Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

‘Anyị Malitere Ịnụkwu Ọkụ n’Obi, Hụkwuokwa Jehova n’Anya’

‘Anyị Malitere Ịnụkwu Ọkụ n’Obi, Hụkwuokwa Jehova n’Anya’

N’ỤTỤTỤ Fraịdee n’ọnwa itoolu n’afọ 1922, ebe niile amalitela ikpo ọkụ ka puku mmadụ asatọ zukọtara n’otu ụlọ ezumeezu. Onyeisi oche mara ọkwa na n’oge a na-eme ihe omume a dị mkpa, onye chọrọnụ nwere ike ịpụ, ma o nweghị onye a ga-ekwe ka ọ bataghachi.

A bụrụ abụ otuto iji malite ihe omume ahụ. Mgbe a bụchara, Nwanna Joseph Rutherford gbagoro n’elu ikpo okwu. Ọtụtụ ndị anọrọ na-ele ka ha mara ihe ọ ga-ekwu. Ụfọdụ nọ na-agagharị ka ebe niile na-ekpo ọkụ. Nwanna Rutherford gwara ha ka ha nọrọ ọdụ, gee ntị. Ka ọ malitere ikwu okwu, ò nwere onye hụrụ nnukwu ákwà a fụkọtara, konye ya n’elu?

Nwanna Rutherford kwuru okwu isiokwu ya bụ: “Alaeze eluigwe dị nso.” O kwuru okwu ruo ihe dị ka otu awa na ọkara, olu ya ana-ada ka ogele n’ụlọ nzukọ ahụ. Ọ kọwara otú ndị amụma oge ochie si kwusaa banyere Alaeze ga-abịanụ n’atụghị egwu. Mgbe o kwuchawara okwu ya, ọ jụrụ, sị: “Ùnu kwetara na Eze ebube amalitela ịchị?” Mmadụ niile tiri, sị, “Ee.”

Nwanna Rutherford ji olu dara ụda kwuo, sị: “N’ihi ya, gaghachinụ ziwe ozi ọma, unu ụmụ Chineke kasị elu! Lee, Eze ahụ achịwala! Ọ bụ unu na-agbasara ya ozi. N’ihi ya, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na Alaeze ya.”

Ọ bụ mgbe ahụ ka e ji nwayọọ tọpee ákwà ahụ e konyere n’elu, ndị mmadụ ahụzie ebe e dere, “Kpọsaanụ Eze Ahụ na Alaeze ya.”

Nwanna Ray Bopp kwuru na “obi tọgburu ndị mmadụ atọgbu.” Anna Gardner kọwara otú “aka ha kụrụ si mee ka osisi ndị e ji kụọ gbamgbam maa jijiji.” Fred Twarosh kwuru, sị: “Mmadụ niile biliri ọtọ otu mgbe.” Evangelos Scouffas sịrị: “Ọ dị ka è nwere ike dọlitere anyị n’oche anyị, anyị eguzo ọtọ, anya mmiri eju anyị anya.”

Ọtụtụ ndị bịara mgbakọ ahụ ekwusawala ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, mgbakọ ahụ mere ka ha na-anụkwu ọkụ n’obi n’ozi ọma. Ethel Bennecoff kwuru na Ndị Mmụta Baịbụl ‘malitere ịnụkwu ọkụ n’obi, hụkwuokwa Jehova n’anya.’ Odessa Tuck, bụ́ nwanna nwaanyị dị afọ iri na asatọ n’oge ahụ, lọtara mgbakọ ahụ ma kpebisie ike ịza òkù ahụ a kpọrọ, nke bụ́ “Ònye ga-eje?” Ọ sịrị: “N’oge ahụ, amaghị m ebe ọ ga-abụ ma ọ bụ otú m ga-esi eje ya ma ọ bụkwanụ ihe bụ́ ozi ahụ. Otu ihe doro m anya bụ na m chọrọ ime ka Aịzaya, bụ́ onye sịrị, ‘Lee m! Ziga m.’” (Aịza. 6:8) Ralph Leffler kwuru, sị: “Ọ bụ n’ụbọchị ahụ pụrụ iche ka a malitere ịkpọsa Alaeze ahụ a ka na-akpọsa n’ụwa niile ruo taa.”

Ka a sịkwa ihe mere na ndị Jehova anaghị echefu mgbakọ ahụ pụrụ iche e mere n’afọ 1922 na Sida Pọịnt, Ohayo, echefu. George Gangas kwuru, sị: “Mgbakọ ahụ mere ka m kpebie na agaghị m ahapụ ịga mgbakọ ọ bụla.” Ruo n’ókè o nwere ike icheta, o nweghị nke ọ hapụrụ ịga. Julia Wilcox dere, sị: “Otú obi si adị m ụtọ ma akwụkwọ anyị kwuo gbasara mgbakọ ahụ e mere na Sida Pọịnt n’afọ 1922 abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Ihe m na-ekwu mgbe niile bụ, ‘Jehova, i meela kwe ka m gaa mgbakọ ahụ.’”

Ọtụtụ n’ime anyị taa nwere ike icheta mgbakọ anyị gara anyị na-anaghị echefu echefu n’ihi na ọ tọgburu anyị atọgbu, meekwa ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi, hụkwuokwa Chineke ukwu anyị na Eze ọ họpụtara n’anya. Anyị cheta mgbakọ ahụ, anyị na-ekwukwa, sị: “Jehova, i meela kwe ka m gaa mgbakọ ahụ.”