ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mee 2018
Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Julaị 9 ruo Ọgọst 5, 2018.
AKỤKỌ NDỤ
Adara M Ogbenye ná Mmalite, ma Baa Ọgaranya n’Ikpeazụ
Samuel Herd dara ogbenye ná mmalite, ma ugbu a, ọ bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ karịa otú o nwere ike iche n’echiche.
Udo, Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ya?
Ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa nsogbu juru, anyị ga-agbalịsi ike ka anyị nwee udo. Olee otú Okwu Chineke ga-esi nyere anyị aka.
Jehova Hụrụ Ndị Ji “Ntachi Obi Na-amị Mkpụrụ” n’Anya
Anyị nwere ike ịda mbà n’obi mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egecha anyị ntị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị niile nwere ike inwe ihe ịga nke ọma n’ozi anyị.
Ihe Mere Anyị Ji “Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”
Ọ dị mkpa ka anyị buru ihe mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma n’uche.
Mara Onye Iro Gị
Anyị ma otú Setan si eduhie ndị mmadụ ma ọ bụ nkata ọ na-akpa.
Ndị Na-eto Eto Guzogidenụ Ekwensu
Anyị na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-alụ agha. O nwere ike iyi ka ndị na-eto eto karịchaa agaghị emerili n’agha a, ma ha ekeela ekike maka ịlụ agha.
Ihe Ubi Hiri Nne
N’otu ebe dị na Yukren, e kee ndị nọ n’obodo ahụ ụzọ anọ, otu ụzọ bụ Ndịàmà Jehova.