghị anya, ada nne m, bụ́ Lucy, anwụọkwa mgbe ọ dị afọ iri na asaa. E mechaa, nwanne mama m bụ́ Nick akpọrọ mụ na ụmụnne m lekọtawa.

Otu ụbọchị, mgbe m ka na-amụ ịga ije, ndị mụ na ha bi hụrụ m ka m na-adọ otu oké ịnyịnya aka n’ọdụ. Ụjọ bịara ha na ịnyịnya ahụ nwere ike ịgba m ụkwụ, ha etiwere m mkpu ka m hapụ ịnyịnya ahụ aka n’ọdụ. Ma ahapụghị m ya. M gbanyeere ha azụ. Anụghị m mkpu ha nọ na-eti. Ekele dịrị Chineke na o nweghị ihe mere m. Ma, ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka ha matara na ntị chiri m.

Otu nwoke anyị na ya dị ná mma kwuru na ọ ga-aka mma ka m banye n’ụlọ akwụkwọ ndị ogbi, bụ́ ebe m ga-eso ụmụaka ndị ọzọ dara ogbi na-amụ ihe. N’ihi ya, deede m Nick tinyere m n’ụlọ akwụkwọ ndị ogbi dị na Saskatun nke dị na Saskachewan. A kpọgara m ebe dị ezigbo anya n’ụlọ anyị. Ụjọ tụrụ m n’ihi na m dị naanị afọ ise. Ọ bụ naanị mgbe e nwere ezumike n’oge ọkọchị ka m na-ala ụlọ. M mechara mụta asụsụ ndị ogbi, iso ụmụaka ndị ọzọ egwu egwu ana-atọkwa m ụtọ.

OTÚ M SI MỤTA EZIOKWU BAỊBỤL

N’afọ 1939, nwanne m nwaanyị nke anyị ji mere ada, bụ́ Marion, lụrụ onye a na-akpọ Bill Danylchuck, ha akpọrọzie mụ na nwanne m nwaanyị bụ́ Frances lekọtawa. Ọ bụ hanwa ka Ndịàmà Jehova bu ụzọ mụwara ihe n’ezinụlọ anyị. Mgbe m lọtara ezumike n’oge ọkọchị, ha kụziiri m ihe ndị ha na-amụta na Baịbụl otú ha nwere ike. Ịgwa gị eziokwu, mụ na ha ikwurịta okwu adịrịghị m mfe ebe ọ bụ na ha amaghị asụsụ ndị ogbi. Ma, ha chọpụtara na ọ na-agụsi m agụụ ike ịmụta eziokwu Baịbụl. M hụrụ na ihe ha na-eme bụ ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, m so ha na-aga ozi ọma. Ọ dịghị anya, mụ achọwa ime baptizim. N’abalị ise n’ọnwa itoolu n’afọ 1941, Bill mere m baptizim n’ime drọn a gbajuru mmiri si n’olulu mmiri. Mmiri ahụ jụrụ ezigbo oyi.

Mgbe mụ na ndị ogbi ndị ọzọ nọ ná mgbakọ e mere na Klivland dị n’Ohayo n’afọ 1946

Mgbe m lọtara n’ụlọ anyị n’oge ọkọchị n’afọ 1946, anyị gara mgbakọ na Klivland dị n’Ohayo nke dị n’Amerịka. N’ụbọchị mbụ ná mgbakọ ahụ, ụmụnne m ndị nwaanyị nọ na-edere m ihe ndị a na-ekwu, onye detụ, ibe ya edetụ ka m nwee ike ịghọta ihe ndị a na-ekwu. N’ụbọchị nke abụọ, obi tọrọ m ụtọ mgbe m chọpụtara na e nwere ndị ogbi otu nwanna na-asụgharịrị ihe a na-ekwu ná mgbakọ ahụ. Ihe a na-eme ná mgbakọ tọwaziri m ụtọ, obi abụrụ m sọ aṅụrị na mụ emechaala ghọtawa eziokwu Baịbụl nke ọma.

ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ EZIOKWU BAỊBỤL

A ka lụchara Agha Ụwa nke Abụọ n’oge ahụ, ndị mmadụ nọkwa na-efe obodo ha ka chi. Mgbe m lọtara mgbakọ ahụ, m laghachiri n’ụlọ akwụkwọ ma kpebisie ike na m ga na-erubere Jehova isi. N’ihi ya, m kwụsịrị iso na-egbupụrụ ọkọlọtọ, na ịbụ abụ e ji eto mba. M kwụsịkwara iso na-eme ememme ụfọdụ, nakwa iso ụmụaka ndị ọzọ na-aga chọọchị ndị nkụzi na-amanye onye ọ bụla ịga. Obi adịghị ndị nkụzi anyị mma. Ha nọ na-emenye m ụjọ, na-aghakwara m ụgha ka m gbanwee obi m. Ihe a niile mere ka ụmụ akwụkwọ ibe m chọọ ịmata ihe na-emenụ. N’ihi ya, m ji ohere ahụ na-ezi ha ozi ọma. Larry Androsoff, Norman Dittrick, na Emil Schneider so n’ụmụ akwụkwọ ibe m mechara ghọọ Ndịàmà Jehova. Ha ka na-efekwa Jehova ruo taa.

M gaa mba ọzọ, m na-agbalịsi ike izi ndị ogbi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, m ziri Eddie Taeger, bụ́ nwa okorobịa nọ n’òtù ọjọọ, ozi ọma n’ebe ndị ogbi na-ezukọ na Mọntriọl. Ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ gara aga, ọ nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na Laval dị na Kwebek. M zikwara nwa okorobịa ọzọ aha ya bụ Juan Ardanez ozi ọma. Ọ na-eme nchọnchọ iji mata ma ihe e ji Baịbụl na-akụziri ya ọ̀ bụ eziokwu otú ahụ ndị Beria mere. (Ọrụ 17:10, 11) Yanwakwa mechara fewe Jehova, bụrụ okenye n’Ọtawa dị n’Ọnterio ruo mgbe ọ nwụrụ.

Mgbe m na-agba àmà okporo ámá n’ihe dị ka n’afọ 1952

N’afọ 1950, m kwafere Vankuva. N’agbanyeghị na izi ndị ogbi ozi ọma na-atọ m ụtọ, agaghị m echefu ihe mere mgbe m ziri otu nwaanyị na-abụghị onye ogbi ozi ọma n’okporo ụzọ. Aha ya bụ Chris Spicer. Ọ tụrụ ọda magazin anyị, chọọkwa ka m bịa hụ di ya bụ́ Gary. N’ihi ya, m gara n’ụlọ ha, mụ na ha ekwurịta okwu ruo ogologo oge. Ọ na-abụ m dee ihe m chọrọ ikwu, ha edee nke ha. Mụ na ha ahụghị anya ọzọ ruo mgbe afọ ole na ole gachara. O juru m anya na ha bịara kelee m ná mgbakọ e mere na Toronto dị n’Ọnterio. Gary ga-eme baptizim n’ụbọchị ahụ. Ihe a merenụ chetaara m na ọ dị mkpa ka anyị na-ekwusa ozi ọma n’ihi na anyị amaghị ebe ma ọ bụ mgbe eziokwu ahụ ga-agba mgbọrọgwụ n’obi ndị mmadụ.

M mechara laghachi Saskatun. N’ebe ahụ, m hụrụ otu nwaanyị mụrụ ụmụ nwaanyị abụọ bụ́ ejima. Aha ha bụ Jean Rothenberger na Joan nwanne ya. Ha bụ ndị ogbi. Mụ na ha gakọrọ ụlọ akwụkwọ ndị ogbi. Nwaanyị ahụ gwara m ka m mụwara ụmụ ya Baịbụl. Ọ dịghị anya, ha akụziwere ụmụ akwụkwọ ibe ha ihe ha na-amụta. Mmadụ ise n’ime ha mechara ghọọ Ndịàmà Jehova. Otu n’ime ha bụ Eunice Colin. Ebe mbụ m hụrụ Eunice bụ n’ụlọ akwụkwọ ndị ogbi ahụ mgbe m gụchawara akwụkwọ. N’oge ahụ, o nyere m swiit, jụọ m ma ànyị nwere ike ịbụ enyi. O mechara bụrụ onye m na-anaghị eji egwu egwu. Ọ ghọrọ nwunye m.

Mụ na nwunye m Eunice n’afọ 1960 nakwa n’afọ 1989

Mgbe mama Eunice chọpụtara na ọ na-amụ Baịbụl, ọ gwara onyeisi ụlọ akwụkwọ ha ka ọ kwụsị ya ịmụ Baịbụl. Onyeisi ụlọ akwụkwọ ha naara ya akwụkwọ ndị o ji amụ Baịbụl. Ma Eunice kpebisiri ike na ọ ga na-eme ihe Jehova chọrọ. Mgbe ọ chọrọ ime baptizim, papa ya na mama ya sịrị ya: “Ị ghọọ Onyeàmà Jehova, ị ga-akwapụrụ anyị n’ụlọ.” Eunice mechara hapụ ụlọ mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Otu ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova akpọrọ ya, lekọtawa. Ọ kwụsịghị ịmụ Baịbụl. E mechakwara mee ya baptizim. Mgbe mụ na ya gbara akwụkwọ n’afọ 1960, ndị mụrụ ya abịaghị agbamakwụkwọ anyị. Ma, ka afọ na-aga, ha malitere ịkwanyere anyị ùgwù n’ihi ihe ndị anyị kweere na otú anyị si zụọ ụmụ anyị.

JEHOVA NA-ELEKỌTA M

Nwa m nwoke Nicholas na Deborah nwunye ya na-eje ozi na Betel dị na Lọndọn

Anyị mụtara ụmụ nwoke asaa na-abụghị ndị ogbi. Ịzụ ha adịghịrị anyị mfe. Ma anyị gbara mbọ kụziere ha asụsụ ndị ogbi ka anyị na ha nwee ike ịna-ekwurịta okwu, anyị ana-akụzikwara ha eziokwu Baịbụl. Ụmụnna ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ nyeere anyị ezigbo aka. Dị ka ihe atụ, otu nwanna dere ihe n’akwụkwọ, gwa anyị na otu n’ime ụmụ anyị nọ na-ekwu okwu ọjọọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Anyị mere ihe ozugbo n’ebe ahụ. Ụmụ anyị anọ bụ́ James, Jerry, Nicholas, na Steven ji obi ha niile na-ejere Jehova ozi, ha na ndị ezinụlọ ha. Ha bụcha ndị okenye. Ihe ọzọ bụ na Nicholas na nwunye ya bụ́ Deborah nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Briten na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ogbi. Steven na nwunye ya bụ́ Shannan so ná ndị na-asụgharị akwụkwọ anyị n’asụsụ ndị ogbi n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Amerịka.

Ụmụ m bụ́ James, Jerry, na Steven nakwa ndị nwunye ha si n’ụzọ dị iche iche na-akwado ozi ọma a na-ekwusa n’asụsụ ndị ogbi

Mgbe ọ fọrọ otu ọnwa ka ọ bụrụ afọ iri anọ mụ na Eunice lụrụ, ọrịa kansa gburu ya. Okwukwe o nwere na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ mere ka obi sie ya ike n’oge ahụ niile ọ na-arịa ọrịa. M na-atụsi anya ike ịhụ ya ọzọ.

Faye na James; Jerry na Evelyn; Shannan na Steven

N’ọnwa abụọ n’afọ 2012, m dara ada gbajie úkwù, ya edoo m anya na e kwesịrị ịna-enyere m aka. N’ihi ya, m gara biri na nke otu nwa m nwoke na nwunye ya. Mụ na ha nọzi n’Ọgbakọ Calgary na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. M ka bụkwa okenye n’ọgbakọ ahụ. N’eziokwu, nke a bụ nke mbụ m na-anọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. Ebe ọ bụ na m nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ Bekee amụ ihe kemgbe afọ 1946, oleezi otú m si mee ka okwukwe m na-esi ike n’oge ahụ? Jehova emeerela m ihe o kwere ná nkwa na ya ga na-elekọta nwa na-enweghị nna. (Ọma 10:14) M na-ekele mmadụ niile ji obi ha niile na-edere m ihe n’akwụkwọ, na ndị mụrụ asụsụ ndị ogbi maka m nakwa ndị nyere aka na-asụgharịrị m ihe ndị a na-ekwu.

Mgbe m gara ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka mgbe m dị afọ iri asaa na itoolu

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mgbe ụfọdụ obi jọrọ m njọ, ya adị m ka m kwụsị ijere Jehova ozi n’ihi na aghọtaghị m ihe e kwuru ma ọ bụ na o yiri ka ndị mmadụ aghọtaghị ihe bụ́ mkpa ndị ogbi. Ma, n’oge ahụ niile, m chetara na Pita gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-alakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 6:66-68) Amụtala m inwe ndidi otú ahụ ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ bụ́ ndị ogbi nọrọla n’ọgbakọ ọtụtụ afọ mere. Amụtala m ichere Jehova na nzukọ ya. Ime otú ahụ abaarala m ezigbo uru. Ugbu a, akwụkwọ anyị juru eju bara abara n’asụsụ ndị ogbi. Ịga ọmụmụ ihe na mgbakọ n’asụsụ ndị ogbi na-atọ m ụtọ. N’eziokwu, obi dị m ụtọ na ozi m jeere Jehova, bụ́ Chineke ukwu anyị, emeela ka m na-enwe obi ụtọ, meekwa ka ọ gọzie m.